Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Gụrụ Ná Ndị Ruru Eru Inweta Alaeze

Ndị A Gụrụ Ná Ndị Ruru Eru Inweta Alaeze

Ndị A Gụrụ Ná Ndị Ruru Eru Inweta Alaeze

“Nke a bụ ihe àmà nke ikpe ezi omume Chineke, nke na-eme ka a gụọ unu ná ndị ruru eru inweta alaeze Chineke.”—2 TESA. 1:5.

1, 2. Gịnị ka Chineke zubere ime, ònyekwa ga-ekpe ikpe ahụ?

PỌL onyeozi nọ n’Atens n’ihe dị ka n’afọ nke 50 O.A. Iwe were ya n’ihi otú ikpere arụsị si jupụta n’obodo ahụ, nke a kpalikwara ya ịgbara ndị obodo ahụ àmà ruru ha n’obi. Ná mmechi okwu ya, o kwuru otu ihe dọtara mmasị ndị ọgọ mmụọ ahụ na-ege ya ntị. O kwuru, sị: “Ugbu a [Chineke] na-agwa ihe a kpọrọ mmadụ na ha niile kwesịrị ichegharị n’ebe niile. N’ihi na o wepụtawo otu ụbọchị nke o zubere ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtara, o nyewokwa mmadụ niile ihe ga-emesi ha obi ike, ebe ọ bụ na o mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”—Ọrụ 17:30, 31.

2 Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ka e chebara ya echiche na Chineke ewepụtala ụbọchị ọ ga-ekpe ụmụ mmadụ ikpe! Ọ bụ onye ahụ Pọl na-akpọghị aha mgbe ọ na-agwa ndị Atens okwu, bụ́kwanụ onye anyị maara, bụ́ Jizọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, ga-ekpe ikpe ahụ. Ikpe Jizọs ga-ekpe ga-ewetara ndị mmadụ ndụ ma ọ bụ ọnwụ.

3. Gịnị mere Jehova na Ebreham ji gbaa ndụ, ònyekwa ga-arụ ọrụ bụ́ isi n’ịhụ na e mezuru ọgbụgba ndụ ahụ?

3 Ụbọchị Ikpe ahụ ga-ewe otu puku afọ. Ọ bụ Jizọs, onye bụ́ Eze nke Alaeze Chineke, ka Jehova họpụtara ikpe ikpe ahụ n’aha ya, ma ọ gaghị abụ naanị ya ga-ekpe ya. Jehova si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ ndị ọzọ ha na Jizọs ga-eso chịa, ha ga-esokwa ya kpee ndị mmadụ ikpe n’ụbọchị ikpe ahụ ga-ewe otu puku afọ. (Tụlee Luk 22:29, 30.) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ anọ gara aga, Jehova tọrọ ntọala maka Ụbọchị Ikpe ahụ mgbe ya na Ebreham bụ́ ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi gbara ndụ. (Gụọ Jenesis 22:17, 18.) Ihe ama gosiri na ọgbụgba ndụ ahụ malitere na 1943 T.O.A. N’eziokwu, Ebreham aghọtachaghị uru ọgbụgba ndụ ahụ ga-abara ụmụ mmadụ. Ma anyị onwe anyị taa chọpụtara na dị ka e kwuru n’ọgbụgba ndụ ahụ, mkpụrụ Ebreham ga-arụ ọrụ bụ́ isi n’ikpe ahụ Chineke zubere na a ga-ekpe ụmụ mmadụ.

4, 5. (a) Ònye bụ́ mkpụrụ bụ́ isi ná mkpụrụ Ebreham, gịnịkwa ka o kwuru banyere Alaeze ahụ? (b) Olee mgbe ohere iso Jizọs chịa n’Alaeze Chineke meghere?

4 Ọ bụ Jizọs ghọrọ mkpụrụ bụ́ isi ná mkpụrụ Ebreham, e ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ na 29 O.A., bụ́ mgbe ọ ghọrọ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, ma ọ bụ Kraịst. (Gal. 3:16) Jizọs jiri afọ atọ na ọkara sochirinụ kwusaara ndị Juu ozi ọma Alaeze ahụ. Mgbe a nwụdesịrị Jọn Onye Na-eme Baptizim, Jizọs gosiri na ndị ọzọ nwere ike iso keta Alaeze ahụ mgbe o kwuru, sị: “Malite n’ụbọchị Jọn Onye Na-eme Baptizim ruo ugbu a, alaeze eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ nke ụmụ mmadụ na-achụsosi ike, ndị sikwara ọnwụ na-achọ ya na-enweta ya.”—Mat. 11:12.

5 Ọ dị mma ịmara na tupu Jizọs ekwuo okwu banyere ndị ‘ga-enweta’ Alaeze nke eluigwe, o kwuru, sị: “N’ezie, ana m asị unu, N’etiti ndị ụmụ nwaanyị mụrụ, ọ dịbeghị onye e mere ka o bilie nke ka Jọn Onye Na-eme Baptizim ukwuu; ma onye ka nta n’alaeze eluigwe ka ya ukwuu.” (Mat. 11:11) Gịnị mere Jizọs ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ohere iso chịa n’Alaeze Chineke adịghịrị ndị kwesịrị ntụkwasị obi biri ndụ tupu a wụsa ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A. Jọn onye na-eme Baptizim anwụọkwalanụ tupu Pentikọst 33 O.A.—Ọrụ 2:1-4.

A Gụọ Mkpụrụ Ebreham ná Ndị Ezi Omume

6, 7. (a) Olee otú mkpụrụ Ebreham ga-esi “dị ka kpakpando nke eluigwe”? (b) Olee ngọzi ndị Ebreham nwetara, oleekwa ngọzi yiri ya nke mkpụrụ ya na-enweta?

6 A gwara Ebreham na mkpụrụ ya ga-amụba ma “dị ka kpakpando nke eluigwe” nakwa dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri. (Jen. 13:16; 22:17) Ya bụ na n’oge Ebreham, o siri ike ịmara mmadụ ole ga-emejupụta mkpụrụ ahụ. Ma e mesịrị kwuo ole mkpụrụ ime mmụọ ya ahụ ga-adị. Ha ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, tinyekwara Jizọs.—Mkpu. 7:4; 14:1.

7 Okwu Chineke kwuru okwu banyere okwukwe Ebreham, sị: “[Ebreham] wee nwee okwukwe n’ebe Jehova nọ; o wee gụọrọ ya nke ahụ dị ka ezi omume.” (Jen. 15:5, 6) N’eziokwu, ọ dịghị mmadụ ọ bụla bụcha nnọọ onye ezi omume. (Jems 3:2) Ma, n’ihi okwukwe pụrụ iche Ebreham nwere, Jehova weere ya dị ka onye ozi omume, ọbụna kpọọ ya enyi ya. (Aịza. 41:8) A kpọrọ Jizọs na ndị so ná mkpụrụ ime mmụọ Ebreham ndị ezi omume, nke a mekwara ka ha nweta ngọzi karịa Ebreham.

8. Olee ngọzi ndị so ná mkpụrụ Ebreham ga-enweta?

8 A kpọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị ezi omume n’ihi na ha nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs. (Rom. 3:24, 28) N’anya Jehova, a tọhapụwo ha ná mmehie ha, a pụzikwara iji mmụọ nsọ tee ha mmanụ ka ha ghọọ ụmụ ime mmụọ Chineke, ụmụnne Jizọs Kraịst. (Jọn 1:12, 13) Ha sonyekwara n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma bụrụ mba ọhụrụ ahụ, nke bụ́ “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16; Luk 22:20) Ihe ndị a niile bụ nnọọ ihe ùgwù magburu onwe ya! N’ihi ihe ndị a Chineke meere ha, Ndị Kraịst e tere mmanụ adịghị atụ anya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ha chụrụ ohere ha nwere ibi n’ụwa n’àjà n’ihi ọṅụ na-enweghị atụ nke iso Jizọs kpee ikpe n’Ụbọchị Ikpe ahụ nakwa iso ya nọrọ n’eluigwe na-achị.—Gụọ Ndị Rom 8:17.

9, 10. (a) Olee mgbe mbụ e ji mmụọ nsọ tee Ndị Kraịst mmanụ, gịnịkwa ka ha na-atụ anya ya? (b) Olee otú e si nyere Ndị Kraịst e tere mmanụ aka?

9 Na Pentikọst 33 O.A., e nyere ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ohere nke iso ná ndị ha na Jizọs ga-achị n’Ụbọchị Ikpe ahụ. E ji mmụọ nsọ mee ihe dị ka otu narị ndị na-eso ụzọ Jizọs na iri abụọ baptizim, ha sikwa otú a ghọọ Ndị Kraịst mbụ e tere mmanụ. Ma nke ahụ bụ naanị mmalite nke olileanya ha na-atụ anya ya. Site mgbe ahụ gawa, ha ga-ahụ na ha ga na-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ọnwụnwa Setan ga-akpatara ha. Ọ bụrụ na ha chọrọ inweta okpueze nke bụ́ ibi ndụ n’eluigwe, ha aghaghị ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.—Mkpu. 2:10.

10 Iji nyere ha aka ime nke a, Jehova na-esite n’Okwu ya nakwa n’ọgbakọ ya na-enye Ndị Kraịst e tere mmanụ ndụmọdụ na agbamume dị ha mkpa. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka akwụkwọ, sị: “Dị ka nna si eme ụmụ ya, otú ahụ ka anyị si na-adụsi onye ọ bụla n’ime unu ọdụ ike, na-agụgụkwa unu ma na-agbara unu àmà, ka unu wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihu Chineke, bụ́ onye na-akpọ unu ka unu banye n’alaeze ya nakwa n’ebube ya.”—1 Tesa. 2:11, 12.

11. Olee akwụkwọ Jehova wepụtara maka “Izrel nke Chineke”?

11 Mgbe ihe dị ka afọ iri isii gasịrị ka a họrọsịrị ndị mbụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ, Jehova mere ka e dee ihe banyere ozi Jizọs jere n’elu ala na ndụmọdụ o nyere Ndị Kraịst narị afọ mbụ na otú o si mesoo ha ihe n’akwụkwọ. Jehova si otú a gbakwụnye Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke dịbu adị. Ọ bụ mba Izrel anụ ahụ́ ka e bu n’obi dee Akwụkwọ Nsọ Hibru n’oge ha na Chineke dị n’ezigbo mma. Ọ bụ “Izrel nke Chineke,” bụ́ ndị e tere mmanụ ịghọ ụmụnna Kraịst na ụmụ ime mmụọ Chineke, ka e bu n’obi dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ma nke ahụ adịtụghị apụta na ndị na-abụghị ndị Izrel agaghị erite uru dị ukwuu n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst a na-ejighị mmụọ nsọ tee mmanụ na-eritekwa uru dị ukwuu site n’ịmụ ndụmọdụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na itinye ya n’ọrụ.—Gụọ 2 Timoti 3:15-17.

12. Gịnị ka Pọl chetaara Ndị Kraịst e tere mmanụ?

12 A kpọrọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ ndị ezi omume ma jiri mmụọ nsọ tee ha mmanụ ka ha wee nwee ike inweta ihe nketa ha n’eluigwe. Na e tere ha mmanụ apụtaghị na ka ha niile ka nọ n’ụwa, ha gazi na-achị Ndị Kraịst ibe ha e tere mmanụ. Ihe ama na-egosi na ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ chefuru nke a ma malite ibuli onwe ha elu karịa ụmụnna ha nọ n’ọgbakọ. Nke a kpaliri Pọl ịjụ, sị: “Afọ ò juworị unu? Ùnu abaworị ọgaranya? Ùnu amalitewo ịchị achị dị ka ndị eze hapụ anyị? Ọ dị m ka ya bụrụ na unu amalitewo ịchị achị dị ka ndị eze, ka anyị wee soro unu na-achị achị dị ka ndị eze.” (1 Kọr. 4:8) N’ihi ya, Pọl chetaara ndị e tere mmanụ n’oge ya, sị: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe okwukwe unu, kama anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu.”—2 Kọr. 1:24.

Imezu Ọnụ Ọgụgụ ahụ E Buru n’Amụma

13. Olee otú e si gaa n’ihu n’ịhọrọ ndị e tere mmanụ mgbe 33 O.A. gasịrị?

13 Ọ bụghị na narị afọ mbụ ka a họpụtachara Ndị Kraịst niile e tere mmanụ dị narị puku na iri puku anọ na puku anọ. A nọgidere na-ahọrọ ha n’oge ndịozi ma o yiri ka a kwụsịtụrụ ka oge na-aga. Ma, a gakwara n’ihu na narị afọ ndị sochirinụ ruokwa n’oge anyị a. (Mat. 28:20) N’ikpeazụ, mgbe Jizọs malitesịrị ịchị na 1914, nhọrọ ahụ gara n’ihu ngwa ngwa.

14, 15. Gịnị merela n’oge anyị n’ihe banyere ịkpọ ndị e tere mmanụ?

14 Jizọs buru ụzọ chụpụsịa ndị niile na-emegide ọbụbụeze Chineke n’eluigwe. (Gụọ Mkpughe 12:10, 12.) Mgbe o mechara nke a, ọ malitere ịchịkọta ndị fọdụrụ n’ime ndị ga-eso ya chịa n’Alaeze ya iji mee ka ha zuo otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Ka ọ na-erule n’afọ ndị sochiri afọ 1930, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ha ezuola, ọtụtụ ndị na-anabatakwa ozi ọma nke alaeze ahụ enweghị ọchịchọ ịga eluigwe. Mmụọ nsọ adịghị agbara ha àmà na ha bụ ụmụ Chineke. (Tụlee Ndị Rom 8:16.) Kama nke ahụ, ha ghọtara na ha so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs. (Jọn 10:16) N’ihi ya, mgbe 1935 gasịrị, e lekwasịrị anya n’ịchịkọta “oké igwe mmadụ,” bụ́ ndị Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ, ndị ga-alanahụkwa “oké mkpagbu ahụ.”—Mkpu. 7:9, 10, 14.

15 Ma, kemgbe afọ ndị sochiri 1930, a ka na-ahọrọ mmadụ ole na ole iso ná ndị ga-aga eluigwe. N’ihi gịnị? O nwere ike ịbụ na e ji ha edochi anya ụfọdụ n’ime ndị a kpọburu ma ha emesịa dapụ n’eziokwu ahụ. (Tụlee Mkpughe 3:16.) Pọl kpọdịrị aha ụfọdụ ndị ọ maara bụ́ ndị hapụrụ eziokwu ahụ. (Fil. 3:17-19) Olee ndị Jehova ga-eji edochi anya ndị dapụrụ n’eziokwu ahụ? Ọ bụ ya ka ọ dịịrị ikpebi. Ma, ọ bụ nnọọ ihe amamihe dị na ya na ndị Jehova ga-eji edochi anya ha abụghị ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ, kama ọ bụ ndị kwesịrịla ntụkwasị obi ruo ogologo oge—dị ka ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs bụ́ ndị ọ gwara okwu ụbọchị ahụ ọ malitere Ncheta ọnwụ ya. *Luk 22:28.

16. Olee ihe Jehova zubere banyere ndị e tere mmanụ nke anyị kwesịrị inwe ekele n’ihi ya, oleekwa ihe obi ga-esi anyị ike na ọ ga-eme?

16 Ma, o yiri ka ọ bụghị ndị niile a họọrọ ịga eluigwe kemgbe afọ ndị sochiri 1930 bụ maka iji dochie anya ndị dapụrụ n’eziokwu. Ihe àmà na-egosi na Jehova chọrọ ka anyị nwee Ndị Kraịst e tere mmanụ n’etiti anyị n’oge ikpeazụ nke usoro ihe a ruokwa mgbe a ga-ebibi “Babịlọn Ukwu ahụ.” * (Mkpu. 17:5) Ka obi sie anyị ike na ọnụ ọgụgụ ndị so na narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ ga-ezu n’oge Jehova chọrọ, nakwa na ha niile ga-emesị soro chịa n’Alaeze ahụ. Anyị kwesịkwara ikwere n’Okwu amụma ahụ kwuru na oké ìgwè mmadụ ahụ nke na-amụba n’ike n’ike ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka otu ìgwè. N’oge na-adịghị anya, ha ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ’ bụ́ nke ga-abịakwasị ụwa Setan pụta ma jiri obi ụtọ banye n’ụwa ọhụrụ Chineke.

Ọ Fọrọ Obere Ka Ndị Ga-achị n’Alaeze Eluigwe Gachaa Eluigwe!

17. Dị ka e dekọrọ ná 1 Ndị Tesalonaịka 4:15-17 na Mkpughe 6:9-11, gịnị ka Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ nwetaworo?

17 Kemgbe afọ 33 O.A., ọtụtụ iri puku ndị e tere mmanụ egosila na ha nwere okwukwe siri ike ma tachie obi ruo ọnwụ. A gụọlarị ha ná ndị ruru eru inweta Alaeze ahụ. Ihe àmà na-egosikwa na kemgbe oge ọnụnọ Kraịst malitere, enyela ha ụgwọ ọrụ ha nke bụ́ ịga eluigwe.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 4:15-17; Mkpughe 6:9-11.

18. (a) Olee ihe obi siri ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa ike na ọ ga-eme? (b) Olee otú ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ si ele ụmụnna ha ndị e tere mmanụ anya?

18 Obi siri nnọọ ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa taa ike na ọ bụrụ na ha anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, na ọ gaghị adị anya ha anata ụgwọ ọrụ maka ikwesị ntụkwasị obi ha. Ka ọtụtụ nde ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ na-ahụ okwukwe nke ụmụnna ha ndị ahụ e tere mmanụ, ha na-ekweta n’ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru banyere ụmụnna ndị e tere mmanụ nọ na Tesalonaịka, sị: “Anyị onwe anyị ji unu akpa nganga n’ọgbakọ dị iche iche nke Chineke n’ihi ntachi obi unu na okwukwe unu n’ime mkpagbu na ahụhụ niile unu na-edi. Nke a bụ ihe àmà nke ikpe ezi omume Chineke, nke na-eme ka a gụọ unu ná ndị ruru eru inweta alaeze Chineke, bụ́ nke unu na-atara ahụhụ.” (2 Tesa. 1:3-5) Mgbe ọ bụla onye ikpeazụ ná ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa nwụrụ, mgbe ahụ ka ndị ga-eso chịa n’Alaeze eluigwe Chineke ga-ezu. Nke ahụ ga-abụ ihe na-enye ọṅụ—ma n’eluigwe ma n’ụwa!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Lee Ụlọ Nche nke March 1, 1992, peeji nke 20, paragraf nke 17.

^ par. 16 Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke May 1, 2007.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee ihe Chineke gwara Ebreham bụ́ nke gbasara Ụbọchị Ikpe ahụ?

• Gịnị mere e ji gụọ Ebreham n’onye ezi omume?

• Gịnị ka ịkpọ mkpụrụ Ebreham ndị ezi omume rụpụtaara ha?

• Olee ihe obi siri Ndị Kraịst niile ike na ọ ga-eme?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 20]

Jizọs gbara ụmụazụ ya ume ka ha gbalịsie ike inweta Alaeze ahụ

[Foto dị na peeji nke 21]

Na Pentikọst 33 O.A., Jehova malitere ịhọrọ ndị ọzọ ga-eso ná mkpụrụ Ebreham

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ nwere ekele na a ka nwere Ndị Kraịst e tere mmanụ ha na ha nọ n’oge ikpeazụ a