Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọ Nche Ọhụrụ A Na-amụ Amụ

Ụlọ Nche Ọhụrụ A Na-amụ Amụ

Ụlọ Nche Ọhụrụ A Na-amụ Amụ

MAGAZIN a ị na-agụ bụ mbipụta nke mbụ nke Ụlọ Nche a na-amụ amụ. Ka anyị kọwaara gị ihe ụfọdụ banyere Ụlọ Nche ọhụrụ a.

Ọ bụ Ndịàmà Jehova na ndị a na-amụrụ Baịbụl na-eme nke ọma ka e bipụtaara Ụlọ Nche a. A ga na-ebipụta ya otu ugbo n’ọnwa, ọ ga na-enwekwa isiokwu anọ ma ọ bụ ise a ga-amụ amụ. A ga na-ede otú a ga-esi na-amụ isiokwu ndị a n’ihu Ụlọ Nche nke ọ bụla. Ebe ọ bụ na a gaghị eji magazin a aga ozi ọma, ihu ya agaghị na-agbanwe agbanwe dị ka Ụlọ Nche nke ọhaneze.

Na peeji nke abụọ nke Ụlọ Nche nke ọ bụla, ị ga-ahụ ebe a kọwara ná mkpirikpi ihe isiokwu nke ọ bụla a ga-amụ amụ na-ekwu, ma ọ bụ ihe isiokwu ndị a ga-amụ amụ na-ekwu, tinyere isiokwu ndị ọzọ. Nke a ga-enyere nnọọ nwanna na-eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche aka mgbe ọ na-akwadebe ọmụmụ ihe ahụ ka o wee nwee ike iwepụta ihe ndị ga-abara onye ọ bụla uru mgbe a na-amụ ya n’ọgbakọ.

Ị ga-achọpụta na isiokwu ndị ahụ aharuchaghị otú ha na-ahabu. Nke a ga-eme ka e nwee ohere a ga-eji tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi dị n’isiokwu ahụ mgbe a na-amụ ya n’ọgbakọ. Jisie ike gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ niile e zoro aka na ha kwa izu. Mgbe a na-amụ Ụlọ Nche n’ọgbakọ, e kwesịrị ịgụ ma kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ e dere “gụọ.” E nwekwara ike ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ ma ọ bụrụ na oge dị. N’isiokwu ụfọdụ, i nwere ike ịhụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e dere “tụlee.” Ebe ọ bụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a ewepụtachaghị isi ihe dị na paragraf a na-atụle, e nwere ike a gaghị agụ ha mgbe a na-amụ ihe n’ọgbakọ. Ma, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a e dere “tụlee” kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe a na-ekwu. Jisie ike gụọ ha mgbe ị na-akwadebe ọmụmụ ihe Ụlọ Nche. I nweziri ike iwebata ha mgbe ị na-aza ajụjụ.

A gaghịzi na-ebipụta akụkọ mgbaafọ n’Ụlọ Nche. Malite n’afọ 2008, ọ ga na-adịzi n’ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nakwa na Yearbook. Ma dị ka e kwuru n’elu, a ga-enwe isiokwu ndị ọzọ n’Ụlọ Nche a a ga na-amụ amụ. Ọ bụ eziokwu na a gaghị amụ ọtụtụ n’ime ha n’ọgbakọ, jisie ike gụọ ha nke ọma. Ha bụkwa nri ime mmụọ si n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.”—Mat. 24:45-47.

Ma anyị ekwesịghị iwere na Ụlọ Nche nke a a na-amụ amụ na nke ọhaneze bụ magazin abụọ dị iche. Ha abụọ ka bụkwa Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova. E kwuru otu ihe na peeji nke abụọ nke Ụlọ Nche nke ọ bụla. Ha kọwara ihe mere e ji ebipụta Ụlọ Nche. A ga-etinyekọta ha abụọ mgbe a na ewepụta mpịakọta Ụlọ Nche kwa afọ. Isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche abụọ ahụ ga-adịchakwa na “Ì Chetara?” bụ́ nke a ga-ebipụta n’Ụlọ Nche nke a ga-amụ amụ.

Kemgbe 1879, ma mgbe a na-alụ agha, ma n’oge ihe isi ike, ma n’oge mkpagbu, Ụlọ Nche anọgidela na-ekwusa eziokwu banyere Alaeze Chineke. Ekpere anyị bụ na ndị nke ọhụrụ a ga-anọgidekwa na-eme otú ahụ site n’enyemaka Jehova. Anyị na-ekpekwa ekpere ka Jehova gọzie gị onwe gị na-agụ ya agụ ka ị na-agụ Ụlọ Nche ọhụrụ a a na-amụ amụ.