Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Malakaị

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Malakaị

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Malakaị

Ọ KARỊALA iri afọ asaa e wughachiri ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem. Ma, ka oge na-aga, ofufe ndị Juu na-efe Chineke nyụrụ nnọọ ọkụ. Ọbụna ndị nchụàjà malitere ịrụrụ aka. Olee onye ga-eme ka ha mata ọnọdụ ha n’ihu Chineke ma nwaa ịtụteghachi ịnụ ọkụ n’obi ha maka ofufe Chineke? Jehova nyere onye amụma bụ́ Malakaị ọrụ a.

Malakaị ji okwu ndị siri ike dekọọ amụma ndị sitere n’ọnụ Chineke n’akwụkwọ ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ige ntị n’okwu amụma Malakaị nwere ike inyere anyị aka ijikere maka “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova,” bụ́ mgbe a ga-ebibi ajọ ụwa a.—Malakaị 4:5.

NDỊ NCHỤÀJÀ “EMEWO KA ỌTỤTỤ MMADỤ SỤỌ NGỌNGỌ”

(Malakaị 1:1–2:17)

Jehova gwara ndị Izrel otú obi dị ya n’ebe ha nọ, sị: “Ahụwo m unu n’anya.” Ma ndị nchụàjà elelịala aha Chineke. Olee otú ha si lelịa ya? Ọ bụ ‘site n’iweta nso achịcha e mere ka ọ ghara ịdị nsọ n’elu ebe ịchụàjà ya’ na inye ya ‘anụ gwọrọ ngwụrọ’ maka ịchụ àjà.—Malakaị 1:2, 6-8.

Ndị nchụàjà “emewo ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ.” Ndị ahụ ‘na-aghọgbu ibe ha.’ Ụfọdụ alụọla ụmụ nwanyị ala ọzọ. Ndị ọzọ aghọgbuola “nwunye [ha] lụtara n’okorobịa.”—Malakaị 2:8, 10, 11, 14-16.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:2—Olee otú Jehova si “bụọ ngọzi nile” nke ndị nchụàjà ahụ na-enupụ isi “ọnụ”? A pụrụ ikwu na Chineke mere nke a n’ihi na o mere ka ngọzi ọ bụla ndị nchụàjà ahụ rịọrọ arịrịọ maka ya bụrụ ọbụbụ ọnụ.

2:3—Olee ihe ‘ifesa nsị anụ’ n’ihu ndị nchụàjà ahụ pụtara? Iwu ahụ kwuru ka e wepụ nsị nke anụ ndị e ji chụọ àjà n’azụ ọmụma ụlọikwuu ma kpọọ ha ọkụ. (Levitikọs 16:27) Ifesa nsị anụ n’ihu ndị nchụàjà pụtara na Jehova jụrụ àjà ha na-achụ nakwa na ndị ahụ na-achụ ya adịghị ihe ha pụtara n’anya ya.

2:13—Olee ndị anya mmiri ákwá ha kpuchiri ebe ịchụàjà Jehova? Ọ bụ anya mmiri ákwá nke ụmụ nwanyị nọ na di bụ́ ndị bịara n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ iji gwa Jehova otú obi dị ha. Olee ihe kpataara ha ụdị mwute ahụ? Ndị di ha bụ́ ndị Juu agbaala ha alụkwaghịm n’ụzọ iwu na-akwadoghị ma hapụ ha, ikekwe iji lụrụ ụmụ agbọghọ ala ọzọ.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:10. Jehova anabataghị àjà nke ndị nchụàjà ahụ dị anyaukwu, bụ́ ndị na-ana ndị mmadụ ego iji rụọ ọbụna obere ọrụ ndị dị ka imechi ụzọ ma ọ bụ itinye ọkụ n’ebe ịchụàjà. Lee otú o si dị mkpa na ofufe anyị, bụ́ nke gụnyere ihe ndị anyị na-eme n’ozi Ndị Kraịst, sitere n’ịhụnanya achọghị ọdịmma onwe onye nanị anyị nwere maka Chineke na ndị agbata obi anyị, ọ bụghị n’ọchịchọ maka uru ego!—Matiu 22:37-39; 2 Ndị Kọrint 11:7.

1:14; 2:17. Jehova anaghị anabata ihu abụọ.

2:7-9. Ndị e nyere ihe ùgwù nke izi ihe n’ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na ihe ndị ha na-ezi kwekọrọ n’Okwu Chineke, bụ́ Akwụkwọ Nsọ, nakwa n’akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” bipụtara.—Luk 12:42; Jems 3:11.

2:10, 11. Jehova na-atụ anya ka ndị na-efe ya ofufe jiri ndụmọdụ ahụ bụ́ ịlụ di ma ọ bụ nwunye “nanị n’ime Onyenwe anyị” kpọrọ ihe.—1 Ndị Kọrint 7:39.

2:15, 16. Ndị na-efe ezi ofufe aghaghị ịkwanyere ọgbụgba ndụ ha na nwunye ha lụrụ n’okorobịa gbara ùgwù.

‘ONYENWE UNU AHỤ GA-ABỊARU ỤLỌUKWU YA’

(Malakaị 3:1–4:6)

“Onyenwe unu ahụ [Jehova Chineke] ga-abịaru ụlọukwu Ya na mberede” ya na “Onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ [Jizọs Kraịst].” Chineke “ga-abịakwute [ndị ya] nso ikpe ikpe,” bụrụkwa onye àmà dị ngwa megide ndị nile na-eme ihe ọjọọ. E wezụga nke ahụ, a ga-edere ndị na-atụ egwu Jehova “akwụkwọ ncheta.”—Malakaị 3:1, 3, 5, 16.

Ụbọchị ahụ nke “na-ere dị ka ite ọkụ ukwu” ga-abịa ma rechapụ ndị ajọ omume nile. Tupu ụbọchị ahụ abịa, a ga-ezipụ otu onye amụma ime “ka obi ndị bụ́ nna chigharịkwute ụmụ ha, ka obi ụmụ chigharịkwutekwa ndị bụ́ nna ha.”—Malakaị 4:1, 5, 6.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

3:1-3—Olee mgbe “Onyenwe unu ahụ” na “Onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ” bịara n’ụlọ nsọ ahụ, oleekwa onye e zipụrụ tupu ha abịaruo? Jehova bịara n’ụlọ nsọ ya ma mee ka ọ dị ọcha site n’izite onye nnọchiteanya ya na ya na Naịsan 10, 33 O.A. Nke ahụ bụ mgbe Jizọs banyere n’ụlọ nsọ ahụ ma chụpụsịa ndị na-azụ ma na-ere ihe na ya. (Mak 11:15) Nke a mere afọ atọ na ọkara e tesịrị Jizọs mmanụ dị ka Onye Ga-abụ Eze. N’otu aka ahụ, o yiri ka afọ atọ na ọkara e chisịrị Jizọs Eze n’eluigwe, ya na Jehova hà so bịa n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ ma chọpụta na ọ dị mkpa ime ka ndị Chineke dị ọcha. Na narị afọ mbụ, e zipụrụ Jọn Onye na-eme Baptizim ịkwadebe ndị Juu maka ọbịbịa Jizọs Kraịst. N’oge anyị, e zipụrụ onye ozi idozi ụzọ maka ọbịbịa Jehova ga-abịa n’ụlọ nsọ ihe atụ ya. N’afọ ndị 1880, otu ìgwè nke ndị mmụta Bible malitere ọrụ ịkụzi Bible iji mee ka ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi mata eziokwu Bible.

3:10—Iwebata “otu ụzọ n’ụzọ iri nile” ọ̀ na-anọchi anya anyị inye Jehova ihe nile anyị nwere? Ọnwụ Jizọs kagburu Iwu Mozis, n’ihi ya, iwu ejikwaghị ndị Chineke iji ego enye otu ụzọ n’ụzọ iri. N’agbanyeghị nke ahụ, inye otu ụzọ n’ụzọ iri nwere ihe ọ nọchiri anya ya. (Ndị Efesọs 2:15) Ọ pụtaghị anyị inye ihe nile anyị nwere. A na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri kwa afọ, ma anyị na-enye Jehova ihe nile anyị nwere otu ugboro—mgbe anyị raara onwe anyị nye ya ma gosi nrara nye ahụ site n’ikwe ka e mee anyị baptizim n’ime mmiri. Site n’oge ahụ gawa, ihe nile anyị nwere bụ nke Jehova. Ma, ọ na-ekwe ka anyị kpebie ihe anyị ga-enye maka ozi ya site n’ihe anyị nwere—ya bụ otu ụzọ n’ụzọ iri ihe atụ. Ọ bụ ihe ọ bụla ọnọdụ anyị kwere anyị mee na ihe obi anyị kwaliri anyị inye. Onyinye anyị na-enye Jehova gụnyere oge, ume, ikike, na ihe onwunwe anyị ndị anyị ji rụọ ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. Ọ gụnyekwara ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, ileta ndị kwere ekwe ibe anyị na-arịa ọrịa na ndị mere agadi, na iji ego anyị akwado ezi ofufe.

4:3—Olee otú ndị na-efe Jehova ga-esi ‘zọda ndị na-emebi iwu’? Ndị Chineke nọ n’ụwa agaghị ‘azọda ndị na-emebi iwu’ n’ụzọ nkịtị, ya bụ, iso mezuo ihe e kpere n’ikpe megide ha. Kama nke ahụ, nke a na-egosi na ndị ohu Jehova nọ n’elu ala ga-eme nke ahụ n’ụzọ ihe atụ site n’iji obi ha nile soro n’ememe mmeri ga-esochi ọgwụgwụ nke ụwa Setan.—Abụ Ọma 145:20; Mkpughe 20:1-3.

4:4—N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ‘cheta iwu Mozis’? Iwu ahụ ejighị Ndị Kraịst, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 10:1) N’ihi ya, ịṅa ntị n’ihe ndị dị n’Iwu Mozis nwere ike inyere anyị aka ịhụ otú ihe ndị dị na ya si mezuo. (Luk 24:44, 45) Ọzọkwa, Iwu ahụ nwere “ihe atụ nke ihe ndị dị n’eluigwe.” Ọ dị anyị ezigbo mkpa ịmụ ya ma ọ bụrụ na anyị ga-aghọta ozizi na àgwà Ndị Kraịst.—Ndị Hibru 9:23.

4:5, 6—Ònye ka “Ịlaịja, bụ́ onye amụma” nọchiri anya ya? E buru amụma na “Ịlaịja” ga-arụ ọrụ mweghachi, ya bụ, ọrụ ịkwadebe obi ndị mmadụ. Na narị afọ mbụ O.A., Jizọs Kraịst kọwara Jọn Onye Na-eme Baptizim dị ka “Ịlaịja.” (Matiu 11:12-14; Mak 9:11-13) E zipụrụ ndị nọchiri anya ya n’oge a “tupu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa.” Ọ dịghị onye ọzọ bụ́ Ịlaịja taa ma ọ́ bụghị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Ìgwè Ndị Kraịst a e tere mmanụ ejiriwo ịdị uchu nọgide na-arụ ọrụ mweghachi ihe atụ ahụ, ya bụ ọrụ ime ka ndị mmadụ na Chineke dịghachi ná mma.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

3:10. Ịjụ inye Jehova ihe nile anyị nwere ike inye bụ ịnapụ onwe anyị ngọzi ya.

3:14, 15. N’ihi ihe nlereanya ọjọọ nke ndị nchụàjà, ndị Juu malitere ileda ozi Chineke anya. Ndị e nyere ọrụ nlekọta n’ọgbakọ Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ezi ihe nlereanya.—1 Pita 5:1-3.

3:16. Jehova na-edetu aha ndị na-atụ egwu ya ma na-ekwesị ntụkwasị nye ya. Ọ na-echeta ha, ọ ga-echebekwa ha mgbe ọ na-ebibi ajọ ụwa Setan. N’ihi ya, ya adịla mgbe anyị ga-ada mbà ná mkpebi anyị mere ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke.—Job 27:5.

4:1. N’ụbọchị ụmụ mmadụ ga-aza Jehova ajụjụ, a ga-ebibi ma “alaka” ma “mkpọrọgwụ”—a ga-ama ụmụaka otu ikpe ahụ a mara ndị mụrụ ha. Lee ka nke ahụ si nye nne na nna ibu ọrụ n’ebe obere ụmụaka ha nọ! Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ ma nọgide bụrụ ndị enyi ya.—1 Ndị Kọrint 7:14.

“Tụọ Egwu Chineke”

Olee ndị a ga-azọpụta ‘n’oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova’? (Malakaị 4:5) Jehova kwuru, sị: “Unu ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-awara, ọgwụgwọ dịkwa na nku ya; unu ga-apụkwa, wụlie elu dị ka ụmụ ehi nke ụlọ ebe a na-eme ka anụ maa abụba.”—Malakaị 4:2.

Jizọs Kraịst, bụ́ “anyanwụ nke ezi omume,” waara ndị na-atụ egwu aha Chineke ma na-asọpụrụ ya, ha na Jehova dịkwa ná mma. (Jọn 8:12) O wetaara ha ‘ọgwụgwọ na nku ya’—ọgwụgwọ ihe atụ ugbu a na ọgwụgwọ nkịtị zuru ezu nke anụ ahụ́ na nke uche n’ụwa ọhụrụ Chineke. (Mkpughe 22:1, 2) N’ihi obi ụtọ na ọṅụ juru ha obi, ha na-eme ka “ụmụ ehi nke ụlọ ebe a na-eme ka anụ maa abụba.” Ebe anyị na-atụ anya ụdị ngọzi ndị ahụ, ka anyị buru ndụmọdụ Eze Solomọn n’uche, nke bụ́: “Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.

[Foto dị na peeji nke 26]

Malakaị onye amụma, ohu Chineke nke na-anụ ọkụ n’obi

[Foto dị na peeji nke 29]

Ihe anyị na-akụzi kwesịrị ikwekọ na Bible

[Foto dị na peeji nke 29]

Ndị ohu Jehova na-akwanyere ọgbụgba ndụ alụmdi na nwunye ha ùgwù