Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị Nwere Ezi Obi” Na-anabata Ozi Ọma Ahụ

“Ndị Nwere Ezi Obi” Na-anabata Ozi Ọma Ahụ

“Ndị Nwere Ezi Obi” Na-anabata Ozi Ọma Ahụ

“Ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị kwere ekwe.”—ỌRỤ 13:48.

1, 2. Olee otú Ndị Kraịst mbụ si mezuo amụma ahụ Jizọs buru na a ga-ekwusa ozi ọma ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi?

N’AKWỤKWỌ Baịbụl bụ́ Ọrụ Ndịozi, e dekọrọ akụkọ na-enye obi ụtọ banyere otú Ndị Kraịst oge mbụ si mee ihe ahụ Jizọs buru n’amụma nke bụ́ na a ga-ekwusa oziọma Alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Mat. 24:14) Ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi setịpụụrụ ndị niile ga-eso ha n’azụ ezi ihe nlereanya. N’ihi àmà ndị na-eso ụzọ Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi gbaa na Jeruselem, ọtụtụ puku mmadụ, gụnyere “oké ìgwè ndị nchụàjà,” nubatara n’ọgbakọ e nwere na narị afọ mbụ.—Ọrụ 2:41; 4:4; 6:7.

2 Ndị ozi ala ọzọ e nwere na narị afọ mbụ nyeere ọtụtụ ndị ọzọ aka ịghọ Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Filip gara Sameria bụ́ ebe ọtụtụ mmadụ gere ya nnọọ ntị. (Ọrụ 8:5-8) Pọl na ọtụtụ ndị ọzọ so gaa kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ebe, ndị gụnyere Saịprọs, mba ndị dị n’Eshia Maịnọ, Masedonia, Gris, na Ịtali. N’obodo ebe ndị o kwusara ozi ọma, imerime ndị Juu na ndị Gris ghọrọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 14:1; 16:5; 17:4) Taịtọs kwusara ozi ọma na Krit. (Taị. 1:5) Pita kwusara nke ya na Babịlọn, ihe dịkwa ka n’afọ 62-64 O.A., bụ́ mgbe o dere akwụkwọ ozi ya mbụ, a mazi banyere ọrụ nkwusa Ndị Kraịst nke ọma n’obodo Pọntọs, Galeshia, Kapadoshia, Eshia, na Bitinia. (1 Pita 1:1; 5:13) Oge ndị ahụ bụ n’ezie oge na-enye ọṅụ! Ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ jiri nnọọ ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma nke na ndị iro ha kwuru na ha ‘ekpuola elu ụwa mmadụ bi ihu.’—Ọrụ 17:6; 28:22.

3. Olee ihe ozi ọma ndị nkwusa Alaeze na-ekwusa na-arụpụta taa, oleekwa otú nke a dị gị n’obi?

3 N’oge anyị a kwa, ọgbakọ Ndị Kraịst amụbaala nnọọ. Obi ọ́ dịghị atọ gị ụtọ mgbe ị gụrụ akụkọ mgbaafọ nke Ndịàmà Jehova ma hụ ihe ndị a na-arụpụta n’ụwa niile? Ọ́ dịghị enye gị obi ụtọ ịmara na n’afọ ije ozi 2007 ndị nkwusa Alaeze duziri ihe karịrị ọmụmụ Baịbụl nde isii n’ụwa niile? Ihe dị ka nde mmadụ iri n’ime ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ gara aga na-egosikwa na e nwere ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ma ha nwere nnọọ mmasị n’ozi ọma ahụ nke mere ha ji bịa ihe omume a dị mkpa. Nke a na-egosi na a ka nwere ọtụtụ ọrụ a ga-arụ.

4. Olee ndị na-anabata ozi ọma nke Alaeze ahụ?

4 Dị nnọọ ka ọ dị na narị afọ mbụ, taakwa, “ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” na-anabata ozi ọma ahụ. (Ọrụ 13:48) Jehova na-adọta ndị dị otú a ná nzukọ ya. (Gụọ Hagaị 2:7.) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ozi anyị anya iji nwee ike ịkwado ọrụ nchịkọta a n’ụzọ zuru ezu?

Kwusaa Ozi Ọma n’Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu

5. Olee ụdị ndị ha na Jehova na-adị ná mma?

5 Ndị Kraịst narị afọ mbụ ghọtara na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ọ bụ mmadụ inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs ga-ekpebi ma onye ahụ na Jehova ọ̀ ga-adị ná mma ma ọ bụ na ya na ya agaghị adị ná mma. (Jọn 3:16, 36) Ọ bụkwa uche Jehova ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Tim. 2:3, 4.

6. Olee ihe ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ na-ekwesịghị ime, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Ọ jọgburu onwe ya ndị na-ekwusa ozi ọma ịghara ịgbara ndị ọzọ àmà n’ihi na ha si n’agbụrụ dị iche, nọrọ n’okpukpe dị iche, bụrụ ogbenye ma ọ bụ ọgaranya ma ọ bụkwanụ n’ihi ụcha akpụkpọ ahụ́ ha ma ọ bụ n’ihi ihe ọ bụla ọzọ. Chegodị echiche: Obi ọ́ dịghị gị ụtọ na onye mbụ kụziiri gị eziokwu Baịbụl ajụghị ime otú ahụ n’ihi na o chere na ị gaghị ege ntị? N’ihi ya, i kwesịghị ịla azụ ikwusara onye ọ bụla chọrọ ige ntị ozi ọma ahụ na-azọpụta ndụ.—Gụọ Matiu 7:12.

7. Gịnị mere anyị ekwesịghị ikpe ndị anyị na-ekwusara ozi ọma ikpe?

7 Jehova ahọpụtala Jizọs ikpe ndị mmadụ ikpe, n’ihi ya ọ dịghị anyị n’aka ikpe onye ọ bụla ikpe. Nke a bụ eziokwu n’ihi na anyị na Jizọs abụghị otu. Anyị pụrụ ịdabere ‘naanị n’ihe anya anyị na-ahụ’ ma ọ bụ ‘n’ihe ntị anyị nụrụ’ na-ekpe ikpe, ma Jizọs maara ihe dị mmadụ n’obi.—Aịza. 11:1-5; 2 Tim. 4:1.

8, 9. (a) Olee ụdị mmadụ Sọl bụ tupu ya aghọọ Onye Kraịst? (b) Olee ihe akụkọ banyere Pọl onyeozi kwesịrị ịkụziri anyị?

8 Ụdị ndị dị iche iche aghọọla ndị ohu Jehova. Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ Sọl onye Tasọs, bụ́ onye mechara zawa Pọl onyeozi. Sọl bụ onye Farisii nke kpagburu nnọọ Ndị Kraịst. Ihe mere o ji kpagbuo Ndị Kraịst otú a bụ n’ihi na o kweere na ha adịghị efe Chineke. (Gal. 1:13) N’anya mmadụ, o yighị ka ọ dị ihe nwere ike ime ka ọ ghọọ Onye Kraịst. Ma ọ dị ihe dị mma Jizọs hụrụ n’ime Sọl mere o ji họrọ ya ịga rụọ ọrụ pụrụ iche. N’ihi ya, Sọl ghọrọ otu n’ime ndị nọ n’ọgbakọ narị afọ mbụ jiri ịnụ ọkụ n’obi jee ozi.

9 Gịnị ka akụkọ banyere Pọl onyeozi na-akụziri anyị? Ikekwe n’ókèala anyị, e nwere ndị na-achọghị iji ntị anụ ozi ọma anyị na-ekwusa. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume na e nwere onye n’ime ha ga-aghọ ezi Onye Kraịst, anyị ekwesịghị ịkwụsị ịdị na-ekwusara ha ozi ọma. Mgbe ụfọdụ ọbụna onye anyị na-atụghịdị anya na ọ ga-ege ntị n’ozi ọma anyị nwere ike ige ntị. Ọrụ anyị bụ ịnọgide na-ekwusara mmadụ niile ozi ọma ahụ “n’akwụsịghị akwụsị.”—Gụọ Ọrụ 5:42.

A Ga-agọzi Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma “n’Akwụsịghị Akwụsị”

10. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịla azụ ikwusara ndị yiri ka ha na-emenye ụjọ ozi ọma? Kọọ ihe atụ ndị ị maara n’ógbè unu.

10 Otú mmadụ dị nwere ike imegharị anyị anya. Dị ka ihe atụ, Ignacio * na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’otu mba dị na South America. A na-atụ ya ụjọ n’ihi na ọ na-eme ihe ike. Ọ bụkwa nke a mere ndị mkpọrọ rụụrụ ndị mkpọrọ ibe ha ọrụ ma ọ bụ resị ha ihe na-eji edunye ya ka ọ gaa nata ndị nke na-achọghị ịkwụ ụgwọ ego. Ma, ka Ignacio na-amụ Baịbụl ma na-etinye ihe ndị ọ na-amụta n’ọrụ, ọ kwụsịrị ime ihe ike ma ghọọ onye obiọma. Ọ dịghịzikwa onye na-edunye ya ka ọ gaa natara ya ndị ji ya ụgwọ ego. N’agbanyeghị nke ahụ, Ignacio nwere obi ụtọ na eziokwu Baịbụl na mmụọ Nsọ Chineke agbanweela ndụ ya. Obi dịkwa ya ụtọ na ndị nkwusa na-amụrụ ya Baịbụl ebughị ụzọ kpebie na ya agaghị ekwe mmekwata.

11. Gịnị mere anyị ji agaghachi na nke ndị anyị kwusaara ozi ọma?

11 Otu ihe mere anyị ji agaghachi na nke ndị anyị kwusaara ozi ọma bụ n’ihi na ọnọdụ ha na àgwà ha nwere ike ịgbanwe, n’eziokwu kwa ha na-agbanwe. E nwere ike ụfọdụ adaala ọrịa kemgbe anyị gachara na nke ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na a chụọla ha n’ọrụ ma ọ bụ na onye ha hụrụ n’anya anwụọla. (Gụọ Ekliziastis 9:11.) Ihe ndị na-eme n’ụwa pụrụ ime ka ndị mmadụ chewe ihe chi ga-abọtara ha. Ihe ndị a nwere ike ime ka onye na-adịbụghị enwe mmasị ma ọ bụdị na-emegide ozi anyị gewezie ntị. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịhapụ iji ohere ọ bụla kwesịrị ekwesị anyị nwere kwusaara ndị ọzọ ozi ọma ahụ.

12. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị anyị na-ekwusara ozi ọma anya, n’ihi gịnịkwa?

12 Ụmụ mmadụ na-elekarị ibe ha anya n’ihu emeso ha ihe, ha na-ekpekarịkwa ndị ọzọ ikpe. Ma, Jehova na-emeso anyị ihe n’otu n’otu. Ọ na-ahụ ebe onye ọ bụla n’ime anyị ga-emeli nke ọma. (Gụọ 1 Samuel 16:7.) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ime otu ihe ahụ n’ozi anyị. E nwere ọtụtụ ihe atụ ndị na-egosi na ile ndị anyị na-ekwusara ozi ọma anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-arụpụta ihe dị mma.

13, 14. (a) Gịnị mere otu onye ọsụ ụzọ ji kwụsị ịga na nke otu nwaanyị ọ hụrụ n’ozi ọma? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ahụmahụ a?

13 Sandra, bụ́ nwanna nwaanyị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ, nọ n’ozi ọma n’otu agwaetiti dị na Caribbean mgbe ọ hụrụ Ruth, bụ́ onye ememme obodo ha riri isi. E chiri Ruth eze nwaanyị ememme ahụ ugbo abụọ. O gosiri nnọọ mmasị n’ihe a gwara ya, kwetakwa ka a bịa duziwere ya ọmụmụ Baịbụl. Sandra kwuru, sị: “Mgbe m batara na palọ ya, ahụrụ m nnukwu foto Ruth ebe o yi ụdị uwe e ji chie ya eze nwaanyị ememme ahụ, hụkwa ọtụtụ ihe nrite ndị o nwetara. Ihe m kwuru n’obi m ozugbo ahụ bụ na onye a ma ama otú a nakwa onye ememme riri isi otú a agaghị enwe mmasị n’eziokwu. N’ihi ya, akwụsịrị m ịga na nke ya.”

14 Otu ụbọchị, Ruth bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, ọ jụrụ Sandra, sị, “Gịnị mere ị naghịzi abịa amụrụ m ihe?” Sandra rịọrọ ya mgbaghara ma kwe ya nkwa ịmaliteghachi ịmụrụ ya ihe. Ruth nwere ọganihu ngwa ngwa, wepụsịa foto ememme ya niile, malitekwa iso na-eme ihe niile a na-eme n’ọgbakọ, ma rara onwe ya nye Jehova. N’eziokwu, nke a kụziiri Sandra na ihe mbụ o chere banyere Ruth ezighị ezi.

15, 16. (a) Gịnị mere mgbe otu onye nkwusa ziri onye ikwu ya ozi ọma? (b) Gịnị mere na ụdị ndụ onye ikwu anyị na-ebi ekwesịghị igbochi anyị ịgbara ya àmà?

15 E nwekwaala ọtụtụ ihe ọma si n’ikwusara ndị ezinụlọ anyị na-ekweghị ekwe ozi ọma pụta, ọbụnadị mgbe o yiri ka ha agaghị ege ntị. Tụlee ihe banyere Joyce, bụ́ nwanna nwaanyị bi na United States. Nwanne di ya agaala mkpọrọ ọtụtụ ugboro kemgbe ọ dị afọ iri na ụma. Joyce kwuru, sị: “Ndị mmadụ kwuru na ndụ ya enweghị isi n’ihi na ọ na-ere ọgwụ ike, na-ezu ohi, ma na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ. N’agbanyeghị ihe ndị a niile ọ na-eme, anọgidere m na-ezi ya ozi ọma ruo afọ iri atọ na asaa.” Ndidi Joyce ji nọgide na-ezi ya ozi ọma rụpụtara nnọọ ihe dị mma mgbe nwanne di ya mechara kwere ka Ndịàmà Jehova mụwara ya Baịbụl, ya agbanweekwa ndụ ya ngwa ngwa. E mere ya baptizim n’oge na-adịbeghị anya ná mgbakọ e nwere na California, U.S.A. mgbe ọ dị afọ iri ise. Joyce na-ekwu, sị: “Anya mmiri gbara m n’ihi ọṅụ. Obi dị m nnọọ ụtọ na akwụsịghị m ikwusara ya ozi ọma!”

16 O nwere ike ịdị na-esiri gị ike ịkọrọ ndị ikwu gị eziokwu ndị dị na Baịbụl n’ihi ụdị ndụ ha na-ebi. Ma, nke a egbochighị Joyce ịgwa nwanne di ya ahụ okwu. A sị kwuwe, olee otú mmadụ ga-esi mara ihe dị onye ọzọ n’obi? O nwere ike onye ahụ ji obi ya niile na-achọ ịmata eziokwu. N’ihi ya, ekwela ka ihe ọ bụla dọghachi gị azụ inye onye ahụ ohere ịchọta eziokwu ahụ.—Gụọ Ilu 3:27.

Akwụkwọ Mara Nnọọ Mma E Ji Amụ Baịbụl

17, 18. (a) Gịnị ka akụkọ e si ná mba dị iche iche nweta na-egosi banyere otú akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? si baa uru? (b) Olee ahụmahụ ndị na-agba ume i nwerela site n’iji akwụkwọ a na-eduziri ndị mmadụ ọmụmụ ihe?

17 Akụkọ ndị e si ná mba dị iche iche nweta na-egosi na ọtụtụ ndị nwere ezi obi nwere obi ụtọ iji akwụkwọ ahụ e ji amụ Baịbụl bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? na-amụ ihe. Penni, bụ́ nwanna nwaanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ na United States, ji akwụkwọ ahụ malite ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl. Mmadụ abụọ n’ime ha bụ́ ndị meworo agadi ejighị okpukpe ha egwuri egwu. Penni nọ nnọọ na-eche ihe ha ga-eme ma o gosi ha eziokwu Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ma o mesịrị dee, sị: “N’ihi otú e si dee ihe ndị dị n’akwụkwọ a n’ụzọ doro anya ma dị mfe nghọta, ha kweere na ihe ha na-amụta bụ eziokwu n’agaghị rụwa ụka ma ọ bụ siwe ọnwụ.”

18 Pat, bụ́ onye nkwusa nọ na Britain, malitere ịmụrụ otu nwaanyị si n’otu mba dị n’Eshia gbata ọsọ ndụ na Britain Baịbụl. Nwaanyị a gbapụrụ ná mba ya mgbe ọ na-ahụghịzi di ya na ụmụ ya ka ndị agha nnupụisi kpụrụsịịrị ha. Tupu ya agbaga Britain, ọ chị obi n’aka mgbe niile, ndị nnupụisi ahụ gbara ụlọ ya ọkụ dinakwaa ya n’ike n’ígwè. Ihe a niile mere ka ndụ gwụ ya ike, ọ gbalịkwaala igbu onwe ya ugboro ugboro. Ma Baịbụl a na-amụrụ ya mere ka o nwee olileanya. Pat dere, sị: “Otú e si kọwaa ihe ndị dị n’ime akwụkwọ ahụ n’ụzọ dị mfe nghọta na ihe atụ ndị doro anya e dere n’ime ya masịrị ya nnọọ. Nwaanyị ahụ nwere ọganihu ngwa ngwa, ruo eruo ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, o kwuokwala na ya chọrọ ka e mee ya baptizim ná mgbakọ ọzọ a ga-enwe. Ọ bụ nnọọ ihe na-enye ọṅụ inyere ndị nwere ezi obi aka ịghọta olileanya ndị e kwuru okwu ha n’Akwụkwọ Nsọ na inwe ekele maka ha.

“Ka Anyị Ghara Ịda Mbà n’Ime Ihe Dị Mma”

19. Gịnị mere o ji dị nnọọ mkpa na a ga-ekwusa ozi ọma ngwa ngwa ugbu a?

19 Ka ụbọchị na-aga, ọ na-adịwanye mkpa ka anyị kwusaa ozi ọma ahụ ma nyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ngwa ngwa. Ọtụtụ puku ndị nwere ezi obi na-anabata ozi ọma anyị kwa afọ. Ma, “oké ụbọchị Jehova dị nso,” nke pụtara na ndị ka nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ “na-adagharị na-aga n’ebe a ga-egbu ha.”—Zef. 1:14; Ilu. 24:11.

20. Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 Anyị ka nwere ike inyere ndị dị otú a aka. Ma iji mee nke ahụ, anyị kwesịrị nnọọ iṅomi Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ́ ndị “nọ na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 5:42) Ṅomie ha site n’ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ihe isi ike ndị ị na-enwe, sitekwa n’ime ka “nkà izi ihe” gị ka mma, nakwa site n’ikwusara onye ọ bụla ozi ọma n’akpaghị ókè! “Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma” n’ihi na ọ bụrụ na anyị atachie obi, anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi, anyị na Chineke ga-adịkwa ná mma.—2 Tim. 4:2; gụọ Ndị Galeshia 6:9.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 A gbanwere ụfọdụ aha ndị dị ebe a.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ndị na-anabata ozi ọma?

• Gịnị mere anyị ekwesịghị ịkpa ókè mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma?

• Olee ahụmahụ ndị e nwetarala site n’iji akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ọtụtụ puku ndị nwere ezi obi na-anabata ozi ọma ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Gịnị ka otú Pọl onyeozi si gbanwee àgwà ya na-akụziri anyị?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ndị nkwusa ozi ọma adịghị akpa ókè