Debe Jehova n’Ihu Gị Mgbe Niile
Debe Jehova n’Ihu Gị Mgbe Niile
“Emewo m ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile.”—ỌMA 16:8.
1. Olee otú akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl nwere ike isi baara anyị uru?
N’OKWU Jehova e dere ede, e nwere ọtụtụ akụkọ ndị magburu onwe ha banyere otú Chineke si mesoo ụmụ mmadụ ihe. A kpọrọ aha ọtụtụ ndị Chineke ji mezuo nzube ya. Ihe mere e ji dee ihe ha kwuru na ihe ndị ha mere na Baịbụl abụghị ka anyị gụọ akụkọ ga-atọ anyị ụtọ. Kama nke ahụ, akụkọ ndị a nwere ike ime ka anyị bịarukwuo Chineke nso.—Jems 4:8.
2, 3. Gịnị ka okwu ndị dị n’Abụ Ọma 16:8 pụtara?
2 Anyị niile nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl banyere ọtụtụ ndị a maara nke ọma, ndị dị ka, Ebreham, Sera, Mozis, Rut, Devid, Esta, na Pọl onyeozi, na ndị ọzọ. Ma, akụkọ banyere ọtụtụ ndị ọzọ a na-amachaghị nke ọma pụkwara ịbara anyị uru. Ịtụgharị uche n’akụkọ ndị dị na Baịbụl pụrụ inyere anyị aka ime ihe ọbụ abụ ahụ kwuru mgbe ọ sịrị: “Emewo m ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile. N’ihi na ọ nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji.” (Ọma 16:8) Gịnị ka okwu ndị a pụtara?
3 Onye agha na-ejikarị mma agha ya n’aka nri, nke pụtara na ọta o ji n’aka ekpe agaghị echebe akụkụ aka nri ya. Ma, o nweghị ihe ga-eme akụkụ aka nri ya ma ọ bụrụ na enyi ya nọ n’akụkụ aka nri ya na-alụ agha. Ọ bụrụ na anyị eburu Jehova n’uche mgbe niile ma na-eme uche ya, ọ ga-echebe anyị. Ugbu a, ka anyị hụ otú ịtụle akụkọ ndị e dere na Baịbụl pụrụ isi wusie okwukwe anyị ike ka anyị wee nwee ike ‘idebe Jehova n’ihu anyị mgbe niile.’—Bible Nsọ nke Union Version.
Jehova Na-aza Ekpere Anyị
4. Nye ihe atụ si n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na Jehova na-aza ekpere.
4 Ọ bụrụ na anyị edebe Jehova n’ihu anyị, ọ ga-aza ekpere anyị. (Ọma 65:2; 66:19) Ihe e meere Elieza, onye o yiri ka ọ bụ ya kasị okenye n’ime ndị ohu Ebreham, gosiri na nke a bụ eziokwu. Ebreham zigara ya Mesopotemia ịchọtara Aịzik nwunye na-atụ egwu Chineke. Elieza kpere ekpere ka Chineke duzie ya, ọ ghọtakwara na Chineke azala ekpere ya mgbe Ribeka nyere kamel ya niile mmiri. Ihe mere Elieza ji chọta onye ghọrọ nwunye Aịzik hụrụ n’anya bụ n’ihi na ọ na-ekpesi ekpere ike. (Jen. 24:12-14, 67) Ọ bụ eziokwu na a pụrụ ikwu na ihe mere na nke ohu Ebreham a bụ na e dunyere ya ozi pụrụ iche, ma ọ̀ bụ na anyị onwe anyị ekwesịghị inwe obi ike na Jehova ga-anụkwa ekpere anyị?
5. Olee ihe mere anyị ga-eji kwuo na ekpere dị mkpirikpi e kpere n’ime obi nwere ike ịrụpụta ihe?
5 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị kpee ekpere ngwa ngwa maka enyemaka Chineke. N’otu oge, Eze Atazaksis nke Peshia chọpụtara na ihu Nehemaya, bụ́ onye na-eburu ya ihe ọṅụṅụ gbarụrụ agbarụ. Eze ahụ jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị na-achọ ka e meere gị?” “Ozugbo ahụ, [Nehemaya] kpekuru Chineke nke eluigwe ekpere.” Nehemaya ekpeghị ekpere ahụ ogologo. Ma Chineke zara ya, n’ihi na eze ahụ kwadoro ka Nehemaya gaa wughachi mgbidi Jeruselem. (Gụọ Nehemaya 2:1-8.) N’eziokwu, ekpere e kpere n’ime obi, ọ bụrụgodị na e kpeteghị ya aka, nwere ike ịrụpụta ihe.
6, 7. (a) Olee ezi ihe nlereanya Epafras setịpụụrụ anyị n’ihe banyere ekpere? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị na-ekpe ekpere maka ndị ọzọ?
6 A gbara anyị ume ka anyị ‘na-ekpere ibe anyị ekpere,’ ọ sọgodị ya ya bụrụ na o yighị ka a ga-aza ya ozugbo. (Jems 5:16) Epafras, “bụ́ onye ozi Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi,” kpesiri ekpere ike maka ndị ha na ya nọ n’otu okwukwe. Pọl si na Rom dee, sị: “Epafras, onye si n’etiti unu [ndị Kọlọsi], bụ́ ohu nke Kraịst Jizọs, na-ekele unu, ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ mgbe niile n’ekpere ya n’ihi ọdịmma unu, ka unu wee bụrụ ndị zuru ezu n’ikpeazụ, na-ekwenyesikwa ike n’ihe niile bụ́ uche Chineke. M na-agbara ya àmà na ọ na-eme mgbalị dị ukwuu n’ihi ọdịmma unu na nke ndị nọ na Leodisia na nke ndị nọ na Haịrapọlis.”—Kọl. 1:7; 4:12, 13.
7 Kọlọsi, Leodisia, na Haịrapọlis bụcha obodo ndị dị n’Eshia Maịnọ. Ndị Kraịst nọ na Haịrapọlis bi n’etiti ndị na-efe chi nwaanyị a na-akpọ Cybele, nsogbu nke Leodisia bụ na ndị hụrụ ihe onwunwe n’anya juru na ya, ebe nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ na-achọkwa ịla okwukwe nke ụmụnna ndị nọ na Kọlọsi n’iyi. (Kọl. 2:8) Ka a sịkwa ihe mere Epafras, bụ́ onye Kọlọsi, ‘ji dọgbuo onwe ya n’ọrụ n’ekpere’ maka ndị kwere ekwe ibe ya nọ n’obodo ahụ! Baịbụl agwaghị anyị otú e si zaa ekpere Epafras, ma ọ kwụsịghị ikpe ekpere maka ndị kwere ekwe ibe ya; anyị onwe anyị ekwesịghịkwa ịkwụsị ime otú ahụ. Ọ bụ ezie na anyị abụghị ndị ‘na-enyonye anya n’ihe na-agbasaghị anyị,’ ma anyị nwere ike ịma na otu onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ enyi anyị na-enweta ọnwụnwa tara ezigbo akpụ. (1 Pita 4:15) Ọ ga-amagbu onwe ya ma anyị cheta onye ahụ mgbe anyị na-ekpe ekpere onwe anyị! Ekpere ndị ọzọ kpere maka Pọl nyeere ya aka, ekpere anyị na-ekpe maka ndị ọzọ nwekwara ike ịrụpụta ọtụtụ ihe dị mma.—2 Kọr. 1:10, 11.
8. (a) Olee otú anyị si mara na ndị okenye ahụ si Efesọs maara mkpa ọ dị ikpe ekpere? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ikpegara Chineke ekpere anya?
8 Ndị ọzọ hà na-ele anyị anya dị ka ndị ji ekpere kpọrọ ihe? Ka Pọl na ndị okenye si Efesọs hụsịrị, “o gburu ikpere n’ala, ya na ha niile, wee kpee ekpere.” Mgbe ha kpesịrị, “ha niile malitere ịkwa ákwá nke ukwuu, ha dakwasịkwara Pọl n’olu ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ, n’ihi na okwu ahụ o kwuru wutere ha karịsịa, ya bụ, na ha agaghị ịhụ ihu ya ọzọ.” (Ọrụ 20:36-38) Anyị amaghị aha ndị okenye ahụ niile, ma o doro anya na ha maara mkpa ọ dị ikpe ekpere. N’ezie, anyị kwesịrị iji ihe ùgwù nke ikpegara Chineke ekpere kpọrọ ihe, anyị kwesịkwara ‘iweli aka na-eguzosi ike n’ihe’ na-enwe okwukwe na Nna anyị nke eluigwe ga-aza anyị.—1 Tim. 2:8.
Na-erubere Chineke Isi Mgbe Niile
9, 10. (a) Olee ihe nlereanya ụmụ ndị nwaanyị Zelofehad setịpụrụ? (b) Olee ihe Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịmụta n’aka ụmụ Zelofehad n’ihe metụtara ịlụ di ma ọ bụ nwunye?
9 Idebe Jehova n’ihu anyị mgbe niile ga-enyere anyị aka irubere ya isi, ọ ga-agọzikwa anyị ma anyị mee nke a. (Diut. 28:13; 1 Sam. 15:22) Iji nweta ngọzi Jehova, anyị ga-adị njikere irube isi. Ka anyị tụlee ihe ụmụnne ise, bụ́ ụmụ nwaanyị ise Zelofehad mụrụ, ndị biri n’oge Mozis mere. N’Izrel, ọ bụ omenala ha ikere ụmụ ndị nwoke ihe niile nna ha nwere. Nwoke ahụ bụ́ Zelofehad amụtaghị nwa nwoke ọ bụla tupu ya anwụọ, Jehova kwukwara ka e keere ụmụ ya nwaanyị ahụ ihe niile nna ha nwere—ma e nwere ihe a chọrọ ka ha mee. Ha ga-alụrịrị di n’etiti ụmụ Manase ka ihe nketa ha ghara ịgara ebo ọzọ.—Ọnụ Ọgụ. 27:1-8; 36:6-8.
10 Ụmụ Zelofehad nwere okwukwe na ihe ga-adị mma ma ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi. Baịbụl na-ekwu, sị: “Dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu, otú ahụ ka ụmụ Zelofehad mere. Mala, Teza na Họgla na Milka na Noa, bụ́ ụmụ Zelofehad, wee lụọ di, ọ bụ ụmụ nke ụmụnne Ọnụ Ọgụ. 36:10-12) Ụmụ nwaanyị ndị ahụ na-erube isi mere ihe Jehova nyere n’iwu. (Jọsh. 17:3, 4) N’otu aka ahụ taa, Ndị Kraịst ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe rurula ogo ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ha alụbeghị, na-erubere Chineke isi site n’ịlụ “naanị n’ime Onyenwe anyị.”—1 Kọr. 7:39.
nna ha lụrụ ha. Ọ bụ ụfọdụ n’ime ndị si n’ezinụlọ ụmụ Manase nwa Josef lụrụ ha, ka ihe nketa ha wee dịgide n’ebo ezinụlọ nna ha.” (11, 12. Olee otú Keleb si gosi na ya tụkwasịrị Chineke obi?
11 Anyị kwesịrị ịdị na-erubere Jehova isi mgbe niile dị ka onye Izrel bụ́ Keleb mere. (Diut. 1:36) Ka ndị Izrel pụtasịrị n’Ijipt na narị afọ nke 16 T.O.A., Mozis zipụrụ ụmụ nwoke iri na abụọ ka ha gaa ledoo ala Kenan, ma ọ bụ naanị abụọ n’ime ha—Keleb na Jọshụa—gbara ndị Izrel ume ka ha tụkwasị Chineke obi kpamkpam ma banye n’ala ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 14:6-9) Ihe dị ka iri afọ anọ ka e mesịrị, Jọshụa na Keleb ka nọ ndụ na-erubekwara Jehova isi kpamkpam, Chineke jikwara Jọshụa duba ndị Izrel n’Ala Nkwa ahụ. Ma, o doro anya na mmadụ iri ndị ọzọ ahụ na-enweghị okwukwe, bụ́ ndị so gaa ledoo ala ahụ, nwụrụ n’ala ịkpa ahụ mgbe ndị Izrel wagharịrị na ya afọ iri anọ.—Ọnụ Ọgụ. 14:31-34.
12 Ebe ọ bụ na Keleb anwụghị n’ime afọ iri anọ ahụ ndị Izrel ji wagharịa n’ala ịkpa, Keleb kwuru n’ihu Jọshụa mgbe o merela agadi, sị: “Mụ onwe m soro Jehova bụ́ Chineke m n’ụzọ zuru ezu.” (Gụọ Jọshụa 14:6-9.) Keleb, bụ́ onye dị iri afọ asatọ na ise, rịọrọ ka e nye ya ógbè ahụ bụ́ ugwu ugwu nke Chineke kwere nkwa inye ya, n’agbanyeghị na ndị iro bi n’obodo ndị e wusiri ike dị n’ebe ahụ.—Jọsh. 14:10-15.
13. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị na-enwe, olee ihe ọ ga-abụ anyị mee anyị enweta ngọzi Jehova?
13 Ọ bụrụ na anyị ‘esoro Jehova n’ụzọ zuru ezu’ dị ka Keleb kwesịrị ntụkwasị obi ma na-erube isi mere, Jehova ga-agọzi anyị. Ọ bụrụ na nsogbu ndị tara akpụ abịara anyị, Jehova ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị ‘esoro ya n’ụzọ zuru ezu.’ Ma ime nke a ná ndụ anyị niile dị ka Keleb mere abụghị obere ọrụ. Ọ bụ eziokwu na Eze Sọlọmọn mere nke ọma ná mmalite, mgbe o mewere agadi, ndị nwunye ya mere ka obi ya chigharịa iso chi ụgha dị iche iche, “obi ya dum adịghịkwa n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ dị ka obi Devid nna ya dịrị.” (1 Eze 11:4-6) N’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị na-enweta taa, ka anyị nọgide na-erubere Chineke isi n’ụzọ zuru ezu ma na-edebe ya n’ihu anyị mgbe niile.
Na-atụkwasị Jehova Obi Mgbe Niile
14, 15. Gịnị ka ahụmahụ Neomi kụziiri gị banyere mkpa ọ dị ịtụkwasị Chineke obi?
14 Anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi karịsịa mgbe anyị dara mba n’obi n’ihi nsogbu ndị anyị nwere bụ́ ndị yiri ka ha enweghị ngwọta. Tụlee ihe banyere Neomi, bụ́ nwaanyị katarala ahụ́, onye di ya na ụmụ ya nwoke abụọ nwụrụ. Mgbe o si Moab lọta Juda, ọ kwara arịrị, sị: “Unu akpọla m Neomi [“Ịdị Ụtọ M”]. Kpọwanụ m Mera [“Ihe Ilu”], n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emewo m ihe obi ilu dị ukwuu. Aka m juru eju mgbe m pụrụ, ma Jehova emewo ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Neomi, ebe ọ bụ na Jehova ewedawo m ala, Onye Pụrụ Ime Rut 1:20, 21.
Ihe Niile akpatawokwara m ọdachi?”—15 Ọ bụ ezie na Neomi nwere ọtụtụ nsogbu, ị gụọ akwụkwọ Rut nke ọma, ị ga-achọpụta na ọ nọgidere na-atụkwasị Jehova obi. Ihe mechakwara dịịrị ya mma! Rut, onye bụ́bu nwunye nwa Neomi, ghọrọ nwunye Boaz ma mụta nwa nwoke. Neomi ghọziri onye na-elekọta nwa ahụ, akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Ndị inyom bụ́ ndị agbata obi ya wee gụọ ya aha, na-asị: ‘A mụworo Neomi nwa nwoke.’ Ha wee malite ịkpọ ya Obed. Ọ bụ ya bụ nna Jesi, nna Devid.” (Rut 4:14-17) Mgbe Neomi ga-ebilite n’ọnwụ n’ụwa a, a ga-agwa ya na Rut, onye ga-anọkwa n’ụwa ọhụrụ ahụ, mesịrị bụrụ nne ochie Jizọs, onye bụ́ Mesaya ahụ. (Mat. 1:5, 6, 16) Dị ka Neomi, anyị agaghị enwe ike ịma otú ọnọdụ ọjọọ anyị nọ na ya nwere ike isi gbanwee. N’ihi ya, ka anyị na-atụkwasị Chineke obi mgbe niile, dị nnọọ ka a gbara anyị ume ka anyị mee n’Ilu 3:5, 6: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”
Bụrụ Onye Mmụọ Nsọ Na-edu
16. Olee otú mmụọ nsọ Chineke si nyere ụfọdụ ndị okenye n’Izrel oge ochie aka?
16 Ọ bụrụ na anyị edebe Jehova n’ihu anyị mgbe niile, ọ ga-eji mmụọ nsọ ya na-edu anyị. (Gal. 5:16-18) Mmụọ Chineke dị n’ahụ́ ndị okenye iri asaa ahụ a họpụtara ka ha nyere Mozis aka ‘ibu ibu’ ilekọta ụmụ Izrel. Ọ bụ naanị Eldad na Midad ka a kpọrọ aha ha, ma mmụọ ahụ nyeere ha niile aka ịrụ ọrụ e nyere ha. (Ọnụ Ọgụ. 11:13-29) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha bụ ụmụ nwoke ruru eru, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, na ndị na-akwụwa aka ha ọtọ, dị nnọọ ka ndị nke e bu ụzọ họrọ. (Ọpụ. 18:21) Ndị okenye ọgbakọ nwekwara àgwà ndị dị otú ahụ taa.
17. Olee ọrụ Jehova ji mmụọ nsọ ya rụọ mgbe a na-arụ ụlọikwuu ahụ?
17 Jehova ji mmụọ nsọ ya rụọ ọrụ dị mkpa mgbe ndị Izrel na-arụ ụlọikwuu mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Jehova kpọlitere Bezalel ka ọ bụrụ onyeisi ndị ọrụ aka ndị ga-arụ ụlọikwuu ahụ ma kwe nkwa na ọ “ga-eme ka mmụọ Chineke jupụta n’ime ya ka o wee nwee amamihe na nghọta na ihe ọmụma na nkà ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla.” (Ọpụ. 31:3-5) Ụmụ nwoke “maara ihe” so Bezalel na onye na-enyere ya aka bụ́ Oholiab rụọ ọrụ ahụ pụrụ iche. Ọ bụkwa mmụọ Jehova kpaliri ndị nwere obi inye ihe ka ha nye onyinye n’ụba. (Ọpụ. 31:6; 35:5, 30-34) Otu mmụọ ahụ na-akpalikwa ndị ohu Chineke nke oge a ime ike ha niile iji hụ na ha na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ha. (Mat. 6:33) Anyị nwere ike ịdị na-eme nke ọma n’ihe ụfọdụ, ma anyị kwesịrị ikpe ekpere maka mmụọ nsọ ma kwe ka ọ na-edu anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-arụzu ọrụ Jehova nyere ndị ya n’oge anyị a.—Luk 11:13.
Na-edo Jehova nke Ụsụụ Ndị Agha Nsọ Mgbe Niile
18, 19. (a) Olee àgwà mmụọ nsọ Chineke na-eme ka anyị nwee? (b) Olee ihe ị mụtara n’ihe nlereanya Simiọn na Ana?
18 Mmụọ nsọ na-eme ka anyị na-asọpụrụ Jehova ma na-edebe ya n’ihu anyị mgbe niile. A gwara ndị Chineke n’oge ochie, sị: “Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ka unu ga-emeso dị ka onye dị nsọ.” (Aịza. 8:13) Simiọn na Ana bụ ndị agadi abụọ doro Chineke nsọ na Jeruselem na narị afọ mbụ. (Gụọ Luk 2:25-38.) Simiọn nwere okwukwe n’amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ ma nọrọ “na-echere ngụgụ obi a ga-agụgụ Izrel.” Chineke wụsara Simiọn mmụọ nsọ ya ma mesie ya obi ike na ọ ga-adị ndụ hụ Mesaya ahụ. Ọ nọkwa ndụ nke ahụ emee. Otu ụbọchị n’afọ nke abụọ T.O.A., Meri bụ́ nne Jizọs na nna kuchiri ya bụ́ Josef, kuuru Jizọs bata n’ụlọ nsọ. Site n’ike mmụọ nsọ, Simiọn buru amụma banyere Mesaya ahụ ma kwuo na Meri ga-enwe ihe mwute, bụ́kwanụ nke mezuru mgbe a kpọgburu Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ. Ma chegodị ụdị obi ụtọ Simiọn nwere mgbe o kuuru “Kraịst nke Jehova” n’aka ya! Otú Simiọn si doo Chineke nsọ bụkwaara ndị ohu Chineke taa ezi ihe nlereanya!
19 Ana, bụ́ nwaanyị di ya nwụrụ na-asọpụrụ Chineke, onye dị iri afọ asatọ na anọ, ‘adịghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ.’ Ọ na-ejere Jehova ozi dị nsọ abalị na ehihie, “na-ebu ọnụ, na-arịọsikwa arịrịọ ike.” Ana nọkwa ya mgbe e kutere Jizọs n’ụlọ nsọ. Obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu ịhụ onye ga-abụ Mesaya ahụ! Ọ ‘malitere nnọọ inye Chineke ekele, na-agwakwa ndị niile na-echere nnapụta Jeruselem banyere nwatakịrị ahụ.’ Obi ụtọ mere Ana ji kọsaara ndị ọzọ ozi ọma a! Dị ka Simiọn na Ana, Ndị Kraịst merela agadi taa na-enwe obi ụtọ na ọ dịghị afọ ndụ ọ ga-abụ mmadụ nọrọ ọ gaghịzi enwe ike ijere Jehova ozi dị ka Onyeàmà ya.
20. N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, olee ihe anyị kwesịrị ime, gịnịkwa mere anyị ga-eji mee ya?
20 N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, anyị kwesịrị idebe Jehova n’ihu anyị mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị emee nke a, ọ ga-agọzi mgbalị ndị anyị na-eme iji kwusaara ndị ọzọ banyere ọbụbụeze ya na ọrụ ya ndị dị ebube. (Ọma 71:17, 18; 145:10-13) Ma ọ bụrụ na anyị chọrọ irubere Jehova isi, anyị aghaghị ịkpa àgwà ndị na-amasị Chineke. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta banyere àgwà ndị na-amasị Chineke site n’ịtụle akụkọ ndị ọzọ a kọrọ na Baịbụl?
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Olee otú anyị si mara na Jehova na-aza ekpere?
• Olee ihe mere anyị ji kwesị irubere Jehova isi n’ụzọ zuru ezu?
• Ọ bụrụgodị na anyị nwere nkụda mmụọ, gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi mgbe niile?
• Olee otú mmụọ nsọ Chineke si enyere ndị ya aka?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 4]
Ekpere Nehemaya kpegaara Jehova rụpụtara ihe
[Foto dị na peeji nke 5]
Icheta ngọzi ndị Neomi mechara nweta ga-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi