Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅomie Onye Ozi Ala Ọzọ Ahụ Kasịnụ

Ṅomie Onye Ozi Ala Ọzọ Ahụ Kasịnụ

Ṅomie Onye Ozi Ala Ọzọ Ahụ Kasịnụ

“Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.”—1 KỌR. 11:1.

1. Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi Jizọs Kraịst?

PỌL onyeozi ṅomiri onye ozi ala ọzọ ahụ kasịnụ bụ́ Jizọs Kraịst. Ọ gbakwara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Kọr. 11:1) Mgbe Jizọs kụzichaara ndịozi ya otú ha ga-esi na-adị umeala n’obi site n’iwetu onwe ya ala saa ha ụkwụ, ọ gwara ha, sị: “M na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.” (Jọn 13:12-15) Anyị bụ́ Ndị Kraịst nke oge a kwesịrị iṅomi Jizọs Kraịst n’okwu ọnụ anyị na n’ihe ndị anyị na-eme nakwa n’otú anyị si akpa àgwà.—1 Pita 2:21.

2. A sịgodị na Òtù Na-achị Isi ahọpụtabeghị gị ije ozi ala ọzọ, olee àgwà i kwesịrị inwe?

2 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara na onye ozi ala ọzọ bụ onye e zigara ịga kwusaa ozi ọma—onye na-ewetere ndị ọzọ ozi ọma. Pọl jụrụ ajụjụ ụfọdụ na-adọrọ mmasị banyere nke a. (Gụọ Ndị Rom 10:11-15.) Cheta na onyeozi ahụ jụrụ, sị: “Olee . . . otú ha ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-ekwusara ha?” Mgbe ọ jụchara ajụjụ a, o kwughachiri ihe ahụ e kwuru n’amụma Aịzaya, sị: “Lee ka ụkwụ nke ndị na-ezisa ozi ọma nke ihe dị mma si maa mma nke ukwuu!” (Aịza. 52:7) A sịgodị na a họpụtabeghị gị ma ziga gị n’obodo ọzọ ịga jee ozi dị ka onye ozi ala ọzọ, ị ka nwere ike inwe mmụọ nke ikwusa ozi ọma ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ dị ka Jizọs mere. N’afọ gara aga, ndị nkwusa Alaeze dị nde isii, narị puku itolu iri puku ise na asaa na narị asatọ iri ise na abụọ ‘rụrụ ọrụ ndị na-ezisa ozi ọma’ na narị ala abụọ na iri atọ na isii.—2 Tim. 4:5.

“Anyị Ahapụwo Ihe Niile, Soro Gị”

3, 4. Olee ihe Jizọs hapụrụ n’eluigwe, gịnịkwa ka anyị ga-eme iji bụrụ ụmụazụ ya?

3 Iji rụzuo ọrụ ọ bịara ịrụ n’ụwa, Jizọs “mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu,” hapụ ụdị ndụ ọ na-ebibu n’eluigwe na ihe ùgwù o nweburu. (Fil. 2:7) Ọ dịtụghịdị ihe anyị ga-eme ka anyị na-agbalị iṅomi Jizọs ya aharuo ka ihe Jizọs mere mgbe ọ na-abịa ije ozi n’ụwa. Ma anyị pụrụ ịnọgide bụrụ ụmụazụ ya, ghara ịdị na-akwa ụta n’ihi ihe ndị anyị hapụrụ n’ụwa Setan.—1 Jọn 5:19.

4 Ọ dị mgbe Pita onyeozi gwara Jizọs, sị: “Lee! Anyị ahapụwo ihe niile, soro gị.” (Mat. 19:27) Mgbe Jizọs gwara Pita, Andru, Jems, na Jọn ka ha soro ya, ha hapụrụ ụgbụ ha ozugbo soro ya. Ha hapụrụ ọrụ ịkụ azụ ha, ma were ikwusa ozi ọma mere aka ọrụ. Dị ka Oziọma Luk si kwuo, Pita sịrị: “Lee! Anyị ahapụwo ihe niile anyị nwere soro gị.” (Luk 18:28) Ọ bụghị iwu na anyị niile ga-ahapụ ihe niile “anyị nwere” iji soro Jizọs. Ma iji bụrụ ụmụazụ Jizọs na ndị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi, anyị kwesịrị ‘ịjụ onwe anyị.’ (Mat. 16:24) Nke a na-eweta nnọọ ọtụtụ ngọzi. (Gụọ Matiu 19:29.) Anyị na-enwe nnọọ ọṅụ mgbe anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ dị ka Jizọs mere, karịsịa ma ọ bụrụ na e nweela onye anyị nyeere aka ịbịaru Chineke na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya nso.

5. Kọọ ahụmahụ gosiri ihe onye kwagara ná mba ọzọ nwere ike ikpebi ime ma ọ mụta eziokwu Baịbụl.

5 Valmir, bụ́ onye Brazil nke bi n’ime ime obodo Suriname, na-arụ ọrụ igwu ọlaedo. Ọ bụ onye aṅụrụma ma na-ebi ndụ rụrụ arụ. Otu ụbọchị ọ gara n’otu obodo ukwu, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ya Baịbụl. Ha mụụrụ ya ihe ụbọchị niile, ya emee ọtụtụ mgbanwe, e meekwa ya baptizim n’oge na-adịghị anya. Mgbe ọ chọpụtara na ọrụ ya adịghị ekwecha ya mee ihe Baịbụl kwuru, o rere ụlọ ọrụ ya na-enye ya ezigbo ego ma laghachi Brazil iji nyere ndị ezinụlọ ya aka ịmụta eziokwu ahụ. Ọtụtụ ndị mụtara eziokwu ahụ ná mba ndị ha kwagara na-eji aka ha ahapụ ọrụ ha na-arụ n’obodo ndị bara ọgaranya ha nọ na ya ma laghachi n’obodo ha iji nyere ndị ikwu ha na ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu ahụ. Ndị nkwusa Alaeze dị otú a nwere nnọọ mmụọ nke ikwusa ozi ọma.

6. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị enwelighị ike ịkwaga n’ebe a chọsiri ndị nkwusa Alaeze ike?

6 Ọtụtụ Ndịàmà akwagala n’ebe ndị a chọsiri ndị nkwusa Alaeze ike. Ụfọdụ na-ejedị ozi ná mba ọzọ. E nwere ike anyị agaghị emeli nke a, ma anyị pụrụ iṅomi Jizọs site n’ịdị na-eme ike anyị niile n’ozi.

Jehova Na-enye Ọzụzụ Dị Mkpa

7. Olee ụlọ akwụkwọ ndị e ji azụ ndị nkwusa Alaeze chọrọ ka nkà izi ihe ha kakwuo mma?

7 Dị nnọọ ka Nna Jizọs si zụọ ya, ọzụzụ Jehova na-enye anyị taa na-abakwara anyị uru. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “E dere n’akwụkwọ ndị amụma, sị, ‘Ha niile ga-abụkwa ndị Jehova kụziiri ihe.’” (Jọn 6:45; Aịza. 54:13) Taa, e nwere ụlọ akwụkwọ ndị ihe bụ́ isi mere e ji hiwe ha bụ iji kwadebe anyị ịbụ ndị nkwusa Alaeze. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke a na-enwe n’ọgbakọ anyị abaarala anyị niile uru n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Ndị ọsụ ụzọ nwere ihe ùgwù nke ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Ụfọdụ ndị rụterela ọrụ ọsụ ụzọ aka enweela ihe ùgwù ịga ya nke ugbo abụọ. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi agaala Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze iji mee ka nkà izi ihe ha kakwuo mma nakwa iji nwekwuo ike ijere ụmụnna ha ozi n’ụzọ ka mma. A zụọla ọtụtụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwaanyị n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, bụ́ nke na-akwadebe ha inyere ndị ọzọ aka n’ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ. A zụọkwala ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị e zigara ozi ala ọzọ na Watchtower Bible School of Gilead.

8. Olee ihe ụmụnna ụfọdụ dị njikere ịchụ n’àjà n’ihi ọzụzụ Jehova na-enye?

8 Ọtụtụ Ndịàmà Jehova emeela mgbanwe ụfọdụ iji nwee ike ịga ụlọ akwụkwọ ndị a. Iji nwee ike ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na Canada, Yugu gbara arụkwaghịm n’ọrụ ya n’ihi na ọga ya ekweghị enye ya oge ezumike. Yugu kwuru, sị: “Adịghị m akwa ụta maka ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na a sị na ha meere m amara nye m oge ezumike, ha nwere ike ịtụ anya ka m nọgide na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ. Ma ugbu a adị m njikere ịnakwere ọrụ ọ bụla Jehova ga-enye m.” Iji nata ọzụzụ Chineke na-enye, ọtụtụ ndị achụọla ihe ndị ha jibu kpọrọ oké ihe n’àjà.—Luk 5:28.

9. Nye ihe atụ gosiri na ọ bụrụ na mmadụ agbalịsie ike ịmụta ihe e si n’Akwụkwọ Nsọ na-akụziri ya na ọ ga-abara ya uru.

9 Ọ bụrụ na e jiri Akwụkwọ Nsọ zụọ mmadụ, onye ahụ agbalịsiekwa ike mụta ihe a kụziiri ya, ọ pụrụ inyere onye ahụ aka inwe nnọọ ọganihu. (2 Tim. 3:16, 17) Tụlee ihe banyere Saulo bi na Guatemala. O nwetụrụ nsogbu n’ụbụrụ mgbe a mụrụ ya, otu n’ime ndị nkụzi ya gwakwara mama ya na o kwesịghị ịmanye Saulo ịmụ ka e si agụ ihe n’ihi na ime otú ahụ ga na-eme ka ahụ́ na-agbakasị ya. Saulo gụsịrị akwụkwọ n’amaghị ka e si agụ ihe. Ma otu Onyeàmà jiri broshuọ bụ́ Apply Yourself to Reading and Writing kụziere Saulo ka e si agụ ihe. Saulo mesịrị mụta ịgụ ihe ruo n’ókè nke ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ka mama Saulo nọ n’ozi ọma otu ụbọchị, o zutere onye nkụzi Saulo ahụ. Mgbe onye nkụzi ahụ nụrụ na Saulo amụtala ịgụ ihe, ọ gwara mama Saulo ka ọ kpọta ya n’ụlọ ya n’izu ọzọ. Mgbe Saulọ gara n’ụlọ onye nkụzi ahụ, ọ jụrụ Saulo sị, “Gịnị ka ị ga-akụziri m?” Saulo malitere ịgụpụta otu paragraf site n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Onye nkụzi ahụ kwuru, sị: “Enweghị m ike ikweta na ọ bụ gị na-akụziziri m ihe ugbu a.” O ji anya mmiri makụọ Saulo.

Ịkụzi Ihe n’Ụzọ Na-eru n’Obi

10. Olee ngwá ọrụ magburu onwe ya anyị nwere iji kụzie eziokwu Baịbụl?

10 Jizọs kụziri ihe ndị Jehova n’onwe ya kụziiri ya nakwa ihe ndị dị n’Okwu Chineke e dere ede. (Luk 4:16-21; Jọn 8:28) Anyị na-eṅomi Jizọs site n’ime ihe ndị ọ kụziri nakwa site n’iji Akwụkwọ Nsọ na-ezi ihe. Ime otú a na-eme ka anyị niile na-ekwu otu ihe ma kwere n’otu ihe, bụ́kwa nke na-eme ka anyị dịrị n’otu. (1 Kọr. 1:10) Obi dị anyị nnọọ ụtọ na “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl iji nyere anyị aka ịnọgide na-ezi otu ihe ma na-ejezu ozi anyị dị ka ndị ozi ọma! (Mat. 24:45; 28:19, 20) Otu n’ime akwụkwọ ndị a e ji amụ Baịbụl bụ akwụkwọ Bible Na-akụzi, bụ́ nke e nwere ugbu a n’asụsụ otu narị na iri asaa na itoolu.

11. Olee otú otu nwanna nwaanyị bi n’Etiopia si jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi merie mmegide?

11 Iji akwụkwọ Bible Na-akụzi amụ Akwụkwọ Nsọ nwedịrị ike ime ka ndị na-emegide anyị gbanwee obi ha. N’otu oge, Lula bụ́ nwanna nwaanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ n’Etiopia, nọ na-amụrụ mmadụ Baịbụl mgbe onye ikwu onye ahụ ọ na-amụrụ ihe wụbatara n’ike ma gwa ha kwụsị ọmụmụ ihe ahụ. Lula weturu nnọọ obi jiri ihe atụ ahụ dị n’isi nke iri na ise nke akwụkwọ Bible Na-akụzi, bụ́ nke kwuru banyere ego adịgboroja, kọwaara onye ikwu onye ahụ ọ na-amụrụ ihe ihe Baịbụl kwuru. Obi jụụrụ nwaanyị ahụ ya ekwerezie ka Lula na onye ahụ ọ na-amụrụ Baịbụl gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ. N’oge ọzọ Lula ha na-amụ ihe, nwaanyị ahụ sonyeere ha ma rịọ ka a bịa mụwara ya ihe nke ya, ọbụna kwe nkwa ịkwụ ụgwọ maka ọmụmụ ihe ahụ! N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịmụ ihe ugboro atọ n’izu ma nwee ezigbo ọganihu.

12. Nye ihe atụ iji gosi otú ndị na-eto eto pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ịkụzi eziokwu Baịbụl.

12 Ndị na-eto eto pụkwara iji akwụkwọ Bible Na-akụzi nyere ndị ọzọ aka. Mgbe Keanu dị afọ iri na otu bi na Hawaii nọ na-agụ akwụkwọ a n’ụlọ akwụkwọ, otu nwa klas ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere unu adịghị eme ememme ndị ọzọ na-eme?” Keanu gụpụtaara ya azịza ya n’isiokwu bụ́ “Ànyị Kwesịrị Ime Ememe Okpukpe?” bụ́ nke dị n’ihe odide ntụkwasị. Ọ sapeteziri ebe e dere isiokwu ndị dị n’ime akwụkwọ ahụ ma jụọ nwa ahụ nke kasị masị ya. Ọ malitere ịmụrụ ya Baịbụl. N’afọ ije ozi gara aga, Ndịàmà Jehova duziri ọmụmụ Baịbụl dị nde isii, narị puku ise na iri puku isii na otu na narị anọ iri abụọ na isii, e jikwa akwụkwọ Bible Na-akụzi malite ọtụtụ n’ime ha. Ị̀ na-eji ngwá ọrụ a amụrụ ndị mmadụ Baịbụl?

13. Olee otú ịmụ Baịbụl pụrụ isi gbanwee nnọọ ndị mmadụ?

13 Iji akwụkwọ Bible Na-akụzi amụrụ ndị mmadụ Baịbụl pụrụ nnọọ ime ka ndị chọrọ ime uche Chineke gbanwee àgwà ha. Otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ná mba Norway malitere ịmụrụ otu ezinụlọ si Zambia Baịbụl. Di na nwunye ahụ si Zambia mụtara ụmụ nwaanyị atọ, ha achọghịkwa ịmụ nwa ọzọ. N’ihi ya, mgbe nwaanyị ahụ chọpụtara na ya dị ime ọzọ, ha kpebiri itepụ ya. Ka ọ fọrọ naanị abalị ole na ole ka ha gaa hụ dọkịta, ha mụrụ isiokwu bụ́ “Ile Ndụ Anya Otú Chineke Si Ele Ya.” Foto nwa e bu n’afọ e sere n’isiokwu ha na-amụ metụrụ nnọọ di na nwunye ahụ n’ahụ́ nke na ha kpebiziri na ha agaghị etepụ ime ahụ. Ha nọgidere na-enwe nnọọ ọganihu. Mgbe nwaanyị ahụ mụrụ nwa ahụ, ha gụrụ ya aha nwanna nwoke ahụ mụụrụ ha ihe.

14. Nye ihe atụ iji gosi otú ime ihe kwekọrọ n’ihe anyị na-akụzi pụrụ isi rụpụta ihe ndị dị mma.

14 Otu ihe dị mkpa banyere otú Jizọs si zie ihe bụ na o mere ihe ọ kụziri. Ọtụtụ ndị na-enwe nnọọ mmasị n’àgwà ọma Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-eṅomi Jizọs site n’ime ihe ha na-akụzi. Ndị ohi kpakara ụgbọala nke otu onye ọchụnta ego bi ná mba New Zealand ma zuru akpa o ji tinye ihe ndị dị ya mkpa. Ọ gara kọọrọ ndị uwe ojii ihe merenụ, ha agwakwa ya, sị: “Naanị ihe ga-eme ka i nweta akpa gị ahụ ọzọ bụ ma ọ bụrụ na otu n’ime Ndịàmà Jehova ahụ ya.” Otu Onyeàmà na-ekesa akwụkwọ akụkọ hụrụ akpa ahụ. Mgbe nwoke ahụ nụrụ na a hụla akpa ya, ọ gara n’ụlọ nwanna nwaanyị ahụ hụrụ ya. Obi lọturu ya mgbe ọ chọpụtara na otu akwụkwọ dị ya oké mkpa ka dị n’ime ya. Nwanna nwaanyị ahụ gwara ya sị, “Ekwesịrị m iweghachi ya karịsịa ebe m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.” Nke a juru nwoke ahụ anya karịsịa mgbe o chetara ihe onye uwe ojii ahụ gwara ya n’ụtụtụ ahụ. O doro nnọọ anya na ezi Ndị Kraịst na-eṅomi Jizọs site n’ime ihe Baịbụl kwuru.—Hib. 13:18.

Ṅomie Otú Jizọs Si Mesoo Ndị Mmadụ Ihe

15, 16. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ozi anyị?

15 Otú Jizọs si mesoo ndị mmadụ ihe mere ka ha gee ntị n’ihe ọ kụziiri ha. Dị ka ihe atụ, ịhụnanya o nwere na otú o si dịrị umeala n’obi mere ka ọ dịrị ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha mfe ịbịakwute ya. O nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị bịakwutere ya ma jiri okwu ọma kasie ha obi, gwọọkwa ọtụtụ n’ime ha ọrịa ha. (Gụọ Mak 2:1-5.) Anyị agaghị arụli ọrụ ebube, ma anyị pụrụ igosi ịhụnanya, dịrị umeala n’obi, ma nwee ọmịiko—bụ́cha àgwà ndị na-enye aka adọta ndị mmadụ n’eziokwu ahụ.

16 Obi ọmịiko nke otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche aha ya bụ́ Tariua nke gara n’ụlọ otu agadi nwoke aha ya bụ́ Beere rụpụtara ihe. Agadi nwoke a bi n’agwaetiti Kiribati nke dịbara n’ime n’Ebe Ndịda Oké Osimiri Pacific. N’agbanyeghị na nwoke a achọghị ige ntị, Tariua chọpụtara na o nwere nkwarụ ma metere ya nnọọ ebere. Ọ jụrụ nwoke ahụ, sị: “Ị̀ nụtụla nkwa Chineke kwere maka ndị na-arịa ọrịa na ndị agadi?” Ọ gụpụtaara ya otu ebe n’akwụkwọ Aịzaya. (Gụọ Aịzaya 35:5, 6.) Nke a masịrị nwoke ahụ, ya ekwuokwa sị, “Agụọla m Baịbụl ruo ọtụtụ afọ, otu onye ozi ala ọzọ nọ na chọọchị m na-abịakwa eleta m kemgbe ọtụtụ afọ, ma agụtatụbeghị m ebe a na Baịbụl.” A malitere ịmụrụ Beere Baịbụl, o nwekwara ọganihu ngwa ngwa. Ọ bụ ezie na nkwarụ ahụ o nwere bịaziri ka njọ, ma emeela ya baptizim ugbu a, ọ na-elekọtazi otu obere ìgwè dịpụrụ adịpụ, ọ na-enwekwa ike aga ekwusa ozi ọma n’àgwàetiti ahụ niile.

Nọgide Na-eṅomi Kraịst

17, 18. (a) Gịnị ga-enyere gị aka ịghọ onye ozi ọma na-eme nke ọma? (b) Gịnị na-echere ndị ji ozi ha kpọrọ ihe?

17 Dị nnọọ ka akụkọ ndị na-enye obi ụtọ a na-enweta n’ozi ubi gosirila ọtụtụ ugboro, anyị ga-arụpụta ihe ndị dị mma n’ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị eṅomie àgwà Jizọs. N’ezie, o kwesịrị nnọọ ekwesị ka anyị na-eṅomi Jizọs site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma!

18 Mgbe ụfọdụ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ, Pita jụrụ, sị: “Gịnịkwanụ ka anyị ga-enweta?” Jizọs zara ya, sị: “Onye ọ bụla nke hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu okpukpu, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.” (Mat. 19:27-29) Anyị ga-ahụ na nke a bụ nnọọ eziokwu ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eṅomi onye ozi ala ọzọ ahụ kasịnụ bụ́ Jizọs Kraịst.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú Jehova si azụ anyị ịbụ ndị ozi ọma?

• Gịnị mere akwụkwọ Bible Na-akụzi ji bụrụ ngwá ọrụ bụ́ ịgba n’ozi anyị?

• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’otú anyị si emeso ndị mmadụ ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Mgbe Jizọs kpọrọ Pita, Andru, Jems na Jọn ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, ha sooro ya ozugbo

[Foto dị na peeji nke 19]

Akwụkwọ ndị dị ka akwụkwọ “Bible Na-akụzi” na-enyere anyị aka ịdị na-akụzi otu ihe