Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye na Ịzụ Ụmụ n’Oge Ikpeazụ A

Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye na Ịzụ Ụmụ n’Oge Ikpeazụ A

Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye na Ịzụ Ụmụ n’Oge Ikpeazụ A

“Oge fọdụrụ dị ntakịrị.”—1 KỌR. 7:29.

1. (a) Olee ihe ndị na-eme n’oge a so n’ihe ndị ‘tara akpụ’? (b) Gịnị mere otú ihe banyere ezinụlọ si na-agbanwe ji eche anyị uche?

OKWU Chineke buru amụma na a ga-enwe agha, ala ọma jijiji, ụkọ nri, na ọrịa na-efe efe ‘n’oge ikpeazụ’ a. (Dan. 8:17, 19; Luk 21:10, 11) Baịbụl dọkwara aka ná ntị na a ga-enwe ọtụtụ mgbanwe n’oge a dị oké egwu ná ndụ ụmụ mmadụ. Nsogbu ezinụlọ ga-eso n’ihe ndị ‘tara akpụ n’oge ikpeazụ a dị oké egwu.’ (2 Tim. 3:1-4) Gịnị mere mgbanwe ndị a ji eche anyị uche? Ọ bụ n’ihi na ha zuru ebe niile ma dị nnọọ njọ nke na ha nwere ike ịgbanwe otú Ndị Kraịst si ele alụmdi na nwunye na ịzụ ụmụ anya. Olee otú nke a pụrụ isi mee?

2. Olee otú ụwa si ele alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm anya?

2 Taa, ọ na-adịziri ndị mmadụ mfe ịgba alụkwaghịm, o zukwara ebe niile, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm n’ọtụtụ mba na-arịkwa elu. Ma, anyị kwesịrị ịghọta nke ọma na Jehova Chineke na-ele alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm anya n’ụzọ dị nnọọ iche n’otú ọtụtụ ndị si ele ya anya n’ụwa taa. Olee otú Jehova si ele okwu a anya?

3. Olee otú Jehova na Jizọs Kraịst si ele alụmdi na nwunye anya?

3 Jehova Chineke na-atụ anya ka ndị lụrụ di na nwunye mezuo nkwa ha kwere onwe ha mgbe ha lụrụ. Mgbe o jikọrọ nwoke mbụ na nwaanyị mbụ ka ha bụrụ di na nwunye, Jehova kwuru na ‘nwoke ga-arapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’ Jizọs Kraịst mechara kwughachi nke a ma gbakwụnyezie, sị: “Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” Jizọs kwukwara, sị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.” (Jen. 2:24; Mat. 19:3-6, 9) N’ihi ya, Jehova na Jizọs na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka ihe e kwesịrị ịnọgide na ya ruo mgbe di ma ọ bụ nwunye nwụrụ. (1 Kọr. 7:39) Ebe alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ, e kwesịghị ile ịgba alụkwaghịm anya dị ka obere okwu. Okwu Chineke kwudịrị na Jehova kpọrọ ịgba alụkwaghịm Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị asị. *Gụọ Malakaị 2:13-16; 3:6.

Kwanyere Alụmdi na Nwunye Ùgwù

4. Gịnị mere ụfọdụ Ndị Kraịst na-eto eto ji akwa mmakwaara ma ha jiri ọsọ gaa lụọ di ma ọ bụ nwunye?

4 Ara mmekọahụ na-agba ụwa a na-adịghị asọpụrụ Chineke nke anyị bi n’ime ya. Kwa ụbọchị, a na-egosi ihe nkiri ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Anyị ekwesịghị iche na o nweghị ihe ha ga-eme anyị, karịsịa ndị na-eto eto anyị hụrụ n’anya nọ n’ọgbakọ. Olee ihe Ndị Kraịst na-eto eto kwesịrị ime banyere ihe ndị a pụrụ imebi àgwà ọma ha, bụ́ ihe ndị pụrụ ịkpali ha inwe agụụ mmekọahụ mgbe ha na-achọghị? Ụfọdụ agbalịala ime ihe banyere nke a site n’ịlụ di ma ọ bụ nwunye mgbe ha ka dị obere. Ha bu n’uche isi otú a zere ịkwa iko. Ma ọtụtụ n’ime ha na-akwa mmakwaara ka obere oge gasịrị. N’ihi gịnị? Mgbe ọṅụ a na-enwe mgbe a lụrụ ọhụrụ gachara, ha na-aghọta na ihe anaghị adabachara ha na onye ha lụrụ. Ihe na-emezinụ bụ na di na nwunye dị otú a na-amalite inwe ezigbo nsogbu.

5. Gịnị ga-enyere di na nwunye aka ịnọgide na-emezu nkwa ha kwere onwe ha mgbe ha lụrụ? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

5 Ezigbo nsogbu na-adị mgbe mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ọ sọgodị ya ya bụrụ onye kwere ekwe ibe ya, ma ya emechaa chọpụta na ihe ọ tụrụ anya ya abụghị ihe ọ hụrụ. (1 Kọr. 7:28) Ma, n’agbanyeghị ụdị nsogbu ha nwere, ezi Ndị Kraịst maara na ịgba alụkwaghịm n’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị abụghị ụzọ kwesịrị ekwesị di na nwunye na-enweghị obi ụtọ ga-esi edozi nsogbu ha. N’ihi ya, ndị nọgidere na-agbalịsi ike ịhụ na alụmdi na nwunye ha etisaghị n’ihi na ha chọrọ imezu nkwa ha kwere onwe ha mgbe ha lụrụ kwesịrị ka Ndị Kraịst ibe ha kwanyere ha ùgwù ma jiri ịhụnanya na-enyere ha aka. *

6. Olee otú Ndị Kraịst na-eto eto kwesịrị isi na-ele alụmdi na nwunye anya?

6 Ị̀ ka bụ nwa okorobịa na-alụbeghị nwaanyị ma ọ bụ nwa agbọghọbịa na-alụbeghị di? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị na-eche banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Ị pụrụ izere ọtụtụ nsogbu ma ọ bụrụ na i chere ruo mgbe i toruru ogo ya, nwee ike idi ihe ndị ya na ya so, ma tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ tupu gị egosiwa mmasị n’ebe nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị nọ. N’eziokwu, Akwụkwọ Nsọ ekwughị afọ ole mmadụ ga-adị ya etoruo ịlụ nwaanyị ma ọ bụ di. * Ma, Baịbụl gosiri na ọ kacha mma ka mmadụ chere ruo mgbe ọ gafere oge ahụ agụụ mmekọahụ na-agụsi ike. (1 Kọr. 7:36) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na agụụ mmekọahụ a na-agụsi ike n’oge a nwere ike imegharị mmadụ anya ma mee ka o mee mkpebi na-ezighị ezi bụ́ nke pụrụ imecha kpatara ya obi mgbawa. Cheta, ezigbo ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl Jehova nyere banyere alụmdi na nwunye bụ maka abamuru gị, ọ ga-enyekwara gị aka inwe obi ụtọ.—Gụọ Aịzaya 48:17, 18.

Ịzụ Ụmụ nke Ọma

7. Olee nsogbu ụfọdụ ndị na-eto eto lụrụ di na nwunye na-enwe, oleekwa otú nke a pụrụ isi kpaa alụmdi na nwunye ha aka ọjọọ?

7 Ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye mgbe ha ka na-eto eto na-amalite mụwa ụmụ mgbe ha onwe ha ka bụ ụmụ. Ha enwebeghịdị ohere mata onwe ha nke ọma tupu ha amụta nwa, bụ́kwanụ onye ha kwesịrị ịdị na-elekọta ehihie na abalị. Mgbe nne mụrụ nwa ahụ ga-abịa lebawara nnọọ nwa ọhụrụ ahụ anya karịa di ya, di ahụ ka na-eto eto nwere ike ikwowe ekworo. Tụkwasị na nke ahụ, ịmụ anya abalị n’ihi nwa ahụ nwere ike ime ka di na nwunye ahụ na-enwe ahụ́ mgbakasị bụ́ nke pụrụ ibute nsogbu n’etiti ha. Ha na-abịa ghọta na ha enwechaghịzi ohere maka onwe ha. Ha enweghịzi ike ịga ebe ndị ha na-agabu ma ọ bụ mee ihe ndị ha na-emebu. Olee otú ha kwesịrị isi lee mgbanwe ndị a anya?

8. Olee otú e kwesịrị isi lee ịzụ ụmụ anya, n’ihi gịnịkwa?

8 Dị nnọọ ka e kwesịrị ịbanye n’alụmdi na nwunye n’ụzọ kwesịrị ekwesị, e kwesịkwara ile ịzụ ụmụ anya dị ka ibu ọrụ na ihe ùgwù sitere n’aka Chineke. N’agbanyeghị ụdị mgbanwe nwa ọhụrụ a mụrụ pụrụ ime ka di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst mee, ha kwesịrị ime ike ha niile iji hụ na ha nagidere ha nke ọma. Ebe Jehova nyere ụmụ mmadụ ikike ịmụ ụmụ, ndị nne na nna kwesịrị ile nwa ọhụrụ ahụ anya dị ka “ihe nketa si n’aka Jehova.” (Ọma 127:3) Nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-agbalịsi ike ịrụ ọrụ ha dị ka “ndị mụrụ [ụmụ] n’ime Onyenwe anyị.”—Efe. 6:1.

9. (a) Gịnị ka ịzụ nwa na-ewe? (b) Olee ihe di nwere ike ime iji nyere nwunye ya aka ịnọgidesi ike n’okwukwe?

9 Ịzụ ụmụ chọrọ ka mmadụ nwee mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụghị obere ọrụ, ọ na-ewekwa oge. Onye Kraịst bụ́ di kwesịrị ịghọta na ruo ọtụtụ afọ ka a mụsịrị nwa ha, a ga-enwe ihe ga-adọpu nwunye ya uche mgbe ọmụmụ ihe na-aga n’ihu, o nwekwara ike ọ gaghị enwecha ohere inwe ọmụmụ ihe onwe onye na ịtụgharị uche. Nke a nwere ike ịkpa ọnọdụ ime mmụọ ya aka ọjọọ. Iji gosi na ya maara otú e si azụ nwa, onye bụ́ di kwesịrị ime ihe niile o nwere ike iji nye aka lekọta nwa ha. Iji nyere nwunye ya aka ịmụta ihe ndị ọ na-amụtaghị n’ọmụmụ ihe, mgbe ha lọtara, o nwere ike ịkọrọ nwunye ya ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe. O nwekwara ike inye aka lekọta nwa ha ka nwunye ya wee nwee ike iso gaa kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ.—Gụọ Ndị Filipaị 2:3, 4.

10, 11. (a) Olee otú e si azụlite ụmụaka “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova”? (b) Gịnị mere e kwesịrị iji kwe ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst n’aka?

10 Ndị nne na nna maara ọrụ ha na-eme ihe karịrị inye nwa ha nri, inye ya uwe, inwe ụlọ ebe ọ ga-anọ, na ịkpọga ya ụlọ ọgwụ mgbe ahụ́ na-adịghị ya. Ọ dị oké mkpa n’oge a dị oké egwu ka ụmụaka site ná nwata mụta ịdị na-akpa àgwà ọma. E kwesịrị ịzụlite ụmụaka “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) “Nduzi echiche” a gụnyere ịkụnye echiche Jehova n’ime uche nwatakịrị site ná mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ, zụrụ ya gafee nnọọ oge ọ na-etoru ogo mmadụ, bụ́ oge tara ezigbo akpụ.—2 Tim. 3:14, 15.

11 Mgbe Jizọs gwara ụmụazụ ya na ha kwesịrị ‘ime ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,’ ihe ịrụ ụka adịghị ya na o bukwa n’obi na ndị nne na nna kwesịrị inyere ụmụ ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:19, 20) Nke a siri ike n’ihi otú ụwa si anwa ndị na-eto eto itinye aka n’ihe ọjọọ. N’ihi ya, ndị nne na nna zụliteliri ụmụ ha ịghọ Ndị Kraịst raara onwe ha nye kwesịrị ka ụmụnna niile kwe ha n’aka. Ha ejila okwukwe na ikwesị ntụkwasị obi ha dị ka ndị nne na nna maara ọrụ ha ‘merie’ ụwa.—1 Jọn 5:4.

Ịnọ n’Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ma Ọ Bụ n’Amụghị Nwa Maka Nzube Pụrụ Iche

12. Gịnị mere ụfọdụ Ndị Kraịst ji kpebie ịghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye ruo oge ụfọdụ?

12 Ebe ọ bụ na ‘oge fọdụrụ dị ntakịrị ọnọdụ ụwa a na-agbanwekwa agbanwe,’ Okwu Chineke na-agba anyị ume ka anyị chebara uru ndị dị n’ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye echiche. (1 Kọr. 7:29-31) N’ihi ya, ụfọdụ Ndị Kraịst na-ekpebi ịghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye ná ndụ ha niile ma ọ bụ kpebie ịnọ naanị ha ruo ọtụtụ afọ tupu ha alụọ. E kwesịrị ịja ha mma na ha ejighị ohere ha nwere n’ihi nke a chụwa ihe ndị ga-adịrị naanị onwe ha mma. Ụfọdụ na-anọgide n’alụghị di ma ọ bụ nwunye iji nwee ike ijere Jehova ozi n’enweghị ihe “ndọpụ uche.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:32-35.) Ụfọdụ Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ ma ọ bụ na-eje ozi na Betel. Ọtụtụ n’ime ha na-agbalị ịbakwuru nzukọ Jehova uru site n’iru eru ije Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. N’ezie, ndị jere ozi oge niile ruo oge ụfọdụ mgbe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma mechaa kpebie ịlụ na-ekwukarị na ihe ndị ha mụtara tupu ha alụọ ka na-abara ha uru n’alụmdi na nwunye ha.

13. Gịnị mere ụfọdụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ji ekpebi ịghara ịmụ ụmụ?

13 N’ebe ụfọdụ n’ụwa, e nwere ụdị ezinụlọ ọzọ a na-enwe—ọtụtụ di na nwunye na-ekpebi ịghara ịmụ nwa. Ụfọdụ na-ekpebi ime nke a n’ihi ụkọ ego; ndị ọzọ na-eme ya iji nwee ike inwe ohere maka ọrụ na-enye ha ezigbo ego. E nwekwara di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ndị kpebiri ịghara ịmụ ụmụ. Ma, ha na-emekarị nke a iji nwekwuo ohere ijere Jehova ozi. Nke a apụtaghị na alụmdi na nwunye ha adịghị otú o kwesịrị. Ọ dị. Ma, ha chọrọ ibute Alaeze ahụ ụzọ karịa uru ndị ọzọ a na-erite site n’ịlụ di na nwunye. (1 Kọr. 7:3-5) Ụfọdụ n’ime di na nwunye ndị a na-ejere Jehova na ụmụnna ha ozi dị ka ndị nlekọta sekit, ndị nlekọta distrikti, ma ọ bụ ndị ozi Betel. Ndị ọzọ na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ. Jehova agaghị echefu ọrụ ha na ịhụnanya ha na-egosi maka aha ya.—Hib. 6:10.

“Mkpagbu n’Anụ Ahụ́”

14, 15. Olee ụdị “mkpagbu” ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst pụrụ inwe “n’anụ ahụ́ ha”?

14 Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye na ha ga-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Kọr. 7:28) Nke a nwere ike ịgụnye ọrịa di ma ọ bụ nwunye ahụ, ụmụ ha, ma ọ bụ ndị mụrụ ha merela agadi pụrụ ịrịa. O nwekwara ike ịgụnye ihe isi ike na nsogbu ndị ha na ịzụ ụmụ so aga. Dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, Baịbụl buru amụma na “n’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” Otu n’ime ihe ndị ga-ata akpụ bụ ụmụ “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi.”—2 Tim. 3:1-3.

15 Ịzụ ụmụ adịghịrị ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst mfe. Anyị sokwa ná ndị ‘oge a dị oké egwu’ na-akpa aka ọjọọ. N’ihi ya, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-anọgide na-ebuso “usoro ihe nke ụwa a” agha ka ọ ghara imebi ụmụ ha. (Efe. 2:2, 3) Ọ bụghịkwanụ mgbe niile ka ha na-emeri n’agha ahụ! Ọ bụụrụ ndị nne na nna gbalịrị ịzụlite nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwaanyị n’eziokwu nke Chineke “mkpagbu” ma ọ bụrụ na nwa ha ahụ akwụsị ijere Jehova ozi.—Ilu 17:25.

“Mgbe ahụ Ka A Ga-enwe Oké Mkpagbu”

16. Olee “mkpagbu” Jizọs buru amụma ya?

16 Ma, e nwere oké mkpagbu ọzọ na-enweghị atụ a ga-enwe nke ga-akarị nnọọ “mkpagbu” ọ bụla e nwetara n’alụmdi na nwunye ma ọ bụ ka a na-azụ ụmụ. Mgbe Jizọs na-ebu amụma banyere ọnụnọ ya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a, o kwuru, sị: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” (Mat. 24:3, 21) Jizọs mechara kwuo na oké ìgwè mmadụ ga-alanahụ “oké mkpagbu” a. Ma, ụwa Setan ga-esi ọnwụ na-alụso Ndịàmà Jehova na-achọghị nsogbu ọgụ ikpeazụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ dịghị onye n’ime anyị, ma okenye ma nwata, oge ahụ ga-adịrị mfe.

17. (a) Gịnị mere ụjọ agaghị atụ anyị maka ọdịnihu? (b) Gịnị kwesịrị ikpebi otú anyị si ele alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ anya?

17 Otú o sina dị, anyị ekwesịghị ịtụ oké egwu maka ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ndị nne na nna na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova pụrụ inwe olileanya na a ga-echebe ha na ụmụ ha. (Gụọ Aịzaya 26:20, 21; Zef. 2:2, 3; 1 Kọr. 7:14) Ka ọ dịgodị, ka ọmụma anyị maara na anyị bi n’oge dị oké egwu nyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi ele alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ anya n’oge ọgwụgwụ a. (2 Pita 3:10-13) Ime otú a ga-ewetara Jehova na ọgbakọ Ndị Kraịst nsọpụrụ ma ànyị lụrụ di ma ọ̀ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na anyị alụghị nakwa ma ànyị mụrụ ụmụ ma anyị amụghị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Gụọ akwụkwọ bụ́ Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ n’okpuru isiokwu bụ́ “Ọ Kpọrọ Ịgba Alụkwaghịm Asị,” nke dị na peeji nke 125.

^ par. 5 Isiokwu ndị kwuru banyere alụmdi na nwunye, bụ́ ndị dị n’Ụlọ Nche nke September 15, 2003, na  , na  , na  , na Teta! nke January 8, 2001 ga-enyere di na nwunye na-enwe nsogbu aka.

^ par. 6 Gụọ isi nke 30 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè n’okpuru isiokwu bụ́ “Àdị M Njikere Maka Alụmdi na Nwunye?”

Ntụleghachi

• Gịnị mere Ndị Kraịst na-eto eto ekwesịghị iji ọsọ gbaba n’alụmdi na nwunye?

• Gịnị ka ịzụ ụmụ gụnyere?

• Gịnị mere ọtụtụ Ndị Kraịst ji ekpebi ịghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ ghara ịmụ nwa ma ha lụọ?

• Olee “mkpagbu” Ndị Kraịst mụrụ ụmụ pụrụ inwe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Gịnị mere o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya ka Ndị Kraịst na-eto eto toruo etoruo tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye?

[Foto dị na peeji nke 18]

E nwere ọtụtụ ihe di nwere ike ime iji nyere nwunye ya aka inwe ohere ijere Chineke ozi

[Foto dị na peeji nke 19]

Gịnị mere ụfọdụ Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye ji ekpebi ịghara ịmụ ụmụ?