Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Nọ Naanị Ha ma E Chefughị Ha

Ha Nọ Naanị Ha ma E Chefughị Ha

Ha Nọ Naanị Ha ma E Chefughị Ha

PỌL onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Gal. 6:10) Taa, anyị na-eme ihe a Pọl ji ike mmụọ kwuo ma na-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi na-emere ụmụnna anyị ihe ọma. Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi so ná ndị ọ dị mkpa ka ọgbakọ Ndị Kraịst na-elekọta, ha kwesịkwara ka a na-elekọta ha.

Ọ bụ ezie na ná mba ụfọdụ, ndị ezinụlọ nne na nna ha merela agadi na-anọ n’ụlọ elekọta ha. Ma ná mba ndị ọzọ, a na-akpọga ndị agadi n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Oleekwanụ maka Ndị Kraịst merela agadi bụ́ ndị a kpọgara n’ebe ndị a na-elekọta ndị agadi? Olee ihe isi ike ndị ha na-enweta n’ebe ahụ? Olee otú ha ga-esi nagide nsogbu ndị ha na-enweta n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ha adịghị eleta ha? Olee otú ọgbakọ Ndị Kraịst pụrụ isi nyere ha aka? Oleekwa ụzọ ndị anyị ga-esi rite uru ma anyị na-aga eleta ha mgbe niile?

Nsogbu Ndị Agadi Na-enweta n’Ebe A Na-elekọta Ha

Ọ bụrụ na a kpọga Ndị Kraịst merela agadi n’ebe a na-elekọta ndị agadi, o nwere ike ya abụrụ na ebe ahụ a kpọgara ha dị n’ókèala ọgbakọ ọzọ bụ́ ebe a na-amaghị ha. Nke a nwere ike ime ka ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ebe ahụ ghara icheta ịdị na-aga eleta ha mgbe niile. E wezụga nke a, o nwere ike ndị ha na ha nọ n’ebe ahụ abụghị Ndịàmà Jehova. Nke a nwere ike itinye ụmụnna anyị bụ́ ndị agadi n’ihe isi ike.

Dị ka ihe atụ, n’ebe ụfọdụ, ndị na-arụ n’ebe ahụ na-eme ndokwa ka a bịa na-ekwuru ndị agadi ahụ okwuchukwu. Otu onye na-elekọta ndị agadi kwuru, sị: “A na-eburu ụfọdụ Ndịàmà bụ́ ndị agadi ndị na-enweghị ike ikwucha okwu nke ọma n’oche nkwagharị gaa n’ebe a na-ekwu okwuchukwu n’ebughịdị ụzọ jụta ha ihe ha chọrọ.” Ihe ọzọkwa bụ na ndị na-arụ ebe ahụ na-ejikarị ụbọchị Krismas ma ọ bụ Ista emere ụbọchị ha ji agbanwe ihe ndị a na-emere ndị agadi ahụ. E nyekwala ụfọdụ ụmụnna anyị nọ n’ebe a na-elekọta ndị agadi nri ndị akọnuche ha na-anabataghị. (Ọrụ 15:29) Ọ bụrụ na anyị na-aga eleta ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị merela agadi mgbe niile, anyị ga-enwe ike inyere ha aka imeri nsogbu ndị a.

Otú Ọgbakọ Si Enye Aka

Ndị Kraịst oge mbụ maara na ọ bụ ọrụ ha ilekọta ndị agadi mgbe ha na-enweghị onye ezinụlọ ha ga elekọta ha. (1 Tim. 5:9) N’otu aka ahụ, taa ndị nlekọta na-agbalị ịhụ na e legharaghị ndị agadi nọ n’ebe a na-elekọta ndị agadi nọ n’ogbe ha, anya. * Robert, bụ́ okenye kwuru, sị: “Ọ ga-akacha mma ma ndị okenye n’onwe ha na-aga eleta ndị agadi iji mara ọnọdụ ha ma soro ha kpekọọ ekpere. Ọgbakọ kwesịrị ịgbalị igboro ha mkpa ha.” Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-aga eleta ndị agadi, anyị na-egosi na anyị ghọtara na ilekọta ndị nọ ná mkpa dị mkpa n’anya Jehova.—Jems 1:27.

Mgbe ọ bụla ọ dị mkpa, ndị okenye na-eme ndokwa ka a na-aga enyere ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ n’ebe a na-elekọta ndị agadi n’ogbe ha aka. Robert kwuru otu n’ime ihe pụrụ ịbụ mkpa ha, sị, “Anyị kwesịrị ịgba ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị merela agadi ume ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụrụ na ha ga-agali.” Ma ndị okenye nwere ike ime ndokwa ihe ọzọ e nwere ike ime iji nyere ndị nke na-enwelighịzi ike ịgaru n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, aka. Jacqueline, bụ́ onye dị iri afọ asatọ na ụma nke na-arịakwa ọrịa ogbu na nkwonkwo na-esi na telifon egere ihe omume a na-eme n’ọgbakọ. O kwuru, sị: “Ịdị na-anụta ihe ndị a na-eme ozugbo a na-eme ha na-abara m nnọọ uru. Enweghị m ike ikwe ka ha kwaa m!”

Ọ bụrụ na nwanna merela agadi enweghị ike isi na telefon gere ihe omume, ndị okenye nwere ike ime ndokwa ka e tinyere ya ihe ndị e kwuru n’ọmụmụ ihe na teepu. Nwanna ga-aga wegara nwanna ahụ nọ n’ebe a na-elekọta ndị agadi teepu ahụ nwere ike jiri ohere ahụ soro ya kparịta ụka. Otu okenye kwuru, sị: “Ịdị na-akọrọ ụmụnna ndị a merela agadi otú ndị nọ n’ọgbakọ si na-eme ga-eme ka ha ghọta na ha ka bụ ụmụnna anyị.”

Gbalịa Ịdị Na-akpanyere Ha Ụka

O kwere nghọta na obi anaghị adị ọtụtụ ndị agadi mma, ahụ́ anaghịkwa eru ha ala ma a kpọga ha n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Nke a na-emekwa ka ụfọdụ na-anọrọ onwe ha. Ma ọ bụrụ na anyị agaa leta ụmụnna anyị ndị a merela agadi ozugbo ha kwagara n’ebe a na-elekọta ha ma mee ka ha ghọta na anyị ga-anọgide na-enyere ha aka, anyị ga-eme ka obi ruo ha ala, ha enweekwa ọṅụ.—Ilu 17:22.

Ọ bụrụ na nká emeela ka ha na-echefukarị ihe ma ọ bụ ghara ịdị na-anụchazi ihe ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha nwere nsogbu ndị ọzọ na-eme ka o siere ha na ndị ọzọ ike ikwurịta okwu, ụfọdụ nwere ike ichewe na ịga leta ha abakwaghị uru. Ma, mgbalị anyị na-eme ịga na-eleta ha, n’agbanyeghị otú o si siruo ike iso ha kparịta ụka, na-egosi na anyị nọgidere ‘na-ebute ụzọ n’igosi ndị kwere ekwe ibe anyị nsọpụrụ.’ (Rom 12:10) Ọ bụrụ na ọ na-esiziri nwanna merela agadi ike icheta ihe ndị mere ọhụrụ, anyị nwere ike ịgba ya ume ka ọ kọọrọ anyị ihe ndị mere oge dị anya gara aga, ọbụnadị ihe ndị mere mgbe ọ dị obere, ma ọ bụkwanụ gwa ya ka ọ kọọrọ anyị otú o si nata eziokwu. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọ na-esiri ya ike ịchọta okwu kwesịrị ekwesị ọ ga-eji kọwaa ihe ọ na-ekwu? Jiri ndidi gee ya ntị, ọ bụrụ na ọ dị mkpa, chetara ya otu okwu ma ọ bụ abụọ ọ dị gị ka ọ na-achọ, ma ọ bụkwanụ kwuo ihe gosiri na ị ghọtara ihe ọ na-achọ ikwu ma gwa ya ka ọ gaa n’ihu. Ọ bụrụ na ọ maghị ihe ọ ga-ekwu, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na okwu na-ara ya ahụ́, ya ana-esikwara anyị ike ịghọta ihe ọ na-ekwu, anyị nwere ike ịgbalị ịghọta ihe ọ na-ekwu site n’ige ntị nke ọma n’olu okwu ya.

Ọ bụrụ na ọ naghịzi ekwuli okwu, ọ dị ihe ọzọ a pụrụ ime. Laurence, bụ́ onye ọsụ ụzọ, na-aga mgbe niile eleta Madeleine, bụ́ nwanna nwaanyị dị afọ iri asatọ nke na-adịghị ekwulizi okwu. Laurence kọrọ otú ya na ya si enweli ike ịkparịta ụka: “M na-ejide aka Madeleine mgbe anyị na-ekpekọ ekpere. Ọ na-ejizi nwayọọ afụkọta aka m ma tabie anya ya iji gosi na ya nwere ekele maka oge a na-enye ya obi ụtọ mụ na ya na-anọ.” Ijide aka ndị agadi anyị hụrụ n’anya na ịmakụ ha pụrụ ime ka obi sie ha ike na a hụrụ ha n’anya.

Ọ Dị Mkpa Ka Ị Na-anọ Ya

Ịdị na-aga eleta ndị agadi mgbe niile na-eme ka ndị na-arụ n’ebe a na-elekọta ha na-elekọtakwu ha nke ọma. Danièle, bụ́ onye kemgbe ihe dị ka iri afọ abụọ ugbu a na-agakarị n’ebe a na-elekọta ndị agadi eleta Ndịàmà ibe ya, kwuru, sị, “Ọ bụrụ na ndị na-arụ n’ebe a na-elekọta ndị agadi achọpụta onye ndị mmadụ na-abịakarị eleta, ha na-elebakwuru onye ahụ anya.” Robert, bụ́ onye e dere ihe o kwuru ná mbụ, sịrị: “Ndị na-arụ n’ebe a na-elekọta ndị agadi na-adị njikere ige onye na-abịakarị eleta ndị agadi ntị. Ha nwere ike ha agaghị akwanyere onye na-abịa naanị mgbe ọ masịrị ya otu ụdị ùgwù ahụ.” Ebe ọ bụ na e nwere ezinụlọ ụfọdụ ndị ọ na-esi ike imeta ha mma, ọ na-amasị ndị nọọsụ ma onye ọbịa kelee ha maka ọrụ ọma ha. Tụkwasị na nke ahụ, ọ bụrụ na anyị na ndị na-arụ n’ebe a na-elekọta ndị agadi adịrị ná mma, ọ ga-adịrị ha mfe ịghara ime ihe ndị megidere ihe Onyeàmà ahụ merela agadi kweere.

Anyị na ndị na-arụ ebe ahụ nwekwara ike ịdị ná mma ma ọ bụrụ na anyị agwa ha ka anyị nyere ha aka rụọ ọrụ ndị dị mfe. N’ebe ụfọdụ a na-elekọta ndị agadi, ụkọ ndị ọrụ na-eme ka a ghara ilekọta ndị agadi nke ọma. Rébecca, bụ́ onye nọọsụ, kwuru, sị: “Oge nri na-agba anyị ọsụsọ. N’ihi ya, oge nri nwere ike ịbụ oge kasị mma mmadụ ịbịa leta enyi ya ma nye aka inye ya nri.” Anyị ekwesịghị ịla azụ ịjụ ndị na-arụ n’ebe ahụ ebe ha ga-achọ ka e nyere ha aka.

Ọ bụrụ na anyị na-aga n’ebe ahụ a na-elekọta ndị agadi ugboro ugboro, anyị ga-enwe ike ịma ihe ndị dị nwanna anyị nọ n’ebe ahụ mkpa, anyị nweziri ike ịnara ikike n’aka ndị na-arụ n’ebe ahụ ma meere ha ihe ndị ahụ na-echeghị ka a gwa anyị agwa. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iji foto ndị onye ahụ hụrụ n’anya ma ọ bụ ihe ụmụaka sere chọọ ime ụlọ onye ahụ mma. Iji gosi na anyị bu ọdịmma onye ahụ n’obi, anyị nwere ike iwetara ya uwe mwụda mara mma ma ọ bụ ncha na ude na ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na a kụrụ okooko osisi n’ebe ahụ a na-elekọta ndị agadi, ànyị nwere ike ịkpọrọ ya pụọ èzí ka ọ naratụ ikuku ndụ? Laurence, onye a kpọtụburu aha, kwuru, sị: “Madeleine na-atụsi anya ọbịbịa m ike kwa izu. Mgbe m kpọ ụmụaka bịa, ọ na-amalite ịmụmụ ọnụ ọchị, ihu ya na-egbukepụkwa!” Ime ihe ndị yiri nke a ga-agba ndị bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi ume nke ukwuu.—Ilu 3:27.

Ọ Na-abara Onye Ọ Bụla Uru

Ileta onye agadi mgbe niile pụrụ ịnwale “ma ịhụnanya [anyị] ọ̀ bụ nke ezigbo ya.” (2 Kọr. 8:8) Olee otú ọ ga-esi mee nke a? Ọ na-agbawa obi ịhụ enyi anyị ka o ji nke nta nke nta na-agbada. Laurence kwuru, sị: “Ná mmalite, otú ọrịa si mee ka ume gwụ Madeleine metụrụ m nnọọ n’ahụ́ nke na m na-ebe ákwá mgbe ọ bụla m gara leta ya. Ma achọpụtara m na ikpesi ekpere ike pụrụ inyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ ma na-agbakwu ha ume.” Ruo ọtụtụ afọ, Robert na-eleta otu nwanna nwoke bụ́ Larry, onye na-arịa ọrịa ọjọọ na-akụrisị ahụ́. Robert kwuru, sị: “Ọrịa a biri Larry aka ọjọọ nke na enweghịzi m ike ịghọta otu mkpụrụ ihe ọ na-ekwu. Ma mgbe ọ bụla mụ na ya kpekọrọ ekpere ọnụ, m na-achọpụta na okwukwe ya ka siri ike.”

Mgbe anyị letara ụmụnna anyị ndị merela agadi, ọ bụghị naanị na anyị na-enyere ha aka, anyị onwe anyị na-eritekwa uru. Mkpebi siri ike ha mere ịnọ Jehova nso n’agbanyeghị na ha bi n’etiti ndị si n’okpukpe ndị dịgasị iche na-akụziri anyị inwe okwukwe na obi ike. Otú agụụ nri ime mmụọ ka si na-agụsi ha ike n’agbanyeghị na ha adịghịzi anụ ihe, ma ọ bụ na-ahụ ụzọ nke ọma, na-egosi na “ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Mat. 4:4) Ka anyị na-ahụ otú obere ihe, dị ka ọchị ụmụaka na nri anyị so ha rie si eme ha obi ụtọ, ọ na-echetara anyị inwe afọ ojuju n’ihe ndị anyị nwere. Otú ha si hụ ihe ime mmụọ n’anya pụrụ inyere anyị aka ibute ihe ndị kwesịrị ekwesị ụzọ.

N’ezie, ọgbakọ dum na-erite uru site n’inyere ndị agadi aka. N’ihi gịnị? Ebe ọ bụ na ndị na-adịghị ike na-achọ nnọọ ka a na-egosi ha ịhụnanya ụmụnna mgbe niile, ha na-eme ka ndị nọ n’ọgbakọ nwee ihe ga-eme ka ha na-egosikwu ọmịiko. N’ihi ya, anyị niile kwesịrị iwere ilekọta ndị agadi, ọ bụrụgodị ruo ogologo oge, dị ka ụzọ anyị si ejere ndị ọzọ ozi. (1 Pita 4:10, 11) Ọ bụrụ na ndị okenye ebute ụzọ na nke a, ha ga-enyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka ịhụ na e kwesịghị ileghara ọrụ a dịịrị anyị dị ka Ndị Kraịst anya. (Ezik. 34:15, 16) Ka anyị ji obi ọcha na ịhụnanya na-elekọta ụmụnna anyị ndị merela agadi, anyị na-eme ka obi sie ha ike na e chefughị ha!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ozugbo odeakwụkwọ ọgbakọ matara na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ha akwagala n’ebe a na-elekọta ndị agadi bụ́ nke na-anọghị n’ógbè ha, ọ ga-akacha mma ka o mee ka ndị okenye nọ n’ebe ahụ mara ozugbo, nke a na-egosi na a hụrụ ha n’anya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]

“Ọ bụrụ na ndị na-arụ n’ebe a na-elekọta ndị agadi achọpụta onye ndị mmadụ na-abịakarị eleta, ha na-elebakwuru onye ahụ anya”

[Foto dị na peeji nke 26]

Ekpere anyị si n’obi nwere ike ime ka ahụ́ ruo Onyeàmà merela agadi ala

[Foto dị na peeji nke 26]

Iji obiọma egosi ụmụnna anyị ndị merela agadi na anyị hụrụ ha n’anya na-ewusi ha ike