Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gbara Ndị Na-agụsị Akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead Ume Ka Ha “Malite Igwu Ala”

A Gbara Ndị Na-agụsị Akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead Ume Ka Ha “Malite Igwu Ala”

Ememme Ngụsị Akwụkwọ nke Klas nke 123 nke Gilead

A Gbara Ndị Na-agụsị Akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead Ume Ka Ha “Malite Igwu Ala”

NA Saturday, September 8, 2007, ìgwè mmadụ dị puku isii narị atọ na iri ise na abụọ, bụ́ ndị si mba iri anọ na otu, bịara ememme ngụsị akwụkwọ nke klas nke otu narị na iri abụọ na atọ nke Watchtower Bible School of Gilead. Mgbe elekere iri nke ụtụtụ kụrụ, onyeisi oche nke ememme ahụ, bụ́ Anthony Morris, onye so n’Òtù Na-achị Isi, nabatara ndị niile bịara ememme ahụ. Mgbe o kwuchara okwu o ji nabata ndị niile bịaranụ, ọ kpọpụtara onye mbụ kwuru okwu bú Gary Breaux, onye so na Kọmitii Alaka United States.

Nwanna Breaux gwara ụmụ akwụkwọ ahụ na n’agbanyeghị ọdịdị elu ahụ́ ha, ndị na-eme uche Jehova mara mma n’anya Ya. (Jer. 13:11) Ọ gbara ha ume ka ha nọgide na-ama mma n’anya Jehova. Mgbe nwanna Breaux kwusịrị okwu, Gerrit Lösch bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi mesiri ya ike na ọ bụghị ihe ọjọọ ịtụ anya inweta ụgwọ ọrụ mgbe anyị na-ejere Jehova ozi. (Hib. 11:6) Ma isi ihe ga-akpali anyị ijere ya ozi kwesịrị ịbụ ịhụnanya sitere n’ala ala obi.

William Samuelson, bụ́ onye nlekọta nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, kwuru okwu ọzọ nke gbara ndị ahụ na-agụsi akwụkwọ ume ka ha nọgidesie ike n’ọrụ ha nke bụ́ ịkpọsa banyere eze ahụ na-achị achị, gwakwa ha ka ha na-akpa àgwà ọma iji gosi na ha bụ ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. * Sam Roberson, bụ́ osote onye nlekọta nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha na-agbalị ịchọpụta ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma. Ọ bụ mgbe ha mere nke a ka ha ga-enwe ike ‘ịhụ òtù ụmụnna dum n’anya.’—1 Pita 2:17.

Mgbe e kwuchara okwu ndị ahụ na-akpali mmasị, onye nkụzi ụlọ akwụkwọ Gilead bụ́ Mark Noumair gbara ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ajụjụ ọnụ, ha kọkwara ahụmahụ ndị ha nwetara n’ozi ọma n’oge ahụ ha na-agụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead. Ndị niile bịara ememme ngụsị akwụkwọ ahụ ji nnọọ anya ha hụ otú ụmụ akwụkwọ ahụ si nwee mmasị n’ozi ubi nakwa otú o si na-agụsi ha agụụ ike inyere ndị ọzọ aka. Mgbe ahụzi, Kent Fischer bụ́ onye si n’ọfịs na-elekọta ezinụlọ Betel nke dị na Patterson gbara ndị so na Kọmitii Alaka nke mba atọ n’ime mba ndị e zigatụrụla ndị ozi ala ọzọ, ajụjụ ọnụ. Ihe ụmụnna ndị a kwuru mesiri ndị bịara ememme ahụ, gụnyere ndị mụrụ ndị a na-agụsị akwụkwọ, obi ike na a na-elezi ndị ozi ala ọzọ anya n’ebe a na-eziga ha. Izak Marais bụ́ onye na-arụ ná Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka gbaziri ndị nọterela aka n’ozi ala ọzọ ajụjụ ọnụ, ahụmahụ ha kọrọ mekwara ka ndị a na-agụsị akwụkwọ mata ọṅụ ndị ha gaje inweta.

Ọ bụ Geoffrey Jackson bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu bụ́ isi e kwuru n’ememme ahụ nke isiokwu ya bụ “Ugbu A Unu Nụcharala Ihe A Niile, Gịnịzi Ka Unu Ga-eme?” Okwu a Nwanna Jackson, bụ́ onye jere ozi ala ọzọ ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri afọ abụọ na ise n’ebe Ndịda Pacific kwuru dabeere n’okwu Jizọs ji mechie Ozizi Elu Ugwu ya. N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jizọs kwuru banyere ụmụ nwoke abụọ rụrụ ụlọ, otu nwere uche, nke ọzọ bụ onye nzuzu. Ọkà okwu ahụ kọwara na ọ ga-abụ na a rụrụ ụlọ abụọ a n’otu ebe. Otú ọ dị, nwoke ahụ bụ́ onye nzuzu rụrụ nke ya n’elu ala, n’ájá nkịtị, ma nwoke ahụ nwere uche gwuru ala ruokwa mgbe o nwetara okwute ọ ga-arụkwasị ụlọ ya. Mgbe oké ifufe fere, ọ dịghị ihe mere nke ahụ a rụrụ n’elu okwute, ma nke ahụ a rụrụ n’ájá dakasịrị.—Mat. 7:24-27; Luk 6:48.

Jizọs kọwara na nwoke ahụ bụ́ onye nzuzu yiri ndị gere naanị ntị n’ihe Jizọs na-ekwu ma ha emeghị ihe o kwuru. Nwoke ahụ nwere uche yiri ndị gere ntị n’okwu Jizọs ma mee ihe o kwuru. Nwanna Jackson gwara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ, sị: “Unu ga-adị ka nwoke ahụ nwere uche n’ebe unu na-eje ozi ala ọzọ ma ọ bụrụ na unu emee ihe ndị unu mụtara site n’ịmụ Baịbụl.” O mechiri okwu ya site n’ịgba ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha “malite igwu ala” n’ebe e zigara ha ozi ala ọzọ.

N’ikpeazụ, e nyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ diplọma ha na ebe ha ga-eje ozi, nwanna Morris gwakwara ha okwu ndụmọdụ ụfọdụ. Ọ gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha na-eso Jizọs mgbe niile, gwakwa ha ka ọ ghara inwe mgbe ha ga-akwụsị ịdabere na Jehova ka o nye ha ume. Mgbe o kwuchara, ememme ngụsị akwụkwọ ahụ bịaziri ná njedebe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụ Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, bụ́ nke Kọmitii Izi Ihe na-elekọta, na-ahazi ụlọ akwụkwọ Gilead, ụlọ akwụkwọ maka ndị Kọmitii Alaka, na ụlọ akwụkwọ maka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị.

[Igbe dị na peeji nke 31]

IHE BANYERE CLASS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 10

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 24

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 56

Nkezi afọ ndụ ha: 33.5

Nkezi afọ ha nọrọla n’eziokwu: 17.9

Nkezi afọ ha nọrọla n’ozi oge niile: 13.8

[Foto dị na peeji nke 32]

Klas nke Otu Narị na Iri Abụọ na Atọ Na-agụsị Akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Esparza, E.; Papaya, S.; Bilal, A.; Suárez, M.; Evers, E.; Dimichino, K. (2) Rosa, M.; Fujii, R.; Ratey, O.; Leveton, J.; Van Leemputten, M. (3) Boscaino, A.; Beck, K.; Budanov, H.; Braz, C.; Peltz, K.; Siaw, A. (4) Leveton, S.; Santikko, H.; Conte, S.; Wilson, J.; Rylatt, J.; Pierce, S.; Fujii, K. (5) Rosa, D.; Boscaino, M.; Austin, V.; Rodiel, P.; Bilal, P.; Dimichino, P. (6) Ratey, B.; Czyzyk, D.; Clarke, C.; Riedel, A.; Esparza, F.; Siaw, P.; Van Leemputten, T.(7) Rodiel, J.; Evers, J.; Green, J.; Czyzyk, J.; Santikko, M.; Rylatt, M. (8) Peltz, L.; Austin, D.; Riedel, T.; Beck, M.; Pierce, W.; Conte, S.; Green, S. (9) Suárez, J.; Clarke, J.; Papaya, S.; Budanov, M.; Wilson, R.; Braz, R.