Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Kraịst—Onye Ozi Ala Ọzọ Kasịnụ

Jizọs Kraịst—Onye Ozi Ala Ọzọ Kasịnụ

Jizọs Kraịst—Onye Ozi Ala Ọzọ Kasịnụ

“Abụ m onye nnọchiteanya si n’ebe ọ nọ, ọ bụ Onye ahụ zitere m.”—JỌN 7:29.

1, 2. Ònye bụ onye ozi ala ọzọ, ònyekwa ka a pụrụ ịkpọ Onye Ozi Ala Ọzọ kasịnụ?

GỊNỊ na-agbata gị n’uche ma ị nụ okwu ahụ bụ́ “onye ozi ala ọzọ”? Ihe na-agbata ụfọdụ n’obi bụ ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na n’achụmnta ego n’obodo ebe ha na-eje ozi. Ma ebe ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ ga-abụ na ihe na-agbata gị n’obi bụ ndị ozi ala ọzọ Òtù Na-achị Isi na-ezipụ ịga kwusaa ozi ọma ná mba dị iche iche n’ụwa niile. (Mat. 24:14) Ndị ozi ala ọzọ a na-eji oge na ume ha arụ ọmarịcha ọrụ nke inyere ndị mmadụ aka ịbịaru Jehova Chineke nso ma soro ya na-akpachi nnọọ anya.—Jems 4:8.

2 Okwu bụ́ “onye ozi ala ọzọ” na “ndị ozi ala ọzọ” apụtaghị ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ. Ma ihe e dere n’ala ala peeji nke Ndị Efesọs 4:11 na Reference Bible na-egosi na a pụkwara ịsụgharị okwu Grik ahụ bụ́ “ndị na-ezisa ozi ọma” ịbụ “ndị ozi ala ọzọ.” Jehova bụ Onye Na-ezisa Ozi Ọma kasịnụ, ma a pụghị ịkpọ ya Onye Ozi Ala Ọzọ kasịnụ, n’ihi na o nweghị onye zigara ya ịga kwusaa ozi ọma. Jizọs Kraịst kwuru banyere Nna ya nke eluigwe, sị: “Abụ m onye nnọchiteanya si n’ebe ọ nọ, ọ bụ Onye ahụ zitere m.” (Jọn 7:29) Jehova zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa iji gosi na ya hụrụ ụwa bụ́ ụmụ mmadụ n’anya. (Jọn 3:16) A pụrụ ịkpọ Jizọs Onye Ozi Ala Ọzọ kasịnụ, ma ọ bụ Onye Ozi Ala Ọzọ kacha mma, n’ihi na otu n’ime ihe ndị mere e ji zite ya n’ụwa bụ ka o wee “gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) O nwere nnọọ ihe ịga nke ọma n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ, ozi ya ka na-abakwara anyị uru taa. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị pụrụ iṅomi otú o si zie ihe, ma ànyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ ma ànyị abụghị.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

3 Ọrụ Jizọs dị ka onye nkwusa Alaeze na-akpalite ajụjụ ndị a: Olee ihe ndị Jizọs zutere mgbe ọ na-eje ozi ya n’elu ala? Gịnị mere ozizi ihe ya ji bụrụ ịgba? Gịnị mere o ji nwee ihe ịga nke ọma n’ozi ya?

Ọ Dị Njikere Ije Ozi n’Agbanyeghị na Ọ Nọ n’Ókèala Dị Iche

4-6. Olee ihe ụfọdụ ndị gbanwere ná ndụ Jizọs mgbe e zitere ya n’ụwa?

4 N’eziokwu, ndị ozi ala ọzọ nke oge a na ụfọdụ Ndị Kraịst kwagara n’ebe ndị a chọsiri ndị nkwusa Alaeze ike na-edi nsogbu akụnụba e nwere n’ebe ha gara ije ozi. Ma anyị enweghị ike ichetatụwa n’echiche ihe dị iche n’ọnọdụ Jizọs zutere mgbe ọ nọ n’ụwa na ọnọdụ ya n’eluigwe, bụ́ ebe ya na Nna ya na ndị mmụọ ozi, bụ́ ndị ji ezi obi na-ejere Jehova ozi, bi. (Job 38:7) Ibi n’eluigwe dị nnọọ iche n’ibi n’etiti ụmụ mmadụ na-eme mmehie n’ime ụwa rụrụ arụ! (Mak 7:20-23) Jizọs hụdịrị ka ndị na-eso ụzọ ya kasị dịrị ya nso na-ese okwu. (Luk 20:46; 22:24) N’eziokwu, Jizọs diri nnọọ ihe niile o zutere n’ụwa.

5 Jizọs amaliteghị ịsụ asụsụ ndị obodo ya n’ụzọ ọrụ ebube; o si mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ mụwa ya. Ị̀ hụkwara nnọọ otú Jizọs bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi n’eluigwe si bịa malite ndụ n’isi n’ụwa! Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ sụrụ ma ọ dịkarịa ala otu n’ime ‘asụsụ nke ụmụ mmadụ.’ Asụsụ a dị nnọọ iche na “nke ndị mmụọ ozi.” (1 Kọr. 13:1) Ma a bịa n’ikwu okwu ọma, ọ dịbeghị mmadụ ọ bụla mere nke a dị ka Jizọs.—Luk 4:22.

6 Tụlee ihe ndị ọzọ mere nnọọ ná ndụ Ọkpara Chineke mgbe ọ bịara n’ụwa. Ọ bụ ezie na Jizọs eketaghị mmehie Adam, Ọ ghọrọ mmadụ, dịkwa nnọọ ka ndị ga-emecha ghọọ “ụmụnna” ya ma ọ bụ ụmụazụ ya e tere mmanụ bụ. (Gụọ Ndị Hibru 2:17, 18.) N’abalị ikpeazụ ọ nọrọ n’ụwa, Jizọs agwaghị Nna ya nke eluigwe ka o zite “ihe karịrị ụsụụ ndị mmụọ ozi iri na abụọ.” Chegodị nnọọ ọnụ ọgụgụ ndị mmụọ ozi ọ chịkwara dị ka Maịkel Onyeisi ndị mmụọ ozi! (Mat. 26:53; Jud 9) N’ezie Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, ma ihe ndị ọ rụzuru mgbe ọ nọ n’ụwa enweghị ebe ha ruru ma e jiri ha tụnyere ihe ndị ọ gaara arụzu n’eluigwe.

7. Olee ihe ndị Juu mere banyere Iwu ahụ?

7 Mgbe Jizọs bụ “Okwu ahụ,” ya bụ, tupu ya aghọọ mmadụ, ọ ga-abụ ya bụ Ọnụ na-ekwuru Chineke nke duru ụmụ Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. (Jọn 1:1; Ọpụ. 23:20-23) Ma ha “natara Iwu ahụ dị ka ndị mmụọ ozi si nye ya ma [ha] edebeghị ya.” (Ọrụ 7:53; Hib. 2:2, 3) N’ezie, ndị ndú okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ aghọtaghị ihe mere e ji nye Iwu ahụ. Dị ka ihe atụ, tụlegodị ihe banyere iwu Ụbọchị Izu Ike. (Gụọ Mak 3:4-6.) Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii “na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.” (Mat. 23:23) Ma nke a akụdaghị Jizọs mmụọ ma mee ka ọ kwụsị ikwusa eziokwu ahụ.

8. Gịnị mere Jizọs ga-eji nwee ike ịgbatara anyị ọsọ enyemaka?

8 Jizọs dị nnọọ njikere inyere ndị ọzọ aka. Ịhụnanya o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ kpaliri ya ịchọ nnọọ inyere ha aka. Ọ dị ya ọkụ n’obi mgbe niile ikwusa ozi ọma. N’ihi na Jizọs rubeere Jehova isi mgbe ọ nọ n’elu ụwa, ọ “ghọrọ onye ọ dị n’aka inye ndị niile na-erubere ya isi nzọpụta ebighị ebi.” Ma, “ebe ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-ele ya ule, o nwere ike ịgbatara ndị a na-ele ule ọsọ enyemaka.”—Hib. 2:18; 5:8, 9.

Onye A Zụrụ nke Ọma Ịbụ Onye Nkụzi

9, 10. Olee ụdị ọzụzụ Jizọs nwetara tupu e zite ya n’ụwa?

9 Tupu e zipụ Ndị Kraịst nke oge a ije ozi ala ọzọ, Òtù Na-achị Isi na-eme ndokwa ka a zụọ ha. Ma è nyere Jizọs Kraịst ọzụzụ? Ee, ma ọ gaghị ụlọ akwụkwọ ndị rabaị tupu a họpụta ya ịbụ Mesaya ahụ; ọ nataghịkwa ọzụzụ n’aka ụfọdụ ndị ndú okpukpe a ma ama. (Jọn 7:15; tụlee Ọrụ 22:3.) Gịnịzi mere Jizọs ji ruo nnọọ eruo izi ihe?

10 N’agbanyeghị na nne Jizọs bụ́ Meri na nna kuchiri ya bụ́ Josef kụziiri ya ihe, ọ bụ Jehova, bụ́ onye kasị ruo eruo izi mmadụ ihe, ziri ya otú ọ ga-esi jee ozi ya. Jizọs kwuru okwu banyere nke a, sị: “Ihe m kwuru esighị n’echiche m, kama ọ bụ Nna m bụ́ onye zitere m nyere m iwu ihe m ga-akọ na ihe m ga-ekwu.” (Jọn 12:49) Ghọtakwa na a gwara Ọkpara ahụ kpọmkwem ihe ọ ga-ezi. Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na tupu Jizọs abịa n’ụwa, o ji nnọọ oge dị ukwuu gee Nna ya ntị. È nwere ọzụzụ ọzọ ga-akarị nke a?

11. Olee ókè Jizọs ṅomiruru otú Nna ya si na-emeso ụmụ mmadụ ihe?

11 Kemgbe e kere Ọkpara ahụ, ya na Nna ya dị nnọọ n’ezigbo mma. Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ ghọtara otú Chineke si emeso ụmụ mmadụ ihe site n’ikiri otú nna ya si eme ihe. Ọkpara ahụ hụkwara ụmụ mmadụ n’anya otú Chineke hụrụ ha. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na n’akụkụ Baịbụl ebe ahụ a kọwara Jizọs dị ka amamihe, o kwuru, sị: “Ihe na-enye m obi ụtọ bụkwa ihe metụtara ụmụ mmadụ.”—Ilu 8:22, 31.

12, 13. (a) Olee otú Jizọs si mụta ihe site n’ikiri otú Nna ya si mesoo ụmụ Izrel ihe? (b) Olee otú Jizọs si mee ihe ndị ọ mụtara?

12 Ọzụzụ Ọkpara ahụ nwetara gụnyekwara ikiri ihe Nna ya mere mgbe e nwere nsogbu. Dị ka ihe atụ, tụlee otú Jehova si mesoo ụmụ Izrel na-enupụ isi ihe. Nehemaya 9:28 na-ekwu, sị: “Ngwa ngwa ha nwere ezumike, ha na-emekwa ihe dị njọ n’ihu gị [Jehova], ị na-ahapụkwa ha n’aka ndị iro ha, ndị na-azọda ha. E mesịa, ha na-alọghachi kpọkuo gị ka i nyere ha aka, gị onwe gị na-anọkwa n’eluigwe nụrụ ma napụta ha mgbe mgbe n’ihi ebere gị nke dị ukwuu.” Iso Jehova na-arụ ọrụ na ikiri otú o si eme ihe nyeere Jizọs aka inwe ọmịiko yiri nke Jehova n’ahụ́ ndị o kwusaara ozi ọma.—Jọn 5:19.

13 Jizọs mere ihe a ọ mụtara site n’iji ọmịiko mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe. N’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, ndịozi ya niile ọ hụrụ n’anya nke ukwuu ‘hapụrụ ya gbaa ọsọ.’ (Mat. 26:56; Jọn 13:1) Ọbụnadị Pita onyeozi gọnahụrụ Kraịst ugbo atọ! Ma Jizọs ka ghewere ụzọ oghe ka ndịozi ya nwee ike ịlaghachikwute ya. Ọ gwara Pita, sị: “Arịọsiwo m arịrịọ ike maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.” (Luk 22:32) E wukwasịrị Izrel Ime Mmụọ n’elu ntọala nke bụ́ “ndịozi na ndị amụma,” nkume e jikwa tọọ ntọala mgbidi Jeruselem Ọhụrụ a nwere aha ndịozi iri na abụọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Nwa atụrụ ahụ bụ́ Jizọs Kraịst. Ruokwa taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị ha na ha na-ejekọ ozi bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, na-eme nke ọma n’ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ dị ka nzukọ nke nọ n’okpuru Chineke nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-eduzi.—Efe. 2:20; Jọn 10:16; Mkpu. 21:14.

Otú Jizọs Si Zie Ihe

14, 15. Olee ihe ndị mere ka otú Jizọs si kụzie ihe dịrị iche n’otú ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si kụzie?

14 Olee otú Jizọs si tinye ọzụzụ ọ natara n’ọrụ mgbe ọ na-ezi ụmụazụ ya ihe? Ọ bụrụ na e jiri otú Jizọs si zie ihe tụnyere nke ndị ndú okpukpe ndị Juu, anyị ga-ahụ nnọọ na otú Jizọs si zie ihe ka nnọọ mma. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ‘mere ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ọdịnala ha.’ Ma Jizọs akụzighị echiche nke onwe ya; ọ kụziri kpọmkwem okwu Chineke. (Mat. 15:6; Jọn 14:10) Anyị kwesịkwara ime otu ihe ahụ.

15 E nwere ihe ọzọ mere Jizọs ji dị nnọọ iche ná ndị ndú okpukpe nke oge ya. O kwuru banyere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, sị: “Ihe niile ha na-agwa unu, meenụ ha, debekwanụ ha, kama unu emela ihe ha na-eme, n’ihi na ha na-ekwu ma ha adịghị eme.” (Mat. 23:3) Jizọs mere ihe ọ kụziri. Ka anyị tụlee otu ihe atụ nke gosiri na nke a bụ eziokwu.

16. Gịnị mere ị ga-eji kwuo na Jizọs mere ihe ahụ o kwuru na Matiu 6:19-21?

16 Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ‘kpakọbara onwe ha akụ̀ n’eluigwe.’ (Gụọ Matiu 6:19-21.) Jizọs ò mere ihe a ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha mee? O mere otú ahụ, ọ bụkwa ya mere o ji nwee ike ikwu n’ezie banyere onwe ya, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọgbà, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ọ ga-atọgbọ isi ya.” (Luk 9:58) Jizọs biri ndụ dị mfe. Ọrụ bụ́ isi ọ rụrụ bụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ, o gosikwara ihe mmadụ inwere onwe ya pụọ ná nchegbu ịkpakọba akụ̀ n’elu ụwa na-akpata pụtara. Jizọs gosiri na ọ ka mma ịkpakọba akụ̀ n’eluigwe, “ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-adịghịkwa awaba zuo ohi.” Ị̀ na-eme ihe a Jizọs kwuru ka anyị na-akpakọba akụ̀ n’eluigwe?

Àgwà Ndị Dọtara Ndị Mmadụ n’Ebe Jizọs Nọ

17. Olee àgwà ndị mere Jizọs ji bụrụ onye ozi ọma pụrụ iche?

17 Olee àgwà ndị mere Jizọs ji bụrụ onye ozi ọma pụrụ iche? Otu n’ime ha bụ otú o si mesoo ndị o nyeere aka. Umeala n’obi, ịhụnanya na ọmịiko so n’àgwà Jehova ndị Jizọs ṅomiri. Àgwà ndị a dọtara nnọọ ndị mmadụ n’ebe Jizọs nọ.

18. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na Jizọs dị umeala n’obi?

18 Ebe Jizọs kwetara ịbịa n’ụwa, o “mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi mmadụ.” (Fil. 2:7) Nke a gosiri nnọọ na ọ dị umeala n’obi. Jizọs eledaghịkwa ndị mmadụ anya. Ọ dịghị eme ihe otú ga-eme ka o yie ka ọ na-asị ndị mmadụ, ‘Ùnu makwa na m si n’ihe ha ka eluigwe bịa, n’ihi ya unu kwesịrị ige m ntị.’ Jizọs adịghị ka ndị ji aka ha mee onwe ha mesaya, ọ dịghịkwa mgbe ọ fụrụ opi iji gwa ndị mmadụ na ya bụ Mesaya ahụ. E nwere oge ndị ọ gwara ndị mmadụ ka ha ghara ịgwa ndị ọzọ onye ya bụ ma ọ bụ ihe ndị ya mere. (Mat. 12:15-21) Jizọs chọrọ ka ndị mmadụ jiri aka ha kpebie iso ya n’ihi ihe ha ji anya ha hụ. Ndị na-eso ụzọ ya nwere nnọọ obi ụtọ na Onyenwe ha atụghị anya ka ha dị ka ndị mmụọ ozi zuru okè ha na ya biri n’eluigwe!

19, 20. Olee otú ịhụnanya na ọmịiko si kpalie Jizọs inyere ndị mmadụ aka?

19 Jizọs Kraịst gosikwara ndị mmadụ ịhụnanya—nke bụ́ àgwà bụ́ isi nke Nna ya nke eluigwe. (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ịhụnanya kpaliri Jizọs ịkụziri ndị mmadụ ihe. Dị ka ihe atụ, cheta otú o si nwee ọmịiko n’ahụ́ otu nwa okorobịa bụ́ onye ọchịchị. (Gụọ Mak 10:17-22.) Jizọs ‘nwere ịhụnanya n’ebe ọ nọ’ chọọkwa inyere ya aka, ma nwa okorobịa ahụ ekweghị ahapụ ọtụtụ ihe o nwere iji ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst.

20 Otu n’ime àgwà Jizọs ndị na-adọrọ mmasị bụ ọmịiko. Dị nnọọ ka ọ dị ụmụ mmadụ niile na-ezughị okè, ndị niile bịara ige ntị n’ozizi ya nwere ọtụtụ nsogbu. Jizọs maara nke a, n’ihi ya, o ji ọmịiko kụziere ha ihe. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kụzigidere ihe ruo n’okè nke na ha enweghịdị ohere iri nri. Ma gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ gbakọtaranụ? “O nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Jizọs chọpụtara ọnọdụ ndị bi n’ógbè ya nọ na ya bụ́ nke kwesịrị imere ebere, ọ gbalịsikwara ike ịkụziri ha ihe na ịrụ ọrụ ebube ndị baara ha uru. Àgwà ọma ndị o nwere dọtara ụfọdụ ndị n’ebe ọ nọ, okwu ya kpalikwara ha ịghọ ndị na-eso ụzọ ya.

21. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso?

21 E nwere nnọọ ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị pụrụ ịmụta banyere ozi Jizọs jere n’elu ala, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi. Olee ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Ozi Ala Ọzọ kasịnụ?

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee ọzụzụ Jizọs natara tupu ya abịa n’ụwa?

• Olee otú ụzọ Jizọs si zie ihe si kara nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii mma?

• Olee àgwà ndị dọtara ndị mmadụ n’ebe Jizọs nọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Olee otú Jizọs si kụziere ìgwè mmadụ ihe?