Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-anụ Mkpu Enyemaka Anyị Na-eti

Jehova Na-anụ Mkpu Enyemaka Anyị Na-eti

Jehova Na-anụ Mkpu Enyemaka Anyị Na-eti

“Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.”—ỌMA 34:15.

1, 2. (a) Olee otú ọ dị ọtụtụ mmadụ taa? (b) Gịnị mere nke a anaghị eju anyị anya?

È NWERE ihe ndị na-echegbu gị? Ọ bụrụ na e nwere, cheta na ọ bụghị naanị gị nwere nsogbu. Ọtụtụ nde mmadụ nwere nsogbu ndị ha na ha na-alụ kwa ụbọchị n’ime ụwa ọjọọ a anyị bi na ya. Ọ na-adịdị ụfọdụ ndị ka nsogbu nke ha enweghị odidi. Ọ na-adị ha ka ọ dị ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, bụ́ onye dere, sị: “Ahụ́ akụnwụwo m, e gbuwokwa mmụọ m nke ukwuu; ebigbọwo m n’ihi ịsụ ude nke obi m. Obi m na-akụsi ike, ike agwụwokwa m, anya m adịkwaghị ahụ ụzọ.”—Ọma 38:8, 10.

2 Ihe isi ike ndị a a na-enweta ná ndụ adịghị eju Ndị Kraịst anya. Anyị ghọtara na “ihe ụfụ nke nhụjuanya” so n’ihe ndị e buru n’amụma e ji ama oge ọnụnụ Jizọs. (Mak 13:8; Mat. 24:3) A na-eji okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ihe ụfụ nke nhụjuanya” akọwa oké ihe ụfụ nwaanyị na-amụ nwa na-enwe mgbe ọ na-amụ nwa. Nke ahụ kọwara nnọọ ụdị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata ‘n’oge a dị oké egwu, nke tara akpụ’!—2 Tim. 3:1.

Jehova Na-aghọta Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe

3. Olee ihe ndị ohu Chineke ghọtara nke ọma?

3 Ndị Jehova ghọtara na ihe isi ike ndị a na-enwe n’ụwa taa na-erutụkwa ha, marakwa na o yiri ka ihe isi ike ga na-akawanye njọ. E wezụga nsogbu onye ọ bụla na-enweta n’ụwa a, ndị ohu Chineke nwekwara ihe ọzọ ha na ya na-alụ, nke bụ́ “onye mmegide [ha], bụ́ Ekwensu,” bụ́ onye forola ntutu taa na ọ ga-emebi okwukwe anyị. (1 Pita 5:8) Ọ dị nnọọ mfe na ọ ga-adị anyị dị ka ọ dịịrị Devid, bụ́ onye kwuru, sị: “Nkọcha etiwaala m obi, ọnyá ya enweghịkwa ngwọta. Anọ m na-atụ anya ka mmadụ meere m ebere, ma ọ dịghị onye meere m ebere; na-atụkwa anya ndị nkasi obi, ma o nweghị onye m hụrụ”!—Ọma 69:20.

4. Olee ihe na-akasi anyị obi mgbe anyị nọ na nsogbu?

4 Ihe a Devid kwuru, ọ̀ pụtara na o nweghị olileanya ọ bụla? Mba. Lee ihe ọ gara n’ihu ikwu n’abụ ọma ahụ: “Jehova na-ege ndị ogbenye ntị, Ọ gaghịkwa eleghara ndị ya nọ n’ụlọ mkpọrọ anya.” (Ọma 69:33) Iji kọwakwuo ya, ọ pụrụ ịdị anyị mgbe ụfọdụ ka anyị bụ́ ndị mkpọrọ, ndị nsogbu na ihe isi ike ndị anyị na-enwe tụrụ mkpọrọ. Ọ pụrụ ịdị ka ndị ọzọ adịghị aghọtacha otú ọ dị anyị—o nwere ike ya abụrụ eziokwu na ha adịghị aghọta. Ma, dị ka Devid, ịmara na Jehova na-aghọta nnọọ ihe anyị na ya na-alụ pụrụ ịkasi anyị obi.—Ọma 34:15.

5. Olee ihe obi siri Eze Sọlọmọn ike na ọ ga-eme?

5 Mgbe a na-arara ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem nye Jehova, nwa Devid, bụ́ Sọlọmọn mere ka o doo anya na Jehova maara nsogbu anyị. (Gụọ 2 Ihe E Mere 6:29-31.) Ọ rịọrọ Jehova ka ọ nụ ekpere onye ọ bụla obi ya dị ọcha nke ga-abịakwute Ya ịkọsara Ya “ihe na-egbu ya mgbu na ihe na-afụ ya ụfụ.” Olee ihe Chineke ga-eme mgbe ọ nụrụ ekpere nke ndị a nwere nsogbu? Sọlọmọn kwupụtara obi ike o nwere na Chineke ga-anụ ekpere ha ma gbatara ha ọsọ enyemaka. Gịnị mere ọ ga-eji mee otú a? Ọ bụ n’ihi na ọ maara “obi ụmụ mmadụ” n’ezie.

6. Gịnị ga-enyere anyị aka idi ihe isi ike, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka nke a ga-eji nyere anyị aka?

6 Anyị nwekwara ike ikpegara Jehova ekpere ma kọsara ya ‘ihe ndị na-egbu anyị mgbu na ihe na-afụ anyị ụfụ,’ ya bụ ihe ndị na-enye onye ọ bụla n’ime anyị nsogbu n’obi. Ịmara na Chineke na-aghọta nsogbu ndị anyị na-enwe nakwa na ọ na-eche banyere anyị kwesịrị ịkasi anyị obi. Pita onyeozi gosiri na nke a bụ eziokwu mgbe o kwuru, sị: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Ihe gbasara anyị na-emetụ nnọọ Jehova n’obi. Jizọs mekwuru ka o doo anya na Jehova na-eche banyere anyị mgbe o kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ. Ya mere, unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Mat. 10:29-31.

Dabere n’Enyemaka Jehova

7. Enyemaka onye ka obi kwesịrị isi anyị ike na anyị ga-enweta?

7 Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova dị njikere ma nwee ike inyere anyị aka mgbe anyị nọ n’ihe isi ike. “Chineke bụ ebe mgbaba anyị na ike anyị, onye dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.” (Ọma 34:15-18; 46:1) Olee otú Chineke si enyere anyị aka? Tụlee ihe 1 Ndị Kọrịnt 10:13, kwuru: “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.” Jehova pụrụ ịgbanwe ihe ụfọdụ iji wepụrụ anyị ihe isi ike ma ọ bụkwanụ ya enye anyị ume iji die ya. Otú ọ bụla ọ sọrọ ya ya siri mee ya, o nyerela anyị aka.

8. Olee otú anyị ga-esi enweta enyemaka Chineke?

8 Olee otú anyị ga-esi enweta enyemaka ahụ? Tụlee ndụmọdụ a e nyere anyị: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile.” Nke a pụtara na anyị ga-ebugara Jehova ihe niile na-akpa anyị na ihe ndị na-echegbu anyị. Anyị ga-agbalị ịkwụsịzi ichegbu onwe anyị ma jiri ndidi tụkwasị ya obi na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị. (Mat. 6:25-32) Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi iji tụkwasị Jehova obi, nke pụtara na anyị agaghị adabere n’ike ma ọ bụ n’amamihe nke onwe anyị. Mgbe anyị wedara onwe anyị ala “n’okpuru aka dị ike nke Chineke,” anyị na-egosi na anyị ghọtara na Chineke karịrị anyị. (Gụọ 1 Pita 5:6.) Ime nke a na-enyekwara anyị aka ịnabata ihe ọ bụla Chineke kwere ka o mee. O nwere ike anyị achọọ ka nsogbu anyị bie ngwa ngwa, ma anyị kwesịrị inwe obi ike na Jehova maara kpọmkwem mgbe ka mma inyere anyị aka na otú o kwesịrị isi mee ya.—Ọma 54:7; Aịza. 41:10.

9. Olee ụdị ibu arọ ọ dị mkpa ka Devid bugara Jehova?

9 Cheta ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 55:22: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.” Mgbe Devid dere okwu ndị ahụ, ọ nọ n’oké ihe mgbu. (Ọma 55:4) A chọpụtara na o dere abụ ọma a mgbe nwa ya bụ́ Absalọm kpara nkata ịnaghara ya ọchịchị. Ahitofel bụ́ onye ndụmọdụ Devid ọ kasị tụkwasị obi sonyeere Absalọm. Devid siri na Jeruselem gbapụ maka ndụ ya. (2 Sam. 15:12-14) Devid nọgidere na-atụkwasị Chineke obi ọbụna n’oge ndị a nsogbu zuru ya ahụ́, Jehova nyekwaara ya aka.

10. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe anyị nwere nsogbu?

10 Dị ka Devid, ọ dị oké mkpa ka anyị na-ebugara Jehova nsogbu niile anyị nwere n’ekpere. Ka anyị tụlee ihe Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị mee banyere nke a. (Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.) Gịnị ka ekpere ahụ anyị ji obi anyị dum kpee ga-arụpụta? “Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi [anyị] na ike iche echiche [anyị] nche site n’aka Kraịst Jizọs.”

11. Olee otú “udo nke Chineke” si echebe obi na ike iche echiche anyị?

11 Ekpere ọ̀ ga-eme ka ọnọdụ gị gbanwee? O nwere ike. Ma anyị kwesịrị ịghọta na ọ bụghị mgbe niile ka Jehova na-aza ekpere anyị otú anyị si chọọ. Ka o sina dị, ekpere na-enyere anyị aka ile ihe anya otú o kwesịrị ka anyị wee ghara ikwe ka nsogbu ndị anyị na-enwe nyịgbuo anyị. “Udo nke Chineke” pụrụ ime ka obi ruo anyị ala mgbe anyị nwere ihe ndị na-echegbu anyị. Dị nnọọ ka ndị agha ọrụ ha bụ ichebe obodo ka ndị iro ghara ịwakpo ya, “udo nke Chineke” ga-echebe obi na ike iche echiche anyị. Ọ ga-emekwa ka anyị ghara ịdị na-enwe obi abụọ, na-atụ ụjọ, ma ọ bụ na-eche echiche ga-akụda anyị mmụọ, gbochiekwa anyị ime mkpebi ọkụ ọkụ bụ́ nke amamihe na-adịghị na ya.—Ọma 145:18.

12. Nye ihe atụ otú mmadụ nwere ike isi nwee udo nke obi.

12 Olee otú anyị pụrụ isi nwee udo nke obi mgbe anyị nọ n’ihe isi ike? Ka anyị tụlee otu ihe atụ nwere ike ikwekọ n’ọnọdụ anyị. Ka e were ya na ọ dị otu onye e were n’ọrụ nke manịja ya na-agwakarị okwu ọjọọ. Ma o nwere ike ịga kọsara onye nwe ụlọ ọrụ ahụ, onye bụ́ nwoke obiọma, na onye na-echebara mmadụ echiche, nsogbu ya. Mgbe ọ gara, ọga nwe ụlọ ọrụ ahụ agwa ya na ya ma ihe na-aganụ, gwakwa ya na a na-aga iwepụ manịja ahụ n’oge na-adịghị anya. Olee otú obi ga-adị onye ahụ e were n’ọrụ mgbe ọ nụrụ nke a? Ikweta ihe ahụ a gwara ya na ịmara ihe na-aga ime ga-eme ka ọ nọgide na-edi ihe ndị na-abịara ya, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ahụhụ ndị ọ ka ga-ata n’aka nwoke ahụ ga-aka njọ. N’otu aka ahụ, anyị maara na Jehova na-aghọta ọnọdụ anyị, ọ na-emekwa ka obi sie anyị ike na n’oge na-adịghị anya “a ga-achụpụ onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31) Lee nnọọ ka nke a ga-esi kasie anyị obi!

13. E wezụga ikpe ekpere, olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime?

13 Ọ̀ pụtara na naanị ihe a chọrọ n’aka anyị bụ ịkọsara Jehova mkpa anyị n’ekpere? Ee e. E nwere ihe ọzọ a chọrọ. Anyị kwesịrị ime ihe kwekọrọ n’ekpere anyị. Mgbe Eze Sọl zitere ndị mmadụ n’ụlọ Devid ka ha bịa gbuo ya, Devid kpere ekpere, sị: “Chineke m, biko, napụta m n’aka ndị iro m; chebe m ka m ghara ịdaba n’aka ndị na-ebili imegide m. Napụta m n’aka ndị na-eme ihe ọjọọ, zọpụtakwa m n’aka ndị ikpe ọbara mara.” (Ọma 59:1, 2) Mgbe Devid kpesịrị ekpere a, o gere nwunye ya ntị ma gbapụ n’obodo ya. (1 Sam. 19:11, 12) N’otu aka ahụ, anyị nwere ike ikpe ekpere ka Chineke nye anyị amamihe iji mara ihe anyị ga-eme banyere nsogbu bịaara anyị ma ọ bụkwanụ mee ka nsogbu ahụ anyị nọ na ya dịtụ mfe.—Jems 1:5.

Otú Anyị Pụrụ Isi Nweta Ike Anyị Ga-eji Die Nsogbu Anyị

14. Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi mgbe anyị nọ n’ihe isi ike?

14 O nwere ike a gaghị eme ka nsogbu anyị kwụsị ozugbo. Ha nwedịrị ike ịdịgide ruo oge ụfọdụ. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, gịnị ga-enyere anyị aka idi ha? Nke mbụ, cheta na ọ bụrụ na anyị anọgide na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị na-enwe, anyị na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya. (Ọrụ 14:22) Cheta ebubo Setan boro Job: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke? Ọ̀ bụ na ị gbaghị ya ogige gburugburu, gbaakwa ụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu? Ị gọziwo ọrụ aka ya, anụ ụlọ ya agbasawokwa ebe niile n’ụwa. Ma, iji nwee ihe dị iche, biko, matịa aka gị, metụ ihe niile o nwere, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.” (Job 1:9-11) Job gosiri na ebubo ahụ Setan boro ya bụ okpotokpo asị site n’ịnọgide na-erubere Chineke isi. Ọ bụrụ na anyị edie nsogbu ndị anyị nwere, anyị ga-enwe ihe anyị ga-eji mee Setan onye ụgha. Ntachi obi anyị ga-emekwa ka anyị nwekwuo obi ike na olileanya.—Jems 1:4.

15. Olee ihe atụ ndị nwere ike ịgba anyị ume?

15 Nke abụọ, cheta na “òtù ụmụnna [anyị] niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a [anyị] na-ata.” (1 Pita 5:9) N’ezie, “ọ dịghị ọnwụnwa bịakwasịrị [anyị] nke na-abụghị nke na-abịara ụmụ mmadụ.” (1 Kọr. 10:13) N’ihi ya, ịtụgharị uche n’otú ndị ọzọ si na-edi ihe isi ike nke ha kama ịnọ na-eche maka nke gị ga-enyere gị aka inwekwu ume na obi ike. (1 Tesa. 1:5-7; Hib. 12:1) Chee nnọọ echiche banyere ndị ị maara bụ́ ndị tachirila nnọọ obi ma nọgide na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ókè ihe isi ike ha nwere. Ì wepụtatụla oge chọọ n’akwụkwọ anyị ma ị̀ ga-ahụ akụkọ ndụ nke ndị nwere ụdị nsogbu ị na-enwe ugbu a? I nwere ike ịchọta ihe ga-agba gị nnọọ ume.

16. Olee otú Chineke si agba anyị ume mgbe anyị nwere ihe isi ike dị iche iche?

16 Nke atọ, cheta na Jehova “bụ́ Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile . . . , onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile, ka anyị wee nwee ike ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi site ná nkasi obi nke Chineke na-akasi anyị onwe anyị.” (2 Kọr. 1:3, 4) O yiri ka Chineke ọ kwụ anyị n’akụkụ na-agba anyị ume, ọ bụghị naanị ná mkpagbu ndị anyị na-enwe ugbu a kamakwa “ná mkpagbu anyị niile.” Nke a na-enyeziri anyị aka ịkasi ndị “nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla” obi. Pọl n’onwe ya chọpụtara na okwu ndị a bụ eziokwu.—2 Kọr. 4:8, 9; 11:23-27.

17. Olee otú Baịbụl ga-esi nyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị na-enwe ná ndụ?

17 Nke anọ, anyị nwere Okwu Chineke bụ́ Baịbụl, bụ́ nke “bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.” (2 Tim. 3:16, 17) Ihe Okwu Chineke na-eme abụghị naanị ime ka anyị “ruo eru” na ‘ịkwadebe anyị ịrụ ezi ọrụ niile,’ kamakwa ọ na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị na-enweta ná ndụ. Ọ na-eme ka anyị “ruo eru n’ụzọ zuru ezu” ‘na-akwadebekwa anyị n’ụzọ zuru ezu.’ Asụsụ mbụ e si na ya sụgharịta okwu a bụ́ ‘kwadebe n’ụzọ zuru ezu’ pụtara n’ụzọ nkịtị “ihe nwere ihe zuru ezu iji mee ihe a chọrọ.” N’oge ochie, o nwere ike ịbụ na a na-eji okwu a akọwa ụgbọ mmiri nwere ihe niile dị mkpa maka njem a chọrọ iji ya mee ma ọ bụkwanụ ígwè ọrụ e nwere ike iji rụọ ụdị ọrụ ọ bụla a chọrọ iji ya rụọ. N’otu aka ahụ, Jehova na-esite n’Okwu ya enye anyị ihe niile dị anyị mkpa iji mara ihe anyị ga-eme maka nsogbu ọ bụla bịara anyị. Ọ bụ ya mere anyị nwere ike iji kwuo, sị, “Ọ bụrụ na Chineke ekwere ka nsogbu a bịara m, ọ ga-enyere m aka idi ya.”

Nnapụta Pụọ ná Nsogbu Anyị Niile

18. Olee ihe ọ ga-abụ anyị na-echeta ya enyekwuoro anyị aka ịtachi obi ma nọgide na-ejere Jehova ozi?

18 Nke ise, buru nkwa ahụ magburu onwe ya Jehova kwere n’uche mgbe niile nke bụ́ na n’oge na-adịghị anya nsogbu niile ụmụ mmadụ na-enwe ga-akwụsị. (Ọma 34:19; 37:9-11; 2 Pita 2:9) N’ikpeazụ, nnapụta Chineke ga-anapụta anyị abụghị naanị na ọ ga-anapụta anyị ná nsogbu niile anyị na-enwe ugbu a kamakwa ọ ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi, ma ànyị ga-eso Jizọs bie n’eluigwe ma ànyị ga-ebi na paradaịs elu ụwa.

19. Gịnị mere ọ ga-eji kwe omume ịtachi obi ma nọgide na-ejere Jehova ozi?

19 Tupu nke ahụ emee, anyị ga-anọgide na-edi nsogbu ndị juru n’ụwa ọjọọ a. Anyị na-atụsi nnọọ anya ike mgbe nsogbu ndị a niile na-agaghị adịzi! (Ọma 55:6-8) Ka anyị cheta na ọ bụrụ na anyị anọgide na-atachi obi ma na-ejere Jehova ozi, anyị na-eme Ekwensu onye ụgha. Ka anyị si n’ekpere nakwa n’òtù ụmụnna anyị na-enweta obi ike, na-echeta na ụmụnna anyị na-enwekwa ihe isi ike yiri ndị nke anyị. Ka anyị nọgide bụrụ ndị ruru eru n’ụzọ zuru ezu na ndị a kwadebere nke ọma site n’ịmụchi Okwu Chineke anya. Ekwekwala ka ihe ọ bụla mee ka ị gharazie inwe obi ike na “Chineke nke nkasi obi niile” ga na-elekọta gị. Cheta na “anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.”—Ọma 34:15.

Ị̀ Ga-azali Ajụjụ Ndị A?

• Olee otú Devid si were nsogbu ndị o nwere?

• Olee obi ike Eze Sọlọmọn kwupụtara?

• Olee ihe ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị Jehova kwere ka ha bịara anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Obi siri Sọlọmọn ike na Jehova ga-enyere ndị Ya nọ ná mkpa aka

[Foto dị na peeji nke 15]

Devid kọsaara Jehova mkpa ya niile n’ekpere ma gbalịa mee ihe kwekọrọ n’ekpere o kpere