Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta Ihe Site ná Njehie Ụmụ Izrel

Mụta Ihe Site ná Njehie Ụmụ Izrel

Mụta Ihe Site ná Njehie Ụmụ Izrel

NDỊ Izrel maara ihe ndị Jehova chọrọ ka ha mee ka ha na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Chineke esila n’ọnụ Mozis nye ha iwu, sị: “Chụpụnụ ndị niile bi n’ala ahụ n’ihu unu ma bibie ihe oyiyi niile ha ji nkume mee, bibiekwanụ ihe oyiyi niile ha ji ígwè wụọ, laakwanụ ebe nsọ ha niile dị elu n’iyi.”—Ọnụ Ọgụ. 33:52.

Ụmụ Izrel na ndị bi n’ala ahụ ekwesịghị ịgba ndụ, ha na ha ekwesịghịkwa ịlụrịta. (Diut. 7:2, 3) N’ezie, a dọrọ ndị Chineke aka ná ntị, sị: “Lezie anya ka gị na ndị bi n’ala ahụ ị na-aga ghara ịgba ndụ, ka ọ ghara ịbụrụ gị ọnyà n’etiti unu.” (Ọpụ. 34:12) N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị a niile, ndị Izrel nupụrụ isi ma daba n’ọnyà. Gịnị tinyere ha ná nsogbu a? Olee ihe ndị anyị ga-esi n’ihe mere ha mụta?—1 Kọr. 10:11.

Site n’Ịkpakọrịta Gaa n’Ikpere Arụsị

Ndị Izrel meriri ndị bi n’Ala Nkwa ahụ n’agha ná mmalite ma weghara ala ha. Ma, ndị Izrel erubereghị Chineke isi ruo n’isi. Ha ekpochapụghị ndị iro ahụ kpamkpam. (Ikpe 1:1-2:10) Kama nke ahụ, ka ndị Izrel biriziri n’etiti “mba asaa” ahụ bi n’ala ahụ, mkpakọrịta ha na ha dugara na ha na ha ịghọ enyi. (Diut. 7:1) Gịnị ka nke a dubara ndị Izrel ime? Baịbụl na-ekwu, sị: “Ha wee lụrụ ụmụ ha ndị inyom, ha kpọkwaara ụmụ ha ndị inyom kpọnye ụmụ ha ndị ikom, ha wee na-efe chi ha dị iche iche. Ụmụ Izrel wee mee ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, ha chefukwara Jehova Chineke ha wee fee Bel na ogwe osisi dị nsọ.” (Ikpe 3:5-7) Ndị Izrel iso ndị ala ahụ na-akpakọrịta mere ka ha na ha lụrịtawa meekwa ka ndị Izrel malite ikpere arụsị. Ozugbo ha na ha malitere ịlụrịta, o siziiri ndị Izrel ike ịchụpụ ndị a na-ekpere arụsị n’ala ahụ. Ha si otú a gwakọta ezi ofufe na ikpere arụsị, ndị Izrel malitekwara ife chi ụgha ha.

Ugbu a ha na ndị bi n’Ala Nkwa ahụ ghọrọ enyi, ọ dịziiri ndị Izrel mfe ịhapụ ofufe Jehova karịa ka ọ dị mgbe ha bụ ndị iro ha. Tụlee ihe ọzọ ọ pụrụ ịbụ na o so duba ha n’ikpere arụsị.

Site n’Ịrụkọ Ọrụ Ugbo Gaa n’Ifekọ Bel

Mgbe ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ, ha kwụsịrị ịdị na-akwagharị site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ, ọtụtụ n’ime ha ghọkwara ndị ọrụ ugbo. O yiri ka otú ha si na-akọ ugbo ha bụ otú ndị ala ahụ si na-akọbu ya tupu ha abịa. Eleghị anya, ọ bụghị naanị otú ndị Kenan si akọ ugbo ka ndị Izrel mụtara. Mkpakọrịta ha na ndị ala ahụ rabara ndị Izrel n’iso ha n’ofufe ha ndị gbasara ọrụ ugbo.

Ndị Kenan na-efe ọtụtụ chi Bel—ha kweere na chi ndị a na-eme ka ala ha na-emepụta nri nke ọma. Ka oge na-aga, ndị Izrel malitere ime ihe karịrị naanị ịkọ ihe na iwe ihe ubi, ha sonyekwara ndị Kenan n’ife chi ha dị iche iche maka ime ka ihe ndị ha kụrụ n’ubi mee nke ọma. Ọtụtụ ndị Izrel si otú a na-eme ka hà na-efe Jehova ma nke bụ́ eziokwu bụ na ha na-ekpere arụsị.

Ịdọ Aka ná Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ Maka Anyị Taa

Obi abụọ adịghị ya na ọ dịghị mgbe ndị Izrel bu n’obi itinye aka n’ife Bel na ime omume rụrụ arụ ndị ya na ya so mgbe ha na ndị bi n’Ala Nkwa ahụ malitere ịkpakọrịta. Ma, ọ bụ nke a ka mkpakọrịta ha na ha dugara na ya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na ụdị ihe a ga-eme anyị ma ọ bụrụ na anyị amalite iso ndị anyị na ha na-anaghị efekọ Jehova ofufe, ma ọ bụ ndị na-ejighị iwu Chineke kpọrọ ihe, ma ọ bụ ndị nwere àgwà ọjọọ na-akpakọrịta? Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị otú anyị ga-esi nnọọ ghara izute ndị na-ekweghị ekwe n’ebe anyị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ anyị, ma ọ bụkwanụ n’ime ezinụlọ anyị. Ma ihe mere ndị Izrel kwesịrị ịbụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị iji gwa anyị na mkpakọrịta dị otú ahụ na-akpata nsogbu. Baịbụl kwuru eziokwu a na-enweghị mgbagha, mgbe ọ sịrị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—1 Kọr. 15:33.

Taa, anyị nwere ọtụtụ ihe isi ike ndị yiri nke ndị Izrel nwere n’oge ahụ. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-efe ka chi taa. Ha gụnyere ego, ndị a na-anụ aha ha na-eme fim, ndị aha ha na-ede ude n’egwuregwu dị iche iche, ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa, ụfọdụ ndị isi okpukpe, na ọbụnadị ndị ezinụlọ ha. Otu n’ime ihe ndị a nwere ike ịghọ ihe bụ́ isi ná ndụ anyị. Iso ndị na-ahụghị Jehova n’anya na-akpachi anya nwere ike imebi adịm ná mma anyị na Chineke.

Mmekọahụ rụrụ arụ so n’ụzọ e si efe Bel, o sokwa rata ọtụtụ ndị Izrel ma duba ha ná nsogbu. Ụfọdụ ndị Chineke na-amakwa n’ọnyà ndị yiri ya taa. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ikiri ihe ụfọdụ ga-emebi akọnuche ya na kọmputa nọ n’ime ụlọ ya n’ihi elezighị anya ma ọ bụ n’ihi ịchọ ịhụtacha ihe niile. Ọ ga-abụ nnọọ ihe dị mwute ma Onye Kraịst kwe ka ihe na-akpali agụụ mmekọahụ a na-egosi n’Intanet rafuo ya.

“Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-edebe Ihe Ncheta Ya”

Ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ̀ ga-erube isi n’iwu ahụ Jehova nyere banyere ịhọrọ ụdị ndị anyị na ha na-akpakọrịta ma ọ bụ na ọ gaghị eme otú ahụ. (Diut. 30:19, 20) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ònye ka mụ na ya na-anọkarị mgbe m na-atụrụ ndụ? Olee otú ha si ele iwu Chineke anya, oleekwa otú àgwà ha dị? Hà na-efe Jehova? Mụ na ha ịkpakọrịta ọ̀ ga-eme ka m bụrụ ezigbo Onye Kraịst?’

Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị ụzọ ha na-enweghị ntụpọ, ndị na-eje ije n’iwu Jehova. Obi ụtọ na-adịrị ndị na-edebe ihe ncheta ya; ha ji obi ha dum na-achọ ya.” (Ọma 119:1, 2) N’eziokwu, “obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova.” (Ọma 128:1) Mgbe a bịara n’ịhọrọ ụdị ndị anyị na ha na-akpakọrịta, anyị kwesịrị isi n’ihe mere ndị Izrel mụta ihe ma rubere Jehova isi kpamkpam.—Ilu 13:20.

[Foto dị na peeji nke 26]

Iso ndị na-ahụghị Jehova n’anya na-akpakọrịta nwere ike iduga anyị n’ikpere arụsị