Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gini Na-eme Ka Ndụ Nwee Isi?

Gini Na-eme Ka Ndụ Nwee Isi?

Gini Na-eme Ka Ndụ Nwee Isi?

“Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu.”—EKLI. 12:13.

1, 2. Olee uru anyị ga-erite site n’ịtụle akwụkwọ Ekliziastis?

E NWERE otu nwoke yiri ka o nwere ihe niile. Ọ bụ onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị, ọ bụ otu n’ime ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa, ọ bụkwa onye kasị nwee amamihe n’oge ya. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ọ nọ na-ajụ onwe ya sị, ‘Gịnị na-eme ka ndụ nwee isi?’

2 Onye a e kwuru okwu ya dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ atọ gara aga. Aha ya bụ Sọlọmọn, n’akwụkwọ Ekliziastis, ọ kọrọ otú o si chọọ inwe afọ ojuju ná ndụ. (Ekli. 1:13) E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike isi n’aka Sọlọmọn mụta. N’eziokwu, okwu amamihe dị n’akwụkwọ Ekliziastis pụrụ inyere anyị aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ga-eme ka ndụ anyị nwee ezi nzube.

“Ịchụso Ifufe”

3. Olee otu ihe dị mkpa banyere ndụ mmadụ nke na-eche anyị niile ihu?

3 Sọlọmọn kwuru na Chineke kere ọtụtụ ihe ndị mara mma n’ụwa—ihe ndị o kere adịghịkwa agwụ agwụ, ha ga-anọgidekwa na-adọrọ mmasị anyị ma na-atọ anyị ụtọ ikiri. Ma, anyị agaghị amatachali ihe ndị Chineke kere eke n’ihi na ndụ anyị dị mkpụmkpụ. (Ekli. 3:11; 8:17) Baịbụl na-ekwu na ụbọchị anyị dị mkpụmkpụ, ọ na-agafekwa ngwa ngwa. (Job 14:1, 2; Ekli. 6:12) Eziokwu a dị mkpa kwesịrị ime ka anyị jiri ndụ anyị na-eme ihe bara uru. Nke ahụ agaghị adị mfe omume n’ihi na ụwa Setan ga na-anwa anyị ime ihe ndị na-abaghị uru.

4. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ihe efu” pụtara? (b) Olee ihe ndị a na-achụso ná ndụ anyị ga-atụle?

4 Sọlọmọn ji okwu bụ́ “ihe efu” mee ihe ugboro iri atọ n’akwụkwọ Ekliziastis iji gosi ihe mere o ji dị njọ mmadụ iji ndụ ya eme inyo. Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ihe efu” n’ebe a pụtara ihe na-enweghị ihe dị ya, ihe na-enweghị isi, ma ọ bụ ihe na-abaghị uru ọ bụla na-adịgide adịgide. (Ekli. 1:2, 3) Mgbe ụfọdụ Sọlọmọn ji okwu bụ́ “ịchụso ifufe” mee ihe dị ka ihe ya na okwu bụ́ “ihe efu” yiri. (Ekli. 1:14; 2:11) O doro anya na ọ dịghị onye ga-anwụdeli ifufe. Onye gbalịkwaranụ ịnwụde ifufe agaghị anwụde ihe ọ bụla. Onye na-achụso ihe ndị na-enweghị isi na-ata ndụ ya ahụhụ. Ndụ a na-adị n’ụwa ochie a dị nnọọ mkpụmkpụ nke na mmadụ ekwesịghị iji ya na-achụ ihe ndị na-enweghị isi. N’ihi ya, iji nyere anyị aka izere ihie ụzọ, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ ndị Sọlọmọn kwuru na a na-achụsokarị ná ndụ. Anyị ga-ebu ụzọ tụlee nchụso a na-achụso ihe ụtọ na ihe onwunwe. E mechaa, anyị ga-atụle uru ọrụ bara.

Ịchụso Ihe Ụtọ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Nwee Obi Ụtọ?

5. Olee ihe ndị Sọlọmọn gbalịrị iji mee onwe ya obi ụtọ?

5 Dị ka ọtụtụ ndị na-eme taa, Sọlọmọn gbalịrị inweta afọ ojuju site n’ịchụso ihe ụtọ. O kwuru, sị: “Ọ dịghị ụdị aṅụrị ọ bụla m gbochiri obi m inwe.” (Ekli. 2:10) Olee ihe ndị ọ gbalịrị iji mee onwe ya obi ụtọ? Dị ka Ekliziastis isi abụọ kwuru, o ji ‘mmanya mee onwe ya obi ụtọ’—ma ọ ṅụbigaghị mmanya okè—ọ chọkwara gburugburu ụlọ ya na obí eze ya mma dị egwu, gee egwú, ma rie nri ndị dị ụtọ.

6. (a) Gịnị mere ọ dịghị njọ mmadụ ịtụrụtụ ndụ? (b) Mgbe a bịara n’ihe banyere ịtụrụ ndụ, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche?

6 Baịbụl ọ̀ katọrọ mmadụ iso ndị enyi ya kporie ndụ? Mba. Dị ka ihe atụ, Sọlọmọn kwuru na mmadụ ịtụsara nnọọ ahụ́ na-eri nri dị ụtọ mgbe ọ rụsịrị ọrụ n’ụbọchị bụ onyinye Chineke. (Gụọ Ekliziastis 2:24; 3:12, 13.) Tụkwasị na nke ahụ, Jehova gwara ndị na-eto eto ka ha ‘ṅụrịa ọṅụ ka obi tọọkwa ha ụtọ’ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ekli. 11:9) Ntụrụndụ kwesịrị ekwesị dị anyị mkpa. (Tụlee Mak 6:31.) Ma, ịtụrụ ndụ ekwesịghị ịbụ ihe bụ́ isi ná ndụ anyị. Kama nke ahụ, ntụrụndụ kwesịrị ịdị ka ihe e ji atacha ọnụ mgbe e richara nri, ọ bụghị nri ahụ n’onwe ya. Ị ga-ekweta na ihe ọ sọkwara ihe ndị ahụ i ji atacha ọnụ ha tọọ n’ụtọ, ike ha ga-agwụ gị ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọzọ ị na-eri, ha agaghịkwa enyecha ahụ́ gị ihe ndị ọ chọrọ. N’otu aka ahụ, Sọlọmọn chọpụtara na onye ji ndụ ya na-achụ ihe ụtọ ‘na-achụso ifufe.’—Ekli. 2:10, 11.

7. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịkpachara anya banyere ụdị ihe ndị anyị na-ahọrọ iji tụrụ ndụ?

7 Ọzọkwa, ọ bụghị ihe niile e ji atụrụ ndụ ziri ezi. Ọtụtụ n’ime ha jọgburu onwe ha—ha pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke nweekwa ike ime ka anyị tinye aka n’omume rụrụ arụ. Ọtụtụ nde mmadụ na-ebizi ndụ na-enweghị isi taa n’ihi na ha chọrọ ‘ikpori ndụ,’ ha na-aṅụ ọgwụ ike, na-aṅụbiga mmanya okè, ma na-agba chaa chaa. Jehova ji obiọma dọọ anyị aka ná ntị na ọ bụrụ na anyị ekwere ka obi ma ọ bụ anya anyị duba anyị n’ihe ga-emerụ anyị ahụ́, anyị ga-atụ anya ịta ahụhụ ya.—Gal. 6:7.

8. Gịnị mere anyị ji kwesị ichebara ndụ anyị echiche?

8 Ịchụ ihe ụtọ ọnwụ ọnwụ pụkwara igbochi anyị ilebara ihe ndị ka mkpa anya dị ka o kwesịrị. Cheta na ndụ na-agafe ngwa ngwa, anyị ejighịkwa n’aka na ọrịa na nsogbu agaghị akpa ndụ anyị a dị mkpụmkpụ aka ọjọọ. Ọ bụ ya mere na, dị ka Sọlọmọn kwukwara, anyị nwere ike irite uru dị ukwuu n’ịga ebe a na-eli ozu—karịsịa ebe a na-eli Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi—karịa ịga “n’ụlọ oriri.” (Gụọ Ekliziastis 7:2, 4.) Gịnị mere nke a ji bụrụ eziokwu? Ka anyị na-ege ntị n’okwu olili ozu ahụ ma na-atụgharị uche n’ụdị ndụ ohu Jehova ahụ kwesịrị ntụkwasị obi biri tupu ya anwụọ, nke ahụ pụrụ ịkpali anyị inyocha ndụ nke anyị. Anyị nweziri ike ịchọpụta na ọ dị mkpa ka anyị gbanwee ihe ndị anyị na-achụso iji nwee ike iji ndụ anyị fọdụrụnụ mee ihe bara uru.—Ekli. 12:1.

Ihe Onwunwe Ọ̀ Ga-enye Anyị Afọ Ojuju?

9. Gịnị ka Sọlọmọn chọpụtara banyere inwe ihe onwunwe?

9 Sọlọmọn bụ otu n’ime ndị kacha baa ọgaranya n’ụwa mgbe o dere akwụkwọ Ekliziastis. (2 Ihe 9:22) O nwere ego ọ ga-eji zụta ihe ọ bụla ọ chọrọ. O dere, sị: “Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla anya m chọrọ nke m na-enyeghị ya.” (Ekli. 2:10) Ma, ọ chọpụtara na ihe onwunwe abụghị ya na-eme ka mmadụ nwee afọ ojuju. O kwuru, sị: “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.”—Ekli. 5:10.

10. Gịnị na-eme ka mmadụ nwee ezi afọ ojuju na akụ̀ nke bụ́ ezigbo ya?

10 N’agbanyeghị na ihe onwunwe na-apụ n’anya ngwa ngwa, ọ ka pụrụ ịdọrọ mmasị. Ná nnyocha e mere ná nso nso a na United States, ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke ụmụ akwụkwọ bara mahadum ọhụrụ kọwara na ihe kacha ha mkpa ná ndụ bụ “ịbụ aka ji akụ̀.” Ọ bụrụgodị na ha aghọọ ihe ahụ ha chọrọ, ọ̀ ga-eme ka ha nwee obi ụtọ n’ezie? Ọ naghị adịcha otú ahụ. Ndị na-eme nnyocha achọpụtadịla na oké ịchụ ihe onwunwe na-egbochidị ndị mmadụ inwe obi ụtọ na afọ ojuju. Sọlọmọn kwudịrị otu ihe ahụ ogologo oge gara aga. O dere, sị: “Akpakọbaara m onwe m ọlaọcha na ọlaedo, kpakọbakwa ihe onwunwe e ji amata ndị eze . . . Ma, lee! ihe niile bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.” * (Ekli. 2:8, 11) Ma, ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-ejere Jehova ozi ma nweta ngọzi ya, anyị ga-enwe akụ̀ nke bụ́ ezigbo ya.—Gụọ Ilu 10:22.

Olee Ụdị Ọrụ Na-eweta Ezigbo Afọ Ojuju?

11. Olee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru iji gosi uru ọrụ bara?

11 Jizọs sịrị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọwokwa m na-arụ ọrụ.” (Jọn 5:17) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịrụ ọrụ na-enye Jehova na Jizọs afọ ojuju. Baịbụl gosiri ụdị afọ ojuju Jehova nwere n’ihe ndị o kere mgbe ọ sịrị: “Chineke hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.” (Jen. 1:31) Ndị mmụọ ozi ‘malitere iti mkpu otuto’ mgbe ha hụrụ ihe niile Chineke kere. (Job 38:4-7) Sọlọmọn chọpụtakwara uru ọrụ dị mma bara.—Ekli. 3:13.

12, 13. (a) Olee otú mmadụ abụọ si gosi afọ ojuju ha na-enweta site n’ịrụsi ọrụ ike? (b) Olee ihe mere ọrụ ego ji nwee ike ịdị na-eme mmadụ obi ọjọọ mgbe ụfọdụ?

12 Ọtụtụ mmadụ ghọtara uru ịrụsi ọrụ ike bara. Dị ka ihe atụ, José, bụ́ onye na-ese ihe nke nwere ihe ịga nke ọma, kwuru, sị, “Ọ bụrụ na i nwee ike iseteli ihe i bu n’obi, ya amaa nnọọ mma, ọ na-adị gị ka i nwetala akụ̀ dị oké ọnụ ahịa.” Miguel, * bụ́ onye ọchụ nta ego, kwuru, sị: “Ọrụ na-enye afọ ojuju n’ihi na ọ na-eme ka i nwee ike ịkpata ihe ezinụlọ gị ga-eri. Ọ pụkwara ime ka i nwee obi ụtọ na o nwere ihe ị rụzuru.”

13 Ma, ọrụ ụfọdụ na-agwụ ike, ha adịghịkwa enyecha ndị na-arụ ha ohere ichepụta ihe ọhụrụ. Mgbe ụfọdụ, ebe ndị a nọ arụ ọrụ ndị a na-emekwa ka obi na-ajọ ndị na-arụ ọrụ njọ, ọ na-adịdị ụfọdụ ka a na-emegbu ha emegbu n’ebe ha na-arụ ọrụ. Dị ka Sọlọmọn kwuru, onye na-arụsi ọrụ ike nwere ike ịdị na-arụ arụ onye umengwụ a na-eri eri ikekwe n’ihi na ya na ndị ọnụ ha na-eru n’okwu dị ná mma. (Ekli. 2:21) E nwekwara ihe ndị ọzọ pụrụ ịdị na-eme onye na-arụ ọrụ obi ọjọọ. Ọrụ na-agabu nke ọma nwere ike ịda ajọ ọdịda n’ihi nsogbu akụnụba ma ọ bụ n’ihi ọdachi bịara ná mberede. (Gụọ Ekliziastis 9:11.) Ọtụtụ mgbe, onye rụsiri ọrụ ike iji nwee ihe ịga nke ọma na-enwe obi ilu n’ihi na ọ chọpụtara na ya nọ kemgbe “na-arụsi ọrụ ike n’ịchụso ifufe.”—Ekli. 5:16.

14. Olee ọrụ na-enye ezigbo afọ ojuju?

14 È nwere ụdị ọrụ na-adịghị eme obi ọjọọ? José, bụ́ onye ahụ na-ese ihe anyị kwuru okwu ya ná mbụ, kwuru, sị: “Ka oge na-aga, ihe e sere ese nwere ike imebi ma ọ bụ fuo. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ihe ndị anyị mere n’ozi Jehova. Site n’irubere Jehova isi ma na-aga ekwusa ozi ọma ọ sịrị kwusaa, enyerela m ndị ọzọ aka ịghọ ezigbo Ndị Kraịst na-atụ egwu Chineke, nke ahụ ga-anọgidekwa na-abara ha uru. Nke a bụkwa ihe a na-apụghị iji ego zụta.” (1 Kọr. 3:9-11) Miguel n’onwe ya kwukwara na ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na-enye ya nnọọ afọ ojuju karịa ọrụ o ji akpa ego. O kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ị ga-eji dochie anya ọṅụ ị ga-enwe mgbe ị kụziiri mmadụ eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ gị ahụkwa na ihe ị kụziiri ya ruru ya n’obi.”

“Zipụ Achịcha Gị n’Elu Mmiri”

15. Gịnị na-eme ka ndụ bụrụ ihe nwere isi n’ezie?

15 Ná ngwụsị, gịnị n’ezie na-eme ka ndụ bụrụ ihe nwere isi? Anyị na-enwe ezigbo afọ ojuju ma ọ bụrụ na anyị ejiri obere oge anyị nwere n’ụwa ochie a mee ezi ihe nakwa ihe na-amasị Jehova. Anyị na Chineke nwere ike ịdị n’ezigbo mma, anyị nwere ike ịkụziri ụmụ anyị ụkpụrụ ndị mara mma dị n’Akwụkwọ Nsọ, anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịmara Jehova, anyị na ụmụnna anyị nwekwara ike ịbụ ezigbo enyi. (Gal. 6:10) Ihe ndị a niile na-anọgide na-aba uru, ha na-ewetakwara ndị nwetara ha ngọzi. Sọlọmọn ji otu okwu na-akpali mmasị kọwaa uru ọ bara ime ihe ọma. Ọ sịrị: “Zipụ achịcha gị n’elu mmiri, n’ihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-ahụ ya ọzọ.” (Ekli. 11:1) Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume, sị: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.” (Luk 6:38) Tụkwasị na nke a, Jehova n’onwe ya kwere nkwa ịkwụghachi ndị meere ndị ọzọ ihe ọma ụgwọ.—Ilu 19:17; gụọ Ndị Hibru 6:10.

16. Olee mgbe kacha mma iji kpebie ihe anyị ga-eji ndụ anyị mee?

16 Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị mee mkpebi ndị ziri ezi mgbe anyị ka na-eto eto banyere ihe anyị ga-eji ndụ anyị eme. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enwe ike izere inwe obi ilu mgbe anyị toro. (Ekli. 12:1) Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị ejiri afọ ndụ anyị ndị kacha mma na-achụ ihe nke ụwa a ma mechaa chọpụta na ihe anyị nọ na-achụ kemgbe bụ ifufe!

17. Gịnị ga-enyere gị aka ịhọrọ ụdị ndụ kacha mma?

17 Dị nnọọ ka nna ọ bụla na-ahụ n’anya ga-achọ, Jehova chọrọ ka anyị nwee ọṅụ ná ndụ, chọọkwa ka anyị zere ihe ndị na-akpata obi mgbawa. (Ekli. 11:9, 10) Gịnị ga-enyere gị aka ime nke ahụ? Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke otuto ma gbalịa iru ha. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri abụọ gara aga, Javier nwere ihe abụọ chere ya ihu ịhọrọ, ịghọ dọkịta na ịbanye ozi oge niile. O kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ọrụ dọkịta na-enye obi ụtọ, o nweghị ihe a ga-eji tụnyere ọṅụ m na-enwe mgbe m nyeere ọtụtụ ndị aka ịmụta eziokwu ahụ. Ozi oge niile emeela ka ndụ m na-atọ m nnọọ ụtọ. Naanị ụta m na-akwa bụ na amaliteghị m n’oge.”

18. Gịnị mere ndụ Jizọs dịrị n’ụwa ji bụrụ nke nwere nnọọ isi?

18 Oleezi ihe kacha mma anyị kwesịrị ịgbalịsi ike inweta? Akwụkwọ Ekliziastis kwuru, sị: “Ezi aha dị mma karịa ezigbo mmanụ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dịkwa mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” (Ekli. 7:1) Ụdị ndụ Jizọs biri kacha gosi na nke a bụ eziokwu. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o meere onwe ya ezigbo aha n’ebe Jehova nọ. Jizọs kwesịgidere ntụkwasị obi ruo ọnwụ, si otú ahụ gosi na ọ bụ Nna ya kwesịrị ịchị, nyekwa ndụ ya dị ka ihe mgbapụta bụ́ nke megheere anyị ụzọ inweta nzọpụta. (Mat. 20:28) N’ime obere oge ọ nọrọ n’ụwa, o setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya—ụdị ihe nlereanya nke anyị kwesịrị ịgbalị iṅomi—nke bụ́kwa ndụ nwere isi n’ezie.—1 Kọr. 11:1; 1 Pita 2:21.

19. Olee ndụmọdụ amamihe nke Sọlọmọn nyere?

19 Anyị onwe anyị nwekwara ike imere onwe anyị ezi aha n’ebe Chineke nọ. Inwe aha ọma n’anya Jehova ga-aka baara anyị uru karịa inwe akụnụba. (Gụọ Matiu 6:19-21.) Kwa ụbọchị, anyị nwere ike ịhụ ụzọ anyị ga-esi mee ihe dị mma n’anya Jehova, nke ahụ ga-emekwa ka anyị nwee afọ ojuju ná ndụ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikwusara ndị ọzọ ozi ọma, mee ka alụmdi na nwunye anyị na ezinụlọ anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma ka anyị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye ma na-aga ọmụmụ ihe. (Ekli. 11:6; Hib. 13:16) Ya mere, ị̀ chọrọ ibi ndụ nwere isi n’ezie? Ọ bụrụ na ị chọrọ, nọgide na-eme ihe a Sọlọmọn dụrụ n’ọdụ: “Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.”—Ekli. 12:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ihe Sọlọmọn na-enweta n’afọ bụ narị talent isii na iri isii na isii (ihe karịrị ọlaedo dị iri puku kilogram abụọ na abụọ n’arọ).—2 Ihe 9:13.

^ par. 12 A gbanwere aha ahụ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Gịnị kwesịrị ịkpali anyị ichebara ihe mgbaru ọsọ anyị echiche?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele nchụso ihe ụtọ na inwe ihe onwunwe anya?

• Olee ụdị ọrụ ga-eweta afọ ojuju na-adịgide adịgide?

• Olee ihe bara nnọọ uru anyị ga-agbalịsi ike inwe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Olee ebe ị ga-edebe ntụrụndụ ná ndụ gị?

[Foto dị na peeji nke 24]

Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji bụrụ ihe na-enye nnọọ afọ ojuju?