Mgbe A Na-ayọcha Ndị Kraịst Dị Ka Ọka Wit
Mgbe A Na-ayọcha Ndị Kraịst Dị Ka Ọka Wit
OBERE oge tupu Jizọs anwụọ, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lee! Setan achọsiwo ike ka a yọchaa unu dị ka ọka wit.” (Luk 22:31) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?
N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ịchịkọta ọka wit bụ ọrụ siri ike ma na-ewe oge. Ihe mbụ ndị na-egbu ọka wit na-eme bụ ịga n’ubi gaa gbute ya. Ha na-abịazi na-apịa ya n’ala siri ike ma ọ bụ jiri ihe e ji etichapụta mkpụrụ nke anụ ụlọ na-adọkpụgharị rịa ya elu iji gbarisịa ya. Nke a na-eme ka mkpụrụ ya si n’okporo ya dapụtasịa. Onye nwe ọka wit ahụ na-awụlizi ọka ahụ elu. Ndị nke bụ́ mkpụrụ ọka na-adasa n’ala, ebe ikuku na-ebufu igbogbo ya. N’ikpeazụzi, a na-achịkọta mkpụrụ ọka ahụ ma fụchasịa ha nke ọma iji wepụsịa ihe ndị na-adịghị mma banyere na ya.
Dị nnọọ ka Jizọs kwuru, Setan nọgidere na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ahụ, ọ ka na-emegidekwa anyị taa. (Efe. 6:11) Ọ bụ ezie na ọ bụghị Setan na-akpatacha ihe isi ike niile na-abịara anyị. (Ekli. 9:11) Ma, ọ dị njikere isi n’ụzọ ọ bụla ruru ya aka mee ka anyị kwụsị irubere Chineke isi. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịnwa anyị ịchụsowe akụnụba, ịhọrọ ntụrụndụ rụrụ arụ, ma ọ bụ itinye aka ná mmekọahụ rụrụ arụ. O nwekwara ike ịkpali ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị ọrụ ibe anyị, ma ọ bụ ndị ikwu anyị na-ekweghị ekwe ịranye anyị ịchụwa ihe nke ụwa a, nke pụrụ ịgụnye agụmakwụkwọ dị elu na ọrụ na-enye ezigbo ego. Setan nwekwara ike ime ka a kpagbuwe anyị n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ iji mee ka anyị kwụsị irubere Chineke isi. N’ezie, e nwere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ Setan si ayọcha anyị.
Olee otú anyị ga-esi merie ajọ onye iro a? Anyị agaghị emerili ya n’ike nke anyị. Setan siri ike karịa anyị; ma, anyị maara na Jehova ka ya nnọọ ike. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị nnọọ Jehova obi, na-ekpesi ekpere ike ka o nye anyị amamihe na obi ike iji tachie obi, ma na-anakwere nduzi ya, ọ ga-eme ka anyị nwee ike iguzogide Setan.—Ọma 25:4, 5.
Mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa, anyị kwesịrị ịgbalị “ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi” bụ́ nke ga-eme ka Setan ghara iduhieli anyị. (Hib. 5:13, 14) Jehova pụrụ inyere anyị aka ime nke a. Anyị kwesịrị ịnọgide na-eme ezi ihe n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla Setan pụrụ iwetara anyị. Ọ bụrụ na anyị anakwere nduzi Jehova, ọ ga-akwado mkpebi anyị ji obi ike mee iji nọgide na-eme ezi ihe.—Efe. 6:10.
Setan nwere ike ịgbalị ịyọcha anyị dị ka ọka wit. Ma site n’enyemaka Jehova, anyị ga-enwe ike iguzogide ya, ma sie ike n’okwukwe. (1 Pita 5:9) Ee, Okwu Jehova na-emesi anyị obi ike mgbe o kwuru, sị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jems 4:7.