Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Mere Ka Ndụ Ha Na-atọkwu Ha Ụtọ—Ị̀ Pụrụ Ime Otu Ihe Ahụ?

Ha Mere Ka Ndụ Ha Na-atọkwu Ha Ụtọ—Ị̀ Pụrụ Ime Otu Ihe Ahụ?

Ha Mere Ka Ndụ Ha Na-atọkwu Ha Ụtọ—Ị̀ Pụrụ Ime Otu Ihe Ahụ?

MARC, bụ́ nwanna nwoke nọ na Canada, na-arụ ọrụ n’ebe a na-emepụta ọkpọka ígwè e ji aga ná mbara igwe. Ọ na-arụ ọrụ ụbọchị ụfọdụ na-arụkwa ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. Otu ụbọchị, onye na-elekọta ebe Marc na-arụ gwara ya na a na-aga ibuli ya n’ọkwá, nke pụtara na ọ ga na-arụzi ọrụ n’ụbọchị niile ma na-eri ụgwọ ọnwa buru ibu. Gịnị ka Marc mere?

Amy, bụ́ nwanna nwaanyị bi n’obodo Philippines, rụrụ ọrụ ọsụ oge niile mgbe ọ fọrọ obere ka ọ gụchaa akwụkwọ. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, o nwetara ọrụ ga na-enye ya ezigbo ego nke ga na-ewekọrọkwa oge ya. Gịnị ka Amy mere?

Ihe Marc mere dị iche n’ihe Amy mere, ihe sikwa n’ihe ha abụọ mere pụta mere ka amamihe dị na ndụmọdụ ahụ e nyere Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt oge ochie pụta ìhè. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ndị ji ụwa eme ihe dịrịkwa ka ndị na-adịghị eji ya eme ihe n’uju.”—1 Kọr. 7:29-31.

Jiri Ụwa Na-eme Ihe ma Ejila Ya Eme Ihe n’Uju

Tupu anyị amata ihe mere Marc na Amy, ka anyị tụlegodị ná mkpirikpi ihe okwu ahụ bụ́ “ụwa” (ma ọ bụ, koʹsmos n’asụsụ Grik) nke Pọl ji mee ihe n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrịnt pụtara. N’ebe ahụ, okwu ahụ bụ́ koʹsmos pụtara ụwa nke anyị bi n’ime ya, ya bụ́, ụwa dum mmadụ bi, nke gụnyekwara ihe nke ụwa a ndị dị ka ụlọ obibi, nri na uwe. * Anyị ga-arụrịrị ọrụ e ji akpata ego iji nweta ihe ndị a dị mkpa ná ndụ. N’ezie, ọ dịghị otú ọzọ anyị ga-esi rụọ ọrụ e nyere anyị n’Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ ịkpata ihe anyị na ndị ezinụlọ anyị ga-eri ma ọ bụghị site n’iji ihe ndị dị n’ụwa arụ ha. (1 Tim. 5:8) Ma anyị ghọtakwara na “ụwa na-agabiga.” (1 Jọn 2:17) N’ihi ya, anyị na-eji ụwa eme ihe ruo n’ókè kwesịrị ekwesị ma anyị adịghị eji ya eme ihe “n’uju.”—1 Kọr. 7:31.

N’ihi ndụmọdụ ahụ e nyere na Baịbụl ka a ghara iji ụwa eme ihe n’uju, ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị elebarala ndụ ha anya, chọta ọrụ na-agaghị na-ewecha oge ha, ma gbalịa ibi ndụ dị mfe. Ka ha mechara nke ahụ, ha na-achọpụta na ndụ na-atọkwu ha ụtọ n’ihi na ha na-enwekwu ohere ha na ndị ezinụlọ ha ji anọkọ, nwekwuokwa ohere ije ozi Jehova. Ndụ dị mfe ha na-ebi na-eme ka ha tụkwasịkwuo Jehova obi kama ịtụkwasị ihe nke ụwa a obi. Ị̀ pụrụ ime otu ihe ahụ, ya bụ, ịgbalị ibi ndụ dị mfe iji nwekwuo oge ị ga-eji na-eje ozi Alaeze Chineke?—Mat. 6:19-24, 33.

“Ọ Dị Anyị Ka Anyị na Jehova Ọ̀ Dịkwu ná Mma Ugbu A”

Marc, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, nakweere ndụmọdụ ahụ Baịbụl nyere ka anyị ghara iji ụwa eme ihe n’uju. O kweghị anara ọkwá ahụ ga-enye ya ezigbo ego. Ka ụbọchị ole na ole gasịrị, onyeisi ọrụ ya ahụ kwere ya nkwa ịkwụ ya ego kadị nke mbụ ọ gwara ya iji mee ka o kweta ịnakwere ọrụ ahụ. Marc kwuru, sị: “Nke ahụ bụ nnọọ ọnwụnwa, ma ajụkwara m ya.” O kwuziri ihe mere o ji jụ, sị: “Mụ na nwunye m bụ́ Paula chọrọ iji ndụ anyị jeere Jehova ozi ruo oké o kwere anyị mee. N’ihi ya, anyị kpebiri ibi ndụ dị mfe. Anyị rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nye anyị amamihe anyị ga-eji ruo ihe mgbaru ọsọ a. Anyị kwukwara kpọmkwem ụbọchị anyị ga-amalite ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu.”

Paula kwuru, sị: “Abụ m odeakwụkwọ n’otu ụlọ ọgwụ, m na-arụ ọrụ ụbọchị atọ n’izu, a na-akwụkwa m ezigbo ụgwọ. Abụkwa m onye ọsụ ụzọ oge niile. Ma, dịkwa nnọọ ka di m, achọrọ m ijikwu ndụ m jeere Jehova ozi ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ma mgbe m nyere ha akwụkwọ m ji agba arụkwaghị m, onyeisi ọrụ m gwara m na a chọrọ ime m odeakwụkwọ ukwu n’ụlọ ọgwụ ahụ. Ọkwá a bụ ọrụ odeakwụkwọ a kasị akwụ ụgwọ na ya n’ụlọ ọgwụ ahụ, ma esiri m ọnwụ ná mkpebi m mere. Mgbe m gwara onyeisi ọrụ m ihe m ji chọọ ịgba arụkwaghị m, ọ jara m mma maka ụdị okwukwe m nwere.”

Obere oge ka e mesịrị, a gwara Marc na Paula ka ha gaa jewe ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’otu obere ọgbakọ dị n’otu ime obodo dị na Canada. Gịnị ka ha rụpụtara n’ebe ahụ ha gara? Marc na-ekwu, sị: “Obi kooro m n’elu mgbe m hapụsịrị ọrụ na-enye m ezigbo ego nke m rụwara kemgbe, ma Jehova gọziri ozi anyị. Anyị na-enweta nnọọ ọṅụ na-abịa site n’inyere ndị ọzọ aka ịmata Chineke. Ozi oge niile mekwara ka mụ na nwunye m dịkwuo ná mma. Ọ bụ ihe ndị dị mkpa n’ezie, ya bụ, ihe ndị metụtara ozi Jehova ka anyị na-ekwurịtakarị banyere ya. Ọ dị anyị ka anyị na Jehova ọ̀ dịkwu ná mma ugbu a.” (Ọrụ 20:35) Paula kwukwara, sị: “Mgbe ị hapụrụ ọrụ gị na ụlọ gị iji jee ozi ebe ọzọ, ọ dịghị ihe ọzọ ga-enyere gị aka ma ọ́ bụghị ịtụkwasị Jehova obi gị niile. Anyị tụkwasịrị Jehova obi, ya agọziekwa anyị. Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ọhụrụ anyị a hụrụ anyị nnọọ n’anya ma mee ka anyị ghọta na anyị dị ha mkpa. Ana m ejizi ike m naara etinye n’ọrụ mbụ m na-arụ na-enyere ndị mmadụ aka ịmata Chineke. Ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na-enye m obi ụtọ dị ukwuu.”

‘Ọ Dịghị Ihe Kọrọ M, ma Enweghị M Obi Ụtọ’

Amy, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mbụ, họọrọ ihe dị iche. O kwetara ịrụ ọrụ ahụ ga-enye ya ezigbo ego. Amy na-ekwu, sị: “N’afọ nke mbụ ka m malitesịrị ọrụ a, m ka na-agachi ozi ọma anya ma achọpụtara m na m ji nke nta nke nta na-akwụsị iji ihe metụtara Alaeze ahụ kpọrọ ihe. M nọ na-adọga ka e bulikwuo m n’ọkwá. Enwetara m ọtụtụ ohere iji rịgokwuo n’ọkwá, etinyekwara m ume m niile iji hụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi m iso ná ndị ọnụ ha na-eru n’okwu. Ka ọrụ m na-ewekọrọsị oge m, adịghịzi m ejechi ozi ọma anya. Ka oge na-aga, akwụsịrị m ịga ozi ọma kpamkpam.”

Amy na-echeta nnọọ ihe ndị mere n’oge ahụ, wee kwuo, sị: “Ọ dịghị ihe e ji ego enweta kọrọ m. M na-eme njem gaa obodo ọ bụla masịrị m, m na-enwekwa obi ụtọ n’ihi ùgwù a na-akwanyere m n’ihi ọkwá m. Ma, enweghị m ezi obi ụtọ. N’agbanyeghị na m nwere ego, enwere m ọtụtụ nsogbu. Ana m adị na-eche ihe na-eme m. Abịaziri m chọpụta na ọ fọrọ ntakịrị ka m “dapụ n’okwukwe” n’ihi ịchụ ihe nke ụwa a. N’ihi ya, enwere m “ọtụtụ ihe mgbu” dị nnọọ ka Okwu Chineke kwuru.—1 Tim. 6:10.

Gịnị ka Amy mere? O kwuru, sị: “Arịọrọ m ndị okenye ka ha nyere m aka ka mụ na Jehova dịghachikwa ná mma, amalitekwara m ịga ọmụmụ ihe. N’otu oge ka a na-abụ abụ, ebidoro m ibe ákwá. Echetara m ụdị obi ụtọ m nwere n’ime afọ ise m so rụọ ọrụ iwe ihe ubi ahụ dị ka onye ọsụ ụzọ n’agbanyeghị na enweghị m ego mgbe ahụ. Amaara m na m kwesịrị ịkwụsị iji oge m ga-eji na-eme ihe bara uru na-achụ ego, marakwa na m kwesịrị ibute ozi Alaeze ahụ ụzọ. Arịturu m n’ọkwá, nke a pụtakwara na a ga-eke ụgwọ ọnwa m ụzọ abụọ. Amaliteziri m ịga ozi ọma ọzọ.” Amy jizi obi ụtọ kwuo, sị: “Enwekwara m obi ụtọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ruo afọ ole na ole. Ugbu a enwere m ụdị afọ ojuju m na-enwetụghị mgbe m ji ihe ka ukwuu n’oge m na-achụ ihe nke ụwa.”

Ì nwere ike ịhazi oge gị ma bie ndụ dị mfe? Ọ bụrụ na i wepụtakwuo oge iji na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ, ị ga-ahụkwa na ndụ gị ga na-atọkwu gị ụtọ.—Ilu 10:22.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 1207-1208.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Ì nwere ike ịhazi oge gị ma bie ndụ dị mfe?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]

Ọ Malitelarị Ịtọ M Ụtọ!”

Ọ gụsiri David, bụ́ okenye ọgbakọ bi na United States, agụụ ike isoro nwunye ya na ụmụ ya na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. O mere ndokwa ịdị na-arụ ọrụ ụbọchị ole na ole n’izu n’ụlọ ọrụ ebe ọ na-arụ ọrụ, ọ malitekwara ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. Ndokwa a o mere ò mere ka ndụ ya tokwuo ya ụtọ? Ka ọnwa ole na ole gasịrị, David degaara otu enyi ya akwụkwọ ozi, sị: “Ọ dịghị ihe kasị enye afọ ojuju karịa mmadụ iso ndị ezinụlọ ya na-ejere Jehova ozi mgbe niile. Echere m na ọ gaara ewe m oge tupu ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ama m ahụ́, ma ọ malitelarị ịtọ m ụtọ! Ọ na-enye m nnọọ obi ụtọ.”

[Foto dị na peeji nke 18]

Ebe Marc na Paula na-ekwusa ozi ọma