Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Gụrụ ná Ndị Ruru Eru Ka E Duga Ha n’Isi Iyi nke Mmiri nke Ndụ

Ndị A Gụrụ ná Ndị Ruru Eru Ka E Duga Ha n’Isi Iyi nke Mmiri nke Ndụ

Ndị A Gụrụ ná Ndị Ruru Eru Ka E Duga Ha n’Isi Iyi nke Mmiri nke Ndụ

“Nwa Atụrụ ahụ, . . . ga-azụ ha dị ka atụrụ, ọ ga-edugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.”—MKPU. 7:17.

1. Olee ihe Okwu Chineke kpọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ, oleekwa ọrụ Jizọs nyere ha?

OKWU CHINEKE kpọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị na-elekọta ihe ndị Kraịst nwere n’ụwa “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” Mgbe Kraịst bịara na 1918 inyocha ihe “ohu” ahụ na-eme, ọ chọpụtara na ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa nọgidere na-enye ndị ohu ya ‘nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị.’ Nke a mere ka obi tọọ Onyenwe ha bụ́ Jizọs, ụtọ, ya emezie ha ndị “na-elekọta ihe niile o nwere.” (Gụọ Matiu 24:45-47.) N’ụzọ dị otú a, ndị e tere mmanụ na-ejere ndị ọzọ ha na ha na-efekọ Jehova n’ụwa ozi tupu ha agawa eluigwe.

2. Olee ihe ndị bụ ihe onwunwe Jizọs?

2 Onye nwe ihe nwere ikike iji ihe o nwere mee ihe otú masịrị ya. Ihe onwunwe Jizọs Kraịst, bụ́ onye Jehova chiri eze, gụnyere ihe niile metụtara Alaeze ahụ n’ụwa. Nke a gụnyere “oké ìgwè mmadụ” bụ́ nke Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ. Jọn si otú a kọwaa oké ìgwè mmadụ ahụ: “Lee! oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yi uwe mwụda na-acha ọcha; ha jikwa igu nkwụ n’aka.”—Mkpu. 7:9.

3, 4. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ nwere ihe ùgwù magburu onwe ya?

3 Oké ìgwè mmadụ a so ná ndị ahụ Jizọs kọwara dị ka “atụrụ ọzọ” ya. (Jọn 10:16) Ha na-atụ anya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs. Obi siri ha ike na Jizọs “ga-edugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ” nakwa na “Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha.” N’ihi olileanya a ha nwere, ha “asawokwa uwe mwụda ha, meekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 7:14, 17) Ha na-egosipụta na ha nwere okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ, n’ihi ya, n’anya Chineke, ha yi ‘uwe mwụda ọcha.’ A kpọrọ ha ndị ezi omume, ndị enyi Chineke, dị ka Ebreham.

4 Ebe ọ bụ na Chineke gụrụ oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ na-amụba n’ike n’ike dị ka ndị ezi omume, ha pụrụ inwe olileanya ịlanahụ mbibi nke ụwa ochie a n’oké mkpagbu ahụ. (Jems 2:23-26) Atụrụ ọzọ a pụrụ ịbịaru Jehova nso, ha nwekwara olileanya magburu onwe ya nke ịlanahụ Amagedọn. (Jems 4:8; Mkpu. 7:15) Ndị so n’atụrụ ọzọ a adịghị eme ihe otú masịrị ha kama ha dị njikere ịnakwere nduzi nke Eze eluigwe ahụ na nke ụmụnna ya e tere mmanụ nọ n’ụwa.

5. Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ si akwado ụmụnna Kraịst e tere mmanụ?

5 A kpagbuwo Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ n’ụwa Setan a, a ga-anọgidekwa na-akpagbu ha. Ma obi siri ha ike na ndị enyi ha bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ ga na-akwado ha. Ka Ndị Kraịst e tere mmanụ na-adịwanye ole na ole ugbu a, ọtụtụ narị puku mmadụ na-esonye n’oké ìgwè mmadụ ahụ kwa afọ. Ndị e tere mmanụ agaghị enweli ike ilekọtacha ihe dị ka otu narị puku ọgbakọ e nwere n’ụwa niile n’onwe ha. N’ihi ya, otu ụzọ atụrụ ọzọ ahụ si akwado ha bụ site ná ndị ikom ruru eru so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ije ozi dị ka ndị okenye ọgbakọ. Ha na-enye aka elekọta ọtụtụ nde Ndị Kraịst e nyefere “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ka ọ na-elekọta taa.

6. Olee otú e si buo amụma banyere otú atụrụ ọzọ ahụ ga-esi na-akwado Ndị Kraịst e tere mmanụ?

6 Aịzaya onye amụma buru amụma banyere nkwado a atụrụ ọzọ ahụ ji obi ha dum na-akwado Ndị Kraịst e tere mmanụ. O dere, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru: ‘Ndị ọrụ Ijipt a na-adịghị akwụ ụgwọ na ndị ahịa Itiopia na ndị Siba, bụ́ ndị toro ogologo, ga-abịakwute gị onwe gị. Ha ga-aghọkwa nke gị. Ha ga na-eso gị n’azụ.’” (Aịza. 45:14) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, taa Ndị Kraịst nwere olileanya ibi n’elu ala na-eso òtù ohu ahụ e tere mmanụ na Òtù Na-achị Isi ya n’azụ site n’ịnakwere nduzi ha. Dị ka ndị ọrụ “a na-adịghị akwụ ụgwọ,” atụrụ ọzọ ahụ ji obi ha dum, ume ha dum, na ihe ọ bụla ha nwere na-akwado ọrụ nkwusa ahụ Kraịst nyere ụmụazụ ya e tere mmanụ nọ n’ụwa.—Ọrụ 1:8; Mkpu. 12:17.

7. Gịnị ka a na-azụ oké ìgwè mmadụ ugbu a maka ya?

7 Ka ha na-akwado ụmụnna ha e tere mmanụ, a na-azụ oké ìgwè mmadụ ahụ ịbụ ndị a ga-eji tọọ ntọala nke ụwa ọhụrụ a ga-enwe mgbe Amagedọn gasịrị. Ntọala ahụ ga-abụ a kwaa akwụrụ, ndị e jikwa tọọ ya ga-adị njikere ime ihe Onyenwe ha gwara ha. A na-enye Onye Kraịst ọ bụla ohere igosi na ya ga-ekwe arụrụ Eze ahụ, bụ́ Kraịst Jizọs, ọrụ. Site n’ime ihe gosiri na ya nwere okwukwe ugbu a na site n’irube isi, Onye Kraịst nke ọ bụla na-egosi na ya ga-erubekwa isi mgbe Eze ahụ ga-enye ya iwu n’ụwa ọhụrụ ahụ.

Oké Ìgwè Mmadụ ahụ Egosi na Ha Nwere Okwukwe

8, 9. Olee otú ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ si egosipụta na ha nwere okwukwe?

8 E nwere ọtụtụ ụzọ atụrụ ọzọ ahụ bụ́ ndị so ndị e tere mmanụ na-arụ ọrụ si egosi na ha nwere okwukwe. Otu ụzọ bụ na ha na-akwado ndị e tere mmanụ n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Nke abụọ, ha ji obi ha niile na-eme ihe Òtù Na-achị Isi gwara ha mee.—Hib. 13:17; gụọ Zekaraya 8:23.

9 Nke atọ, ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-akwado ụmụnna ha bụ́ ndị e tere mmanụ site n’ime ihe ndị Jehova nyere n’iwu. Ha na-agbalịsi ike inwe “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” (Gal. 5:22, 23) Ndị mmadụ adịghị akpakarị àgwà ndị a taa, kama ha na-akpakarị àgwà ndị a kọwara dị ka “ọrụ nke anụ ahụ́.” Ma, ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ekpebisiela ike izere “ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, inwe òtù, anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị otú a.”—Gal. 5:19-21.

10. Gịnị ka ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ kpebisirila ike ime?

10 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ọ pụrụ isiri anyị ike igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ, zere ọrụ nke anụ ahụ́ ma guzogide ihe isi ike ndị anyị na-enweta n’ime ụwa Setan. Otú o sina dị, anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla kụda anyị mmụọ ma ọ bụ mee ka okwukwe anyị ma ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ jụọ oyi, ọ sọkwa ya ya bụrụ adịghị ike, ihe ndọghachi azụ, ma ọ bụ ọrịa. Anyị maara na Jehova ga-emezu nkwa ya nke bụ́ ịhụ na oké ìgwè mmadụ ahụ lanahụrụ oké mkpagbu ahụ.

11. Olee ụzọ aghụghọ ndị Setan jirila gbalịa ime ka okwukwe Ndị Kraịst ghara isi ike?

11 Ma, anyị na-anọ ná nche mgbe niile n’ihi na anyị maara na onye iro anyị bụ́ isi bụ Ekwensu, ike adịghịkwa agwụ ya ngwa ngwa. (Gụọ 1 Pita 5:8.) Ọ nwaala ike ya iji ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ rafuo anyị ka anyị chee na ihe ndị a na-ezi anyị bụ ụgha. Ma ọtụtụ mgbe, aghụghọ ya a na-akụ afọ n’ala. N’otu aka ahụ, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ mkpagbu na-eme ka a kwụsịlata ọrụ nkwusa anyị, ma ọtụtụ mgbe, mkpagbu na-eme ka okwukwe ndị a na-akpagbu sikwuo ike. N’ihi ya, Setan na-ejikarị ụzọ ndị o chere ga-agara ya aka eme ka okwukwe anyị ghara isi ike. Ọ na-agbalịkarị inweta anyị mgbe ọ maara na anyị nwere nkụda mmụọ. A dọrọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ aka ná ntị banyere nke a mgbe a gwara ha, sị: “Chesienụ echiche ike banyere onye ahụ [Kraịst] nke diri okwu mmegide dị otú ahụ nke ndị mmehie kwuru megide ọdịmma ha.” N’ihi gịnị? Ọ bụ “ka ike ghara ịgwụ unu, unu ewee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.”—Hib. 12:3.

12. Olee otú ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl si agba ndị nwere nkụda mmụọ ume?

12 Ọ dịtụla mgbe ọ dị gị ka ị kwụsị ijere Jehova ozi? Ọ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ị naghị eru ihe a chọrọ? Ya bụrụ otú ahụ, ekwela ka Setan jiri echiche ndị a mee ka ị kwụsị ijere Jehova ozi. Ịmụchi Baịbụl anya, ikpechi ekpere anya, na ịgachi ọmụmụ ihe anya na iso ndị kweere ekwe ibe gị na-akpachi anya ga-eme ka okwukwe gị sie ike ma nyere gị aka ka ị ghara ‘ịda mbà ná mkpụrụ obi gị.’ Jehova ekwela nkwa inyere ndị na-ejere ya ozi aka inweta ike, ọ ga-emezukwa nkwa ya. (Gụọ Aịzaya 40:30, 31.) Nọgide na-ejechi ozi Alaeze ahụ anya. Zere itinye aka n’ihe ndị ga-ewekọrọ oge gị ma dọpụ uche gị, ma gbalịsie ike inyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na i mee nke a, ị ga-enwe ike ịtachi obi n’agbanyeghị ihe ndị na-akụda mmụọ.—Gal. 6:1, 2.

Isi n’Oké Mkpagbu ahụ Pụta Ma Banye n’Ụwa Ọhụrụ

13. Olee ọrụ ndị lanahụrụ Amagedọn ga-arụ?

13 Amagedọn gasịa, ọ ga-adị mkpa ka a kụziere ọtụtụ nde ndị ajọ omume ndị a ga-esi n’ọnwụ kpọlite iwu Jehova. (Ọrụ 24:15) Ọ ga-adịkwa mkpa ka ha mụta ihe banyere àjà mgbapụta Jizọs; tụkwasị na nke ahụ, ọ dịkwa oké mkpa ka a kụziere ha otú ha ga-esi mee ihe gosiri na ha nwere okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ ka ha wee nwee ike irite uru site na ya. Ha kwesịrị ịhapụ nkwenkwe okpukpe ụgha ndị ha kwebuuru ma kwụsị ibi ụdị ndụ ha naara ebi. Ha kwesịkwara ịmụta iyiri mmadụ ọhụrụ, bụ́ nke e ji ama ezi Ndị Kraịst. (Efe. 4:22-24; Kọl. 3:9, 10) Ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị nke ga-alanahụ Amagedọn, ga-enwe ọrụ buru ibu ha ga-arụ. Ọ ga-abụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ ịrụrụ Jehova ọrụ dị otú a mgbe nsogbu na ihe ndọpụ uche ndị dị n’ụwa ọjọọ anyị a na-agaghịzi adị!

14, 15. Kọwaa ụdị mkparịta ụka ga-adị n’etiti ndị lanahụrụ oké mkpagbu ahụ na ndị ezi omume a kpọlitere n’ọnwụ.

14 Ndị ohu Jehova nwụrụ tupu Jizọs abịa jee ozi n’ụwa ga-enwe ọtụtụ ihe ha ga-amụta n’oge ahụ. Ha ga-amata onye Mesaya ahụ e kwere ná nkwa bụ, bụ́ onye ha tụsiri anya ya ike ma ha ahụghị ya. N’oge ahụ ha dịbu ndụ, ha gosiri na ha ga-anakwere nduzi Jehova. Ọ ga-abụ nnọọ ihe na-enye ọṅụ na ihe ùgwù inyere ha aka, dị ka ihe atụ ịkọwara Daniel otú amụma ndị ahụ o deturu ọ na-aghọtachaghị si mezuo!—Dan. 12:8, 9.

15 Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-amụta n’aka anyị, anyị ga-enwekwa ọtụtụ ajụjụ ndị anyị ga-ajụ ha. Ha ga-enwe ike ịkọchara anyị otú ọtụtụ ihe ndị a na-akọruchaghị n’isi ná Baịbụl si mee. Chegodị otú ọ ga-adị ịnụ mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim ga-akọrọ anyị ọtụtụ ihe ndị anyị na-amaghị banyere nwa nwanne mama ya bụ́ Jizọs! Obi abụọ adịghị ya na ihe ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ga-akọrọ anyị ga-eme ka anyị ghọtakwuo Okwu Chineke karịa ka anyị ghọtara ya ugbu a. Ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụla anwụ—gụnyere ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ bụ́ ndị nwụrụ n’oge ọgwụgwụ—ga-enweta “mbilite n’ọnwụ ka mma.” Ha malitere ijere Jehova ozi n’ime ụwa Setan na-achị. Ọ ga-enyekwa ha ọṅụ dị ukwuu ịga n’ihu na-ejere Jehova ozi n’ime ụwa ọhụrụ ebe ha na-agaghịzi enwe nsogbu!—Hib. 11:35; 1 Jọn 5:19.

16. Dị ka e buru n’amụma, olee otú Ụbọchị Ikpe ahụ ga-esi gaa?

16 N’Ụbọchị Ikpe ahụ, e nwere oge a ga-emeghe akwụkwọ mpịakọta. A ga-eji ihe ndị e dere n’akwụkwọ a nakwa na Baịbụl kpee ndị niile dị ndụ ikpe ma hà ga-eru eru inweta ndụ ebighị ebi. (Gụọ Mkpughe 20:12, 13.) Tupu Ụbọchị Ikpe ahụ abịa ná njedebe, onye ọ bụla ga-enwe ohere zuru ezu igosi ebe ọ kwụ n’ihe iseokwu ahụ banyere onye kwesịrị ịchị eluigwe na ala. Onye ahụ ga-ekpebi ma ọ̀ ga-akwado Alaeze ahụ ma kwere ka Atụrụ ahụ duga ya “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ,” ka ọ̀ ga-anọgide na-ajụ ịkwado Alaeze Chineke. (Mkpu. 7:17; Aịza. 65:20) Tupu oge a eruo, ndị niile bi n’ụwa agaala enwe ohere ikpebi onye ha ga-eso, ha agaghị abụ ndị mmehie e ketara eketa ma ọ bụ ụwa ọjọọ ha nọ n’ime ya manyere ime ihe na-abụghị uche ha. Agaghịkwa enwe onye ga-ekwu na otú Jehova si kpee ikpe ikpeazụ a ezighị ezi. Ọ bụ naanị ndị mmehie ka a ga-ebibi kpamkpam.—Mkpu. 20:14, 15.

17, 18. Olee ihe mere Ndị Kraịst e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ ji na-enwe ọṅụ ka ha na-atụ anya Ụbọchị Ikpe ahụ?

17 Ebe a gụworo Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa taa ná ndị ruru eru inweta Alaeze, ha na-atụsi anya ike iso Jizọs chịa n’Ụbọchị Ikpe ahụ. Ọ bụụrụ ha nnọọ nnukwu ihe ùgwù! Olileanya a na-akpali ha ime ihe Pita gwara ụmụnna ha na narị afọ mbụ, sị: “Gbalịsienụ ike ọbụna karị ka unu mee ka òkù a kpọrọ unu na nhọrọ a họọrọ unu bụrụ ihe unu onwe unu ji n’aka; n’ihi na ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, unu agaghị ada mgbe ọ bụla. N’eziokwu, a ga-esi otú a mee ka unu banye n’ụzọ dị ebube n’alaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.”—2 Pita 1:10, 11.

18 Atụrụ ọzọ ahụ nwekwara obi ụtọ na ụmụnna ha ndị e tere mmanụ nwere ụdị olileanya a. Ha ekpebisiekwala ike ịkwado ha. Ha bụ ndị a kpaliri ime ike ha niile n’ozi Chineke n’ihi na ha bụ ndị enyi Chineke nke oge a. N’Ụbọchị Ikpe ahụ, obi ga-adị ha ụtọ iji obi ha niile kwadoo ndokwa Chineke mere ka Jizọs duga ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ. Mgbe ahụ—n’ikpeazụ—a ga-agụnye ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị ohu Jehova n’elu ala ruo mgbe niile ebighị ebi!—Rom 8:20, 21; Mkpu. 21:1-7.

Ì Chetara?

• Olee ihe ndị bụ́ ihe onwunwe Jizọs?

• Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ si na-akwado ụmụnna ha ndị e tere mmanụ?

• Olee ihe ùgwù oké ìgwè mmadụ ahụ nwere, oleekwa ihe ndị ha na-atụ anya ya?

• Olee otú i si ele Ụbọchị Ikpe ahụ anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ asaala uwe mwụda ha meekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 27]

Olee ihe ị na-atụ anya ịmụta n’ọnụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi a kpọlitere n’ọnwụ?