Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwee Ọṅụ n’Alụmdi na Nwunye Gị

Nwee Ọṅụ n’Alụmdi na Nwunye Gị

Nwee Ọṅụ n’Alụmdi na Nwunye Gị

“a ga-eji amamihe wulite ezinụlọ, a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike.”—ILU 24:3.

1. Olee otú Chineke si gosipụta amamihe ya mgbe o kere nwoke mbụ ahụ?

NNA anyị nke eluigwe, bụ́ onye nwere amamihe, maara ihe ndị dị anyị mma. Dị ka ihe atụ, Chineke maara na ka nzube Ya wee nwee ike imezu, “ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya” n’ogige Iden. Otu ihe dị mkpa mere o ji kwuo nke a bụ na o zubere ka di na nwunye mụọ ụmụ ma “jupụta ụwa.”—Jen. 1:28; 2:18.

2. Olee ndokwa Jehova mere maka abamuru ụmụ mmadụ?

2 Jehova kwuru, sị: “M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.” Chineke meziri ka oké ụra buru nwoke mbụ ahụ ma si n’ahụ́ ya zuru okè wepụta otu ọgịrịga jiri ya kpụọ nwaanyị. Mgbe Jehova kpọtaara Adam nwaanyị a zuru okè bụ́ Iv, Adam kwuru, sị: “Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m na anụ ahụ́ nke si n’anụ ahụ́ m. A ga-akpọ onye a Nwaanyị, n’ihi na e si n’ahụ́ nwoke wepụta ya.” Iv mere n’ezie ka Adam zuo ezuo. Onye ọ bụla n’ime ha nwere ihe e ji mara ya na àgwà nke ya, ma ha abụọ zuru okè e kekwara ha n’onyinyo Chineke. Jehova si otú a hiwe alụmdi na nwunye mbụ. Adam na Iv jiri nnọọ obi ọcha ha nabata ndokwa a Chineke mere bụ́ nke ga-eme ka ha na-enyerịtara ibe ha aka.—Jen. 1:27; 2:21-23.

3. Olee otú ọtụtụ ndị si ele alụmdi na nwunye anya, oleekwa ajụjụ ndị nke a na-ewelite?

3 Ọ dị mwute na mmụọ nke nnupụisi bịaziri jupụta n’ụwa taa. Ọ bụghị Chineke na-akpata nsogbu ndị na-esi na ya apụta. Ọtụtụ ndị adịghị akwanyere alụmdi na nwunye Chineke hiwere ùgwù, ha na-ele ya anya dị ka ihe mgbe ochie na ihe na-akpata obi mgbawa ma ọ bụ esemokwu. Ọtụtụ ndị lụrụ alụ na-agbakarịkwa alụkwaghịm. A naghị egosi ụmụaka ịhụnanya, ụfọdụ na-elekwa ha anya dị ka ihe ha ga-eji napụta di ma ọ bụ nwunye ha ego mgbe e nwere nsogbu. Ọtụtụ ndị nne na nna adịghị ekwe ekwe, ọbụna mgbe ha kwesịrị ikwenyere ibe ha ka udo wee dị. (2 Tim. 3:3) Oleezi otú di na nwunye ga-esi nọgide na-enwe ọṅụ n’oge a dị oké egwu? Olee otú ikwenye ekwenye pụrụ isi nyere di na nwunye aka izere ihe ọ bụla ga-etisasi ha? Olee ihe anyị pụrụ ịmụta n’aka ndị di na nwunye ka na-enwe ọṅụ taa?

Ikwenyere Nduzi Jehova

4. (a) Olee ntụziaka Pọl nyere banyere alụmdi na nwunye? (b) Olee otú Ndị Kraịst na-erube isi si agbaso ntụziaka a Pọl nyere?

4 Site n’ike mmụọ nsọ, Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi gwara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na ọ bụrụ na ha chọrọ ịlụgharị di, ha kwesịrị ịlụ “naanị n’ime onyenwe anyị.” (1 Kọr. 7:39) Nke a abụghịrị Ndị Kraịst na-ekpebu okpukpe ndị Juu ntị ọhụrụ. Iwu Chineke nyere ndị Izrel gwara ha hoo haa ka ha na mba ndị na-ekpere arụsị gbara ha gburugburu ghara ịlụrịta mgbe ọ sịrị ka ha ghara ‘ịkpọrọ nwa ha nwaanyị kpọnye nwa ha nwoke, ma ọ bụ lụtara nwa ha nwoke nwa ha nwaanyị.’ Jehova kwukwara ihe ga-eme ma e leghara iwu a o nyere anya. “N’ihi na ọ ga-eme ka nwa gị nwoke kwụsị iso m, ha ga-efekwa chi ọzọ dị iche iche; Jehova ga-ewesokwa unu iwe dị ọkụ, ọ ga-alakwa gị n’iyi ọsọ ọsọ.” (Diut. 7:3, 4) Gịnị ka Jehova na-atụ anya ka ndị ohu ya nke oge a mee n’okwu a? O doro anya na ohu Chineke kwesịrị ịlụ “n’ime Onyenwe anyị,” ya bụ, onye ya na ya na-efekọ Jehova, nke raara onwe ya nye e mekwara baptizim. Ikwenyere nduzi Jehova n’okwu a bụ ihe amamihe dị na ya.

5. Olee otú Jehova na ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst si ele nkwa di na nwunye kwere onwe ha n’ụbọchị ha lụrụ anya?

5 Chineke weere nkwa di na nwunye kwere onwe ha n’ụbọchị ahụ ha lụrụ dị ka ihe dị nsọ. Mgbe Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs na-ekwu okwu banyere alụmdi na nwunye mbụ ahụ, ọ sịrị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:6) Ọbụ abụ ahụ chetaara anyị na anyị ekwesịghị iji nkwa anyị kwere gwurie egwu mgbe ọ sịrị: “Chụọrọ Chineke ekele dị ka àjà gị, nyekwa Onye Kasị Elu ihe ndị i kwere ya ná nkwa.” (Ọma 50:14) Ọ bụ ezie na di na nwunye nwere ike inwe ọṅụ dị ukwuu ma ha lụọ, nkwa ahụ ha kwere onwe ha n’ụbọchị ahụ ha gbara akwụkwọ abụghị ihe a ga-eji egwuri egwu, ha kwesịkwara ịgbali imezu nkwa ha.—Diut. 23:21.

6. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe Jefta mere?

6 Tụlee ihe banyere Jefta bụ́ onye jere ozi dị ka onyeikpe n’Izrel na narị afọ nke iri na abụọ T.O.A. O kwere Jehova nkwa, sị: “Ọ bụrụ na i nyefee ụmụ Amọn n’aka m, ọ ga-erukwa na onye ọ bụla pụtaranụ, onye si n’ọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m si n’ebe ụmụ Amọn nọ lọta n’udo, ga-aghọ nke Jehova, m ga-achụ onye ahụ dị ka àjà nsure ọkụ.” Mgbe ọ hụrụ na ọ bụ ada ya, bụ́ naanị nwa o nwere, pụtara ịbịa zute ya mgbe ọ lọrutere n’ụlọ ya dị na Mizpa, Jefta ọ̀ gbalịrị ịchọ ihe ọ ga-eji ghara imezu nkwa ya? Mba. Ọ sịrị: “Mụ onwe m emegheworo Jehova ọnụ m, enweghịkwa m ike ịgbanwe ihe m kwuru.” (Ikpe 11:30, 31, 35) Jefta mezuru nkwa o kwere Jehova, n’agbanyeghị na nke a ga-eme ka ámá ya chie. Nkwa Jefta kwere na nkwa di na nwunye na-ekwe onwe ha n’ụbọchị ha lụrụ abụghị otu, ma otú o si mezuo ihe o kwere ná nkwa bụụrụ ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ezi ihe nlereanya.

Gịnị Na-eme Ka Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma?

7. Olee mgbanwe ndị ọ dị mkpa ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ mee?

7 Ọtụtụ ndị di na nwunye na-enwe nnọọ obi ụtọ ma ha cheta otú ọ dị ha mgbe ahụ ha malitere ịhụ onwe ha n’anya tupu ha alụọ. O nyere ha nnọọ obi ụtọ ịmata ụdị mmadụ onye ha na-achọ ịlụ bụ! Ka ha na-ahụkwu onwe ha, otú ahụ ka ha na-amatatụkwu onwe ha karị. Ma hà lụrụ mgbe ha matatụchara onwe ha ma ọ̀ bụ mmadụ hụtaara ha onye ha lụrụ, mgbe ọ bụla ha lụrụ, ọ na-adị oké mkpa na ha ga-eme mgbanwe ụfọdụ. Otu di kwuru ihe gosiri na nke a bụ eziokwu, si: “Nsogbu bụ́ isi anyị nwere mgbe anyị ka lụrụ ọhụrụ bụ ịmata na anyị anọghịzi naanị anyị. O sitụụrụ anyị ike ịmata oge anyị na ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị ga na-anọru.” Nwoke ọzọ lụrụla nwaanyị ruo iri afọ atọ ugbu a ghọtara ná mmalite na ya agaghị na-echezi naanị banyere onwe ya. Tupu ya ekweta ịza òkù ọ bụla a kpọrọ ha ma ọ bụ kweta ime ihe ụfọdụ, ọ na-ebu ụzọ kọọrọ nwunye ya ma kpebizie ihe ga-adị ha abụọ mma. N’oge dị otú a, ịbụ onye na-ekwenye ekwenye na-enye aka.—Ilu 13:10.

8, 9. (a) Olee ihe mere o ji dị mkpa ka di na nwunye na-agwarịta ibe ha ihe dị ha n’obi? (b) Olee ihe ndị ọ dị mkpa ka a ghara isiwe ọnwụ na ha, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

8 Mgbe ụfọdụ, mmadụ abụọ na-esighị n’otu ebe nwere ike ịlụ. Mgbe ọ dị otú a, ọ na-adị nnọọ mkpa ka ha abụọ na-agwa ibe ha ihe dị ha n’obi mgbe niile. Ndị mmadụ nwere ụzọ dị iche iche ha si eme ka a mara ihe dị ha n’obi. Ịchọpụta otú di gị ma ọ bụ nwunye gị si agwa ndị ikwu ya okwu ga-enyere gị aka ịghọtakwu ụdị onye ọ bụ. Mgbe ụfọdụ, ọ bụghị ihe onye ahụ kwuru kama otú o si kwuo ya ga-enyere gị aka ịghọta ihe dị ya n’obi. I nwekwara ike isi n’ihe ndị dị ya n’obi ghọta ọtụtụ ihe. (Ilu 16:24; Kọl. 4:6) Nghọta dị oké mkpa iji nwee obi ụtọ.—Gụọ Ilu 24:3.

9 Mgbe a bịara n’ịhọrọ ụdị ihe a ga-eji atụrụ ndụ, ọtụtụ achọpụtala na ọ dị mkpa ịghara isiwe ọnwụ. O nwere ike ịbụ na tupu unu alụọ, e nwere ụdị egwuregwu ma ọ bụ ihe ntụrụndụ na-amasị di gị ma ọ bụ nwunye gị. Ùnu nwere ike imetụ mgbanwe ụfọdụ? (1 Tim. 4:8) E kwesịkwara ime otu ihe a mgbe a bịara n’oge unu ji eso ndị ikwu unu anọkọ. O doro anya na di na nwunye kwesịrị iwepụta oge iji nwee ike imekọ ihe ndị metụtara ofufe Jehova na ihe ndị ọzọ ọnụ.—Mat. 6:33.

10. Olee otú mmadụ ịghara ịchọ ka okwu na-ebi n’ọnụ ya si eme ka udo dị n’etiti ndị nne na nna na ụmụ ha ndị lụrụla di ma ọ bụ nwunye?

10 Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ọ na-ahapụ nna ya na nne ya, otú ahụkwa ka ọ dị nwaanyị. (Gụọ Jenesis 2:24.) Ma, na mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye apụtaghị na o kwesịghịzi idebe iwu ahụ Chineke nyere ka a na-asọpụrụ ndị nne na nna. N’ihi ya, ọbụna mgbe ha lụchara, ha ka nwere ike iso ndị mụrụ ha na ndị ọgọ ha nọrịa. Otu nwoke lụrụla nwaanyị kemgbe afọ iri abụọ na ise kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike mmadụ ime ihe ga-amasịcha nwunye ya, ndị mụrụ ya, ụmụnne ya, na ndị ọgọ ya mgbe niile. Ihe e dere na Jenesis 2:24 enyerela m aka ịma ihe m ga-eme. Onye ọ bụla kwesịrị ilekọta ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ ma amaokwu Baịbụl a gosiri na mmadụ kwesịrị ilebara nwunye ya anya karịsịa.” N’ihi ya, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-adịghị achọ ka okwu bie n’ọnụ ha na-aghọta na ụmụ ha ndị lụrụla di ma ọ bụ nwunye enweela ezinụlọ ọzọ nke ọ bụzi di ka ọ dị n’aka iduzi ihe ga na-eme na ya.

11, 12. Olee ihe mere ịmụkọ Baịbụl ọnụ na ikpekọ ekpere ọnụ ji dị di na nwunye mkpa?

11 Ọ dị oké mkpa ka ezinụlọ na-amụchi Baịbụl anya. Ahụmahụ ọtụtụ ezinụlọ Ndị Kraịst nwerela gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọ naghị adịcha mfe ịmalite ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ ma ọ bụ ịnọgide na-enwe ya. Otu onyeisi ezinụlọ kwuru, sị: “A sị anyị bidoghachi alụmdi na nwunye anyị n’isi, otu ihe anyị ga-achọ ịhụ na anyị meziri bụ ịmalite ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ anyị ozugbo anyị lụchara.” O kwukwara, sị: “Ọ na-enye m nnọọ obi ụtọ ịhụ ụdị ọṅụ nwunye m na-enwe mgbe ọ chọpụtara uru ụkpụrụ Baịbụl ụfọdụ anyị hụrụ mgbe anyị na-amụkọ ihe ọnụ bara.”

12 Ihe ọzọ na-enye aka bụ ikpekọ ekpere ọnụ. (Rom 12:12) Mgbe di na nwunye na-efekọ Jehova ọnụ, mmekọrịta ha na Chineke pụrụ ime ka alụmdi na nwunye ha bụrụ a kwaa akwụrụ. (Jems 4:8) Otu di bụ́ Onye Kraịst kwuru, sị: “Ịrịọ mgbaghara ngwa ngwa mgbe anyị mejọrọ ibe anyị na ịkpọtụ ihe ndị ahụ kpasuru onye nke ọzọ iwe aha mgbe anyị na-ekpekọ ekpere bụ ụzọ anyị si egosi na ihe ahụ anyị mejọrọ wutere anyị, ọ bụrụgodị na ihe ahụ kpasuru ya iwe adịghị ihe ọ bụ.”—Efe. 6:18.

Bụrụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye Na-ekwenye Ekwenye

13. Olee ndụmọdụ Pọl nyere n’ihe banyere mmekọahụ n’etiti di na nwunye?

13 Ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị izere ụdị omume ndị na-emetọ alụmdi na nwunye nke ụfọdụ n’ime ha bụ ụdị àgwà juru ebe niile n’ụwa a ara mmekọahụ na-agba. Pọl nyere ndụmọdụ banyere nke a, sị: “Ka di na-enye nwunye ya ihe ruuru ya; ka nwunye na-emekwara di ya otú ahụ. Ọ bụghị nwunye na-achị ahụ́ ya, kama ọ bụ di ya; otú ahụkwa, ọ bụghị di na-achị ahụ́ ya, kama ọ bụ nwunye ya.” Pọl nyeziri ntụziaka doro anya, sị: “Unu ajụla inye ya ibe unu, ọ gwụla ma ùnu kwekọrịtara maka oge a kara aka.” N’ihi gịnị ka ha ji kwesị ime nke a? “Ka unu wee tinye oge n’ikpe ekpere wee nọkọọ ọzọ, ka Setan wee ghara ịnọ na-anwa unu ọnwụnwa maka na unu enweghị ike ịchịkwa onwe unu.” (1 Kọr. 7:3-5) Pọl kpọtụrụ ekpere aha ebe a iji gosi ihe Onye Kraịst kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ ya. Ma o mekwara ka o doo anya na Onye Kraịst bụ́ di ma ọ bu nwunye kwesịrị ilebara mkpa anụ ahụ́ nke onye ọ lụrụ anya ma wepụtakwa oge soro ya na-anọkọ.

14. Olee otú ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ si enye aka n’ihe banyere mmekọahụ n’etiti di na nwunye?

14 Di na nwunye kwesịrị ịdị na-agwarịta ibe ha eziokwu, ha kwesịkwara ịdị na-aghọta na ịghara ịdị nro mgbe a bịara n’ihe banyere mmekọahụ na-ebute nsogbu. (Gụọ Ndị Filipaị 2:3, 4; tụlee Matiu 7:12.) Nke a na-emekarị n’ezinụlọ ebe di na nwunye na-adịghị ekpe otu okpukpe. Ọ bụrụgodị na e nwee nsogbu, di ma ọ bụ nwunye bụ́ Onye Kraịst pụrụ idozi nsogbu ahụ site n’àgwà ọma ya, obiọma ya, na ikwenyere di ma ọ bụ nwunye ya. (Gụọ 1 Pita 3:1, 2.) Ịhụnanya di na nwunye nwere n’ebe Jehova nọ na nke ha nwere n’etiti onwe ha, na njikere ha dị ikwenyere ibe ha, ga-enyere ha aka ịghara inwe nsogbu mgbe a bịara n’ihe banyere mmekọahụ.

15. Olee otú nkwanye ùgwù si eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ?

15 Mgbe a bịakwara n’ihe ndị ọzọ, di nwere obiọma ga-akwanyere nwunye ya ùgwù. Dị ka ihe atụ ọ ga na-echebara ihe ndị nwunye ya nwere ikwu echiche, ọbụna n’ihe ndị na-adịghị oké mkpa. Otu nwoke lụrụla nwaanyị kemgbe iri afọ anọ na asaa kwuru, sị: “Aka m na-amụ otú m ga-esi na-echebara nwunye m echiche.” A gwara Ndị Kraịst bụ́ nwunye ka ha na-akwanyere di ha ùgwù nke ukwuu. (Efe. 5:33) Nwaanyị na-akatọkarị di ya ma ọ bụ na-agbakarị mmejọ di ya n’anwụ n’ihu ndị ọzọ, adịghị akwanyere di ya ùgwù. Ilu 14:1 na-echetara anyị, sị: “Nwaanyị nke maara ihe n’ezie ewulitewo ụlọ ya, ma nwaanyị nzuzu na-eji aka ya akwatu ya.”

Unu Ekwenyerela Ekwensu

16. Olee otú di na nwunye pụrụ isi mee ihe e dere ná Ndị Efesọs 4:26, 27?

16 “Weenụ iwe, ma unu emehiela; unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara, unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Efe. 4:26, 27) Ọ bụrụ na di na nwunye emee ihe a e kwuru ebe a, ọ ga-enyere ha aka idozi nsogbu biliterenụ, ma ọ bụdị mee ka nsogbu ghara ibilite ebilite. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Echeghị m na ọ dịtụla mgbe mụ na di m nwere nghọtahie anyị aghara ịgbalị idozi ya ọ bụrụgodị na ọ ga-ewe ọtụtụ awa iji dozie ya.” Malite mgbe ha lụrụ ọhụrụ, ya na di ya kpebiri na ha agaghị ekwe ka otu ụbọchị gafee n’edozighị nghọtahie ọ bụla ha nwere. O kwuru, sị: “Anyị kpebiri na ihe ọ sọkwara nsogbu ahụ bụrụ, anyị ga na-agbaghara ibe anyị ma ghara ikwe ka nsogbu ọ bụla bọọ chi.” Ha si otú a ghara ‘inye Ekwensu ohere.’

17. A sịgodị na ihe anaghị adabachara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị, gịnị nwere ike inyere unu aka?

17 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị lụrụ onye ihe na-adịghị adabachara gị na ya? I nwere ike ịchọpụta na alụmdi na nwunye gị adịghị atọ gị ụtọ otú o si atọ ndị ọzọ. Ma icheta otú Onye Okike si ele alụmdi na nwunye anya ga-enyere gị aka. Pọl gwara Ndị Kraịst site n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Hib. 13:4) E kwesịghịkwa ichefu ihe ọzọ e kwuru na Baịbụl, nke bụ́: “Ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ, a pụghị ịdọbi ya ngwa ngwa.” (Ekli. 4:12) Ọ bụrụ na di na nwunye ebute ido aha Jehova nsọ ụzọ ná ndụ ha, mmekọrịta dị n’etiti ha ga-esi ike, ha na Chineke ga-adịkwa nnọọ ná mma. Ha kwesịrị ịgbalịsi ike ịhụ na alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma na-amara na ime otú ahụ ga na-ewetere Jehova bụ́ Onye hiwere alụmdi na nwunye, otuto.—1 Pita 3:11.

18. Gịnị ka obi pụrụ isi anyị ike na o nwere ike ime n’alụmdi na nwunye?

18 N’ezie ọ ga-ekwe omume di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ịnọgide na-enwe ọṅụ. Ma ọ chọrọ mgbalị, chọọkwa ka onye ọ bụla na-akpa àgwà e ji mara Ndị Kraịst, nke otu n’ime ya bụ ikwenye ekwenye. Taa, n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị gburugburu ụwa, e nwere ọtụtụ ndị di na nwunye na-egosi na ọ ga-ekwe omume di na nwunye ịnọgide na-enwe ọṅụ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Gịnị mere o ji bụrụ ihe ga-ekwe omume di na nwunye ịnọgide na-enwe ọṅụ?

• Gịnị ga-enyere di na nwunye aka inwe ihe ịga nke ọma?

• Olee àgwà ndị di na nwunye kwesịrị ịmụta?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Di na nwunye kwesịrị ikwurịta ma hà ga-aga òkù a kpọrọ ha ma ọ bụkwanụ tupu ha ekweta iyi agba ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 10]

Unu ekwela ka nghọtahie ọ bụla unu nwere bọọ chi, ka unu ghara ‘inye Ekwensu ohere.’