Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-eche Ozi ahụ Ị Nabatara n’Ime Onyenwe Anyị Nche”

“Na-eche Ozi ahụ Ị Nabatara n’Ime Onyenwe Anyị Nche”

“Na-eche Ozi ahụ Ị Nabatara n’Ime Onyenwe Anyị Nche”

“Na-eche ozi ahụ ị nabatara n’ime Onyenwe anyị nche, ka i wee jezuo ya.”—KỌL. 4:17.

1, 2. Olee ụgwọ Ndị Kraịst ji ụmụ mmadụ?

ANYỊ ji nnọọ ndị agbata obi anyị ezigbo ụgwọ. Mkpebi ndị ha na-eme ugbu a ga-egosi ma hà ga-adị ndụ gafee ‘oké mkpagbu ahụ’ ma hà ga-anwụ na ya. (Mkpu. 7:14) Onye ji ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ Ilu kwuru, sị: “Napụta ndị a na-akpọgara ọnwụ; gbochiekwa ndị na-adagharị na-aga n’ebe a ga-egbu ha.” Okwu ndị a gbara ọkpụrụkpụ! Ọ bụrụ na anyị agaghị dọọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ihe ndị pụrụ isi ná mkpebi ndị ha mere pụta, anyị pụrụ ịbụ ndị ikpe ọbara mara. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ gakwara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụrụ na ị sị: ‘Lee! Anyị amaghị banyere ihe a,’ ọ̀ bụ na onye na-enyocha obi agaghị achọpụta, onye na-elegide mkpụrụ obi gị anya ọ́ gaghị amata wee kwụọ mmadụ ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị?” N’ezie ndị ohu Jehova enweghị ike ikwu na ha ‘amaghị’ ihe ize ndụ ndị mmadụ nọ na ya.— Ilu 24:11, 12.

2 Jehova ji ndụ kpọrọ ihe. Ọ na-agwakwa ndị ohu ya ka ha mee ihe niile ha nwere ike ime iji hụ na a zọpụtara ndị mmadụ. Ohu Chineke ọ bụla ga-ekwusarịrị ozi na-azọpụta ndụ nke dị n’Okwu Chineke. Ọrụ a e nyere anyị yiri nke onye nche, bụ́ onye na-ama ọkwa mgbe e nwere nsogbu. Anyị achọghị ka ọbara nke ndị a na-aga ibibi dịrị anyị n’isi. (Ezik. 33:1-7) N’ihi ya, ọ dị nnọọ oké mkpa na anyị ga-anọgidesi ike ná mgbalị ndị anyị na-eme iji “kwusaa okwu ahụ”!—Gụọ 2 Timoti 4:1, 2, 5.

3. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a nakwa n’abụọ ndị ọzọ ga-esochi?

3 N’isiokwu a, ị ga-amụta otú i pụrụ isi merie ihe ndị na-egbochi gị ikwusa ozi a na-azọpụta ndụ nakwa otú i ga-esi nyekwuoro ọtụtụ mmadụ aka. Isiokwu na-esonụ ga-akụziri gị otú ị pụrụ isi mee ka otú i si akụzi eziokwu ahụ dị oké mkpa ka mma. Isiokwu nke atọ anyị ga-amụ ga-akọrọ anyị ahụmahụ ụfọdụ na-agba ume nke ndị nkwusa Alaeze nwere n’ụwa niile. Ma tupu anyị elebawa anya n’isiokwu ndị a, ọ ga-adị mma ka anyị tụlee ihe mere oge anyị a ji dị oké egwu.

Ihe Mere na Ọtụtụ Ndị Enweghị Olileanya

4, 5. Olee ihe ndị ha na ụmụ mmadụ na-alụ taa, oleekwa otú ọtụtụ mmadụ si ewere ha?

4 Ihe ndị na-eme n’ụwa taa na-egosi na anyị bi ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a,’ na-egosikwa na oge agwụla agwụ. Ihe ha na ụmụ mmadụ na-alụ taa bụ ihe ndị ahụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwuru a ga-eji mara ‘oge ikpeazụ.’ “Ihe ụfụ nke nhụjuanya,” nke gụnyere agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na nsogbu ndị ọzọ, na-esi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala taa. Ndị na-emebi iwu, ndị na-achọ ọdịmma onwe ha naanị na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke juru ebe niile. ‘Oge a dị oké egwu ma taa akpụ’ na-emetụtakwa ọbụna ndị na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru.—Mat. 24:3, 6-8, 12; 2 Tim. 3:1-5.

5 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ taa amaghị ihe ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi. N’ihi ya, ọtụtụ na-echegbu onwe ha taa banyere ihe ha ga-eme iji hụ na ọ dịghị ihe ga-eme ha na ezinụlọ ha. Obi na-agbawa ọtụtụ ndị mgbe ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ ma ọ bụ mgbe ha nwere ọdachi ndị ọzọ. Ndị dị otú a enweghị olileanya na ihe ga-adị mma n’ihi na ha amaghị ihe mere ihe ndị a ji na-eme, ha amaghịkwa ihe ga-akwụsị ha.—Efe. 2:12.

6. Gịnị mere “Babịlọn Ukwu ahụ” enwebeghị ike inyere ndị òtù ya aka?

6 “Babịlọn Ukwu ahụ,” nke bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, adịghị ewetara ndị mmadụ nkasi obi. Kama nke ahụ, o jirila “mmanya nke ịkwa iko ya” tinye imerime mmadụ ná mgbagwoju anya nke amaghị eziokwu banyere Chineke. Ebe ọ bụ na okpukpe ụgha na-eme ka nwaanyị akwụna, ọ rafuokwala “ndị eze ụwa” ma na-atụziri ha ihe ha ga na-eme. O jirila ozizi ụgha ya na omume mgbaasị ya mee ka ụmụ mmadụ na-agbara ndị ọchịchị ohu. Okpukpe ụgha esila otú a na-akpazi ike, nke a emekwaala ka ọ ghara ịdị na-akụzi eziokwu.—Mkpu. 17:1, 2, 5; 18:23.

7. Olee ihe na-echere ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ, ma olee otú a pụrụ isi nyere ụfọdụ aka?

7 Jizọs kwuru na ọtụtụ mmadụ nọ n’okporo ụzọ ahụ dị obosara ma na-eduga n’ịla n’iyi. (Mat. 7:13, 14) Ihe mere ụfọdụ mmadụ ji nọrọ n’okporo ụzọ ahụ dị obosara bụ n’ihi na ha kpachaara anya jụ ịnabata ihe Baịbụl na-akụzi, ma ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ n’ihi na e duhiere ha, ma ọ bụkwanụ n’ihi na a kọwaraghị ha kpọmkwem ihe Jehova chọrọ ha n’aka. Ikekwe ụfọdụ ga-agbanwe otú ha si ebi ndụ mgbe e si n’Akwụkwọ Nsọ kụziere ha ihe mere ha ga-eji mee otú ahụ. Ma, “n’oké mkpagbu ahụ,” a ga-ebibi ndị nọgidere na Babilọn Ukwu ahụ nakwa ndị nọgidere na-eleghara ihe e dere na Baịbụl anya.—Mkpu. 7:14.

Nọgide Na-ekwusa Ozi Ọma “Na-esepụghị Aka”

8, 9. Gịnị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere mgbe e megidere ha, gịnịkwa mere ha ji mee otú ahụ?

8 Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ ma nyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19, 20) N’ihi ya, kemgbe ụwa, ezi Ndị Kraịst na-ele ikwusa ozi ọma anya dị ka ụzọ bụ́ isi ha si egosi na ha na-erubere Chineke isi, nakwa ihe na-egosi na ha nwere okwukwe. N’ihi ya Ndị Kraịst oge mbụ nọgidere na-ekwusa ozi ọma ọbụna mgbe a na-emegide ha. Ha tụkwasịrị Jehova obi ka o nye ha ike, kpegakwara ya ekpere ka o nyere ha aka ịnọgide “na-ekwu okwu [ya] n’atụghị egwu ọ bụla.” Jehova zara ekpere ha site n’ime ka ha jupụta na mmụọ nsọ, ha ejirikwa obi ike kwusaa okwu Chineke.—Ọrụ 4:18, 29, 31.

9 Ndị na-eso ụzọ Jizọs hà kwụsịrị ikwusa ozi ọma mgbe e megidere ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ? Mbanụ. Iwe were ndị ndú okpukpe ndị Juu n’ihi na ndịozi ahụ nọgidere na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, ha jidere ha, yie ha egwu, ma pịa ha ụtarị. N’agbanyeghị nke a, ndịozi ahụ “nọ na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” Ha maara nnọọ na ha aghaghị “irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:28, 29, 40-42.

10. Olee nsogbu Ndị Kraịst na-enwe taa, ma olee ihe àgwà ọma ha nwere ike ịrụpụta?

10 Ọ bụghị ndị ohu Chineke niile ka e tirila ihe ma ọ bụ tụọ mkpọrọ n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma. Ma, ule na ọnwụnwa dị iche iche na-abịara ezi Ndị Kraịst niile. Dị ka ihe atụ, ihe akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ chọrọ ka i mee nwere ike ịbụ ihe ndị ọzọ na-enweghị mmasị na ya bụ́ nke nwere ike ime ka ị gbapụ iche. Ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, na ndị agbata obi gị nwere ike ịdị na-ele gị anya dị ka onye na-amaghị nke a na-akọ n’ihi na i kpebiri ime ihe Baịbụl kwuru. Ma ekwela ka omume ha kụda gị mmụọ. Ụwa nọ n’ìsì n’ụzọ ime mmụọ, ma Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-enwu dị ka “ndị na-enye ìhè n’ụwa.” (Fil. 2:15) Ikekwe ụfọdụ ndị nwere ezi obi nwere ike ịhụ ọrụ ọma gị ma nye Jehova otuto n’ihi ya.—Gụọ Matiu 5:16.

11. (a) Olee ihe ụfọdụ mmadụ pụrụ ime ka anyị na-ekwusara ha ozi ọma? (b) Olee ụdị mmegide Pọl onyeozi nwetara, oleekwa ihe o mere?

11 Obi ike dị anyị mkpa iji nọgide na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Ụfọdụ ndị, ọbụna ndị ikwu gị, nwere ike ịchị gị ọchị ma ọ bụ chọọ ụzọ ndị ọzọ ha nwere ike isi mee ka ị kwụsị. (Mat. 10:36) E tiri Pọl onyeozi ihe ihe karịrị otu ugbo n’ihi na o kweghị akwụsị ikwusa ozi ọma. Lee ihe o kwuru banyere mmegide ndị ahụ: ‘Anyị ji nkwuwa okwu site n’enyemaka Chineke, gbasie mgba ike zie unu ozi ọma Chineke mgbe anyị bu ụzọ tasịa ahụhụ, e meekwa anyị ihe ihere.’ (1 Tesa. 2:2) N’eziokwu, ọ dịghịrị Pọl mfe ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ mgbe e jidesịrị ya, gbaa ya ọtọ, jiri igwe tie ya ihe, ma tụọ ya mkpọrọ. (Ọrụ 16:19-24) Gịnị nyeere ya aka ịnọgide jiri nkwuwa okwu na-ekwusa ozi ọma ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ gụsiri ya nnọọ agụụ ike ikwusa ozi ahụ Chineke dunyere ya.—1 Kọr. 9:16.

12, 13. Olee nsogbu ụfọdụ ndị na-nweta, oleekwa ihe ndị ha mere iji merie ha?

12 Ọ na-esikwa ike ịnọgide jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’ókèala ebe anyị na-adịghị ahụkarị ndị mmadụ n’ụlọ ma ọ bụkwanụ n’ebe ndị mmadụ na-enwechaghị mmasị n’ozi Alaeze ahụ. Gịnị ka anyị nwere ike ime mgbe ọ dị otú a? Ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị kata nnọọ obi zie ndị mmadụ ozi ọma mgbe anyị na-anọghị n’ozi. O nwekwara ike ịdị mkpa ka anyị gbanwee oge ndị anyị ji eje ozi ọma ma ọ bụ gbalịa ịga n’ebe ndị anyị ga-aka enweta ndị mmadụ.—Tụlee Jọn 4:7-15; Ọrụ 16:13; 17:17.

13 Ọrịa na nká pụrụ ime ka o siere ọtụtụ ndị ike ikwusa ozi ọma ruo ókè ha chọrọ. Ọ bụrụ na i nwere nsogbu ndị a, adala mbá. Jehova maara ókè ike gị ha, obi na-atọkwa ya ụtọ mgbe ọ hụrụ mgbalị ndị ị na-eme. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 8:12.) N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla ị na-enwe—ma ndị mmadụ hà na-emegide gị, jụ ige ntị n’ozi ọma gị, ma ọ bụ ya abụrụ na ị na-arịa ọrịa—mee nnọọ ihe ọ bụla i nwere ike ime iji kwusaa ozi ọma.—Ilu 3:27; tụlee Mak 12:41-44.

‘Na-eche Ozi Gị Nche’

14. Olee ihe nlereanya Pọl onyeozi setịpụụrụ Ndị Kraịst ibe ya, oleekwa ndụmọdụ o nyere?

14 Pọl onyeozi ji nnọọ ozi ya kpọrọ ihe, ọ gbakwara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha mee otú ahụ. (Ọrụ 20:20, 21; 1 Kọr. 11:1) Otu onye Pọl gbara nnọọ ume n’ụzọ pụrụ iche bụ Onye Kraịst dịrị ndụ na narị afọ mbụ bụ́ Akịpọs. Mgbe Pọl na-edegara ụmụnna nọ na Kọlọsi akwụkwọ ozi, o kwuru, sị: “Gwakwanụ Akịpọs, sị: ‘Na-eche ozi ahụ ị nabatara n’ime Onyenwe anyị nche, ka i wee jezuo ya.’” (Kọl. 4:17) Anyị amaghị onye Akịpọs bụ ma ọ bụ nsogbu ndị o nwere, ma o doro anya na ọ nabatara ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst raara onwe ya nye, gị onwe gị anabatakwala ọrụ ikwusa ozi ọma. Ị̀ na-anọgide na-eche ozi gị nche iji hụ na i jezuru ya?

15. Olee ihe ndị Onye Kraịst ịrara onwe ya nye gụnyere, oleekwa ajụjụ ndị nke a na-eweta?

15 Tupu e mee anyị baptizim, anyị raara onwe anyị nye Jehova n’ekpere. Nke a pụtara na anyị ekpebiela ime uche ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ugbu a, sị, ‘Ime uche Chineke, ọ̀ bụ ya bụ ihe kasị mkpa ná ndụ m n’ezie?’ Anyị nwere ike inwe ọrụ ndị ọzọ Jehova chọrọ ka anyị na-arụ—dị ka ilekọta ezinụlọ anyị. (1 Tim. 5:8) Ma gịnị ka anyị ji oge na ike anyị fọdụrụ na-eme? Olee ihe ka mkpa ná ndụ anyị?—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15.

16, 17. Olee ohere Ndị Kraịst na-eto eto ma ọ bụ ndị na-enwebeghị ibu ọrụ buru ibu nwere?

16 Ị̀ bụ Onye Kraịst na-eto eto raara onwe ya nye nke gụcharala akwụkwọ ma ọ bu na-achọ ịgụcha akwụkwọ? Eleghị anya, i nwebeghị ibu ọrụ ezinụlọ. Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka i bu n’obi iji ndụ gị mee? Olee mkpebi ndị ga-akasị enyere gị aka imezu nkwa ahụ i kwere Jehova na i ga-eme uche ya? Ọtụtụ ndị ahaziela oge ha iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, nke a emekwaala ka ha nwee ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu.—Ọma 110:3; Ekli. 12:1.

17 Ikekwe ị bụ nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa. Ị na-arụ ọrụ ego ma i nweghị ọtụtụ ibu ọrụ ma ọ́ bụghị naanị ilekọta onwe gị. Obi abụọ adịghị ya na ọ na-atọ gị ụtọ isonyere ọgbakọ gị na-eje ozi ọma rụọ n’ókè oge gị kwere gị mee. Ọ́ gaghị amasị gị inwekwu ọṅụ? Ì chetụla echiche ime ihe ga-eme ka i nwekwuo ọṅụ? (Ọma 34:8; Ilu 10:22) N’ebe ụfọdụ, a ka nwere ọrụ dị ukwuu a ga-arụ iji hụ na e kwusaara onye ọ bụla eziokwu ahụ nke na-enye ndụ. Ị̀ ga-enwe ike ime mgbanwe ná ndụ gị, ikekwe ịga jewe ozi n’ebe a chọsiri ndị nkwusa Alaeze ike?—Gụọ 1 Timoti 6:6-8.

18. Olee mgbanwe otu di na nwunye ka lụrụ ọhụrụ mere, oleekwa ihe nke a rụpụtaara ha?

18 Ka anyị tụlee otú Kevin na Elena si United States si setịpụ ihe nlereanya. * Dị nnọọ ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ n’ógbè ha na-emekarị, ha chere na ọ dị mkpa ka ha zụta ụlọ nke ha. Ha abụọ na-arụ ọrụ ego, ha na-ebikwa ndụ dị ụtọ. Ma ọrụ ha na ihe ndị ụfọdụ ha nwere ime n’ụlọ na-eme ka ha ghara inwe ohere jee ozi ọma. Ha chọpụtara na ha na-etinye oge ha na ike ha niile n’ịkpata ihe onwunwe. Ma mgbe ha chọpụtara otú ndụ otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ si atọ ha ụtọ, Kevin na Elena kpebiri ịgbanwe ihe ha na-ebute ụzọ ná ndụ ha. Mgbe ha kpegasịịrị Jehova ekpere, ha rere ụlọ ha ma kwaba n’ebe ha ga na-akwụ ụgwọ ụlọ. Elena malitere ịrụ ọrụ na-agaghị ewekọrọ oge ya niile, ma malitekwa ọrụ ọsụ ụzọ. Mgbe Kevin nụrụ ahụmahụ ndị na-enye obi ụtọ nwunye ya na-enwe, ọ kwụsịrị ọrụ ya ma malite ọrụ ọsụ ụzọ. Ka oge na-aga, ha kwagara n’otu mba dị na South America ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa Alaeze. Kevin kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na mụ na nwunye m na-ebi n’obi ụtọ, ma mgbe anyị abụọ bidoro ọrụ ọsụ ụzọ, anyị nwere obi ụtọ karịrị nke anyị nweburu.”—Gụọ Matiu 6:19-22.

19, 20. N’ihi gịnị ka ikwusa ozi ọma ji bụrụ ọrụ kasị mkpa e nwere taa?

19 Ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kasị mkpa a na-arụ n’ụwa taa. (Mkpu. 14:6, 7) Ọ na-eme ka ndị mmadụ doo aha Jehova nsọ. (Mat. 6:9) Ozi dị na Baịbụl na-eme ka ọtụtụ puku ndị na-anabata ya kwa afọ na-agbanwe àgwà ha, nke a pụkwara ime ka a zọpụta ha. Ma, Pọl onyeozi jụrụ, sị: “Olee . . . otú ha ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-ekwusara ha?” (Rom 10:14, 15) Ọ gaghị ekwe omume! N’ihi ya, kpebisie ike ime ihe niile i nwere ike ime iji jezuo ozi gị.

20 Ime ka otú i si ezi ihe ka mma bụ ụzọ ọzọ i nwere ike isi nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ha kwesịrị ime n’ihi oge a dị oké egwu, nakwa ihe ndị ga-esi ná mkpebi ndị ha na-eme ugbu a pụta. Anyị ga-atụle otú ị ga-esi mee nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 A gbanwewo aha ndị ahụ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ụgwọ Ndị Kraịst ji ụmụ mmadụ?

• Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe e nwere ihe ndị na-achọ igbochi ọrụ nkwusa anyị?

• Olee otú anyị pụrụ isi jezuo ozi anyị nabatara ije?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọ dị mkpa na anyị ga-enwe obi ike iji nọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide

[Foto dị na peeji nke 7]

Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị na-ekwusa ozi ọma n’ókèala ebe a na-adịghị ahụkarị ndị mmadụ n’ụlọ?