Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Matiu

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Matiu

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Matiu

ONYE mbụ dere akụkọ na-akpali mmasị banyere ndụ na ozi Jizọs bụ Matiu—onye bụ́bu ọnaụtụ nke ya na Jizọs Kraịst kpachiri nnọọ anya. Asụsụ mbụ e ji dee Oziọma Matiu bụ asụsụ Hibru, ma e mesịrị sụgharịa ya gaa n’asụsụ Grik. E dechara ya n’afọ 41 O.A., ọ bụkwa ya jikọtara Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Juu ka e bu n’obi dee Oziọma a na-akpali mmasị ma baa uru, ọ kọwara Jizọs dị ka Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, onye bụ́ Ọkpara Chineke. Ịṅa ntị n’ozi dị na ya ga-ewusi okwukwe anyị nwere n’ezi Chineke ahụ, n’Ọkpara ya, nakwa ná nkwa Ya, ike.—Hib. 4:12.

“ALAEZE ELUIGWE ERUWO NSO”

(Mat. 1:1–20:34)

Matiu kọwara ihe banyere Alaeze ahụ nakwa ozizi Jizọs, ọ bụ ezie na otú o si dee ihe ndị a ekwekọghị ná mgbe ihe ndị a mere. Dị ka ihe atụ, ọ kọrọ banyere Ozizi Elu Ugwu ahụ ná mmalite nke akwụkwọ ya, ma Jizọs ziri ozizi ahụ mgbe ozi ya garala ọkara.

Mgbe Jizọs na-eje ozi na Galili, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, nye ndịozi ya iri na abụọ ntụziaka banyere otú ha ga-esi na-eje ozi, katọọ ndị Farisii, ma nye ihe atụ ndị o ji kọwaa Alaeze ahụ. O sizi na Galili pụọ “wee bịa n’ókèala Judia n’ofe Jọdan.” (Mat. 19:1) Mgbe ha nọ n’ụzọ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Anyị na-agbago Jeruselem, a ga-amakwa Nwa nke mmadụ ikpe ọnwụ, n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.’—Mat. 20:18, 19.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

3:16—Olee otú o si bụrụ na “eluigwe meghere” mgbe e mere Jizọs baptizim? Nke a yiri ka ọ na-egosi na Jizọs chetara mgbe ọ nọ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa.

5:21, 22—Mmadụ igosipụta iwe ya ọ̀ ka ibu ya n’obi njọ? Jizọs dọrọ aka ná ntị na onye na-eburu nwanne ya iwe n’obi na-eme mmehie dị oké njọ. Ma iji iwe kwuo okwu na-egbu mmụọ ka ya njọ, ọ ga-emekwa ka onye ahụ zaa ajụjụ n’ụlọikpe ka elu.

5:48—Ọ̀ ga-ekwe omume anyị “izu okè, dị ka Nna [anyị] nke eluigwe zuru okè”? Anyị nwere ike ime otú ahụ ruo n’ókè ụfọdụ. Ọ bụ ihe banyere ịhụnanya ka Jizọs na-ekwu okwu ya ebe a, ọ gwakwara ndị na-ege ya ntị ka ha ṅomie Chineke ma zuo okè, ma ọ bụ zuo ezuo, n’ịhụnanya ha. (Mat. 5:43-47) Olee otú ha ga-esi mee nke a? Ọ bụ site n’ịhụ ma ndị iro ha n’anya.

7:16—Olee “mkpụrụ” e ji ama ezi okpukpe ahụ? Ọ bụghị naanị àgwà anyị bụ mkpụrụ ndị a a na-ekwu okwu ha. Ha gụnyekwara ihe ndị anyị kweere—ozizi ndị anyị kweere na ha.

10:34-38—Ọ̀ bụ ozi ọma dị n’Akwụkwọ Nsọ na-akpata nkewa n’ezinụlọ? Ee e. Kama nke ahụ, ihe na-akpata nkewa bụ àgwà nke ndị na-ekweghị ekwe nọ n’ezinụlọ. Ha nwere ike ịhọrọ ịjụ ma ọ bụ imegide ozizi Ndị Kraịst, ime nke a pụkwara ịkpata nkewa n’ezinụlọ.—Luk 12:51-53.

11:2-6—Ọ bụrụ na Jọn maara na Jizọs bụ Mesaya ahụ n’ihi na ọ nụrụ mgbe Chineke kwuru na ya nwapụtara Jizọs, gịnịzi mere o ji jụọ ma ọ̀ bụ Jizọs bụ “Onye ahụ Na-abịanụ”? Ọ ga-abụ na ihe mere Jọn ji jụọ ajụjụ ahụ bụ n’ihi na ọ chọrọ ka Jizọs jiri ọnụ ya kwuo ya. E wezụga nke ahụ, Jọn chọrọ ịmara ma è nwere “onye ọzọ” ga-eji ike Alaeze abịa ma mezuo ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ihe Jizọs zara gosiri na ọ dịghị onye ọzọ na-abịanụ.

19:28—Olee ndị ka “ebo iri na abụọ nke Izrel” a ga-ekpe ikpe na-anọchi anya ha? Ha adịghị anọchi anya ebo iri na abụọ nke Izrel ime mmụọ. (Gal. 6:16; Mkpu. 7:4-8) Ndịozi ahụ Jizọs nọ na-agwa okwu na-aga iso n’Izrel ime mmụọ, ha anaghị aga ikpe ndị ọzọ so n’Izrel ime mmụọ ahụ ikpe. Jizọs so ha ‘gbaa ndụ inye ha alaeze,’ ha na-agakwa ịbụrụ ‘Chineke alaeze na ndị nchụàjà.’ (Luk 22:28-30; Mkpu. 5:10) Ndị so n’Izrel ime mmụọ ahụ “ga-ekpe ụwa ikpe.” (1 Kọr. 6:2) N’ihi ya, ihe àmà na-egosi na “ebo iri na abụọ nke Izrel,” bụ́ ndị ndị ahụ nọ n’ocheeze n’eluigwe na-aga ikpe ikpe, na-anọchi anya ụmụ mmadụ ndị na-esoghị ná ndị ahụ bụ́ ndị eze na ndị nchụàjà, dịkwa nnọọ ka ebo iri na abụọ nke Izrel nọchiri anya ụmụ mmadụ nkịtị n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie.—Levitikọs isi 16.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

4:1-10. Akụkọ a na-akụziri anyị na e nwere onye bụ́ Setan n’ezie nakwa na Setan abụghị àgwà ọjọọ dị n’ime mmadụ. Ọ na-eji “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ” anwa anyị ọnwụnwa. Ma itinye ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke.—1 Jọn 2:16.

5:1–7:29. Mara mkpa ime mmụọ gị. Bụrụ onye na-eme udo. Zere echiche rụrụ arụ. Mezuo ihe i kwere ná nkwa. Mgbe ị na-ekpe ekpere, bute ihe ndị metụtara ofufe Jehova ụzọ ọ bụghị ihe onwunwe. Bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ. Buru ụzọ chọọ Alaeze Chineke na ezi omume ya. Ekpela ndị ọzọ ikpe. Na-eme uche Chineke. E nwere nnọọ ọtụtụ ihe ndị bara uru anyị na-amụta n’Ozizi Elu Ugwu ahụ!

9:37, 38. Anyị kwesịrị ịdị na-eme ihe kwekọrọ n’arịrịọ anyị na-arịọ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka “o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya” site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Mat. 28:19, 20.

10:32, 33. Anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ịgwa ndị ọzọ ihe anyị kweere.

13:51, 52. Ịghọta eziokwu banyere Alaeze ahụ na-eme ka anyị jiri ụgwọ ịkụziri ya ndị ọzọ na inyere ha aka ịghọta ya.

14:12, 13, 23. Ọ dị nnọọ mkpa ka mmadụ nwee oge ọ ga-anọrọ onwe ya iji nwee ike ịtụgharị uche.—Mak 6:46; Luk 6:12.

17:20. Okwukwe dị anyị mkpa iji merie nsogbu ndị yiri ugwu bụ́ ndị na-egbochi anyị ime nke ọma n’ozi Jehova, ọ na-enyekwara anyị aka imeri ihe isi ike ndị anyị na-enwe. Anyị kwesịrị ịma mkpa ọ dị inwe okwukwe na Jehova na ná nkwa ya, marakwa mkpa ọ dị ime ka okwukwe dị otú ahụ na-esi ike.—Mak 11:23; Luk 17:6.

18:1-4; 20:20-28. Ọ bụ ezughị okè mmadụ na okpukpe ndị Juu ha nọbu na ya, bụ́ nke ji oké aha kpọrọ oké ihe, mere ka ndị na-eso ụzọ Jizọs sọrịtawa mpi onye ka ibe ya. Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma zere ọchịchọ ime mmehie ma nọgide na-ele ihe ùgwù na ibu ọrụ ndị anyị nwere anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

“A GA-ENYEFE NWA NKE MMADỤ”

(Mat. 21:1–28:20)

Jizọs nọkwasịrị “n’ịnyịnya ibu” banye na Jeruselem na Naịsan 9, 33 O.A. (Mat. 21:5) N’echi ya, ọ batara n’ụlọ nsọ ahụ ma mee ka ọ dị ọcha. Na Naịsan 11, ọ kụziri ihe n’ụlọ nsọ, katọọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ma mesịa gwa ndị na-eso ụzọ ya “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [ya] na nke ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 24:3) N’ụbọchị sochiri ya, ọ gwara ha, sị: “Unu maara na abalị abụọ taa, a ga-eme ememme ngabiga, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ ka a kpọgide ya n’osisi.”—Mat. 26:1, 2.

Na Naịsan 14, mgbe Jizọs hiwesịrị ihe omume e ji echeta ọnwụ ya nke na-eru nso, a raara ya nye, nwụde ya, kpee ya ikpe, ma kpọgbuo ya. N’ụbọchị nke atọ, a kpọlitere ya n’ọnwụ. Tupu Jizọs arịgoo n’eluigwe ka a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, o nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Mat. 28:19.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

22:3, 4, 9—Olee mgbe a kpọrọ òkù ahụ a kpọrọ ugboro atọ ka ndị mmadụ bịa ememme agbamakwụkwọ ahụ? Ọ bụ mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya malitere ikwusa ozi ọma na 29 O.A. ka a malitere ịkpọ òkù nke mbụ ka a chịkọta ndị so n’òtù nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, a nọgidekwara na-akpọ ha ruo n’afọ 33 O.A. A malitere ịkpọ òkù nke abụọ mgbe a wụsara ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A. a nọgidekwara na-akpọ òkù a ruo n’afọ 36 O.A. Ọ bụ naanị ndị Juu, ndị na-eso ụzọ ndị Juu, na ndị Sameria ka a kpọrọ òkù abụọ a. Ma ọ bụ ndị a hụrụ n’okporo ụzọ e si apụ n’obodo ahụ, ya bụ, ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ka a kpọrọ òkù nke atọ. A malitere ịkpọ ha n’afọ 36 O.A., bụ́ mgbe a tọghatara ọchịagha ndị Rom bụ́ Kọniliọs, a ka na-akpọkwa ha taa.

23:15—Gịnị mere onye na-eso ụzọ ndị Juu, ma ọ bụ onye ndị Farisii tọghatara ji “jiri okpukpu abụọ ghọọ onye a ga-atụba na Gehena” karịa ndị Farisii n’onwe ha? E nwere ike ndị ụfọdụ ndị Farisii tọghatara na-emebu mmehie dị oké njọ. Ma ha bịara buru okpukpe Farisii n’isi, eleghị anya karadị ndị tọghatara ha a marala ikpe, njọ. N’ihi ya, ‘a ga-atụba ha na Gehena,’ okpukpu abụọ ma e jiri ya tụnyere nke a ga-eme ndị Farisii bụ́ ndị Juu.

27:3-5—Olee ihe Judas kwara ụta banyere ya? Ọ dịghị ihe ọ bụla gosiri na ụta Judas kwara pụtara na o ji obi ya chegharịa. Kama ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara ya, ọ gara kwupụtara onyeisi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu mmehie ya. Ebe ọ bụ na Judas emeela ‘mmehie na-eweta ọnwụ,’ obi ya kwesịrị nnọọ ịma ya ikpe, o kwesịkwara inwe nkụda mmụọ. (1 Jọn 5:16) Ihe mere o ji kwaa ụta bụ n’ihi na obi koziri ya n’elu.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

21:28-31. Ihe ka Jehova mkpa bụ anyị ime uche ya. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-enyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Mat. 24:14; 28:19, 20.

22:37-39. Iwu abụọ ahụ kasị mkpa chịkọtara nnọọ ihe Chineke chọrọ n’aka ndị na-ejere ya ozi.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ì ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ owuwu ihe ubi ahụ?

[Ebe E Si Nweta Foto]

© 2003 BiblePlaces.com

[Foto dị na peeji nke 31]

Matiu kọrọ banyere Alaeze ahụ