Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ònye Maara Ihe ma Nwee Nghọta n’Etiti Unu?”

“Ònye Maara Ihe ma Nwee Nghọta n’Etiti Unu?”

“Ònye Maara Ihe ma Nwee Nghọta n’Etiti Unu?”

“Ònye maara ihe ma nwee nghọta n’etiti unu? Ya jiri ịdị nwayọọ nke e ji mara amamihe gosi ọrụ ya site n’ime omume ọma.”—JEMS 3:13.

1, 2. Olee otú ị ga-esi kọwaa ndị e weere dị ka ndị maara ihe?

ÒNYE ka ị na-ewere ka onye maara ihe n’ezie? Ikekwe ọ bụ ndị mụrụ gị, ma ọ bụ nwoke merela agadi, ma ọ bụkwanụ onye bụ́ prọfesọ na mahadum. O nwere ike ihe na-ekpebi onye ị na-ewere dị ka onye maara ihe bụ otú e si zụlite gị na ebe ị nọ too. Ma ihe ka ndị Chineke mkpa bụ onye Chineke weere dị ka onye maara ihe.

2 Ọ bụghị ndị niile ụwa weere na ha ma ihe maara ihe n’ezie n’anya Chineke. Dị ka ihe atụ, Job na ụmụ nwoke ndị chere na ha na-ekwu okwu ka ndị maara ihe kparịtara ụka, ma Job gwara ha, sị: “Ahụghị m onye maara ihe n’etiti unu.” (Job 17:10) Pọl onyeozi kwuru banyere ụfọdụ ndị jụrụ amamihe Chineke, sị: “Ọ bụ ezie na ha na-ekwusi ike na ha maara ihe, ha ghọrọ ndị nzuzu.” (Rom 1:22) Jehova sikwa n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo hoo haa, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe n’anya onwe ha.”—Aịza. 5:21.

3, 4. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịbụ onye maara ihe n’ezie, gịnị ka ọ ga-eme?

3 O doro anya na ọ dị mkpa ka anyị mara ihe ndị na-eme ka mmadụ bụrụ onye maara ihe n’ezie ka anyị wee bụrụ ndị ga-enweta ngọzi Chineke. Ilu 9:10 na-agwa anyị, sị: “Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe, ịmara Onye Kasị Nsọ ka nghọta bụkwa.” Onye maara ihe aghaghị ịdị na-atụ egwu Chineke ma na-erube isi n’iwu ya. Ma, a chọrọ ihe karịrị mmadụ ikwere na Chineke dị na ikwere na o nwere iwu. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems kwuru otu ihe nke ga-akpali anyị ichebara nke a echiche. (Gụọ Jems 3:13.) Chegodị banyere okwu a bụ́: “Ya . . . gosi ọrụ ya site n’ime omume ọma”? Ezi amamihe anyị nwere kwesịrị ịpụta ìhè n’omume na n’okwu ọnụ anyị kwa ụbọchị.

4 Ezi amamihe gụnyere anyị ile ihe anya otú kwesịrịnụ na iji ihe anyị mụtara na nghọta mee ihe n’ụzọ dị mma. Olee ihe ndị ọ ga-abụ anyị mee ya egosi na anyị nwere amamihe dị otú ahụ? Jems kwuru ọtụtụ ihe mmadụ ga-abụ o mee ya egosi na onye ahụ maara ihe. * Olee ihe o kwuru ga-enyere anyị aka ka anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na ndị na-abụghị ndị Jehova na-adị ná mma?

Omume Mmadụ Na-egosi Ma Ọ̀ Maara Ihe n’Ezie

5. Olee otú onye maara ihe n’ezie ga-esi akpa àgwà?

5 Ọ dị mma icheta na Jems gosiri na e nwere ihe jikọrọ amamihe na omume ọma. Ebe ọ bụ na ịtụ egwu Jehova bụ mmalite nke amamihe, onye maara ihe na-agbalị ịkpa àgwà kwekọrọ n’ụzọ nke Chineke na iwu ya. Anyị ebughị amamihe Chineke pụta ụwa. Ma anyị nwere ike inweta ya site n’ịmụchi Baịbụl anya na ịtụgharị uche n’ihe anyị na-amụ. Ihe ndị a ga-enyere anyị aka ime ihe Ndị Efesọs 5:1 gwara anyị mee. Ọ sịrị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke.” Ka anyị na-akpa àgwà kwekọrọ na nke Jehova, otú ahụ ka anyị ga-enwekwu ike ime omume gosiri na anyị maara ihe. Ụzọ Jehova dị nnọọ elu karịa nke mmadụ. (Aịza. 55:8, 9) N’ihi ya, ka anyị na-agbalị iṅomi ụzọ Jehova si eme ihe, ndị mmadụ ga-ahụ na anyị dị iche ná ndị ọzọ.

6. Gịnị mere ịdị nwayọọ ji bụrụ ihe e ji ama onye na-atụ egwu Chineke, oleekwa otú mmadụ si egosi na ya nwere àgwà a?

6 Jems kwuru na otu ụzọ anyị ga-esi adị ka Jehova bụ site n’inwe “ịdị nwayọọ nke e ji mara amamihe.” Ọ bụ ezie na ịdị nwayọọ chọrọ mmadụ ịdị nro, n’otu oge ahụ, Onye Kraịst kwesịkwara ịbụ onye na-agbagidesi ụkwụ ike n’ihe Baịbụl kwuru, nke a ga-enyere ya aka ime ihe otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụ ezie na ike Chineke enweghị ọgwụgwụ, Chineke dị nwayọọ, anyị anaghịkwa atụ ụjọ ịbịaru ya nso. Ọkpara Chineke ṅomikwara nnọọ ịdị nwayọọ Nna ya nke mere o ji nwee ike ikwu, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.”—Mat. 11:28, 29; Fil. 2:5-8.

7. Gịnị mere anyị ga-eji were Mozis dị ka ezi ihe nlereanya ma a bịa n’ịdị nwayọọ?

7 A kọkwara akụkọ banyere ndị ọzọ dị nwayọọ, ma ọ bụ umeala n’obi, na Baịbụl. Mozis bụ otu onye n’ime ha. E nyere ya ọrụ dị ukwuu, n’agbanyeghị nke ahụ, a kọwara ya dị ka nwoke “dị nnọọ umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụ. 11:29; 12:3) Cheta ụdị obi ike Jehova nyere Mozis ka o wee nwee ike imezu uche Ya. Ọ masịrị Jehova iji ndị dị nwayọọ emezu nzube ya.

8. Olee otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi gosipụta “ịdị nwayọọ nke e ji mara amamihe”?

8 Obi abụọ adịghị ya na ọ ga-ekwe omume ụmụ mmadụ na-ezughị okè igosipụta “ịdị nwayọọ nke e ji mara amamihe.” Oleekwanụ maka anyị? Olee otú anyị ga-esi tinyekwuo mgbalị n’igosipụta àgwà a? Ịdị nwayọọ so n’akụkụ nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ Jehova. (Gal. 5:22, 23) Anyị nwere ike ịrịọ Jehova maka mmụọ ya ma gbalịsie ike igosipụta mkpụrụ ya, nwee obi ike na Chineke ga-enyere anyị aka ịdịkwu nwayọọ. Okwu ọbụ abụ na-akpalikwu anyị ịgbalị inwe àgwà a. Ọ sịrị: “[Chineke] ga-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.”—Ọma 25:9.

9, 10. Olee mgbalị ọ dị mkpa ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị nwayọọ ka Chineke, n’ihi gịnịkwa ka anyị ga-eji gbalịa ime ya?

9 Ka o sina dị, ịdịkwu nwayọọ chọrọ mgbalị dị ukwuu. O nwere ike ọ gaghị adịrị ụfọdụ n’ime anyị mfe ịdị nwayọọ n’ihi otú e si zụlite anyị. Tụkwasị na nke ahụ, ndị anyị na ha na-akpa nwere ike ịdị na-agba anyị ume ime ihe dị iche n’ihe Baịbụl kwuru site n’ịkwado àgwà “i mee m mụ emegwara.” Ma nke ahụ ọ̀ bụ ihe e ji ama onye maara ihe? Ọ bụrụ na obere ọkụ achọọ ịgba n’ụlọ gị, ị̀ ga-eji mmanụ ka ọ̀ bụ mmiri emenyụ ya? Ịwụnye mmanụ n’ọkụ na-enwu enwu ga-eme ka o nwusikwuo ike, ma ịwụ ya mmiri oyi ga-eme ka ọ nyụọ. N’otu aka ahụ, Baịbụl na-adụ anyị ọdụ, sị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.” (Ilu 15:1, 18) Ànyị na-ahụ ugbu a otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ezi amamihe site n’igosipụta ịdị nwayọọ mgbe ọzọ mmadụ kpasuru anyị iwe, ma ọ̀ bụ n’ọgbakọ, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ?—2 Tim. 2:24.

10 Dị ka a kọwarala, ọtụtụ ndị nwere mmụọ nke ụwa adịghị nwayọọ, ha adịghịkwa eme ihe n’udo. Kama nke ahụ, ndị dị aka ike na ndị na-awagbu onwe ha n’anya juru ebe niile. Jems maara nke a, ọ dọkwara aka ná ntị ka ndị nọ n’ọgbakọ zere ịbụ ndị mmụọ nke ụwa ga-emebi uche ha. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta na ndụmọdụ ahụ o nyere?

Àgwà E Ji Ama Ndị Na-amaghị Ihe

11. Olee àgwà ndị na-adịghị egosi na mmadụ nwere amamihe Chineke?

11 Jems ezoghị ọnụ n’ikwu àgwà ndị na-emegide nnọọ amamihe Chineke. (Gụọ Jems 3:14.) Ekworo na esemokwu bụ àgwà anụ ahụ́, ha abụghị àgwà ime mmụọ. Tụlee ihe na-eme ma ndị mmadụ na-eche echiche dị ka onye anụ ahụ́ na-achịkwa. E nwere òtù isii sị na ha bụ Ndị Kraịst na-achịkwa akụkụ dị iche iche nke chọọchị a na-akpọ Church of the Holy Sepulchre dị na Jeruselem, bụ́ nke e kwuru na e wuru ya n’ebe ahụ a nọ kpọgbuo Jizọs ma lie ya. Òtù isii a nọ n’esemokwu kemgbe. N’afọ 2006, magazin bụ́ Time kọrọ otu ihe mere n’otu oge, bụ́ mgbe ndị mọnk ha “bara mba ruo ọtụtụ awa, . . . jiri nnukwu ihe e ji etinye kandụl na-akụ ibe ha.” Esemokwu dị n’etiti ha dị ukwuu nke na e nyere onye Alakụba mkpịsị ugodi e ji agbape ụlọ chọọchị ha.

12. Mgbe amamihe na-adịghị, gịnị nwere ike ime?

12 E kwesịghị ịhụ ụdị esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ dị otú ahụ n’etiti ezigbo Ndị Kraịst. Ma mgbe ụfọdụ, ezughị okè emeela ka ụfọdụ ndị siwe ọnwụ na a ga-emerịrị ihe ha kwuru. Nke ahụ nwere ike ịkpatatụ esemokwu na ịba mba. Pọl onyeozi chọpụtara na ihe dị otú a na-eme n’ọgbakọ dị na Kọrịnt, n’ihi ya o degaara ha akwụkwọ, sị: “Ebe e nwere ekworo na esemokwu n’etiti unu, ọ̀ bụ na unu abụghị ndị anụ ahụ́ na-achị, ọ̀ bụkwa na unu adịghị eje ije dị ka ụmụ mmadụ si eje?” (1 Kọr. 3:3) Ọ dị mwute ikwu na nsogbu ahụ ditetụrụ aka n’ọgbakọ Kọrịnt narị afọ mbụ ahụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịnọ ná nche ka ụdị mmụọ a ghara ịbata n’ọgbakọ anyị taa.

13, 14. Nye ihe atụ otú mmadụ nwere ike isi gosi na ya bụ onye anụ ahụ́ na-achị.

13 Olee otú àgwà dị otú ahụ nwere ike isi gbebata n’ọgbakọ? O nwere ike isi n’ihe ndị na-enweghị ihe ha bụ malite. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụfọdụ ndị nwere ike inwe echiche dị iche banyere otú ihe ụfọdụ kwesịrị ịdị. Otu nwanna nwere ike iwewa iwe n’ihi na a nabataghị aro ọ tụrụ, ikekwe o nwere ike ịmalite ịkatọwa mkpebi ndị e mere. O nwedịrị ike ịjụ itinyezi aka n’ọrụ ahụ! Onye na-eme otú ahụ na-echefu na ihe na-enye aka ịhụ na a rụchara ụdị ọrụ a a na-arụ n’ọgbakọ abụghị otú e si rụọ ya kama ọ bụ otú ndị niile nọ n’ọgbakọ si gbakọọ aka rụọ ya n’udo. Ọ bụ ịdị nwayọọ na-amasị Jehova ọ bụghị esemokwu.—1 Tim. 6:4, 5.

14 Ihe atụ ọzọ nwere ike ịbụ mgbe ndị okenye ọgbakọ chọpụtara na otu okenye n’ọgbakọ ha, n’agbanyeghị na ọ dịla anya ọ bụ okenye, erughịzi ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ iji nọgide na-abụ okenye. Mgbe onye nlekọta sekit chọpụtara na a dọọla nwanna nwoke ahụ aka ná ntị kpọmkwem banyere nsogbu a ma ya ajụ ịgbanwe, onye nlekọta ahụ ekweta ma sonyere ndị okenye ndị ọzọ kwado ka e wepụ ya n’òtù ndị okenye. Olee ihe ọ ga-eme? Ọ̀ ga-eji obi umeala na ịdị nwayọọ nabata ihe ahụ ndị okenye niile gbakọrọ aka kpebie ma nakwerekwa ịdọ aka ná ntị si n’Akwụkwọ Nsọ e nyere ya ma kpebizie ịgbalị iru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ iji nwee ike ịghọ okenye ọzọ? Ka ọ̀ ga-amalite ibu iwe n’obi ma kwosawa ndị okenye ndị ọzọ ekworo n’ihi na a napụrụ ya ihe ùgwù o nweburu? Gịnị mere nwanna ga-eji na-eme ka ò ruru eru ịbụ okenye mgbe o doro anya na o rughị? Ọ ga-aka nnọọ mma ma o gosi na ya bụ onye dị umeala n’obi na onye nwere nghọta!

15. Olee ihe mere i ji chee na ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị na Jems 3:15, 16 dị oké mkpa?

15 N’eziokwu, e nwekwara ụzọ ndị ọzọ mmadụ nwere ike isi gosi na ya bụ onye anụ ahụ́ na-achị. Ma, ihe ọ sọkwara ya ya bụrụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịhụ na anyị zeere àgwà ndị dị otú ahụ. (Gụọ Jems 3:15, 16.) Jems onye na-eso ụzọ kwuru na àgwà ndị dị otú ahụ bụ “nke ụwa” n’ihi na ha bụ nke anụ ahụ́, e nweghịkwa ihe ọ bụla jikọrọ ha na amamihe Chineke. Ha bụ “anụ ahụ́” n’ụdị na ha bụ́ ihe anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè na-eduba anyị ime, bụ́kwanụ nke yiri àgwà ụmụ anụmanụ na-enweghị uche. Àgwà ndị dị otú ahụ bụ nke “ndị mmụọ ọjọọ,” n’ihi na ha bụ àgwà e ji mara ndị mmụọ ọjọọ bụ́ ndị iro Chineke. Onye Kraịst ekwesịtụdịghị ịkpa àgwà ndị ahụ!

16. Olee mgbanwe ndị ọ dị mkpa ka anyị mee, oleekwa otú anyị ga-esi nwee ike ime ha?

16 Ọ dị mkpa ka Onyeàmà Jehova ọ bụla nyochaa onwe ya ma gbalịa wepụ aka n’àgwà ndị dị otú ahụ. Ebe ndị okenye bụ ndị na-ezi ihe n’ọgbakọ, ha kwesịkwara ịhụ na ha wepụrụ aka n’àgwà ọjọọ. Ọ dịghị mfe ime nke a n’ihi na anyị bụ ndị na-ezughị okè, mmụọ nke ụwa a na-emekwa ka ụmụ mmadụ na-achọ ịkpa àgwà ndị ahụ. Ịgbalị iwepụ aka n’àgwà ọjọọ ndị ahụ dị ka ịgbalị ịrị ugwu bụ́ apịtị apịtị ma na-amị amị. Ọ bụrụ na e nweghị ihe anyị ga-ejide aka na-arị ya, anyị nwere ike ịda. Ma ọ bụrụ na anyị ejidesie aka ike na ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl, nwetakwa enyemaka site n’ọgbakọ Chineke zuru ụwa ọnụ, anyị ga-enwe ike ịga n’ihu.—Ọma 73:23, 24.

Àgwà Ndị Maara Ihe Na-agbalị Ịkpa

17. Gịnị ka onye maara ihe na-eme mgbe a nwara ya ime ihe ọjọọ?

17 Gụọ Jems 3:17. Ịtụle ụfọdụ n’ime àgwà mmadụ ga-amalite ịkpa ma ọ bụrụ na ọ na-egosipụta “amamihe nke si n’elu” ga-abara anyị uru. Ịdị ọcha gụnyere enweghị mmetọ na ịghara ịbụ ndị e merụrụ omume na echiche obi anyị. Ọ dị mkpa ka anyị jụ ihe ọ bụla dị njọ ozugbo. E kwesịghị ichetara anyị echetara ime nke a. Ikekwe ọ dịtụla mgbe mmadụ chọrọ ịrụnye gị aka n’anya. Ị naghị echedị eche tupu i zere anya gị ma ọ bụ jiri aka gị dochie ya. Otú ahụ ka anyị kwesịrị ịdị na-eme mgbe ọ bụla a nwara anyị ime ihe ọjọọ. Ọbụbụ anyị bụ ndị dị ọcha na akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ kwesịrị ime ka anyị jụ ime ihe ọjọọ. (Rom 12:9) Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị mere otú ahụ, dị ka Josef na Jizọs.—Jen. 39:7-9; Mat. 4:8-10.

18. Gịnị ka (a) ịbụ onye na-adị n’udo pụtara? (b) ịbụ onye na-eme udo pụtara?

18 Amamihe si n’elu chọkwara ka anyị bụrụ ndị na-adị n’udo. Nke a gụnyere anyị izere ịdị na-eme ihe ike ike, ịghara ịdị na-akpata esemokwu, ma ọ bụ izere ime ihe ndị ga-akpaghasị udo. Jems gakwara n’ihu ịkọwakwu isiokwu ya site n’ikwu, sị: “A na-aghakwa mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.” (Jems 3:18) Ị̀ rịbara okwu ahụ bụ́ “maka ndị na-eme udo” ama? N’ọgbakọ anyị, à maara anyị dị ka ndị na-eme udo ka ọ bụ dị ka ndị na-akpaghasị udo? Anyị na ndị ọzọ ànyị na-enwekarị nghọtahie, ya bụ, ànyị bụ ndị na-ewekarị iwe ọsọ ọsọ na ndị na-emejọkarị ndị ọzọ? Ànyị na-ekwukarị na o nweghị ihe anyị ga-emeli iji gbanwee omume anyị nakwa na ndị ọzọ kwesịrị iwere anyị otú anyị dị, ka anyị na-eji obi umeala agbalị iwepụ àgwà ndị na-akpasukarị ndị ọzọ iwe? À maara anyị dị ka ndị na-agbalị ike anyị ịhụ na udo dị, ndị na-adịkarị njikere ịgbaghara ndị ọzọ ma chefuo mmejọ ọ bụla e mejọrọ anyị? Inyocha onwe anyị nke ọma ga-enyere anyị aka ịhụ ebe ndị ọ dị mkpa ka anyị gosipụtakwuo amamihe Chineke n’akụkụ ndị a.

19. Olee ihe ndị e ji ama na mmadụ nwere ezi uche?

19 Jems gụnyere mmadụ inwe ezi uche mgbe ọ na-akọwa ihe ndị na-egosi na mmadụ nwere amamihe nke si n’elu. À maara anyị dị ka ndị na-ekwenye ekwenye ma ọ bụrụ na enweghị iwu Akwụkwọ Nsọ a dara, ndị na-adịghị esi ọnwụ ka ọ bụrụ ihe anyị chọrọ ka a na-eme? À maara anyị dị ka ndị dị nwayọọ na ndị ọ na-adịrị ndị ọzọ mfe ịgwa okwu? Ime ihe ndị a ga-egosi na anyị amụtala inwe ezi uche.

20. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ana-egosipụta àgwà ndị a anyị tụlere ugbu a?

20 Ọ bụrụ na ndị niile nọ n’ọgbakọ ana-agbalịsi ike na-akpa àgwà ọma ndị a Jems kwuru okwu ha, ọgbakọ ahụ ga-adị nnọọ n’udo! (Ọma 133:1-3) Anyị ịdị nwayọọ, ịdị na-eme udo, na inwe ezi uche ga-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị nnọọ ná mma ma gosikwa na anyị nwere “amamihe nke si n’elu.” Ihe ọzọ anyị ga-eleba anya na ya bụ otú ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha pụrụ isi nyere anyị aka igosipụta àgwà ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Okwu ndị gbara okwu a Jems kwuru gburugburu na-egosi na ndị mbụ Jems bu n’uche dee ihe a bụ ndị okenye, ma ọ bụ “ndị ozizi,” nọ n’ọgbakọ. (Jems 3:1) Ndị okenye a kwesịrị ịbụ ezi ihe nlereanya n’igosipụta amamihe nke Chineke, ma anyị niile nwere ike ịmụta ihe ná ndụmọdụ a Jems nyere.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị na-eme ka Onye Kraịst bụrụ onye maara ihe n’ezie?

• Olee otú anyị pụrụ isi bụrụkwuo ndị nwere amamihe nke Chineke?

• Olee àgwà ndị na-enweghị “amamihe nke si n’elu” na-akpa?

• Olee àgwà ọma ndị i kpesirila ike ịmụtakwu ịdị na-akpa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Olee otú esemokwu nwere ike isi gbebata taa?

[Foto dị na peeji nke 24]

Ịgbara ihe ọjọọ ọsọ ọ̀ bụ àgwà maara gị ahụ́?