Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ekwenye Ekwenye, Adịla Na-esi Ọnwụ

Na-ekwenye Ekwenye, Adịla Na-esi Ọnwụ

Na-ekwenye Ekwenye, Adịla Na-esi Ọnwụ

“Nọgide na-echetara ha ka ha . . . nwee ezi uche.”—TAỊTỌS 3:1, 2.

1, 2. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere mmadụ ikwenye ekwenye, oleekwa ihe mere nke a ji dị mkpa?

AMAMIHE Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova enweghị atụ. Anyị bụ́ ndị o kere na-elegara ya anya ka ọ na-eduzi anyị. (Ọma 48:14) Onye na-eso ụzọ Kraịst bụ́ Jems gwara anyị na “amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche [ma ọ bụ na-ekwenye ekwenye], dị njikere irube isi, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, ọ dịghị akpa ókè n’ihi ile mmadụ anya n’ihu, ọ dịghị ihu abụọ.”—Jems 3:17.

2 Pọl onyeozi gbara anyị ume, sị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche [ma ọ bụ na unu na-ekwenye ekwenye].” * (Fil. 4:5) Kraịst Jizọs bụ Onyenwe anyị nakwa Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Efe. 5:23) Ọ dị nnọọ oké mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị gosi na ya nwere ezi uche, ya bụ́, na-ekwenyere ntụziaka Kraịst, gharakwa ịdị na-esi ọnwụ ka ndị ọzọ na-eme ihe ọ chọrọ mgbe niile!

3, 4. (a) Kọwaa uru ndị anyị na-erite mgbe anyị na-ekwenye ekwenye. (b) Gịnị ka anyị ga-atụle?

3 Ọ bụrụ na anyị a na-ekwenye ekwenye, ọ na-abara anyị uru dị ukwuu. Dị ka ihe atụ: Mgbe a chọpụtasịrị atụmatụ a sị na ndị ọjọọ mere ịgbawa ụgbọelu na Britain, ndị na-agba ụgbọelu dịzi nnọọ njikere ikwenye ịghara iji ihe ụfọdụ ndị a naara ekwe ha jiri banye n’ụgbọelu. Mgbe anyị na-anya ụgbọala, anyị na-ahụ mkpa ọ dị ikwenyere ndị ọzọ na-anya ụgbọala, dị ka mgbe anyị chọrọ ịtụgharị n’ebe ụzọ wara ngalaba, ka anyị wee ghara isukara ụgbọala ọzọ ma hụ na ihe na-aga nnọọ n’usoro.

4 Ọ naghị adịrị ọtụtụ n’ime anyị mfe ikwenye ekwenye. Iji nyere anyị aka, ka anyị tụlee ihe atọ ha na ikwenye ekwenye na-agakọ, ha bụ, ihe kwesịrị ịkpali anyị ikwenye ekwenye, otú anyị si ele ndị nọ n’isi anya, na ókè anyị kwesịrị ịbụru ndị na-ekwenye ekwenye.

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ịdị Na-ekwenye Ekwenye?

5. Dị ka e kwuru n’Iwu Mozis, gịnị pụrụ ime ka onye bụ́ ohu họrọ ịnọgide n’aka nna ya ukwu?

5 Ihe atụ nke otu ihe a na-eme tupu oge Ndị Kraịst gosiri ihe kwesịrị ịkpali mmadụ ikwenye ekwenye. Dị ka e kwuru n’Iwu Mozis, n’afọ nke asaa, ma ọ bụ n’afọ Jubili, nke ọ bụla bu ụzọ ruo, e kwesịrị ịhapụ onye Hibru gbaworo ohu ka o nwere onwe ya. Ma ohu ahụ nwere ike ịhọrọ ịnọgide bụrụ ohu. (Gụọ Ọpụpụ 21:5, 6.) Gịnị nwere ike ime ka ohu ahụ họrọ ime nke a? Ọ bụ ịhụnanya ohu ahụ nwere n’ebe nna ya ukwu dị obiọma nọ pụrụ ime ka ọ chọọ ịnọgide n’aka ya.

6. Olee otú ịhụnanya si enyere anyị aka ikwenye ekwenye?

6 N’otu aka ahụ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-akpali anyị ịrara ndụ anyị nye ya ma na-agbalị ime ihe ọ chọrọ ka anyị mee. (Rom 14:7, 8) Jọn onyeozi dere, sị: “N’ihi na nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3) Onye nwere ụdị ịhụnanya a adịghị achọ naanị ọdịmma onwe ya. (1 Kọr. 13:4, 5) Mgbe gị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, ọ bụrụ na ị hụrụ ha n’anya, ị gaghị esiwe ọnwụ ka e mee ihe ị chọrọ kama ị ga-ege ha ntị. Kama ịchọwa ọdịmma onwe anyị naanị, anyị kwesịrị ịchọ ọdịmma ndị ọzọ.—Fil. 2:2, 3.

7. Olee otú ịhapụ ihe ụfọdụ na-amasịkarị anyị si enyere anyị aka n’ozi anyị?

7 Anyị ekwesịghị ikwe ka okwu ọnụ anyị ma ọ bụ omume anyị na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. (Efe. 4:29) Ịhụnanya ga-akpali anyị izere ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka ndị si n’ebe dị iche iche ghara ịbịa fewe Jehova. Ọtụtụ mgbe, nke a nwere ike ịchọ ka anyị hapụ ime ihe ụfọdụ na-amasịkarị anyị. Dị ka ihe atụ, ụmụnna nwaanyị nọ n’ozi ala ọzọ bụ́ ndị ọ na-amasịkarị itecha ntecha ma ọ bụ ndị iyi traụza marala ahụ́, adịghị esi ọnwụ ịnọgide na-eme ihe ndị a n’obodo ebe a na-ele ihe ndị a anya ọjọọ nke na ha pụrụ ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.—1 Kọr. 10:31-33.

8. Olee otú ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ pụrụ isi nyere anyị aka ịkpa àgwà dị ka ‘ndị ka nta’?

8 Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-eme ka anyị ghara ịdị mpako. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs rụrịtachara ụka banyere onye ka ibe ya ukwuu, Jizọs kpọtara otu nwatakịrị n’etiti ha. Ọ gwara ha, sị: “Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị a n’aha m na-anabatakwa m, onye ọ bụlakwa nke na-anabata m na-anabatakwa onye ahụ nke zitere m. N’ihi na onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.” (Luk 9:48; Mak 9:36) O nwere ike ịdị na-esiri anyị n’otu n’otu ike ime onwe anyị dị ka “onye ka nta.” Mmehie anyị ketara eketa na mpako nwere ike ime ka anyị chọwa ịnọ n’isi, ma ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ịghara isiwe ọnwụ ka a na-eme ihe anyị chọrọ mgbe niile.—Rom 12:10.

9. Gịnị ka anyị ga-eme ka e wee gụọ anyị ná ndị na-ekwenye ekwenye?

9 A ga-agụ anyị ná ndị na-ekwenye ekwenye ma ọ bụrụ na anyị a na-erubere ndị Chineke họpụtara isi. Ezi Ndị Kraịst maara mkpa ọ dị ịdị na-ekwenyere ndị Chineke debere n’isi. Pọl onyeozi mere ka nke a doo ndị Kọrịnt anya mgbe ọ gwara ha, sị: “Ma achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.”—1 Kọr. 11:3.

10. Gịnị ka anyị ikwenyere Jehova na-egosi?

10 Anyị ikwenyere Chineke na-egosi na anyị tụkwasịrị Nna anyị na-ahụ n’anya obi. Ọ maara ihe niile na-emenụ, ọ pụkwara ịkwụghachi anyị ụgwọ dị ka ọrụ anyị si dị. Ọ dị mkpa iburu nke a n’uche mgbe ndị ọzọ na-akparị anyị ma ọ bụ mgbe ha na-eweso anyị iwe. Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.” Pọl mesiri ndụmọdụ a o nyere ike site n’ịgbakwụnye, sị: “Unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’”—Rom 12:18, 19.

11. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-ekwenyere Kraịst?

11 Anyị kwesịkwara ikwenyere ndị Chineke họpụtara n’ọgbakọ. Mkpughe isi mbụ kwuru na Kraịst Jizọs ji “kpakpando” nke ọgbakọ n’aka nri ya. (Mkpu. 1:16, 20) A pụrụ ikwu na “kpakpando” ndị a na-anọchi anya ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta, nọ n’ọgbakọ. Ndị nlekọta dị otú a na-ekwenyere nduzi Kraịst ma na-eṅomi ụzọ obiọma o si mesoo ndị ọzọ ihe. Ndị niile nọ n’ọgbakọ na-erube isi ná ndokwa Jizọs mere ka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” na-enye nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. (Mat. 24:45-47) Taa, njikere anyị dị ịmụ ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ a na ime ha na-egosi na anyị onwe anyị na-ekwenyere Kraịst, nke a sokwa eme ka anyị nwee udo ma dịrị n’otu.—Rom 14:13, 19.

Olee Ókè Anyị Ga-abụru Ndị Na-ekwenye Ekwenye?

12. Gịnị mere anyị agaghị ekwenye n’ihe niile?

12 Ma ịbụ ndị na-ekwenye ekwenye apụtaghị na anyị ga-emebi okwukwe anyị ma ọ bụ daa iwu Chineke. Olee ihe Ndị Kraịst oge mbụ mere mgbe ndị ndú okpukpe nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma n’aha Jizọs? Pita na ndịozi ndị ọzọ ji obi ike kwuo, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 4:18-20; 5:28, 29) N’otu aka ahụ taa, ọ bụrụ na ndị ọchịchị achọọ ịkwụsị anyị ikwusa ozi ọma, anyị agaghị ekwe, ihe anyị nwere ike ime bụ ịgbanwe ụzọ ndị anyị si ezisa ozi ọma iji nwee ike ijiri akọ nọgide na-eme ihe anyị na-eme. Ọ bụrụ na a sị anyị ekwusazịla ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị nwere ike ịchọta ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi na-agwa ndị mmadụ okwu ma nọgide na-arụ ọrụ Chineke nyere anyị. Ọ bụrụkwa na “ndị ọchịchị” agwa anyị ka anyị kwụsị inwe ọmụmụ ihe ọgbakọ, anyị na-eji akọ na-ezukọ n’obere ìgwè n’obere ìgwè.—Rom 13:1; Hib. 10:24, 25.

13. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ikwenyere ndị nọ n’isi?

13 N’Ozizi Elu Ugwu Jizọs, o kwuru ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-ekwenyere ndị nọ n’isi: “Ọ bụrụkwa na mmadụ achọọ ịkpụga gị n’ụlọikpe ka o wee nara gị uwe ime gị, hapụkwuoro ya uwe elu gị; ọ bụrụkwa na onye nwere ikike amanye gị ịga otu maịl, soro ya gaa maịl abụọ.” (Mat. 5:40, 41) * Ichebara ndị ọzọ echiche na ịdị njikere inyere ha aka ga-eme ka anyị gakwuo otu maịl dị ka a pụrụ isi kwuo ya.—1 Kọr. 13:5; Taị. 3:1, 2.

14. Gịnị mere anyị agaghị anwa anwa kwenyere ndị si n’ezi ofufe dapụ?

14 Ma anyị ekwesịghị ikwenyere ndị si n’ezi ofufe dapụ iji gosi na anyị na-ekwenye ekwenye. Anyị kwesịrị ịkwụsi ike mgbe ha bịara iji wee nwee ike ịhụ na a gwagbughị eziokwu ahụ nakwa iji wee hụ na ọgbakọ nọgidere na-adị n’otu. Pọl dere banyere “ụmụnna ụgha,” sị: “Anyị enyeghị ndị a ohere site n’ido onwe anyị n’okpuru ha, ee e, ọbụna ruo otu awa, ka eziokwu nke ozi ọma ahụ wee dịgide n’ebe unu nọ.” (Gal. 2:4, 5) Ọ bụrụ na e nwee ka onye si n’ezi ofufe dapụ si bịa iduhie ezi Ndị Kraịst, ha ga-akwụsi ike n’ihe ziri ezi.

Ndị Nlekọta Kwesịrị Ịbụ Ndị Na-ekwenye Ekwenye

15. Olee otú ndị okenye ọgbakọ ga-esi gosi na ha na-ekwenye ekwenye mgbe ha na-enwe nzukọ?

15 Otu n’ime ihe na-egosi na mmadụ ruru eru ịbụ onye nlekọta n’ọgbakọ bụ na onye ahụ ga-abụ onye na-ekwenye ekwenye. Pọl dere, sị: “Onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye . . . nwere ezi uche [ma ọ bụ onye na-ekwenye ekwenye].” (1 Tim. 3:2, 3) Nke a dị oké mkpa karịsịa mgbe ndị okenye ọgbakọ na-enwe nzukọ ha ji eleba anya ná mkpa ndị e nwere n’ọgbakọ. Tupu ha ekpebie ime ihe ọ bụla, a na-enye onye ọ bụla nọ ebe ahụ ohere ikwu nnọọ obi ya, ma nke a apụtaghị na okenye ọ bụla ga-ekwurịrị okwu. Mgbe ha na-akparịta ihe a ga-eme, mmadụ nwere ike ịgbanwe echiche ya n’ihi otú ndị ọzọ si webata ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ihe ahụ ha na-ekwu. Kama ịchọwa otú ọ ga-esi gbaa ihe ndị ọzọ kwuru ụkwụ ma ọ bụ siwe ọnwụ ka e mee ihe o chere, okenye tozuru okè na-ekwenye n’ihe ndị ọzọ kwuru. Ná mmalite, e nwere ike inwe echiche dịgasị iche, ma ikpe ekpere banyere okwu ahụ na-eme ka ndị okenye dị obi umeala ma na-ekwenye ekwenye, dịrịkwa n’otu.—1 Kọr. 1:10; Gụọ Ndị Efesọs 4:1-3.

16. Olee ụdị àgwà okenye ọgbakọ kwesịrị inwe?

16 Okenye ọgbakọ kwesịrị ịgbalị ịdị na-eme ihe niile ọ na-eme n’ụzọ Chineke si chọọ. O kwesịrị ịdị na-eme nke a ọbụna mgbe ọ na-elekọta atụrụ Chineke, nke a ga-enyere ya aka ịdị na-echebara ndị ọzọ echiche nakwa ịdị na-egosi ha obiọma. Pita dere, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha; ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya, kama n’ịnụ ọkụ n’obi.”—1 Pita 5:2.

17. Olee otú onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ pụrụ isi gosi na ya na-ekwenye ekwenye site n’otú o si emeso ndị ọzọ ihe?

17 Ndị merela agadi nọ n’ọgbakọ na-enwe obi ụtọ mgbe ndị ọzọ na-akatabeghị ahụ́ nọ n’ọgbakọ nyeere ha aka, nke a na-emekwa ka ha jiri ha kpọrọ ihe. Ndị na-eto eto n’onwe ha kwa na-akwanyere ndị nọterela aka n’ozi Jehova ùgwù. (1 Tim. 5:1, 2) Ndị okenye ọgbakọ na-achọpụta ụmụ nwoke ndị ruru eru n’ọgbakọ bụ́ ndị ha ga-enye ọrụ ụfọdụ, ha na-azụ ha ka ha ruo eruo ilekọta atụrụ Chineke. (2 Tim. 2:1, 2) Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl ji ike mmụọ nsọ nye, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha [na-ekwenyenụ ekwenye], n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.”—Hib. 13:17.

Otú Anyị Ga-esi Bụrụ Ndị Na-ekwenye Ekwenye n’Ezinụlọ Anyị

18. Gịnị mere o ji dị mma ka ndị nọ n’ezinụlọ na-ekwenye ekwenye?

18 Anyị kwesịkwara igosi na anyị bụ ndị na-ekwenye ekwenye n’ezinụlọ anyị. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:18-21.) Baịbụl kwuru ihe bụ́ ọrụ onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ Ndị Kraịst. Nna bụ isi nke nwunye ya bụrụkwa onye bụ́ isi ọ dị n’aka ịzụ ụmụ ya. Nwunye kwesịrị ịghọta na ọ bụ di ya bụ isi, ụmụaka kwesịkwara ịgbalị irube isi, nke a bụ́kwa ihe na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ pụrụ inye aka mee ka ezinụlọ ha dịrị n’otu ma dị n’udo site n’ịdị na-ekwenye ekwenye dị ka o kwesịrị. E nwere ụfọdụ ihe atụ ndị dị na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịkọwa nke a.

19, 20. (a) Olee ihe dị iche n’otú Ilaị si kwenyere ụmụ ya na otú Jehova si kwenyere mmụọ ozi ya? (b) Olee ihe ndị nne na nna nwere ike isi n’ihe atụ ndị a mụta?

19 Mgbe Samuel ka dị nnọọ obere, Ilaị bụ nnukwu onye nchụàjà n’Izrel. Ma, ụmụ Ilaị bụ́ Họfnaị na Finihas, “bụ ndị ikom na-abaghị n’ihe; ha amaghị Jehova.” Ilaị nụrụ akụkọ ọjọọ niile a na-akọ banyere ha, tinyere na ha na-edina ụmụ nwaanyị ndị na-eje ozi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Gịnị ka Ilaị mere? Ọ gwara ụmụ ya na ọ bụrụ na ọ bụ Jehova ka ha na-emehie megide, ọ dịghị onye ga-ekpechitere ha ekpere. Ma ọ basirighị ha mba ike ma nye ha ntaramahụhụ kwesịrị ihe ha mere. N’ihi ya, ụmụ Ilaị nọgidere na-eme ihe ọjọọ ha na-eme. N’ikpeazụ, Jehova kpebiri na ha kwesịrị ọnwụ. Mgbe Ilaị nụrụ na ụmụ ya anwụọla, ya onwe ya nwụkwara. Nke a dị nnọọ mwute! N’ezie, otú Ilaị si kwenyere ụmụ ya—ya bụ́, gba ha nkịtị ka ha nọgide na-eme ihe ọjọọ—adịghị mma.—1 Sam. 2:12-17, 22-25, 34, 35; 4:17, 18.

20 Tụlegodị otú dị iche Chineke si kwenyere ndị mmụọ ozi ya. Mịkaya onye amụma hụrụ ọhụụ dị ịrịba ama ebe ọ hụrụ Jehova na ndị mmụọ ozi Ya. Jehova jụrụ ndị mmụọ ozi ya onye n’ime ha nwere ike ịga rafuo Eze Ehab nke Izrel, ka o wee si otú ahụ laa eze ọjọọ ahụ n’iyi. Jehova gere ndị mmụọ ozi ya dị iche iche ntị mgbe ha na-ekwu otú ha ga-esi eme ya. Otu mmụọ ozi pụtaziri kwuo na ya ga-eme ya. Jehova jụrụ ya otú ọ chọrọ isi mee ya. Ihe o kwuru juru Jehova afọ, ọ gwakwara ya ka ọ gaa mee ihe o kwuru. (1 Eze 22:19-23) Ọ̀ bụ na ndị ezinụlọ dị iche iche apụghị isi n’akụkọ a mụta mkpa ọ dị ikwenye ekwenye? Ọ ga-adị mma ma Onye Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nna chebara aro nwunye ya na ụmụ ya tụrụ echiche. N’aka nke ọzọ, ndị nwunye na ụmụaka kwesịrị ịmara na ọ bụrụ na ha atụsịa aro ha, ha kwesịrị ikwenye ná mkpebi nna ha mere bụ́ onye Akwụkwọ Nsọ nyere ikike ime mkpebi ikpeazụ.

21. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Obi dị anyị nnọọ ụtọ na Jehova ji ịhụnanya na amamihe na-echetara anyị mkpa ọ dị ịbụ ndị na-ekwenye ekwenye. (Ọma 119:99) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú ịbụ ndị na-ekwenye ekwenye dị ka o kwesịrị ga-esi mee ka di na nwunye nwekwuo ọṅụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 E nweghị otu mkpụrụ okwu nke a pụrụ iji sụgharịa nnọọ kpọmkwem okwu Pọl onyeozi ji mee ihe n’ebe a. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ọ pụtara bụ mmadụ ịghara isi ọnwụ inweta ihe ruuru ya, ọ pụtakwara mmadụ ichebara ndị ọzọ echiche nakwa iji obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe.” Ya mere, otu ihe okwu ahụ pụtara bụ mmadụ ikwenye ekwenye na inwe ezi uche, mmadụ ịghara isi ọnwụ ịhụ na e mezuru ihe niile e dere n’iwu ma ọ bụ na-achọ mgbe niile ka e mee ihe otú o si chọọ.

^ par. 13 Lee isiokwu bụ́ “Ọ bụrụ na A Manye Gị Ịrụ Ọrụ,” n’Ụlọ Nche nke February 15, 2005, peeji nke 23-26.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ezi ihe ịbụ ndị na-ekwenye ekwenye nwere ike ịrụpụta?

• Olee otú ndị okenye ọgbakọ pụrụ isi gosi na ha na-ekwenye ekwenye?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị ezinụlọ na-ekwenyere ibe ha?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 4]

Ndị okenye na-eṅomi ụzọ obiọma Jizọs si emeso ndị ọzọ ihe

[Foto dị na peeji nke 6]

Mgbe ndị okenye ọgbakọ na-enwe nzukọ ha, ikpe ekpere na ịbụ ndị na-ekwenye ekwenye na-eme ka ha dị n’otu