Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mak

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mak

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mak

OZIỌMA Mak kasị obere n’ime Oziọma anọ ahụ e dere banyere Jizọs. Ọ bụ Jọn Mak dere ya n’ihe dị ka afọ iri atọ ka Jizọs Kraịst nwụsịrị ma si n’ọnwụ bilie. Ọ kọrọ ná mkpirikpi ná mkpirikpi ọtụtụ ihe ndị na-akpali mmasị mere n’ime afọ atọ na ọkara Jizọs Kraịst ji jee ozi.

O yiri ka ọ bụ ndị na-abụghị ndị Juu, karịsịa ndị Rom, ka Mak bu n’uche dee akụkọ a, n’ihi na n’akwụkwọ ya, ọ kọwara Jizọs dị ka Ọkpara Chineke onye na-arụ ọrụ ebube, onye ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma. Ihe ọ kọrọ akụkọ ya karịsịa bụ ọrụ ndị Jizọs rụrụ kama ịkọ ihe ndị ọ kụziri. Ịgụ Oziọma Mak ga-eme ka okwukwe anyị nwere na Mesaya ahụ sikwuo ike ma kpalie anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi Chineke.—Hib. 4:12.

OZI PỤRỤ ICHE E ZISARA NA GALILI

(Mak 1:1–9:50)

Mgbe Mak kọsịrị banyere ozi Jọn Onye Na-eme Baptizim jere na otú Jizọs si nọọ iri ụbọchị anọ n’ala ịkpa naanị n’amaokwu iri na anọ, ọ maliteziri ịkọ banyere ozi na-akpali mmasị Jizọs jere na Galili. Otú o si webata okwu bụ́ “ozugbo” n’ọtụtụ ebe n’akụkọ ya gosiri na ọ kọrọ ya ọkụ ọkụ.—Mak 1:10, 12.

N’ime ihe na-erughị afọ atọ, Jizọs jezuru ozi ọma na Galili ugboro atọ. Mak kọrọ ọtụtụ n’ime ihe ndị mere n’ozi Jizọs otú kwekọrọ n’oge ha mere. Ọ kọghị banyere Ozizi Elu Ugwu Jizọs nakwa ozizi ndị ọzọ toro ogologo Jizọs ziri.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:15—“Oge ahụ a kara aka” maka gịnị ruru? Jizọs nọ na-ekwu na oge a kara aka maka ya ịmalite ije ozi ya eruola. N’ihi na ya onwe ya, bụ́ Onye A Họpụtara Ịbụ Eze nọ ya, ọ pụtara na Alaeze Chineke eruwo nso. Ozi ọma o kwusara nweziri ike ime ka ndị nwere ezi obi gbanwee àgwà ha ma mee ihe ndị ga-eme ka ha na Chineke dị ná mma.

1:44; 3:12; 7:36—Gịnị mere Jizọs achọghị ka a kọsawa ọrụ ebube ndị ọ rụrụ? Jizọs achọghị ka ndị mmadụ kweta na ya bụ Kraịst n’ihi akụkọ e tinyere nnu na ose ndị ọzọ kọọrọ ha, kama ọ chọrọ ka ndị mmadụ ji anya ha hụ ihe ndị ga-eme ka ha kweta na ya bụ Kraịst ahụ ma kpebie ịghọ ndị na-eso ụzọ ya dabere n’ihe ndị ha hụrụ. (Aịza. 42:1-4; Mat. 8:4; 9:30; 12:15-21; 16:20; Luk 5:14) Ọ bụ naanị nwoke ahụ mmụọ ọjọọ jibu n’obodo ndị Geresa ka Jizọs na-egbochighị ịkọ ihe e meere ya. Ọ gwara ya ka ọ lakwuru ndị ikwu ya ma kọọrọ ha ihe niile Chineke meere ya. Ndị obodo ahụ gwara Jizọs ka ọ pụọ n’ógbè ha, n’ihi ya, Jizọs agaghị enwe ohere izi ndị obodo ahụ ozi ọma. Ọ bụrụ na ha ahụ nwoke ahụ Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ nụkwa ihe o nwere ikwu, ọ ga-eme ka akụkọ banyere ìgwè ezì ndị ahụ nwụrụnụ ghara ime ka ndị mmadụ katọwa Jizọs.—Mak 5:1-20; Luk 8:26-39.

2:28—Gịnị mere e ji kpọọ Jizọs “Onyenwe ụbọchị izu ike”? Pọl onyeozi dere, sị: “Iwu ahụ nwere onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.” (Hib. 10:1) Dị ka e kwuru n’Iwu ahụ, a na-enwe Ụbọchị Izu Ike ma ụbọchị isii e ji arụ ọrụ gasịa, ọ bụkwa n’ụbọchị ahụ ka Jizọs gwọrọ ọtụtụ n’ime ọrịa ndị ọ gwọrọ. Nke ahụ na-ese onyinyo ezumike na ngọzi ndị ụmụ mmadụ ga-enwe n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst mgbe ọchịchị nchịgbu Setan ga-abịa ná njedebe. N’ihi ya, Eze nke Alaeze ahụ bụkwa “Onyenwe ụbọchị izu ike.”—Mat. 12:8; Luk 6:5.

3:5; 7:34; 8:12—Olee otú Mak si mara nnọọ otú obi dị Jizọs n’oge dị iche iche? Mak abụghị otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ nke o jikwanụ bụrụ onye ya na Jizọs kpachiri anya. Akụkọ ọdịnala ndị Juu kwuru na ọ bụ Pita onyeozi, bụ́ ezigbo enyi Mak, gwara Mak ọtụtụ n’ime ihe ndị ọ kọrọ n’akwụkwọ ya.—1 Pita 5:13.

6:51, 52—Gịnị bụ “ihe achịcha ahụ pụtara” nke ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aghọtaghị? N’ime awa ole na ole gara aga, Jizọs ji achịcha ise na azụ̀ abụọ zụọ puku ndị ikom ise nri ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụaka. “Ihe achịcha ahụ pụtara” bụ́ nke ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịghọta mgbe ahụ Jizọs rụrụ ọrụ ebube ahụ bụ na Jehova Chineke nyere Jizọs ikike ịrụ ọrụ ebube. (Mak 6:41-44) A sị na ha ghọtara otú ike e nyere Jizọs ha, ọ gaaraghị atụcha ha n’anya mgbe ha hụrụ Jizọs ka ọ na-eje ije n’elu mmiri.

8:22-26—Gịnị mere Jizọs ji jiri nke nta nke nta meghee anya nwoke ahụ kpuru ìsì? Ọ ga-abụ na Jizọs mere nke a n’ihi na ọ chọrọ igosi nwoke ahụ obiọma. Iji nke nta nke nta meghee anya nwoke ịnọ n’ọchịchịrị marala ahụ́, nyeere ya aka iji nwayọọ nwayọọ hụwa ìhè anyanwụ.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

2:18; 7:11; 12:18; 13:3. Mak kọwara omenala, okwu ụfọdụ, na ebe ndị dị n’Izrel, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na onye na-abụghị onye Juu amaghị. Ọ kọwara na ndị Farisii “na-ebu ọnụ,” na kọban bụ “onyinye a raara nye Chineke,” na ndị Sadusii “na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị,” nakwa na ‘Ugwu Oliv chere ụlọ nsọ ahụ ihu.’ O kwughị ihe ọ bụla banyere osuso ọmụmụ Mesaya ahụ n’ihi na ọ maara na ọ bụ ndị Juu ga-aka nwee mmasị na ya. Mak si otú a setịpụrụ anyị ihe nlereanya. Mgbe anyị nọ n’ozi ma ọ bụ na-eme ihe omume n’ọgbakọ, anyị kwesịrị iburu n’uche ụdị ndị anyị na-agwa okwu na ihe ndị dị mkpa ka ha mara.

3:21. Ndị ikwu Jizọs ekweghị na ya. N’ihi ya, ọ na-emetere ndị nwere ndị na-ekweghị ekwe n’ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị a na-eme akaje n’ihi okwukwe ha ebere.

3:31-35. Mgbe e mere Jizọs baptizim, ọ ghọrọ Ọkpara ime mmụọ Chineke, “Jeruselem nke dị n’elu” bụkwa nne ya. (Gal. 4:26) Site mgbe ahụ gawa, ndị na-eso ụzọ Jizọs bụzi ndị ha na ya kasị dị ná mma ma kara akpachi anya karịa ndị ikwu ya nke anụ ahụ́. Nke a na-akụziri anyị na ọ dị mkpa ka anyị bute ihe ndị metụtara ofufe Chineke ụzọ ná ndụ anyị.—Mat. 12:46-50; Luk 8:19-21.

8:32-34. Anyị kwesịrị ịmata ngwa ngwa mgbe ndị ọzọ gosiwara anyị obiọma hiere ụzọ ma jụ ya. Onye ọ bụla na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịdị njikere mgbe niile ‘ịjụ onwe ya,’ ya bụ, ịnapụ onwe ya ihe ụfọdụ ma jụ ọchịchọ ime ihe ga-abara naanị onwe ya uru. O kwesịrị ịdị njikere ‘ibuli osisi ịta ahụhụ ya’—nke pụtara ịta ahụhụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ma ọ bụ bụrụ onye e menyere ihere ma ọ bụ kpagbuo ma ọ bụdị gbuo egbuo n’ihi ịbụ Onye Kraịst. O kwesịkwara ịdị ‘na-eso Jizọs mgbe niile,’ na-ebi ụdị ndụ O biri. Ibi ndụ dị ka onye na-eso ụzọ Kraịst chọrọ anyị ịmụta na ịnọgide na-enwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà dị ka Jizọs Kraịst.—Mat. 16:21-25; Luk 9:22, 23.

9:24. Ihere ekwesịghị ime ka anyị ghara ikwupụta okwukwe anyị ma ọ bụ ghara ịrịọ ka e nyekwuo anyị okwukwe.—Luk 17:5.

ỌNWA NKE IKPEAZỤ

(Mak 10:1–16:8)

Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke afọ 32 O.A., Jizọs banyere “n’ókèala Judia na n’ofe Jọdan,” ìgwè mmadụ wee gbakọta ọzọ n’ebe ọ nọ. (Mak 10:1) Ka o kwusachara ozi ọma n’ebe ahụ ya etinye isi n’ụzọ e si aga Jeruselem.

Na Naịsan 8, Jizọs nọ na Betani. Ọ nọ na-eri nri mgbe otu nwaanyị batara ma were mmanụ na-esi ísì ụtọ wụsa ya n’isi. A kọziri ihe ndị ọzọ mere malite ná mgbe Jizọs banyere na Jeruselem ruo mgbe o bilitere n’ọnwụ n’usoro ha si mee.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

10:17, 18—Gịnị mere Jizọs ji gwa otu nwoke ka ọ ghara ịkpọ Ya “Ezi Onye Ozizi”? Jizọs jụrụ utu aha a na-ebu isi nwoke a turu ya iji mee ka ndị mmadụ mara na ọ bụ Jehova kwesịrị ịnata otuto niile nakwa iji gosi na ọ bụ ezi Chineke ahụ ka ezi ihe niile si n’aka. Ọzọkwa, Jizọs mere ka ndị mmadụ mata eziokwu ahụ dị mkpa nke bụ́ na ọ bụ naanị Jehova Chineke, bụ́ Onye kere ihe niile, kwesịrị ịgwa anyị ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ.—Mat. 19:16, 17; Luk 18:18, 19.

14:25—Gịnị ka ihe ahụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Agaghị m aṅụ mmanya si ná mkpụrụ vaịn ọzọ ruo ụbọchị ahụ m ga-aṅụ ya nke ọhụrụ n’alaeze Chineke” pụtara? Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na e nwere mmanya nkịtị n’eluigwe. Ma, ebe ọ bụ na mgbe ụfọdụ a na-ekwutekarị okwu mmanya mgbe a na-ekwu okwu inwe ọṅụ, ihe Jizọs na-ekwu ebe a bụ ọṅụ nke ya na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ si n’ọnwụ bilie ga-enwe mgbe ha zukọtara n’Alaeze ya.—Ọma 104:15; Mat. 26:29.

14:51, 52—Ònye bụ nwa okorobịa ahụ ‘gbaara ahụ́ ọtọ gbalaga’? Ọ bụ naanị Mak kọrọ ihe a merenụ, n’ihi ya anyị nwere ike ikwu na ọ na-akọ banyere onwe ya.

15:34—Okwu ahụ Jizọs kwuru, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji gbahapụ m?” ọ̀ pụtara na o nweghịzi okwukwe? Mbanụ. Ọ bụ ezie na anyị agaghị enwe ike ikwu kpọmkwem ihe mere Jizọs ji kwuo ihe ahụ o kwuru, o nwere ike ịbụ na ihe ahụ o kwuru na-egosi na Jizọs ghọtara na Jehova akwụsịtụla ichebe ya ka e wee nwaa Ọkpara Ya ruo n’isi. O nwekwara ike ịbụ na Jizọs kwuru nke a ka o wee mezuo ihe e buru n’amụma banyere ya n’Abụ Ọma 22:1.—Mat. 27:46.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

10:6-9. Ọ bụ nzube Chineke ka ndị di na nwunye nọgide n’alụmdi na nwunye ha. N’ihi ya, kama ime ngwa ngwa gbaa alụkwaghịm, ndị di na nwunye kwesịrị ịgbalịsi ike mee ihe Baịbụl kwuru mgbe ha nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ha.—Mat. 19:4-6.

12:41-44. Ihe nwaanyị ahụ di ya nwụrụ mere na-akụziri anyị na anyị kwesịrị iji obi anyị dum na-enye onyinye iji kwadoo ezi ofufe.

[Foto dị na peeji nke 29]

Gịnị mere Jizọs ji gwa nwoke a ka ọ gaa kọọrọ ndị ikwu ya ihe niile mere ya?