Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-elezi “Nkà Izi Ihe” Gị Anya

Na-elezi “Nkà Izi Ihe” Gị Anya

Na-elezi “Nkà Izi Ihe” Gị Anya

“Kwusaa okwu Chineke, . . . jiri ogologo ntachi obi niile na nkà izi ihe dọọ aka ná ntị, baa mba, gbaakwa ndị mmadụ ume.”—2 TIM. 4:2.

1. Olee iwu Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa ihe nlereanya o setịpụụrụ ha?

N’AGBANYEGHI na Jizọs rụrụ ọrụ ndị dị ike nke gụnyere ịgwọ ọrịa mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa, amaghị ya dị ka ọgwọ ọrịa ma ọ bụ onye ọrụ ebube, kama ihe bụ́ isi e ji mara ya bụ na ọ bụ onye ozizi. (Mak 12:19; 13:1) Jizọs butere ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke ụzọ, otú ahụkwa ka ndị na-eso ụzọ ya na-eme taa. E nyere Ndị Kraịst ọrụ nke ịnọgide na-enyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs site n’izi ha ihe ka ha debe ihe niile Jizọs nyere n’iwu.—Mat. 28:19, 20.

2. Olee ihe anyị kwesịrị ime iji rụzuo ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere anyị?

2 Iji rụzuo ọrụ inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọ dị mkpa ka anyị nọgide na-eme ka ụzọ anyị si ezi ihe na-akawanye mma. Pọl onyeozi kọwara mkpa nke a dị mgbe ọ degaara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti akwụkwọ ozi. O kwuru, sị: “Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile. Nọgide n’ihe ndị a, n’ihi na site n’ime otú a, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.” (1 Tim. 4:16) Ụdị izi ihe Pọl na-ekwu okwu ya ebe a abụghị naanị ime ka ndị mmadụ mụta ihe. Ndị Kraịst maara ezi ihe nke ọma na-eru n’obi ndị mmadụ ma kpalie ha ime mgbanwe ná ndụ ha. Nke a chọrọ nkà. Oleezi otú anyị ga-esi mee ka “nkà izi ihe” anyị kakwuo mma mgbe anyị na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke?—2 Tim. 4:2.

Inwe “Nkà Izi Ihe”

3, 4. (a) Olee otú anyị pụrụ isi mee ka “nkà izi ihe” anyị ka mma? (b) Olee otú Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke si enyere anyị aka ịghọ ndị nkụzi maara nke a na-akọ?

3 Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara “nkà” dị ka “ihe mmadụ na-amụta site n’ịmụ ihe, itinye ihe ọ mụtara n’ọrụ, ma ọ bụ site n’ikiri ihe onye ọzọ na-eme.” Anyị kwesịrị ilebara ihe atọ a anya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọ ndị na-ezi ozi ọma nke ọma. Anyị ga-aghọta isiokwu anyị na-amụ nke ọma ma ọ bụrụ na anyị arịọ enyemaka Jehova n’ekpere mgbe anyị na-amụ ya. (Gụọ Abụ Ọma 119:27, 34.) Ikiri ndị maara ezi ihe mgbe ha na-ezi ihe ga-enyere anyị aka ịmụta ụzọ dị iche iche ha si ezi ihe ma ṅomie ihe nlereanya ha. Ịnọgide na-agbalị itinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ ga-enyere anyị aka imezikwu otú anyị si ezi ihe.—Luk 6:40; 1 Tim. 4:13-15.

4 Jehova bụ Onye Ozizi Ukwu anyị. Ọ na-eji akụkụ nzukọ ya nke a na-ahụ anya agwa ndị ohu ya nọ n’ụwa otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma ahụ. (Aịza. 30:20, 21) N’ihi ya, n’izu ọ bụla, ọgbakọ ọ bụla na-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ nke e hiwere iji nyere ndị niile debara aha ha na ya aka ime nke ọma n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Akwụkwọ bụ́ isi e ji amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ a bụ Baịbụl. Okwu Jehova e dere n’ike mmụọ nsọ na-agwa anyị ihe anyị ga-akụzi. Ọ na-agwakwa anyị ụzọ ka mma isi kụziere ndị mmadụ ihe ya arụpụta ihe. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-echetara anyị mgbe niile na ihe ga-enyere anyị aka ịbụ ndị nkụzi maara nke a na-akọ bụ iji Okwu Chineke na-akụzi ihe. Ọ na-echetakwara anyị ụzọ anyị ga-esi jiri ajụjụ na-akụzi ihe nke ọma, otú anyị ga-esi na-akụzi ihe n’ụzọ ga-adịrị ndị mmadụ mfe nghọta, nakwa ụzọ anyị kwesịrị isi gosi na anyị nwere ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ka anyị tụlezie ihe ndị a n’otu n’otu. E mesịa, anyị ga-atụle ụzọ anyị ga-esi ruo n’obi onye anyị na-amụrụ ihe.

Hụ Na Ihe Ị Na-akụzi Dabeere n’Okwu Chineke

5. Olee ebe ihe anyị na-akụzi kwesịrị ịdabere, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

5 Jizọs, bụ́ onye nkụzi kacha ndị nkụzi niile e nwere n’ụwa, mere ka ihe ọ kụziri dabere n’Akwụkwọ Nsọ. (Mat. 21:13; Jọn 6:45; 8:17) Ihe o kwuru bụ ihe Onye zitere ya gwara ya kwuo, ọ bụghị ihe o chepụtara n’onwe ya. (Jọn 7:16-18) Ọ bụkwa otú ahụ ka anyị na-eme taa. N’ihi ya, mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụ mgbe anyị na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, ihe anyị na-ekwu kwesịrị ịdabere kpamkpam n’Okwu Chineke. (2 Tim. 3:16, 17) Otú ọ̀ sọkwara anyị anyị bụrụ aka ochie n’ịza ndị mmadụ ajụjụ ha jụrụ, ọ dịghị otú anyị ga-esi mee nke ọma karịa ka anyị ga-eme ma anyị jiri Akwụkwọ Nsọ zaa ajụjụ ahụ. Baịbụl na-akpa ike n’ezie. Ụzọ kasị mma isi mee ka onye anyị na-amụrụ ihe ghọta ihe anyị na-agbalị ịkọwara ya bụ ịgụrụ ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ihe ahụ anyị na-akụziri ya.—Gụọ Ndị Hibru 4:12.

6. Olee otú onye na-amụrụ mmadụ ihe ga-esi hụ na onye ọ na-amụrụ ihe ghọtara ihe ọ na-amụrụ ya?

6 Ma ihe anyị na-ekwu abụghị na onye na-amụrụ mmadụ Baịbụl ekwesịghị ịkwadebe maka ọmụmụ ihe ahụ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ichebara akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’akwụkwọ anyị na-amụ echiche iji mara nke anyị ga-agụ ma ọ bụ nke anyị ga-agwa onye anyị na-amụrụ ihe ka ọ gụọ mgbe anyị na-amụ ihe. Ọ na-akakarị mma ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwadoro ihe ndị anyị kweere. Ọ dịkwa mkpa inyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla a gụrụ.—1 Kọr. 14:8, 9.

Jụọ Ajụjụ Ndị Na-eru n’Obi

7. Gịnị mere o ji dị mma iji ajụjụ na-akụzi ihe?

7 Ọ bụrụ na onye nkụzi amara ajụjụ ndị o kwesịrị ịjụ, ọ ga-enyere ya aka iru n’obi onye ọ na-amụrụ ihe, kpaliekwa onye ahụ ichebara ihe a na-amụrụ ya echiche. N’ihi ya, kama ịkọwara onye ị na-amụrụ ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ unu gụrụ, gwa ya ka ọ kọwaara gị ihe ọ ghọtara. Mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mkpa ka ị jụkwuo otu ajụjụ ma ọ bụ karịa iji nyere onye ahụ aka ịghọta kpọmkwem ihe a na-ekwu. Ọ bụrụ na i jiri ajụjụ na-akụzi ihe otú a, ọ bụghị naanị na ị na-enyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe aka ịhụ ihe mere ọ ga-eji kwere n’ihe unu na-amụ, kamakwa ị na-enyere ya aka ikwenyesi ike na ihe ọ na-amụta bụ eziokwu.—Mat. 17:24-26; Luk 10:36, 37.

8. Olee otú anyị pụrụ isi mata ihe dị n’obi onye anyị na-amụrụ ihe?

8 Akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ ihe na-enwe ajụjụ na azịza. Obi abụọ adịghị ya na ọ ga-adịrị ihe ka ọtụtụ ná ndị ị na-amụrụ Baịbụl mfe isite n’ihe ndị dị na paragraf zaa ajụjụ paragraf ndị ahụ. Ma, onye nkụzi chọrọ iru n’obi onye ọ na-amụrụ ihe agaghị agafe ngwa ngwa na paragraf ọzọ mgbe onye ahụ zatara ihe a jụrụ ya. Dị ka ihe atụ, onye ị na-amụrụ ihe nwere ike ịzata ihe Baịbụl kwuru banyere ịkwa iko. (1 Kọr. 6:18) Ma ịjụ ya ajụjụ iji mata ihe dị ya n’uche n’ezie nwere ike igosi kpọmkwem ihe o chere n’onwe ya banyere okwu ahụ. N’ihi ya, onye nkụzi ahụ nwere ike ịjụ ya, sị: “Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ọ dị njọ mmadụ iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ? Gịnị ka i chere banyere ihe a Chineke sị anyị emela? Ì chere na ime ihe ndị Chineke sị anyị na-eme ga-abara anyị uru?” Ihe onye ahụ ga-aza gị ga-enyere gị aka ịmata ihe dị ya n’obi n’ezie.—Gụọ Matiu 16:13-17.

Kụzie Ihe n’Ụzọ Ga-adị Mfe Nghọta

9. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-akụziri ndị mmadụ ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ?

9 Ọtụtụ ihe e kwuru n’Okwu Chineke dị nnọọ mfe nghọta. Ma, o nwere ike ịbụ na e jirila ozizi okpukpe ụgha duhie ndị anyị na-amụrụ Baịbụl. Dị ka ndị nkụzi, ọrụ anyị bụ ịkụziri ha Baịbụl otú ọ ga-adịrị ha mfe nghọta. Ndị nkụzi maara nke a na-akọ na-akụzi ihe n’ụzọ dị mfe nghọta ma doo anya, ha na-akụzikwa ihe bụ́ eziokwu. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a e kwuru, anyị agaghị akụzi eziokwu ahụ n’ụzọ ọ ga-esiri ndị anyị na-akụziri ya ike nghọta. Ewebatala ihe ndị na-adịghị mkpa. Kọwaa naanị otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ unu gụrụ si gbasa ihe unu na-amụ. Lekwasị anya naanị n’ihe ndị ga-enyere onye ahụ aka ịghọta ihe unu na-amụ. Ọ bụrụ na i mee otú a, onye ahụ ị na-amụrụ ihe ga-amalite ịghọta eziokwu ndị miri emi dị n’Akwụkwọ Nsọ.—Hib. 5:13, 14.

10. Gịnị ga-ekpebi otú ihe anyị na-amụ n’otu oge ga-aharu?

10 Olee otú ihe a ga-amụ n’otu oge ga-aharu? Ọ dị mkpa ka i jiri nghọta mee ihe na nke a. Otú onye nkụzi na onye ọ na-amụrụ ihe si aghọta ihe abụghị otu, ma anyị kwesịrị icheta mgbe niile na ebumnobi anyị dị ka ndị nkụzi bụ inyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ime ka okwukwe ya sie ike. N’ihi ya, anyị kwesịrị inye ya nnọọ ohere ọ ga-eji gụọ, ghọta ma kweta eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke. Anyị ekwesịghị ịmụ ihe buru ibu karịa otú ọ ga-aghọtali. Ma ọ dịkwa mkpa ka anyị mee ka ọmụmụ ihe ahụ na-aga aga. Ozugbo onye anyị na-amụrụ ihe ghọtara ihe a na-ekwu, anyị kwesịrị ịgafe n’ihe ọzọ.—Kọl. 2:6, 7.

11. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Pọl onyeozi mgbe a bịara n’ịkụzi ihe?

11 Pọl onyeozi mere ka okwu ya dị mfe nghọta mgbe ọ na-ekwusara ndị na-anụbeghị eziokwu ahụ mbụ ozi ọma. N’agbanyeghị na ọ gụrụ ezigbo akwụkwọ, o jighị okwu ndị siri ike nghọta zie ndị mmadụ ihe. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:1, 2.) Otú eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ si dị mfe nghọta na-adọta mmasị ndị nwere ezi obi ma ju ha afọ. Ọ dịghị mkpa na mmadụ ga-agụ oké akwụkwọ tupu ya aghọta ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu.—Mat. 11:25; Ọrụ 4:13; 1 Kọr. 1:26, 27.

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Aka Ịghọta Uru Ihe Ndị Ha Na-amụ Ga-abara Ha

12, 13. Gịnị pụrụ ịkpali onye a na-amụrụ ihe ime ihe ọ na-amụta? Nye ihe atụ.

12 Iji bụrụ ndị na-ezi ihe nke ọma, anyị kwesịrị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ ihe ihe n’ụzọ ga-eru ha n’obi. Onye ahụ a na-amụrụ ihe kwesịrị ịghọta otú ihe a na-amụ si gbasa ya, otú ọ ga-esi baara ya uru, na otú ndụ ya ga-esi ka mma ma ọ bụrụ na o mee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.—Aịza. 48:17, 18.

13 Dị ka ihe atụ, ka anyị were ya na anyị gụrụ Ndị Hibru 10:24, 25, bụ́ nke gbara Ndị Kraịst ume ka ha na ndị kwere ekwe ibe ha na-ezukọ iji tụlekọọ ihe ndị ga-ewusi ha ike site n’Akwụkwọ Nsọ nakwa iji gosi ibe ha ịhụnanya. Ọ bụrụ na onye ahụ anyị na-amụrụ ihe amalitebeghị ịga ọmụmụ ihe, anyị nwere ike ịkọwatụrụ ya otú anyị si amụ ihe n’ọgbakọ nakwa ihe ndị anyị ga-amụ. Anyị nwere ike ịgwa ya na ọmụmụ ihe ndị ahụ bụ otu ụzọ anyị si efe Chineke, gwakwa ya uru ndị ha na-abara anyị. Anyị nweziri ike ịgwa onye ahụ anyị na-amụrụ ihe ka o jisie ike gaa. Ihe ga-akpali ya ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru kwesịrị ịbụ n’ihi na ọ chọrọ ime ihe Jehova kwuru, ọ bụghị iji mee onye na-amụrụ ya ihe obi ụtọ.—Gal. 6:4, 5.

14, 15. (a) Gịnị ka onye a na-amụrụ Baịbụl nwere ike ịmụta banyere Jehova? (b) Olee otú ịmara ụdị onye Chineke bụ pụrụ isi baara onye a na-amụrụ Baịbụl uru?

14 Otu uru pụtara ìhè ịmụ Baịbụl na ime ihe Baịbụl kwuru na-abara ndị a na-amụrụ ihe bụ na ọ na-eme ka ha mata onye Jehova bụ nke ọma ma hụ ya n’anya. (Aịza. 42:8) Ọ bụghị naanị na Jehova bụ Nna na-ahụ n’anya, Onye Okike na Onye nwe eluigwe na ụwa kamakwa ọ na-eme ka ndị hụrụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi mara ụdị onye ọ bụ na ihe ndị o nwere ike ime. (Gụọ Ọpụpụ 34:6, 7.) Mgbe Mozis na-achọ idupụta mba Izrel n’Ijipt, Jehova kwuru banyere onwe ya, sị: “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụ. 3:13-15) Nke a pụtara na Jehova ga-aghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo ihe o zubere maka ndị ya ọ họpụtara. Ndị Izrel si otú a mara Jehova dị ka Onye Nzọpụta, Dike, Onye na-egbo mkpa, na Onye na-emezu nkwa ya, nakwa onye na-enyere ha aka n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ.—Ọpụ. 15:2, 3; 16:2-5; Jọsh. 23:14.

15 E nwere ike Jehova agaghị egboro ndị anyị na-amụrụ ihe mkpa ha n’ụzọ ọrụ ebube dị ka o mere n’oge Mozis. Ma, ka okwukwe ndị anyị na-amụrụ ihe na-esiwanye ike, ha ana-enwekwukwa ekele maka ihe ndị ha na-amụta, malitekwa ime ha, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ga-ahụ mkpa ọ dị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere ha aka inweta obi ike na amamihe nakwa na ọ ga na-eduzi ha. Ka ha na-eme nke a, ha ga-abịakwa mara na Jehova bụ Onye a pụrụ ịdabere na ndụmọdụ ya, Onye na-echebe ndị ya, na Onye na-enye ha nnọọ ihe ndị na-akpa ha n’ụba.—Ọma 55:22; 63:7; Ilu 3:5, 6

Gosi na I Bu Ọdịmma Ndị Ị Na-amụrụ Ihe n’Obi

16. Gịnị mere na ịbụ ọka n’ịkụzi ihe abụchaghị ya ga-eme ka ị bụrụ ezigbo onye nkụzi?

16 Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị naghị ezi ihe nke ọma otú ị gaara achọ isi na-ezi ihe, kara obi. Ọ bụ Jehova na Jizọs na-ahụ maka ọrụ izi ihe a a na-arụ n’ụwa niile taa. (Ọrụ 1:7, 8; Mkpu. 14:6) Ha pụrụ ịgọzi mgbalị anyị na-eme ka ihe anyị na-akụzi nwee ike ịkpali ndị obi ha ziri ezi ime ihe a chọrọ n’aka ha. (Jọn 6:44) Ịhụnanya onye nkụzi nwere n’ebe onye ọ na-amụrụ ihe nọ pụrụ ikpuchi ebe onye nkụzi ahụ na-adịghị emecha nke ọma mgbe ọ na-ezi ihe. Pọl onyeozi gosiri na ya ghọtara mkpa ọ dị ịhụ ndị ọ na-akụziri ihe n’anya.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.

17. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ezi mmasị n’ebe onye nke ọ bụla n’ime ndị anyị na-amụrụ Baịbụl nọ?

17 Dị ka Pọl, anyị nwere ike igosi na anyị hụrụ onye anyị na-amụrụ ihe n’anya site n’ịgbalị ịmatakwu ya nke ọma. Ka anyị na ya na-amụ ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, o yikarịrị ka anyị ga-amata nsogbu ndị ọ na-enwe. Anyị nwere ike ịchọpụta na ọ malitela itinye ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl n’ọrụ. Anyị nwekwara ike ịchọpụta na a ka nwere ebe ndị ọzọ ọ dị mkpa ka o mee mgbanwe. Ọ bụrụ na anyị na-enyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịhụ otú ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl si gbasa ya, anyị nwere ike isi otú a nyere ya aka ịghọ ezigbo onye na-eso ụzọ Kraịst.

18. Gịnị mere o ji dị mkpa anyị na onye anyị na-amụrụ ihe ikpekọ ekpere nakwa ịkpọtụ aha ya mgbe anyị na-ekpe ekpere?

18 Nke kasị mkpa bụ na anyị na onye anyị na-amụrụ Baịbụl nwere ike ikpekọ ekpere, anyị nwekwara ike ịkpọtụ aha ya mgbe anyị na-ekpe ekpere. O kwesịrị ịghọta na nzube anyị bụ inyere ya aka ịbịa matakwuo Onye Okike ya nke ọma, bịaruo ya nso ma rite uru ná nduzi ya. (Gụọ Abụ Ọma 25:4, 5.) Mgbe anyị na-ekpe ekpere ka Jehova gọzie mgbalị onye anyị na-amụrụ ihe na-eme itinye ihe ndị ọ na-amụta n’ọrụ, ọ ga-ahụ mkpa ọ dị ịbụ ‘onye na-eme okwu ahụ.’ (Jems 1:22) Ka onye ahụ anyị na-amụrụ Baịbụl na-anụ ekpere si n’ala ala obi i na-ekpe, ya onwe ya ga-amụtakwa otú e si ekpe ekpere. Inyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ime ka mmekọrịta ya na Jehova sie ike bụ nnọọ ihe na-enye ọṅụ!

19. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ọ na-enye anyị obi ụtọ ịmara na ihe karịrị nde Ndịàmà isii na ọkara n’ụwa niile na-agbalisi ike ịmụta iji ‘nkà ezi ihe,’ iji nwee ike inyere ndị nwere ezi obi aka ime ihe niile Jizọs nyere n’iwu. Olee ihe ndị anyị rụpụtarala n’ozi ọma anyị? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

Ì Chetara?

• N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji kwesị inwe “nkà izi ihe”?

• Olee ụzọ ndị anyị ga-esi mee ka otú anyị si ezi ihe kakwuo mma?

• Ọ bụrụ na anyị amachaghị ezi ihe nke ọma, gịnị ka anyị nwere ike ime ka ọ ghara ịpụtacha ìhè?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ì debala aha gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke?

[Foto dị na peeji nke 10]

Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị gwa onye ị na-amụrụ ihe ka ọ gụọ ebe Baịbụl kwadoro ihe unu na-ekwu?

[Foto dị na peeji nke 12]

Gị na onye ị na-amụrụ ihe kpekọọ ekpere, kpọtụkwa ya aha mgbe unu na-ekpe ekpere