Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Nwere Onye Mụ na Ya Yiri Agba Dị Ezigbo Mkpa

O Nwere Onye Mụ na Ya Yiri Agba Dị Ezigbo Mkpa

O Nwere Onye Mụ na Ya Yiri Agba Dị Ezigbo Mkpa

O NWERE onye mụ na ya yiri agba dị ezigbo mkpa. Ka m kọọrọ gị ihe mere mụnwa bụ́ nne na-akatabeghị ahụ́ nke si Spain ji yie agba a.

Udo adịghị n’ezinụlọ ndị mụrụ m. Obi gbawara anyị mgbe nwanne m nwoke nke nta nwụrụ n’ihe ọghọm mgbe ọ dị afọ anọ. Tụkwasị na nke a, àgwà ọjọọ papa m na-akpa mere ka mama m ghara inwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. Ma nsogbu a emeghị ka mama m hapụ ịkụziri mụ na nwanne m nwoke nke tọrọ m otú e si akpa àgwà ọma.

Ka oge na-aga, nwanne m nwoke ahụ lụrụ nwaanyị, mụ onwe m alụọkwa di. Ọ dịghị anya, mama m arịawa ọrịa kansa, bụ́ nke mesịrị gbuo ya. Ma tupu ya anwụọ, o nyere anyị otu ihe dị oké ọnụ ahịa.

E nwere otu enyi ya ziri ya ozi ọma banyere olileanya mbilite n’ọnwụ nke dị n’Akwụkwọ Nsọ, mama m kwetakwara ịmụ Baịbụl. Tupu ya anwụọ, ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl mere ka o nwee olileanya ma nyere ya aka inwe obi ụtọ.

Mgbe mụ na nwanne m nwoke hụrụ otú ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl si mee ka o nwee obi ụtọ, anyị malitekwara ịmụ Okwu Chineke. E mere m baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova mgbe ọ fọrọ otu ọnwa ka m mụọ nwa m nke abụọ, bụ́ ọmarịcha nwa m nke anyị gụrụ Lucía.

Ụbọchị e mere m baptizim bụụrụ m ụbọchị pụrụ iche. Otu ihe mere m ji were ya otú ahụ bụ na o mere ka m bụrụzie nke Jehova, ebe ọ bụ na ararala m onwe m nye ya ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ọzọ mere m ji nwee obi ụtọ bụ na ugbu a enwere m ike ịkụziri ụmụ m abụọ m hụrụ n’anya ihe Baịbụl na-ekwu.

Ma n’oge na-adịghị anya, e nwere otu ihe merenụ nke mebiri ihe nke abụọ ahụ na-enye m obi ụtọ. Mgbe Lucía dị afọ anọ, afọ malitere igbusi ya mgbu ike. Mgbe e lesịrị ya ahụ́ ọtụtụ ugboro, dọkịta chọpụtara na e nwere ihe ha ka otu isi oroma toro n’imeju ya. Dọkịta ahụ kọwara na ọ bụ ọrịa kansa toro ihe ahụ n’imeju ya, nakwa na ọ ga na-eto na-aga n’ihu. Otú a ka Lucía si malite ọrịa ọ rịara afọ asaa, nke mekwara ka ọ na-anọ n’ụlọ ọgwụ ruo ogologo oge.

Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà

N’afọ ndị ahụ tara akpụ, Lucía na-adị na-eme m obi ụtọ site n’ịmakụ m na isusu m ọnụ iji gbaa m ume ma mesie m obi ike. Otú o sikwa were ọrịa ya ahụ masịrị ndị niile na-arụ n’ụlọ ọgwụ ebe ọ nọrọ. Ọ na-adị njikere inyere ndị nọọsụ aka iwegara ụmụaka ndị ọzọ ahụ́ na-adịghị nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ ihe ndị dị ka yogọt na juus. Ndị nọọsụ nyedịrị Lucía otu uwe ọrụ ha na baajị na-egosi na ọ bụ “onye na-enyere ndị nọọsụ aka.”

Otu n’ime ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ebe Lucía nọrọ kwuru, sị: “Omume Lucía metụrụ m nnọọ n’ahụ́. Ọ bụ nwa dị gara gara, nwee ọgụgụ isi, ise ihe na-amasịkwa ya. Ọ na-ekwukwa nnọọ obi ya, ọ na-akpakwa àgwà ka okenye.”

Okwu Chineke Lucía na-agụ na-agba ya ume na-emekwa ka obi ruo ya ala. (Hib. 4:12) O kwenyesiri ike n’ihe Okwu Chineke kwere ná nkwa na n’ime ụwa ọhụrụ, “ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpu. 21:4) O nwere nnọọ mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, ọ na-ejikwa ohere ọ bụla dapụtaranụ agwa ha ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụ obi ike Lucía nwere na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nyeere ya aka ịnọgide na-enwe obi iru ala na ihu ọchị n’agbanyeghị na o yiri ka ọ gaghị agbake n’ọrịa ahụ. (Aịza. 25:8) Ọ nọgidere na-enwe obi ụtọ ruo ụbọchị ọrịa kansa ahụ gburu ya.

Ọ bụ n’ụbọchị ahụ Lucía nwụrụ ka m yiri agba ahụ dị ezigbo mkpa. O siiri Lucía ike imeghe anya ya. Nna ya ji ya n’otu aka ebe m ji ya n’aka ya nke ọzọ. Anọ m na-agwa ya, sị: “Enyela onwe gị nsogbu, agaghị m ahapụ gị. Jiri nwayọọ nwayọọ na-eku ume. Mgbe ị ga-eteta, ahụ́ ga-adị gị. Ị gaghịzịkwa ata ụdị ahụhụ a, m ga-anọkwa n’akụkụ gị oge ahụ.”

Mụ na ya eyiela agba, aga m ahụkwa na m mezuru nkwa m. Ama m na ọ gaghị adị mfe ichewe ruo mgbe m ga-ahụ ya. Ma amakwa m na ọ bụrụ na m tụkwasị Jehova obi ma jiri ndidi na-echere ya, ma nọgide na-ejere ya ozi, aga m anọ ya mgbe a ga-akpọlite nwa m n’ọnwụ.

Ihe Lucía Hapụụrụ Anyị

Otú Lucía si gosi obi ike, na otú ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ si kwadoo anyị metụrụ nnọọ di m, bụ́ onye na-abụghị Onyeàmà Jehova, n’ahụ́. N’ụbọchị ahụ Lucía nwụrụ, ọ gwara m na ya na-aga ichebara onwe ya echiche. Mgbe izu ole na ole gasịrị, ọ gwara otu okenye n’ọgbakọ anyị ka ọ bịa mụwara ya Baịbụl. Ọ dịghị anya di m amalite ịgazu ọmụmụ ihe anyị niile. Jehova nyeere ya aka ịkwụsị ise sịga, nke bụ́ ihe ọ na-enwebeghị ike ịkwụsị kemgbe.

Echefuchabeghị m ọnwụ Lucía kpamkpam, ma ana m ekele Jehova maka ihe Lucía hapụụrụ anyị. Mụ na di m na-ejizi olileanya mbilite n’ọnwụ akasirịta onwe anyị obi, anyị na-eji uche anyị na-ahụ ka anyị na Lucía nọkọtara ọzọ—anya ya na-egbukepụ egbukepụ, na otú ntì ya si arụba n’ime ma ọ na-amụmụ ọnụ ọchị.

E nwere otu onye agbata obi anyị ihe mere Lucía metụrụ nnọọ n’ahụ́. N’ụtụtụ otu ụbọchị Saturday mmiri na-ezo, otu nwaanyị nwa ya nwoke gara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ebe Lucía naara aga bịara n’ụlọ anyị. Otu ọrịa ahụ gburu Lucía gbukwara nwa ya nwoke ọzọ dị afọ iri na otu. Mgbe ọ nụrụ ihe mere Lucía, nwaanyị ahụ jụtara ebe anyị bi ma bịa ileta anyị. Ọ chọrọ ịma otú m si na-edi ọnwụ Lucía ma tụọkwa aro ka mụ na ya hiwe otu òtù ga na-akasị ndị nne ụdị ọrịa a gburu ụmụ ha obi.

A gwara m ya na otu n’ime ihe kasiri m obi bụ otu n’ime nkwa Chineke kwere na Baịbụl, nke karịrị nnọọ nkasi obi mmadụ ọ bụla nwere ike inye. Obi tọrọ ya ụtọ mgbe m gụụrụ ya okwu Jizọs bụ́ nke e dekọrọ ná Jọn 5:28, 29. O kwere ka a mụwara ya Baịbụl, ọ dịghịkwa anya ya enweta “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Fil. 4:7) Ọtụtụ mgbe, mgbe m na-amụrụ ya Baịbụl, anyị na-akwụsịtụ ma chewe otú ọ ga-adị anyị n’ụwa ọhụrụ ahụ mgbe anyị ga-anabata ndị anyị hụrụ n’anya a kpọlitere n’ọnwụ.

Ọ bụ eziokwu na Lucía adịteghị ndụ aka, ọ hapụụrụ anyị ihe ga-adịru mgbe ebighị ebi. Okwukwe ya emeela ka ezinụlọ anyị niile na-ejere Chineke ozi, o mekwaala ka m kpebisikwuo ike ịnọgidesi ike n’okwukwe. Obi abụọ adịghị ya na anyị niile bụ́ ndị nwere onye anyị hụrụ n’anya e nwere ike isi n’ọnwụ kpọlite nwere agba dị mkpa anyị ga-edebe.

[Foto dị na peeji nke 20]

Foto paradaịs Lucía sere