Ịgbasa Ozi Ọma n’Ugwu Andes
Ịgbasa Ozi Ọma n’Ugwu Andes
ANYỊ dị mmadụ iri na asatọ, ihe anyị ji dina tọgbọcha n’ala nkịtị. Ahụ́ na-ama anyị jijiji n’ihi ezigbo oyi na-atụ anyị, nnukwu mmiri nọ na-ezo, anyị na-anụkwa ụda ya n’elu gbamgbam nke ụlọ anyị nọ n’ime ya. N’ihi otú obere ụlọ ahụ anyị nọ n’ime ya dị, anyị nọ na-eche ma ọ bụ anyị bụ ụmụ mmadụ mbụ rahụtụrụla n’ime ya.
Gịnị butere mmadụ iri na asatọ n’ụdị ebe a? Azịza ya gbadoro ụkwụ n’otú o si dị anyị ọkụ n’obi irube isi n’iwu Jizọs nyere ka e kwusaa ozi ọma ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Ọrụ 1:8; Mat. 24:14) Anyị bịara ikwusa ozi ọma n’ebe a dịpụrụ adịpụ dị n’ugwu Andes nke dị ná mba Bolivia.
Ahụhụ Anyị Tara Tupu Anyị Eruo Ebe Ahụ
Ihe isi ike mbụ anyị nwetara bụ inweta ụgbọala anyị ga-eji ruo ebe ahụ. Anyị nụrụ na inweta ụgbọala na-ebuga ndị mmadụ n’ime ime obodo ahụ anaghị adị mfe. Mgbe bọs anyị bịara, anyị chọpụtara na ọ dị nnọọ obere n’ihi ya kwa, ụfọdụ n’ime anyị kwụ ọtọ n’ime ya. Ma anyị niile mechara ruo ebe anyị na-aga.
Nzube anyị bụ ịga kwusaara ndị bi n’ime ime obodo ndị dị n’elu ugwu Andes ahụ ozi ọma. N’ihi ya, mgbe bọs ahụ busara anyị ebe ọ na-akwụsị, anyị niile buuru ihe ndị anyị ji bịa ma kwụrụ n’ahịrị soro obere ụzọ ndị dị rịgọ rịgọ rịgowe n’elu ugwu ahụ.
Ọ bụ ezie na o yiri ka obodo ndị ahụ ha dịcha ntakịrị, ma a rusasịrị ụlọ ndị dị na ha arụsasị nke na o were ọtụtụ awa iji gazuo obodo nke ọ bụla. Ka anyị na-aba n’ime, anyị na-ahụ ụlọ ọzọ nọbakwuru n’ime. Ọtụtụ mgbe anyị furu ụzọ n’ihi otú ụzọ ndị dị n’ime ọhịa ndị ahụ si dị rịgọ rịgọ.
“Gịnị Mere na Unu Abịabeghị Kemgbe?”
Otu nwaanyị kwere ka anyị jiri nkụ ya sie nri ehihie anyị na kichin ya n’ihi obi ụtọ o nwere maka otú anyị si gaa nnọọ ogologo ije iji rute ebe ahụ. Mgbe a kọwaara otu nwoke ihe Baịbụl kwuru banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ọ jụrụ anyị, sị, “Gịnị mere unu abịabeghị kemgbe?” Ihe ndị ọ nụrụ tọrọ ya ụtọ nke ukwuu nke na ọ hapụrụ obodo ya ma soro anyị gaa ebe ndị ọzọ iji nwee ohere ịjụkwu anyị ajụjụ ndị ọzọ mgbe anyị nọ n’ụzọ. Otu nwoke ọzọ anụtụbeghị banyere Ndịàmà Jehova, o gosikwara nnọọ mmasị n’akwụkwọ anyị. O kelere anyị nnọọ maka ịbịa ma nye anyị mkpịsị ugodi e ji agbape otu obere ụlọ bụ́ ebe anyị nwere ike ịdị na-arahụ.
N’otu abalị, ebe niile gbara itiri nke na anyị amaghị oge anyị ji rụọ ụlọ ntu anyị n’ebe aṅarahịa kwụjuru. Ahụhụ ndị ahụ nyụrụ anyị anya maka ịbịa nọchiere ha ụzọ. Ma n’ihi otú ike si gwụ anyị, anyị ebilidịghị ebe ahụ, ọ dịghịkwa anya ahụhụ ndị ahụ ahapụ anyị.
Mgbe anyị malitere ihi n’ala nkịtị, azụ anyị na ọgịrịga anyị na-egbucha anyị mgbu, ma anyị adịghị anụ ụfụ ha n’abalị. Ma chi foo, anyị na-echefu ahụ́ mgbu niile anyị
nwere ma anyị na-ekiri ọmarịcha ndagwurugwu na urukpuru na ọnụ ugwu ndị snow kpuchiri. Naanị ihe ị ga na-anụ bụ ụda mmiri na-asọ asọ na abụ ụmụ nnụnụ.Mgbe anyị sachara ahụ́ ná mmiri dị ebe ahụ, anyị atụlekọta ihe mmụta dịịrị ụbọchị, rie nri ụtụtụ, ma jiri nwayọọ nwayọọ gbagowe n’obodo ndị ọzọ dị n’ime ime. Ahụhụ anyị tara gbagoo ebe ndị ahụ efughị ọhịa. Otu agadi nwaanyị anyị zutere bere ákwá mgbe ọ hụrụ na aha Chineke bụ́ Jehova dị na Baịbụl. O riri ya ọnụ. Ugbu a ọ ga na-akpọzi aha Chineke n’ekpere ya!
Otu agadi nwoke kwuru na ọ ga-abụrịrị na Chineke echetala ya, ma malite ịbụ abụ, na-asị na ọ bụ ndị mmụọ ozi zitere anyị. Otu nwoke ọzọ ezigbo ọrịa ji nke na ọ naghị esili n’ụlọ ya apụta èzí, gwara anyị na ọ dịbeghị onye si n’obodo ya o metụrụ n’obi ịbịa leta ya. O juru ya anya na anyị si ihe ha ka obodo La Paz bịa ileta ha. Ọ tọrọ otu nwoke ọzọ ụtọ nke ukwuu na Ndịàmà Jehova na-aga eleta ndị mmadụ n’ụlọ ha ebe ndị okpukpe ndị ọzọ na-eji mgbịrịgba akpọ ndị mmadụ ka ha bịa n’ụlọ ụka ha.
O nweghị ụlọ nọ ebe ahụ nwere ọkụ eletrik, n’ihi ya kwa, ndị mmadụ na-ehi ụra ozugbo itiri gbara ma bilie ozugbo anyanwụ pụtara. N’ihi ya, anyị na-amalite ikwusa ozi ọma n’elekere isii nke ụtụtụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ndị mmadụ n’ụlọ. Ma ọ́ bụghị ya, ọtụtụ n’ime ha ga-anọzi n’ugbo tupu anyị erute n’ụlọ ha. Anyị na-emesịkwa nweta ụfọdụ ndị dị njikere ịkwụsị ọrụ ha ma gee ntị n’Okwu Chineke anyị bịara ikwusara ha, nke a na-enyekwa ehi ha ji akọ ala ha ohere izurutụ ike. Ọtụtụ n’ime ndị anyị hụrụ n’ụlọ na-atụrụ anyị akpụkpọ anụ n’ala ka anyị jiri nọrọ ọdụ, ha na-akpọkọkwa ndị ezinụlọ ha niile ka ha bịa gee ntị. Ụfọdụ ndị ọrụ ugbo na-ebunye anyị nnukwu akpa ọka iji gosi ekele ha maka akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl anyị nyere ha.
“Unu Echefughị M”
Ọ bụghị naanị otu ugbo e ziri ndị mmadụ ozi ọma ka ha na-amụtacha ihe niile dị na Baịbụl. Ọtụtụ n’ime ndị anyị ziri ozi ọma rịọrọ anyị ka anyị bịa kụzikwuoro ha ihe. N’ihi nke a, anyị agaghachila ọtụtụ ugboro n’obodo ndị a dị na Bolivia.
N’otu n’ime oge ndị a anyị laghachiri, otu agadi nwaanyị nwere nnọọ obi ụtọ na anyị bịaghachiri ileta ya, wee kwuo, sị: “Ọ dị m nnọọ ka unu bụ ụmụ m. Unu echefughị m.” Otu nwoke kelere anyị maka ọrụ anyị ma gwa anyị na anyị nwere ike ịnọ na nke ya oge ọzọ anyị ga-abịa. Ikekwe, otu n’ime ihe kasị mma mgbalị anyị rụpụtara bụ mgbe anyị nụrụ na otu nwaanyị anyị ziri ozi ọma n’otu n’ime oge ndị anyị bịara akwagala n’otu obodo ukwu nọrọkwa ebe ahụ na-ekwusa ozi ọma ugbu a.
Tupu ụbọchị ikpeazụ nke njem mbụ anyị agwụ, mmanụ ọkụ anyị gwụrụ, ọ fọkwara obere ka nri anyị gwụsịa. Anyị tụtụtara nkụ menwuo ọkụ, sie nri ikpeazụ anyị nwere ma were ụkwụ lawa. Ebe anyị nọ dị nnọọ anya site n’ebe anyị ga-anọ baa bọs ga-ebula anyị. Ma anyị mesịrị ruo ebe anyị na-aga mgbe chi jiri.
Ịlaghachi Ụlọ Anyị
Anyị nwekwara nsogbu mgbe anyị na-ala n’ihi na bọs anyị mebiri. Ma anyị mesịrị banye otu gwongworo ndị mmadụ juru.
Nke a mere ka anyị nwee ohere izi ndị anyị na ha nọ na gwongworo ahụ ozi ọma bụ́ ndị chọrọ ịma ihe anyị bịara ebe ahụ ime. Ọ bụ ezie na ndị ebe a bụ ndị ihere, ma ha bụ nnọọ ndị obiọma.
Mgbe anyị nọchara awa itoolu n’azụ gwongworo ahụ, anyị rutere ụlọ anyị—mmiri matọrọ anyị amatọ, oyi na-atụ anyị abụghịkwa ihe e ji ọnụ ekwu. Ma njem anyị ahụ rụpụtara ihe. Ka anyị nọ n’ụzọ, otu nwaanyị bi n’obodo ukwuu kwere ka anyị bịa mụwara ya Baịbụl.
N’ezie, ọ bụ ohere magburu onwe ya ikwusara ndị bi n’ebe ndị a dịpụrụ adịpụ ozi ọma. Anyị kwusara ozi ọma n’obodo anọ na ọtụtụ ọnụmara. Anyị chetara nnọọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-ekwu, sị: “Lee ka o si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-eweta ozi ọma, bụ́ onye na-ekwusa udo, onye na-eweta ozi ọma nke ihe ka mma, onye na-ekwusa nzọpụta.”—Aịza. 52:7; Rom 10:15.
[Foto dị na peeji nke 17]
Mgbe anyị na-achọ ịgawa ozi ọma