Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onyinye ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa I Nyere M”

“Onyinye ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa I Nyere M”

“Onyinye ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa I Nyere M”

NKE ahụ bụ otú onye bụ́bu praịm minista mba Belgium si kọwaa akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. * Otu onye agbata obi ya letara ya, ọ natakwara ya akwụkwọ ahụ. Mgbe e mesịrị, o degaara onye agbata obi ya ahụ akwụkwọ ozi ekele, sị: “Nleta i letara m masịrị m nnọọ, onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa i nyere m masịdịrị m karịa: ya bụ akwụkwọ ahụ kọwara ‘Nwoke ahụ Kasị Ukwuu.’”

Onye ahụ bụ́bu praịm minista tụlere akwụkwọ ahụ ma kwuo, sị: “A sị na ndị mmadụ ga-enwekwu mmasị n’Oziọma anọ ahụ ma tinye ụkpụrụ Jizọs Kraịst n’ọrụ, ụwa agatụghị adị otú ọ dị taa. Kansụl Nchebe agaghị adịkwa anyị mkpa; a gaghịkwa enwe mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu, ụwa agaghịkwa anabata ime ihe ike.” Ọ bụ ezie na o kwuru na nke a yiri ihe a na-arọ ná nrọ, o kwuru na ya ji ihe ọma ahụ onye agbata obi ya meere ya kpọrọ ihe.

Akwụkwọ ozi ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ị nọ n’òtù ndị nwere obiọma bụ́ ndị na-anaghị enwe nchekwube gabiga ókè ma ọ bụ na-eche na ụwa enweghị mmekwata, kama nke ahụ, ha kweere na ihe ga-aka mma nakwa na ụmụ mmadụ ga-emezili àgwà ha.”

Ndịàmà Jehova kweere na Jehova, ọ bụghị ụmụ mmadụ, ga-emesị mee ka ụwa ka mma. Ha na-anwa iṅomi nwoke ahụ kasị ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst. Ndịàmà Jehova hà abịala na nke gị na nso nso a? Ikekwe, ọ ga-amasị gị ka ha kọọrọ gị ihe banyere nwoke ahụ kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Obi ga-adịkwa ha ụtọ inye gị akwụkwọ ahụ masịrị nnọọ onye a bụ́bu praịm minista.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 2 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.