Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Guzonụ Onwe Unu n’Ebe A, Hụ Nzọpụta Jehova”

“Guzonụ Onwe Unu n’Ebe A, Hụ Nzọpụta Jehova”

“Guzonụ Onwe Unu n’Ebe A, Hụ Nzọpụta Jehova”

“Jehova dịịrị m, m gaghị atụ egwu: gịnị ka mmadụ ga-eme m?” —ABỤ ỌMA 118:6.

1. Olee oké ọdachi ụmụ mmadụ na-eche ihu?

TAA, ụmụ mmadụ na-eche nnukwu ọdachi nke ụdị ya na-emetụbeghị ihu. Mgbe Jizọs na-ebu amụma na nke a ga-eme n’oge anyị, ọ dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghịkwa enwe ya ọzọ. N’eziokwu, ma ọ́ bụghị ma è mere ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta anụ ahụ́ ọ bụla; ma n’ihi ndị a họọrọ, a ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.”—Matiu 24:21, 22.

2. Olee ihe ji oké mkpagbu ahụ ịmalite?

2 Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe na-egbochi oké mkpagbu ahụ ugbu a, ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ apụghị iji anya ha ahụ ha. Jizọs mere ka Jọn onyeozi hụ ọhụụ na-egosi ihe mere ndị mmụọ ozi ji na-egbochi mkpagbu ahụ n’otu ọhụụ o nyere ya. Lee otú onyeozi ahụ mere agadi si kọwaa ya: “Ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha na-eguzo na nkuku anọ nke ụwa, na-ejidesi ifufe anọ nke ụwa ike . . . M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka o si n’ọwụwa anyanwụ na-arịgo, na-enwe akara nke Chineke ahụ dị ndụ; o wee jiri oké olu tikuo ndị mmụọ ozi anọ ahụ . . . na-asị: ‘Unu emebila ụwa ma ọ bụ oké osimiri ma ọ bụ osisi, ruo mgbe anyị kasịworo ndị ohu nke Chineke anyị akara n’egedege ihu ha.’”—Mkpughe 7:1-3.

3. Olee ihe oké mkpagbu ahụ ga-eji amalite?

3 Ịka akara ikpeazụ nke “ndị ohu nke Chineke anyị,” bụ́ ndị e tere mmanụ na-eru ná njedebe. Ndị mmụọ ozi anọ ahụ adịla njikere ịhapụ ifufe nke mbibi ndị ahụ. Mgbe ha hapụrụ ha, olee ihe mbụ ga-emenụ? Otu mmụọ ozi zara ajụjụ ahụ, sị: “Otú a ka a ga-eji ụzọ dị ngwa tụda obodo ukwu ahụ bụ́ Babilọn, ọ dịghịkwa mgbe a ga-ahụ ya ọzọ.” (Mkpughe 18:21) Lee ụdị ọṅụ a ga-enwe n’eluigwe mgbe nke a mere, bụ́ mgbe a ga-ebibi alaeze ụwa nke okpukpe ụgha!—Mkpughe 19:1, 2.

4. Olee ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?

4 Mba nile dị n’ụwa ga-agbakọtawo aka imegide ndị Jehova. Mba nile hà ga-enwe ike ikpochapụ Ndị Kraịst ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? O nwere ike iyi ka hà ga-emeli ya. Ma lee! Ndị agha eluigwe so Kraịst Jizọs n’azụ ga-ahụ na e bibiri ndị agha ahụ bụ́ ụmụ mmadụ. (Mkpughe 19:19-21) N’ikpeazụ, a ga-atụba Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya n’ime abis nke arụghị ọrụ. Ha agakwaghị enwe ike iduhie mmadụ n’ihi na a ga-eke ha agbụ ruo otu puku afọ. Leenụ otú nke ahụ ga-esi mee ka ahụ́ ruo oké ìgwè mmadụ lanahụrụ oké mkpagbu ahụ ala!—Mkpughe 7:9, 10, 14; 20:1-3.

5. Olee ihe ndị na-enye ọṅụ na-echere ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova?

5 Anyị ga-ahụ nnukwu ọdachi ndị a na-emenye ụjọ n’oge na-adịghị anya. Ha nile bụ iji hụ na e gosiri na ọ bụ nanị Jehova ka o ruuru ịchị eluigwe na ala. Cheekwa echiche banyere nke a: Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ma kwadosie ọbụbụeze ya ike, anyị ga-enwe ike iso doo aha Jehova nsọ ma soro mezuo nzube ya. Lee ọṅụ na-enweghị atụ nke ahụ ga-enye anyị!

6. N’ihi ihe ndị na-aga ime n’oge na-adịghị anya, olee ihe anyị ga-atụle?

6 Ànyị ejikerela maka ihe ndị ahụ dị mkpa ga-emenụ? Ànyị nwere okwukwe na Jehova ga-azọpụtali anyị? Obi ò siri anyị ike na ọ ga-agbatara anyị ọsọ enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị na n’ụzọ kasị mma? Ka anyị na-aza onwe anyị ajụjụ ndị ahụ, anyị nwere ike iburu n’obi ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya bi na Rom, nke bụ́: “Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Otu n’ime ihe ndị ahụ e dere iji nye anyị ntụziaka, nakwa iji kasie anyị obi ma mee ka anyị nwee olileanya bụ ihe ndekọ nke nnapụta Jehova napụtara ndị Izrel n’aka ndị Ijipt na-echi ha ọnụ n’ala. Iji nlezianya tụlee ihe ndị ahụ na-akpali akpali mere mgbe Jehova mere ihe iji napụta ụmụ Izrel kwesịrị ịgba anyị nnọọ ume ka anyị na-eche oké mkpagbu ahụ na-abịa n’ike n’ike.

Jehova Napụtara Ndị Ya

7. N’afọ 1513 T.O.A., olee ọnọdụ tara akpụ dapụtara n’Ijipt?

7 Ihe a anyị chọrọ ịkọ mere n’afọ 1513 T.O.A. Jehova adịla mbụ tie ndị Ijipt ihe otiti itoolu. Mgbe nke ikpeazụ n’ime ihe otiti ndị ahụ gasịrị, Fero ji okwu ndị a chụpụ Mozis: “Pụọ n’ahụ́ m laa, lezie onwe gị anya, ahụla ihu m ọzọ; n’ihi na n’ụbọchị ị hụrụ ihu m ka ị ga-anwụ.” Mozis zara ya, sị: “Nke ọma ka i kwuworo; m gaghị ahụkwa ihu gị ọzọ.”—Ọpụpụ 10:28, 29.

8. Olee ntụziaka e nyere ndị Izrel bụ́ nke ga-eme ka a zọpụta ha, oleekwa ihe si na ya pụta?

8 Jehova gwaziri Mozis na e nwere otu ihe otiti ọzọ ya ga-eti Fero na ndị Ijipt, nke ikpeazụ. Mgbe ọnwa Abib (Naịsan) gbara abalị iri na anọ, nwa ọ bụla na anụmanụ ọ bụla e buru ụzọ mụọ n’ezinụlọ ọ bụla nke ndị Ijipt gaje ịnwụ. Ma, a pụrụ ichebe nwa ọ bụla na anụmanụ ọ bụla e buru ụzọ mụọ n’ezinụlọ ndị Izrel ma ọ bụrụ na ha ejiri nlezianya gbasoo ntụziaka Chineke nyere Mozis. Ha ga-ewere ọbara ebulu fesa ya n’awara ụzọ ha abụọ nakwa n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ha ma ghara ịpụta èzí. Olee ihe mere n’abalị ahụ? Ka Mozis were ọnụ ya kọọrọ anyị ihe merenụ: “O ruo, n’etiti abalị, na Jehova tigburu nwa ọ bụla e buru ụzọ mụọ n’ala Ijipt.” Fero mere ihe ozugbo. Ọ kpọrọ Mozis na Erọn ma gwa ha, sị: “Bilienụ, sinụ n’etiti ndị m pụọ, . . . jeekwanụ, fee Jehova, dị ka unu kwuru.” Ndị Izrel pụwara ozugbo, ma eleghị anya ihe karịrị nde ndị Izrel atọ na “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” bụ́ ndị na-abụghị ndị Izrel a na-amaghị ọnụ ọgụgụ ha.—Ọpụpụ 12:1-7, 29, 31, 37, 38.

9. Olee ụzọ Chineke si na ya duru ndị Izrel pụọ n’Ijipt, n’ihi gịnịkwa?

9 Ụzọ kasị nso ndị Izrel ga-esi na ya gafee bụ ụzọ dị n’akụkụ Oké Osimiri Mediterenian, bụ́ nke gafere n’ala ndị Filistia. Ma nke ahụ bụ ógbè ndị iro. N’ihi ya, ikekwe iji gbochie ndị ya ịlụ agha, Jehova duuru ha si n’ụzọ ọzara Oké Osimiri Uhie gafee. Ọ bụ ezie na ndị ahụ dị ihe dị ka nde mmadụ atọ, ha nọ na-aga n’usoro. Bible kwuru, sị: “Ụmụ Izrel chịịrị ihe ekike agha si n’ala Ijipt rịgopụta.”—Ọpụpụ 13:17, 18.

“Hụ Nzọpụta Jehova”

10. N’ihi gịnị ka Chineke ji gwa ndị Izrel ka ha maa ụlọikwuu ha n’ihu Paịhahaịrọt?

10 Ihe dị egwu meziri. Jehova gwara Mozis, sị: “Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa, maa ụlọikwuu ha n’ihu Paịhahaịrọt, n’etiti Migdọl na oké osimiri, n’ihu Bel-zifọn.” Mgbe ìgwè mmadụ ahụ mere ihe a a sịrị ha mee, ha hụrụ onwe ha n’agbata ugwu na otu akụkụ nke Oké Osimiri Uhie. Ha yiri ndị tọrọ atọ. Ma, Jehova maara ihe ọ na-eme. Ọ gwara Mozis, sị: “M ga-emekwa ka obi Fero dị ike, ọ ga-achụkwa ha n’azụ; a ga-asọpụrụkwa m n’ahụ́ Fero na n’ahụ́ ụsụụ ndị agha ya nile; ndị Ijipt ga-amarakwa na Mụ onwe m bụ Jehova.”—Ọpụpụ 14:1-4.

11. (a) Olee ihe Fero mere, oleekwa ihe ndị Izrel mere n’ihi ya? (b) Olee otú Mozis si zaghachi ndị Izrel mgbe ha mewere mkpesa?

11 Fero bịara chee na ya kpara àgwà iberibe site n’ịhapụ ndị Izrel ka ha si n’Ijipt laa, n’ihi ya, ọ kpọọrọ narị ndị agha ịnyịnya isii aka siri ike chụwa ha ka a na-anwụ anwụ. Mgbe ndị Izrel hụrụ ndị agha Ijipt, ha malitere ịtụ ụjọ ma tikuo Mozis, sị: “Ọ̀ bụ n’ihi na ili adịghị n’Ijipt na ị chụpụwo anyị ịnwụ n’ọzara?” N’ihi obi ike Mozis nwere na Jehova ga-azọpụta ha, ọ zara ha, sị: “Unu atụla egwu, guzonụ onwe unu n’ebe a, hụ nzọpụta Jehova, nke Ọ ga-emere unu taa . . . Jehova ga-eburu unu agha, ma unu onwe unu ga-agba nkịtị.”—Ọpụpụ 14:5-14.

12. Olee otú Jehova si zọpụta ndị ya?

12 Dị nnọọ ka Mozis kwuru na Jehova ga-alụrụ ndị Izrel ọgụ, ihe ndị karịrị ikike mmadụ malitere ime. Mmụọ ozi Jehova rụrụ ọrụ ebube nke mere ka ogidi igwe ojii ahụ nọ na-edu ụlọikwuu ndị Izrel si n’ihu ha pụọ ma gaa n’azụ ha. Ọ bụ ezie na ogidi ahụ ghọrọ ọchịchịrị nye ndị Ijipt, ma ọ nọ na-enye ndị Izrel ìhè. (Ọpụpụ 13:21, 22; 14:19, 20) Mozis rubeere iwu Chineke nyere ya isi ma setịpụ aka ya. Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Jehova wee were ifufe Ihu anyanwụ dị ike mee ka oké osimiri ahụ jee n’azụ n’abalị ahụ nile . . . Ụmụ Izrel wee baa n’etiti oké osimiri ahụ n’elu ala akọrọ ahụ: mmiri ahụ wee ghọọrọ ha mgbidi n’aka nri ha, na n’aka ekpe ha.” Ndị Ijipt chụwara ha, ma Jehova nọnyeere ndị ya. O tinyere ndị agha Ijipt n’ọgba aghara ma gwazie Mozis, sị: “Setịpụ aka gị n’elu oké osimiri, mmiri ahụ ga-alọtakwa n’ahụ́ ndị Ijipt, n’ahụ́ ụgbọala ha, na n’ahụ́ ndị ịnyịnya ha.” Jehova bibiri ndị agha Fero kpamkpam nke na ọ dịghị onye agha ọ bụla fọrọ ndụ!—Ọpụpụ 14:21-28; Abụ Ọma 136:15.

Mụta Ihe ná Nzọpụta ahụ A Zọpụtara Izrel

13. Olee ihe ụmụ Izrel mere mgbe a napụtasịrị ha?

13 Olee otú obi dị ndị Izrel n’ihi ọrụ ebube ahụ Chineke rụrụ iji napụta ha? Leenụ, Mozis na ụmụ Izrel amadịghị mgbe ha ji bụwa abụ, na-eto Jehova! Ha bụrụ, sị: “Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na O biliwo elu nke ukwuu . . . Jehova ga-abụ eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Ọpụpụ 15:1, 18) Ee, ihe mbụ gbatara ha n’obi bụ ibuli Chineke elu. Ihe ahụ merenụ gosiri na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị.

14. (a) Olee ihe anyị pụrụ ịmụta banyere Jehova site n’ihe mere ndị Izrel? (b) Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 2008?

14 Olee ihe anyị mụtara n’ihe ndị ahụ na-akpali akpali merenụ, olee otú ha ga-esi kasie anyị obi ma mee ka anyị nwee olileanya? N’ezie, anyị ahụla na Jehova dị njikere inyere ndị ohu ya aka imeri ọnwụnwa ọ bụla a ga-anwa ha. Ọ dịghị ọnọdụ ọ bụla ha nwere ike ịnọ na ya nke ga-akarị ya akarị. Oké Osimiri Uhie egbochilighị ndị Izrel ịgafe mgbe Jehova mere ka ifufe dị ike si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee. O mekwara ka otu Oké Osimiri Uhie ahụ ghọọrọ ndị agha Fero ili. Ịtụgharị uche n’ihe a merenụ pụrụ ime ka anyị kwughachi ihe ọbụ abụ kwuru, bụ́ onye kwuru, sị: “Jehova dịịrị m, m gaghị atụ egwu: gịnị ka mmadụ ga-eme m?” (Abụ Ọma 118:6) Okwu Pọl e dere ná Ndị Rom 8:31 nwekwara ike ịkasị anyị obi, nke bụ́: “Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?” Lee nnọọ obi ike okwu ndị a e si n’ike mmụọ nsọ kwuo na-enye anyị! Ha na-ewepụ ụdị ụjọ na obi abụọ ọ bụla n’obi anyị ma mee ka anyị nwee olileanya. N’ihi ya, ọ dabara nnọọ adaba na isiokwu dịịrị afọ anyị maka afọ 2008 bụ: “Guzosienụ ike hụ nzọpụta Jehova”!—Ọpụpụ 14:13.

15. Olee otú nrubeisi dịruru ndị Izrel ná mkpa ná nnapụta ahụ a napụtara ha site n’Ijipt, oleekwa otú ọ dịruru anyị ná mkpa taa?

15 Olee ihe ọzọ anyị pụrụ ịmụta site n’Ọpụpụ ndị Izrel si n’Ijipt pụọ? Na anyị aghaghị irubere Jehova isi n’agbanyeghị ihe ọ sịrị anyị mee. Ndị Izrel rubere isi site n’ime ihe nile a sịrị ha mee n’ịkwadebe Ememe Ngabiga ahụ. Ha rubere isi nọrọ n’ime ụlọ ha n’abalị Naịsan 14. Ha “chịịrị ihe ekike agha [ma ọ bụ, ‘a haziri ha n’usoro dị ka ndị agha’]” mgbe ha mechara si n’Ijipt pụọ. (Ọpụpụ 13:18) Taa, ọ dị nnọọ mkpa na anyị ga-agbaso nduzi e si n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye anyị! (Matiu 24:45) Anyị kwesịrị nnọọ ige ntị nke ọma n’okwu Chineke anyị na-anụ n’azụ anyị, nke na-asị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:21) Ka anyị na-erukwu oké mkpagbu ahụ nso, anyị pụrụ inweta ntụziaka ndị a kapịrị ọnụ. Anyị ịgabiga oge ndị ahụ tara nnọọ akpụ n’enweghị ihe mere anyị ga-adabere n’anyị iso ndị ohu Jehova ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi na-emekọ ihe ọnụ.

16. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Chineke si mee ihe iji napụta ndị Izrel?

16 Chetakwa na Jehova dubara ndị Izrel n’ebe mere ka ha yie ndị tọrọ atọ n’agbata ugwu na Oké Osimiri Uhie. O yitụghị ka ụzọ ahụ ọ̀ bụ ụzọ ha kwesịrị isi. Ma Jehova maara ihe ọ na-eme, ihe nile gakwara nke ọma ma wetara ya otuto, wetakwara ndị ya nzọpụta. Taa, anyị nwere ike ghara ịghọtacha ihe mere nzukọ Jehova ji mee ihe ụfọdụ otú ha si mee ha, ma anyị pụrụ ịtụkwasị nduzi Jehova si n’aka ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi enye anyị obi. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ iyi ka ihe ọ̀ na-agara ndị iro anyị nke ọma karịa anyị. Ebe ọ bụ na anyị amaghị ihe nile, anyị agaghị enwe ike ịhụ ihe nile otú ha dị. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ga-agbanweli ọnọdụ otú ọ chọrọ kpọmkwem mgbe oge ya ruru, otú ahụ o meere ụmụ Izrel n’oge gara aga.—Ilu 3:5.

Tụkwasị Jehova Obi

17. Gịnị mere anyị nwere ike iji nwee obi ike zuru ezu na Chineke ga-echebe anyị?

17 Ì nwere ike ịtụle ụdị obi ike ndị Izrel na-aghaghị inwe mgbe ha chetara ogidi igwe ojii ahụ na-edu ha n’ehihie na ogidi ọkụ ahụ na-edu ha n’abalị? Nke ahụ gosiri na “mmụọ ozi nke Chineke” nọ na-edu ha n’ije ha. (Ọpụpụ 13:21, 22; 14:19) Taa, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova nọnyeere ndị ya, iduzi ha, ichebe ha na ịnapụta ha. Anyị pụrụ iburu nkwa a n’obi, nke bụ́: ‘Jehova adịghị ahapụ ndị ebere Ya, ruo mgbe ebighị ebi ka a na-edebe ha.’ (Abụ Ọma 37:28) Ya adịkwala mgbe anyị ga-echefu ndị mmụọ ozi dị ike na-enyere ndị ohu Chineke aka taa. Ebe ọ bụ na ha na-enyere anyị aka, anyị pụrụ ‘iguzo onwe anyị, hụ nzọpụta Jehova.’—Ọpụpụ 14:13.

18. Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ‘iyikwasị ekike agha zuru ezu nke sitere n’aka Chineke’?

18 Olee ihe ga-enyere anyị nile aka ‘iguzosi ike’ n’ụzọ nke eziokwu? Ọ bụ iyiri ekike agha ndị ahụ sitere n’aka Chineke Pọl kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs. Cheta na onyeozi ahụ dụrụ anyị ọdụ ka anyị ‘yikwasị ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke.’ Ànyị yi ihe nile mejupụtara ekike agha a sitere n’aka Chineke? N’afọ a bụ́ 2008, ọ ga-adị mma ka onye ọ bụla n’ime anyị chebara onwe ya echiche iji jide n’aka na o yi ihe nile mejupụtara ekike agha ahụ, nakwa na o yi ha nke ọma. Onye iro anyị bụ́ Setan Ekwensu, maara ebe anyị na-adịghị ike, ọ na-agbalịkwa ịnwụde anyị mgbe anyị na-anọghị na nche ma ọ bụ si n’ebe anyị na-adịghị ike buso anyị agha. Anyị nwere “mgba” megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ. N’agbanyeghị nke ahụ, site n’ike Jehova, anyị ga-emeri!—Ndị Efesọs 6:11-18; Ilu 27:11.

19. Ọ bụrụ na anyị atachie obi, olee ihe anyị ga-enwe ihe ùgwù ime?

19 Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Site ná ntachi obi unu, unu ga-enweta mkpụrụ obi unu.” (Luk 21:19) Ka anyị soro ná ndị ga-eji ikwesị ntụkwasị obi die ihe isi ike ọ bụla ha nwere ike izute ma soro ná ndị ‘ga-eguzo onwe ha, hụ nzọpụta Jehova’ site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ihe ndị na-akpali mmasị ga-eme n’isi nso?

• Olee otú Jehova si gosi na ya nwere ikike ịzọpụta ndị ya n’afọ 1513 T.O.A.?

• Olee ihe i kpebisiri ike ime n’ọdịnihu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

Isiokwu dịịrị afọ 2008 bụ: “Guzosienụ ike hụ nzọpụta Jehova.”—Ọpụpụ 14:13.

[Foto dị na peeji nke 17]

“Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka”

[Foto dị na peeji nke 18]

Isi akwara Fero gbara wetaara ndị Ijipt ọdachi

[Foto dị na peeji nke 19]

A zọpụtara ndị Izrel mgbe ha mere ihe nile Jehova gwara ha mee