Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eje Ije n’Ụzọ Jehova

Na-eje Ije n’Ụzọ Jehova

Na-eje Ije n’Ụzọ Jehova

“obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova, onye na-eje ije n’ụzọ ya.”—ỌMA 128:1.

1, 2. Gịnị mere anyị ga-eji nwee obi ike na anyị pụrụ inwe obi ụtọ?

ONYE ọ bụla chọrọ inwe obi ụtọ. Ma obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekweta na mmadụ ịchọ inwe obi ụtọ na onye ahụ inwe obi ụtọ n’ezie abụghị otu.

2 Ma, anyị pụrụ inwe obi ụtọ n’ezie. Abụ Ọma 128:1 kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova, onye na-eje ije n’ụzọ ya.” Anyị pụrụ inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na-efe Chineke ma na-eje ije n’ụzọ ya site n’irubere ya isi. Olee otú nke a pụrụ isi metụta àgwà anyị na ụdị onye anyị bụ?

Bụrụ Onye A Pụrụ Ịtụkwasị Obi

3. Olee ihe jikọrọ nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke na ịbụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi?

3 Ndị na-atụ egwu Jehova bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi dịkwa nnọọ ka Jehova n’onwe ya bụ. Jehova mezuru nkwa niile o kwere ndị Izrel oge ochie. (1 Eze 8:56) Mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke, anyị na-ekwe ya nkwa kasịnụ anyị nwere ike ikwe ya, ịdị na-ekpe ekpere mgbe niile ga-enyekwara anyị aka imezu nkwa a. Anyị pụrụ ikpe ekpere dị nnọọ ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kpere, sị: “Gị onwe gị, Chineke, egewo ntị ná nkwa m kwere. . . . M ga na-abụku aha gị abụ olu ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, ka m wee na-emezu nkwa m kwa ụbọchị.” (Ọma 61:5, 8; Ekli. 5:4-6) Iji bụrụ ndị enyi Chineke, anyị ga-egosi na anyị bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi.—Ọma 15:1, 4.

4. Olee otú Jefta na ada ya si lee nkwa Jefta kwere Jehova anya?

4 N’oge Ndị Ikpe n’Izrel, Jefta kwere Jehova nkwa na ọ bụrụ na o mee ka ya merie ndị Amọn, na ya ga-achụ onye mbụ bịara izute ya mgbe ya na-alọta agha ahụ dị ka “àjà nsure ọkụ.” Onye mbụ bịara zute Jefta bụ ada ya, onye bụ́kwanụ naanị nwa o nwere. N’ihi okwukwe ha nwere na Jehova, ma Jefta ma ada ya na-alụbeghị di mezuru nkwa ahụ Jefta kwere Jehova. Ọ bụ ezie na e ji ịlụ di na ịmụta nwa kpọrọ oké ihe n’Izrel, ada Jefta jiri obi ya niile kweta ịghara ịlụ di ma nwee ihe ùgwù nke ije ozi dị nsọ n’ebe nsọ Jehova.—Ikpe 11:28-40.

5. Olee otú Hana si gosi na ya bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi?

5 Nwaanyị na-atụ egwu Chineke bụ́ Hana gosiri na ya bụ nwaanyị a pụrụ ịtụkwasị obi. Ya na di ya bụ́ onye Livaị bụ́ Elkana, na nwunye di ya bụ́ Penina, bi n’ebe ugwu obodo Ifrem. Penina mụrụ ọtụtụ ụmụ ma na-achị Hana ọchị na ọ mụtaghị nwa, ọ na-emekarịkwa nke a ma ezinụlọ ha gaa ife ofufe n’ụlọikwuu. Otu ụbọchị ha gara ife ofufe n’ụlọikwuu, Hana kwere Jehova nkwa na ọ bụrụ na ya amụta nwa, na ya ga-enye ya Jehova. N’oge na-adịghị anya, ọ dịịrị ime ma mụta nwa nwoke, bụ́ onye a gụrụ Samuel. Mgbe Hana napụrụ ya ara, ọ kpọtaara ya Chineke na Shaịlo, n’ezie, o nyere Samuel Jehova “ụbọchị ndụ ya niile.” (1 Sam. 1:11) O si otú a mezuo nkwa ya n’agbanyeghị na ọ maghị na ya ga-emecha mụta ụmụ ọzọ.—1 Sam. 2:20, 21.

6. Olee otú Tikikọs si gosipụta na a pụrụ ịtụkwasị ya obi?

6 Onye Kraịst narị afọ mbụ bụ́ Tikikọs bụ nwoke a pụrụ ịtụkwasị obi nakwa “onye ozi nke kwesịrị ntụkwasị obi.” (Kọl. 4:7) Tikikọs so Pọl onyeozi si Gris gaa Masedonia, banye n’Eshia Maịnọ, eleghịkwa anya ruo Jeruselem. (Ọrụ 20:2-4) Ọ ga-abụ ya bụ “nwanna ahụ” nyeere Taịtọs aka ikesa ihe ndị ahụ a tụkọtara maka ụmụnna ndị ihe na-esiri ike nọ na Judia. (2 Kọr. 8:18, 19; 12:18) Mgbe mbụ a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, ọ bụ nwanna a a pụrụ ịtụkwasị obi bụ́ Tikikọs ka Pọl nyere akwụkwọ ozi ka o wegara ụmụnna nọ n’Efesọs na Kọlọsi. (Efe. 6:21, 22; Kọl. 4:8, 9) Ná nke ugbo abụọ a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, o zigara Tikikọs n’Efesọs. (2 Tim. 4:12) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, Jehova ga-agọzikwa ozi anyị.

7, 8. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na Devid na Jọnatan bụ ezigbo enyi?

7 Chineke na-atụ anya ka anyị bụrụ ndị enyi a pụrụ ịtụkwasị obi. (Ilu 17:17) Nwa Eze Sọl bụ́ Jọnatan ghọrọ enyi Devid. Mgbe Jọnatan nụrụ na Devid egbuola Golaịat, “e kekọtara mkpụrụ obi Jọnatan na mkpụrụ obi Devid, Jọnatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya.” (1 Sam. 18:1, 3) Jọnatan gwadịrị Devid mgbe Sọl chọrọ igbu ya. Mgbe Devid gbapụchara, Jọnatan gakwuuru ya ha abụọ agbaa ndụ. Ọ fọdịrị obere ka Sọl gbuo Jọnatan mgbe ọ na-agwa Sọl banyere Devid, ma Jọnatan na Devid zutekwara ọzọ ma mee ka enyi ha bụ sikwuo ike. (1 Sam. 20:24-41) Mgbe ha zutere na nke ikpeazụ ya, Jọnatan mere ka obi Devid sie ike “n’ebe Chineke nọ.”—1 Sam. 23:16-18.

8 Jọnatan nwụrụ mgbe ha na ndị Filistịa na-alụ agha. (1 Sam. 31:6) Devid bụrụ abụ ákwá, sị: “M na-enwe mwute n’ihi gị, nwanne m Jọnatan, Ị dị m mma nke ukwuu. Ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ dị ukwuu karịa ịhụnanya ndị inyom.” (2 Sam. 1:26) Nke a bụ naanị ụdị ịhụnanya na-adị n’etiti enyi na enyi, ọ bụghị ụdị nke ndị chọrọ inwe mmekọahụ. Devid na Jọnatan bụ nnọọ ezigbo enyi.

Na-adị “Umeala n’Obi” Mgbe Niile

9. Olee otú e si gosi mkpa ịdị umeala n’obi dị ná Ndị Ikpe isi nke 9?

9 Iji bụrụ ndị enyi Chineke, anyị ga-adịrịrị “umeala n’obi.” (1 Pita 3:8; Ọma 138:6) E gosiri otú ịdị umeala n’obi si dị mkpa ná Ndị Ikpe isi nke 9. N’ebe ahụ, nwa Gidiọn bụ́ Jotam kwuru, sị: “O ruru otu mgbe, osisi dị iche iche gara ịhọpụta eze ga na-achị ha.” A kpọrọ osisi oliv, osisi fig, na vaịn aha. Ha nọchiri anya ndị ruru eru ịchị ndị Izrel ibe ha ma ha enweghị mmasị ịchị ha. Ma osisi ogwu—bụ́ nke na-abaghị uru ọ bụla ma ọ́ bụghị iji ya kwaa ọkụ—nọchiri anya ọchịchị Abimelek dị mpako, onye bụ́ ogbu mmadụ nke na-achọ ịchị ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ọ “bụrụ onyeisi Izrel ruo afọ atọ,” ọ nwụchuru ọnwụ. (Ikpe 9:8-15, 22, 50-54) Ị̀ hụlanụ ihe mere o ji ka mma ịdị “umeala n’obi”!

10. Gịnị ka ị mụtara n’otú Herọd na-esighị ‘nye Chineke otuto’?

10 Na narị afọ mbụ O.A., esemokwu bilitere n’etiti Eze Herọd Agripa dị mpako nke na-achị Judia na ndị Taya na Saịdọn, ha bịakwutekwara ya ka ha na ya kpezie. Otu oge mgbe Herọd na-agwa ọha mmadụ okwu, ndị ahụ zukọtaranụ tiri mkpu, sị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghị olu mmadụ!” Herọd nabatara otuto a ha nyere ya, n’ihi ya mmụọ ozi Jehova tigburu ya ozugbo ya anwụọkwa ọnwụ ihere “n’ihi na o nyeghị Chineke otuto ahụ.” (Ọrụ 12:20-23) Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na anyị bụ ọkà okwu ma ọ bụkwanụ bụrụ aka ochie n’ịkụzi eziokwu Baịbụl? Ya bụrụ otú ahụ, ka anyị kelee Jehova n’ihi ihe a o kwere ka anyị mee.—1 Kọr. 4:6, 7; Jems 4:6.

Nwee Obi Ike ma Dị Ike

11, 12. Olee otú akụkọ banyere Inọk si gosi na Jehova na-enye ndị ohu ya obi ike na ume?

11 Ọ bụrụ na anyị ejiri obi umeala na-eje ije n’ụzọ Jehova, ọ ga-eme ka anyị nwee obi ike na ume. (Diut. 31:6-8, 23) Inọk, onye nke asaa n’agbụrụ Adam, jiri obi ike soro Chineke jee ije site n’ime ihe ziri ezi n’etiti ndị ajọ omume ha na ya dịkọrọ ndụ. (Jen. 5:21-24) Jehova mere ka Inọk jiri obi ike kpọsaara ha ozi dị ike n’ihi okwu na omume asọpụrụghị Chineke ha. (Gụọ Jud 14, 15.) Ì nwere ụdị obi ike a bụ́ nke dị mkpa iji kpọsaa ikpe Chineke?

12 Jehova jiri Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ laa ndị ajọ omume n’iyi n’oge Noa. Ma amụma a Inọk buru na-agbakwa anyị ume taa n’ihi na n’oge na-adịghị anya, ọtụtụ puku ndị mmụọ ozi Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume nke oge anyị a. (Mkpu. 16:14-16; 19:11-16) Jehova na-aza ekpere anyị site n’inye anyị obi ike iji kpọsaa ozi ya, ma ozi a ọ̀ bụ banyere mbibi a ga-ebibi ndị ajọ omume ma ọ̀ bụkwanụ banyere ngọzi ndị Alaeze ya ga-eweta.

13. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Chineke pụrụ ime ka anyị nwee obi ike na ume iji die ihe isi ike ndị na-enye anyị nsogbu n’obi?

13 Obi ike na ume nke Chineke na-enye dị anyị mkpa iji nwee ike idi ihe isi ike ndị na-enye anyị nsogbu n’obi. Mgbe Ịsọ gara lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ bụ́ ndị Het, ‘ha kpataara ndị mụrụ ya, bụ́ Aịzik na Ribeka, obi ilu.’ Ribeka jidị mwute gwa di ya, sị: “Ndụ a m dị agbụla m n’ihi ndị inyom Het. Ọ bụrụ na [nwa anyị nwoke] Jekọb anwaa anwaa si n’etiti ndị inyom Het ndị a, bụ́ ndị inyom nke ala a, lụta nwaanyị, olee uru ndụ m baara m?” (Jen. 26:34, 35; 27:46) Aịzik mere ihe ozugbo ma zipụ Jekọb ka ọ gaa chọrọ nwaanyị n’ebe ndị na-efe Jehova. Ọ bụ ezie na Aịzik na Ribeka enweghị ike imegharị ihe Ịsọ merela, Chineke nyere ha amamihe, obi ike, na ume iji nọgide na-eme uche Ya. Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka enyemaka Jehova, ọ ga-enyere anyị aka dịkwa ka o nyeere Aịzik na Ribeka.—Ọma 118:5.

14. Olee otú otu nwatakịrị nwaanyị bụ́ onye Izrel si gosi na ya nwere obi ike?

14 Ka ọtụtụ narị afọ gafechara, otu nwatakịrị nwaanyị bụ́ onye Izrel nke ìgwè ndị ọ lụọ ọ gbalaga kpụụrụ gaa Siria ghọrọ odibo ọchịagha ndị Siria bụ́ Neeman, nwoke ekpenta zuru ahụ́. Ebe ọ bụ na nwatakịrị nwaanyị a anụla banyere ọrụ ebube ndị Chineke siri n’aka Ịlaịsha onye amụma rụọ, ọ kara obi gwa nwunye Neeman, sị: ‘A sị nnọọ na onyenwe m ga-aga Izrel, onye amụma Jehova ga-agwọ ya ekpenta ya.’ Neeman gara Izrel, a gwọọkwa ya ekpenta ya n’ụzọ ọrụ ebube. (2 Eze 5:1-3) Nwatakịrị nwaanyị a bụ ezi ihe nlereanya nye ndị na-eto eto bụ́ ndị na-elegara Jehova anya ka o nye ha obi ike iji gbaara ndị nkụzi ha, ụmụ akwụkwọ ibe ha na ndị ọzọ àmà!

15. Olee ihe Obedaya bụ́ onye na-elekọta ụlọ Ehab kara obi mee?

15 Obi ike nke Chineke na-enye na-enyere anyị aka idi mkpagbu. Tụlee ihe banyere onye na-elekọta ụlọ Eze Ehab bụ́ Obedaya, onye dịrị ndụ n’oge Ịlaịja onye amụma. Mgbe Jezibel bụ́ nwunye eze nyere iwu ka e gbuo ndị amụma Chineke, Obedaya zoro otu narị n’ime ha “mmadụ iri ise mmadụ iri ise n’ọgba.” (1 Eze 18:13; 19:18) Ị̀ ga-aka obi nyere Ndị Kraịst ibe gị a na-akpagbu aka dị nnọọ ka Obedaya nyeere ndị amụma Jehova aka?

16, 17. Gịnị ka Arịstakọs na Geyọs mere mgbe a na-akpagbu ha?

16 Ọ bụrụ na a na-akpagbu anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-anọnyere anyị. (Rom 8:35-39) N’otu ámá egwuregwu dị n’Efesọs, Arịstakọs na Geyọs bụ́ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ zutere ọtụtụ puku ndị na-eme ihe ike iwe ji. Ọ bụ Dimitriọs, bụ́ onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe, kpọ ndị ahụ na-eme ihe ike bịa. Ya na ndị ọzọ ji ọlaọcha akpụ ihe na-akpụ ihu arụsị chi nwaanyị bụ́ Atemis ma ozi ọma Pọl ziri n’ebe ahụ, bụ́ nke mere ka ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ kwụsị ife arụsị, mere ka ahịa na-asụ ha. Ìgwè mmadụ ahụ iwe ji kpụgara Arịstakọs na Geyọs n’ámá egwuregwu ahụ ma na-eti mkpu, sị: “Atemis nke ndị Efesọs dị ukwuu!” Arịstakọs na Geyọs chere na a na-aga igbu ha ma onye na-elekọta obodo ahụ mere ka obi jụrụ ìgwè mmadụ ahụ.—Ọrụ 19:23-41.

17 Ọ bụrụ na ọ bụ gị ka e mere ihe a, ị̀ ka ga-anọgidesi ike n’ozi gị? Ọ dịtụghị ihe gosiri na Arịstakọs ma ọ bụ Geyọs ji ụjọ kwụsị ozi ha na-eje. Ebe ọ bụ na Arịstakọs si Tesalonaịka, ọ maara na ikwusa ozi ọma pụrụ ịkpata mkpagbu. Tupu mgbe ahụ, e nweela mgbe e nwere ọgba aghara na Tesalonaịka mgbe Pọl kwusaara ha ozi ọma. (Ọrụ 17:5; 20:4) Chineke nyere Arịstakọs na Geyọs ume na obi ike idi mmegide a n’ihi na ha jere ije n’ụzọ Jehova.

Na-elekwasị Anya n’Ihe Ndị Metụtara Ndị Ọzọ

18. Olee otú Priska na Akwịla si ‘lekwasị anya’ n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ?

18 Ma à na-akpagbu anyị ugbu a ma ọ bụ na adịghị akpagbu anyị, anyị kwesịrị ịdị na-eche banyere ụmụnna anyị. Priska na Akwịla “na-elekwasị anya” n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ. (Gụọ Ndị Filipaị 2:4.) Ọ ga-abụ na di na nwunye a bụ́ ndị ezigbo mmadụ nyere Pọl ụlọ ọ nọrọ n’Efesọs, bụ́ ebe Dimitriọs na-eji ọlaọcha akpụ ihe kpalitere ọgba aghara ahụ e kwuru okwu ya. Ọ ga-abụ nsogbu a mere ka Akwịla na Priska ‘tinye ndụ ha n’ihe ize ndụ’ n’ihi Pọl. (Rom 16:3, 4; 2 Kọr. 1:8) Taa, inwe nchegbu maka ụmụnna anyị ndị a na-akpagbu na-eme ka anyị “dị akọ dị ka agwọ.” (Mat. 10:16-18) Anyị na-eji akọ arụ ọrụ anyị, ma jụ ịranye ụmụnna anyị n’aka ndị iro site n’ịghara ịgwa ndị mkpagbu aha ha nakwa ihe ndị ọzọ banyere ha.

19. Olee ihe ọma ndị Dọkas meere ndị ọzọ?

19 E nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi na-elekwasị anya n’ihi ndị metụtara ndị ọzọ. Ụfọdụ Ndị Kraịst nwere mkpa, anyị nwekwara ike igboro ha mkpa ndị a. (Efe. 4:28; Jems 2:14-17) N’ọgbakọ narị afọ mbụ dị na Jọpa, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Dọkas onye bụ́ o mepụrụ onye ọ dịịrị. (Gụọ Ọrụ 9:36-42.) Dọkas “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere” bụ́ nke gụnyere ịkwatara ụmụ nwaanyị isi mkpe ákwà. Mgbe ọ nwụrụ n’afọ 36 O.A., obi gbawara nnọọ ụmụ nwaanyị isi mkpe ndị a. Chineke mere ka Pita onyeozi kpọlite Dọkas, ọ ga-abụkwa na Dọkas ji ọṅụ jiri oge niile o biziri ndụ n’elu ụwa kwusaa ozi ọma ahụ ma meere ndị ọzọ ihe ọma. Obi dị anyị nnọọ ụtọ na taa anyị nwekwara ụmụnna nwaanyị yiri Dọkas bụ́ ndị na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha naanị!

20, 21. (a) Olee ihe jikọrọ inye agbamume na ilekwasị anya n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ? (b) Gịnị ka ị ga-eme iji nwee ike ịdị na-agba ndị ọzọ ume?

20 Anyị na-egosi na anyị na-elekwasị anya n’ihe metụtara ndị ọzọ site n’ịgba ha ume. (Rom 1:11, 12) Onye ya na Pọl rụkọrọ ọrụ, bụ́ Saịlas, gbara nnọọ Pọl ume. Mgbe e kpebichara okwu banyere ibi ùgwù na 49 O.A., òtù na-achị isi nọ na Jeruselem zigara ndị nnọchianya ka ha gaa kesaara Ndị Kraịst nọ n’obodo ndị ọzọ akwụkwọ ozi. Saịlas, Judas, Banabas, na Pọl gara Antiọk. N’Antiọk, Saịlas na Judas “gbara ụmụnna ahụ ume, meekwa ka ha sie ike.”—Ọrụ 15:32.

21 E mechara tụọ Pọl na Saịlas mkpọrọ na Filipaị, ma e jiri ala ọma jijiji tọhapụ ha. Chetụkwala ụdị ọṅụ ha nwere ịgbara onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ àmà ma hụ ka ya na ndị ụlọ ya ghọrọ ndị kwere ekwe! Tupu Saịlas na Pọl esi n’obodo ahụ pụọ, ha gbara ụmụnna nọ n’ebe ahụ ume. (Ọrụ 16:12, 40) Dị ka Pọl na Saịlas mere, jisie ike na-agba ndị ọzọ ume site n’ajụjụ ị na-aza n’ọgbakọ, ihe omume ndị ị na-eme n’ikpo okwu, nakwa site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma. Ọ bụrụ na i “nwere okwu agbamume,” jisie ike ‘kwuo ya.’—Ọrụ 13:15.

Nọgide Na-eje Ije n’Ụzọ Jehova

22, 23. Gịnị n’ezie ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka akụkọ ndị e dekọrọ na Baịbụl baara anyị uru?

22 Anyị kwesịrị nnọọ inwe ekele maka akụkọ ndị a mere eme e dekọrọ n’Okwu Jehova, bụ́ “Chineke nke agbamume niile”! (2 Kọr. 1:3, Byington) Ka ahụmahụ ndị a wee nwee ike ịbara anyị uru, anyị kwesịrị ime ihe Baịbụl kwuru ma kwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị.—Gal. 5:22-25.

23 Ịtụgharị uche n’ihe ndị e dekọrọ na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịdị na-akpa àgwà ndị na-amasị Chineke. Ọ ga-eme ka anyị na Jehova, bụ́ onye na-enye anyị “amamihe na ihe ọmụma na aṅụrị,” dịkwuo nnọọ ná mma. (Ekli. 2:26) Nke a ga-emekwa ka anyị mee ka obi Chineke ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ka anyị kpebisie ike ime ka obi Chineke ṅụrịa site n’ịnọgide na-eje ije n’ụzọ ya.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú ị pụrụ isi gosi na ị bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi?

• Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị “umeala n’obi”?

• Olee otú akụkọ ndị e dekọrọ na Baịbụl pụrụ isi nyere anyị aka inwe obi ike?

• Olee ụzọ ndị anyị pụrụ isi “na-elekwasị anya” n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 8]

Jefta na ada ya, bụ́ ndị gosiri na a pụrụ ịtụkwasị ha obi, mezuru nkwa Jefta kwere n’agbanyeghị na ime nke a adịghịrị ha mfe

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị na-eto eto, gịnị ka unu mụtara n’aka nwatakịrị nwaanyị Izrel ahụ?

[Foto dị na peeji nke 11]

Olee otú Dọkas siri gbooro Ndị Kraịst ibe ya mkpa ha?