Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-enwe “Obi Ọmịiko”

Na-enwe “Obi Ọmịiko”

Na-enwe “Obi Ọmịiko”

Ọ DỊBEGHỊ mgbe ọ dị ụmụ mmadụ ibe anyị mkpa ka e jiri nnọọ ọmịiko nyere ha aka otú ọ dị ha ugbu a ka ha na-edi ụnwụ nri, ọrịa, ịda ogbenye, mpụ, ọgba aghara, na ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ọmịiko pụtara mmadụ ịma ahụhụ onye ọzọ na-ata ma ọ bụ ihe isi ike onye ahụ nọ na ya na inwe ọchịchọ ibelata ya. Dị ka otú otu iko mmiri oyi nwere ike isi mee ka ahụ́ jụọ mmadụ oyi n’oge oké okpomọkụ mgbe anyanwụ na-achasi ike, otú ahụ ka ọmịiko nwere ike isi meda onye dara mba n’obi obi, belata ihe mgbu mmadụ na-enwe ma gbaa onye na-ata ahụhụ ume.

Anyị nwere ike igosi ọmịiko site n’omume na okwu ọnụ anyị—na-eche banyere ndị ọzọ ma na-adị njikere inyere ha aka mgbe enyemaka anyị dị ha mkpa. Ọ dịghị mma ka ọ bụrụ nanị ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị ka anyị ga na-enwe ọmịiko n’ahụ́ ha. Anyị nwere ike ịmalite inwe ọmịiko ọbụna n’ahụ́ ndị anyị na-amabughị. Mgbe Jizọs Kraịst na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya, ọ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ ndị na-ahụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee ụgwọ ọrụ unu nwere?” Nwoke a dị ọmịiko kwukwara, sị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 5:46, 47; 7:12.

I nwere ike ịgụ okwu ndị a n’Akwụkwọ Nsọ. Ọtụtụ ndị kweere na Bible bụ ebe kasị mma anyị nwere ike isi mụta otú e si eme ọmịiko. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị ugboro ugboro na ọ bụ ọrụ dịịrị anyị inyere ndị ihe ụfọdụ mere ka ha ghara inwe ike igbo mkpa ha aka. Bible mere ka anyị ghọta Onye Chepụtara ya na Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, dị ka onye kasị nwee ọmịiko.

Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ, sị: “[Chineke] na-azọtara ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ihe ndị ruuru ha. Ọ na-elekọta ndị bịara abịa ma na-enye ha nri na uwe.” (Deuterọnọmi 10:18, Contemporary English Version) A kọwara Jehova Chineke dị ka “Onye na-emere ndị a na-emegbu ihe O kpere n’ikpe; Onye na-enye ndị agụụ na-agụ nri.” (Abụ Ọma 146:7) Jehova nyere iwu banyere ndị si mba ọzọ kwabata bụ́ ndị ihe na-esiri ike, sị: “Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ́ unu ka ọbịa ga-adịrị unu . . . ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị.”—Levitikọs 19:34.

Otú ọ dị, ọ naghị adị mfe mgbe nile inwe ọmịiko. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi akwụkwọ ozi, sị: “Yipụnụ ụdị mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yikwasịnụ onwe unu ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ, bụ́ nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị . . . Dị ka ndị Chineke họọrọ, ndị dị nsọ a hụkwara n’anya, yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko.”—Ndị Kọlọsi 3:9, 10, 12.

N’ihi ya, ịmụta inwe ọmịiko chọrọ mgbalị. O so ‘n’ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ’ a na-atụ anya ka Ndị Kraịst yikwasị. Pọl biri n’obodo Rom oge ochie e ji ime ihe ike mara. Ọ gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha gbanwee àgwà ha kpamkpam iji ghọọ ndị na-emekwu ebere ma dịkwuo ọmịiko.

Ikike nke Ọmịiko

Ụfọdụ ndị na-ewere ndị na-eme ebere dị ka ndị na-adịghị ike na ndị dị mfe nrigbu. Echiche ahụ ò ziri ezi?

Ọ dịghị ma ọlị! Isi ihe na-akpali ezi ọmịiko bụ ịhụnanya miri emi, bụ́ nke si n’aka Chineke, bụ́ onye kasị ahụ n’anya. “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:16) Ọ dabara adaba na a kpọrọ Jehova “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3) Ihe bụ́ isi okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “obi ebere” pụtara bụ “ebere, ọmịiko n’ihi ihe ọjọọ dabaara ndị ọzọ.” Ọbụna Jehova “dị obiọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ”!—Luk 6:35.

Onye Okike anyị chọrọ ka anyị onwe anyị kwa na-akpa àgwà ndị na-egosi obiọma, dị ka ọmịiko. Anyị na-agụ na Maịka 6:8, sị: “Gị mmadụ, O gosiwo gị ihe dị mma; ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya?” N’Ilu 19:22, anyị na-agụ, sị: “Ihe na-eme ka a na-achọsi mmadụ ike bụ ebere ya.” Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ́ onye gosipụtara àgwà Nna ya n’ụzọ zuru okè, dụkwara ụmụazụ ya ọdụ, sị: “Nọgidenụ na-eme ebere, dị nnọọ ka Nna unu na-eme ebere.” (Luk 6:36) The Jerusalem Bible si otú a sụgharịa ndụmọdụ a: “Na-enwenụ ọmịiko dị ka Nna unu si enwe ọmịiko.”

E nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-enwe ọmịiko otú ahụ, n’ihi na ọ pụrụ ime ka anyị nweta ezigbo ụgwọ ọrụ. Mgbe mgbe, anyị na-ahụ eziokwu dị n’ihe e dere n’Ilu 11:17: “Onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere bụ.” Mgbe anyị meere onye nọ ná mkpa ọmịiko, Chineke na-ewere ya na ọ bụ Ya ka anyị meere ihe ọma ahụ. Ọ na-ewere ya dị ka ọrụ dịịrị ya ịkwụ ndị na-efe ya ụgwọ ọrụ maka omume ọmịiko ọ bụla ha mere. E nyere Eze Solomọn ike mmụọ nsọ ikwu, sị: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ ga-akwụghachi ya.” (Ilu 19:17) Pọl dekwara, sị: “Unu maara na onye ọ bụla, n’agbanyeghị ihe ọma ọ bụla ọ pụrụ ime, ga-anataghachi nke a n’aka Jehova.”—Ndị Efesọs 6:8.

Ọmịiko nwere ike ime ka udo dịrị, ọ na-edozikwa esemokwu. Ọ na-enye aka ewepụ nghọtahie, ma na-eme ka ọ dị mfe ịgbaghara mmejọ. Mmadụ nwere ike ịghọtahie anyị n’ihi na ọ bụghị mgbe nile ka anyị na-ekwupụtacha ihe dị anyị n’obi otú anyị chọrọ, ma ọ bụkwanụ e nwere ike ịghọtahie ihe anyị mere. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọmịiko na-enye aka ma gbochie esemokwu. Ọ na-adị mfe ịgbaghara onye a maara na ọ na-enwe ọmịiko n’ahụ́ ndị ọzọ mgbe o mejọrọ. Ọmịiko na-enyere anyị aka ime ihe kwekọrọ na ndụmọdụ a Pọl nyere Ndị Kraịst: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ọmịiko—Ime Ebere

Ọzọkwa, ọmịiko nwere ikike ibelata ahụhụ. Dị ka anyị kwurula, ọmịiko bụ imere ndị nọ n’ahụhụ ebere, ọ na-emekwa ka anyị soro ndị na-ata ahụhụ taa ahụhụ. Ọmịiko pụtakwara ichebara ndị nọ ná nsogbu echiche na ime ihe a hụrụ anya iji nyere ha aka.

Ndị Kraịst na-eṅomi Jizọs site n’inwe ọmịiko. Ọ dịghị mgbe o kwuru na ya ji ọrụ n’aka nke na ya agaghị enyeliri ndị mmadụ aka ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ihe metụtara ofufe Chineke. Mgbe ọ hụrụ na ndị ọzọ nọ ná mkpa, ọmịiko mere ka ọ chọọ otú ọ ga-esi nyere ha aka.

Tụlee ihe Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ọ na-adịghị onye na-akụziri ha ihe banyere Chineke: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Otu ọkà mmụta Bible kwuru na okwu a sụgharịrị ịbụ “o nwere ọmịiko” pụtara “mmetụta uche nke na-akpali mmadụ ruo n’ime ime obi ya.” N’ezie, a kpọrọ okwu a otu n’ime okwu ndị kasị sie ike n’asụsụ Grik maka mmetụta nke ọmịiko.

N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst dị ọmịiko na-eme ngwa inyere ndị mmadụ aka ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’inyeju ndị agụụ nke okwu Chineke na-agụ afọ. Pita onyeozi dere, sị: “Unu nile nwee otu obi, na-egosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, na-enwe obi ọmịiko.” (1 Pita 3:8) Dị ka ihe atụ, mgbe otu ezinụlọ Ndị Kraịst nọ ná mkpa na-aghaghị ịkwaga ebe ọzọ n’ihi ọrịa, ndị kwere ekwe ibe ha kwere ka ha biri n’otu ụlọ n’akwụghị ụgwọ ụlọ ruo ọnwa isii. Nna nwe ụlọ ahụ kọrọ, sị: “Kwa ụbọchị ha na-abịa ịmara otú anyị mere, okwu agbamume ha mekwara ka ahụ́ ruo anyị ala.”

Ezi Ndị Kraịst na-echekwa banyere mkpa nke ndị ha na-amaghị. Ha na-eji obi ụtọ ewepụta oge ha, ike ha, na ihe onwunwe ha iji jeere ndị ha na-amaghị ozi. Ndịàmà Jehova bụ ndị ọrụ afọ ofufo ahụ e kwuru banyere ha n’isiokwu bu nke a ụzọ bụ́ ndị nyeere ndị ha na-amabughị aka.

N’ihi ya, e ji ọmịiko na ebere mara nnọọ ọgbakọ Ndị Kraịst. Ịhụnanya na-akpali ndị nọ n’ọgbakọ ịchọ ụzọ ndị ha ga-esi na-ejere ndị ọzọ ozi. O nwere ike ịdị ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nọ n’ọgbakọ mkpa ka i chebara ha echiche ma meso ha omume ọmịiko n’ihi nsogbu dị iche iche ha na-enwe. Ì nwere ike inyere ndị dị otú ahụ aka ịnagide ịda ogbenye, enweghị ego zuru ezu iji na-agwọ onwe ha, enweghị ebe obibi zuuru ha, ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ ha na-enwe?

Tụlee ihe banyere otu di na nwunye na Gris. Nke nwoke rịara ọrịa strok. E bugara ya na nwunye ya n’otu ụlọ ọgwụ dịpụrụ nnọọ adịpụ site n’ụlọ ha. Otú ọ dị, ihe ha ji na-akpata obere ego bụ ọtụtụ oroma ha na-aghọ ma na-ere. Ònye ga na-aghọrọ ha ya ma na-ere ya mgbe ha nọ n’ụlọ ọgwụ? Ndị ọgbakọ ha mere ihe. Ha ghọrọ oroma ndị ahụ ma ree ha, bụ́ nke mere ka ego dịtụ di na nwunye ahụ nọ ná mkpa n’aka, meekwa ka obi ruo ha ala.

Ọ dị ọtụtụ ụzọ a pụrụ isi gosipụta ọmịiko. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst dị ọmịiko maara na mgbe ụfọdụ isi ihe dị ndị nọ ná nsogbu mkpa bụ ndị ga-eleta ha ịma otú ha mere ma jiri ọmịiko gee ha ntị, metere ha ebere, ma jiri Akwụkwọ Nsọ kasie ha obi.—Ndị Rom 12:15.

Gị na Ndị Nwere Obi Ọmịiko Kpakọọ

E ji udo na nkasi obi mara ọgbakọ Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ, ndị nọ na ya dịkwa ọmịiko ma na-eme ebere. Ezi Ndị Kraịst maara na ọmịiko na-adọta ndị mmadụ, nakwa na obi ịta mmiri na-achụ ha achụ. N’ihi ya, ka ha na-agbalị iṅomi Nna ha nke eluigwe, ha na-anwa ịdị “na-enwe obi ọmịiko” n’ụzọ ndị a hụrụ anya.

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-agba gị ume ka ị bịa hụ ọmịiko, ịhụnanya na nchebara echiche e ji mara ọgbakọ Ndị Kraịst ha. O doro ha anya na àgwà ndị a dị n’ọgbakọ ha ga-amasị gị.—Ndị Rom 15:7.

[Foto dị na peeji nke 5]

Pọl gbara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ume ka ha yikwasị onwe ha mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Mgbe Jizọs hụrụ na ndị mmadụ nọ ná mkpa, o ji ọmịiko chọọ ụzọ ọ ga-esi nyere ha aka