Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jọn

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jọn

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jọn

JỌN—“onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ onye Jizọs hụrụ n’anya”—bụ onye ikpeazụ ji ike mmụọ nsọ dee akụkọ ndụ Kraịst na otú o si jee ozi ya. (Jọn 21:20) E dere akwụkwọ a ihe dị ka n’afọ 98 O.A., a kọrọ ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-akọghị n’Oziọma atọ ndị nke ọzọ n’Oziọma Jọn a.

Jọn onyeozi nwere kpọmkwem ihe o bu n’obi dee Oziọma a. Mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ndị o dere, ọ sịrị: “Ma e dere ihe ndị a ka unu wee kwere na Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, ka unu wee nwee ndụ site n’aha ya n’ihi na unu kweere.” (Jọn 20:31) Ihe o dere n’akwụkwọ ya baara anyị nnọọ uru n’ezie.—Hib. 4:12.

“LEE NWA ATỤRỤ CHINEKE”

(Jọn 1:1–11:54)

Ozugbo Jọn Onye Na-eme Baptizim hụrụ Jizọs, o ji obi ike kwuo, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa!” (Jọn 1:29) Ka Jizọs na-agagharị n’ime Sameria, Galili, Judia, na obodo ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan—na-ekwusa ozi ọma, na-ezi ihe, na-arụkwa ọtụtụ ọrụ dị ike—‘ọtụtụ ndị bịakwutere ya wee nwee okwukwe n’ebe ọ nọ.’—Jọn 10:41, 42.

Otu n’ime ọrụ ebube kasị pụta ìhè Jizọs rụrụ bụ ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Ọtụtụ mmadụ malitere inwe okwukwe na Jizọs mgbe ha hụrụ ka o mere ka nwoke e liri kemgbe ụbọchị anọ dịghachi ndụ. Ma ndị isi nchụàjà na ndị Farisii gbara izu igbu Jizọs. N’ihi ya, Jizọs pụrụ ma gawa “n’obodo ndị dị nso n’ala ịkpa, banye n’otu obodo a na-akpọ Ifrem.”—Jọn 11:53, 54.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:35, 40—Ònye bụ onye na-eso ụzọ ahụ ya na Jọn Onye Na-eme Baptizim guzo ma e wezụga Andru? Mgbe ọ bụla onye kọrọ ihe a na-ekwu maka Jọn Onye Na-eme Baptizim ọ na-akpọ ya “Jọn,” ọ dịghị ebe ọ bụla ọ kpọrọ onwe ya aha n’Oziọma ya. N’ihi ya, o yiri ka onye na-eso ụzọ ahụ a na-akpọghị aha ya ọ̀ bụ Jọn onye dere Oziọma Jọn.

2:20—Olee ụlọ nsọ nke e ji “afọ iri anọ na isii wuo”? Ihe ndị Juu ahụ na-ekwu okwu ya bụ mwugharị Eze Herọd nke Judia wugharịrị ụlọ nsọ ahụ Zerubabel wuru. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kọọ, a malitere ịrụgharị ya n’afọ nke iri na asatọ ka Herọd malitesịrị ịchị, ma ọ bụ n’ihe dị ka n’afọ 18 ma ọ bụ 17 T.O.A. E ji afọ asatọ rụgharịa ebe nsọ nke ụlọ nso ahụ na akụkụ ya ndị ọzọ bụ́ isi. Ma ọrụ nọgidere na-aga n’ihu n’ụlọ ndị ọzọ dị n’ụlọ nsọ ahụ gafee oge Ememme Ngabiga nke afọ 30 O.A., bụ́ mgbe ndị Juu ahụ kwuru na e ji iri afọ anọ na isii wuo ya.

5:14—Ọ̀ bụ mmehie mmadụ mere na-akpatara onye ahụ ọrịa? Ọ bụchaghị ya. Ihe mere nwoke ahụ Jizọs gwọrọ ji na-arịa ọrịa kemgbe afọ iri atọ na asatọ bụ ezughị okè o ketara n’aka Adam. (Jọn 5:1-9) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ugbu a e meerela nwoke ahụ ebere, na o kwesịrị ịnọgide na-eso ụzọ nzọpụta ma ghara ịma ụma na-eme mmehie ka ihe ka ọrịa njọ ghara ịdakwasị ya. Nwoke ahụ nwere ike ime mmehie a na-agaghị agbaghara ya, nke ga-eme ka ọ nwụọ n’enweghị olileanya ibilite n’ọnwụ.—Mat. 12:31, 32; Luk 12:10; Hib. 10:26, 27.

5:24, 25—Olee ndị bụ ndị ahụ ‘si n’ọnwụ gafere ná ndụ’? Jizọs na-ekwu banyere ndị nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ ma mgbe ha nụrụ okwu ya, ha enwee okwukwe na Jizọs ma kwụsị ịdị na-eme mmehie. Ha ‘si n’ọnwụ gafere ná ndụ’ n’ụdị na a maghịzikwa ha ikpe ọnwụ, kama, e nyeziri ha olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ihi okwukwe ha nwere na Chineke.—1 Pita 4:3-6.

5:26; 6:53—Gịnị ka mmadụ inwe ‘ndụ n’ime onwe ya’ pụtara? Jizọs Kraịst inwe ndụ n’ime onwe ya pụtara na Chineke enyela ya ikike ime ihe abụọ—ikike ime ka ụmụ mmadụ na Jehova dịrị ná mma na ikike inye ha ndụ site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ‘inwe ndụ n’ime onwe ha’ pụtara ha inweta ndụ ebighị ebi. Ndị Kraịst e tere mmanụ na-enweta ya mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ ha agaa biri n’eluigwe. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ga-enweta ndụ zuru ezu naanị ma ha gafee ule ikpeazụ ahụ bụ́ nke ga-ewere ọnọdụ ozugbo Ọchịchị Puku Afọ Kraịst gasịrị.—1 Kọr. 15:52, 53; Mkpu. 20:5, 7-10.

6:64—Jizọs ọ̀ maara na ọ bụ Judas Iskarịọt ga-arara ya nye mgbe ahụ ọ na-ahọro ụmụazụ ya? O doro anya na ọ maghị. Ma n’otu oge n’afọ 32 O.A., Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Otu onye n’ime unu bụ onye nkwutọ.” O nwere ike bụrụ na n’oge a, Jizọs achọpụtawala na Judas Iskarịọt ‘amalitewela’ ime omume ọjọọ.—Jọn 6:66-71.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

2:4. Ihe Jizọs na-agwa Meri bụ na ebe ọ bụ na ya bụ Ọkpara Chineke e mere baptizim ma jiri mmụọ nsọ tee mmanụ, na ọ bụ Nna ya nke eluigwe kwesịrị ịgwa ya ihe ndị ya kwesịrị ime. Ọ bụ eziokwu na Jizọs ka na-amalite ozi ya amalite, ọ maara oge awa, ma ọ bụ oge o kwesịrị ịrụ ọrụ ya nke gụnyere ọnwụ ọ gaje ịnwụ iji chụọ àjà. O kweghịdị ka nne ya bụ́ Meri tinye ọnụ n’otú ọ ga-esi emezu nzube Chineke. Anyị onwe anyị kwesịrị ikpebisikwa ike ife Jehova Chineke n’otu aka ahụ.

3:1-9. Akụkọ banyere Nikọdimọs, onye bụ́ otu n’ime ndị na-achị ndị Juu, kụziiri anyị ihe abụọ dị mkpa. Nke mbụ, Nikọdimọs gosiri na ya dị umeala n’obi, ma nwee nghọta, gosikwa na ya maara mkpa ime mmụọ ya, ghọtakwa na nwa ọkwa nkà na-enweghị ihe ọ bụ bụ onye ozizi Chineke zitere. Taa, ọ dịkwa mkpa ka ezi Ndị Kraịst dị umeala n’obi. Nke abụọ, Nikọdimọs aghọghị onye na-eso ụzọ Kraịst mgbe Jizọs ka nọ n’ụwa. Ikekwe ihe kpatara ya bụ n’ihi na ọ na-atụ egwu mmadụ, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ọ chọrọ ịnọgide ná nnukwu ọkwá o nwere na Sanhedrin, ma ọ bụkwanụ n’ihi akụnụba ya. Nke a na-akụziri anyị ihe bara ezigbo uru: Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị a e kwuru okwu ha mee ka anyị ghara ‘ibuli osisi ịta ahụhụ anyị ma nọgide na-eso Jizọs.’—Luk 9:23.

4:23, 24. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nabata ofufe anyị, ọ ga ekwekọrịrị n’eziokwu dị n’ime Baịbụl, ọ ga-abụkwa nke mmụọ nsọ na-eduzi.

6:27. Ịrụ ọrụ iji nweta “nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi” bụ mmadụ ịgbalị igbo mkpa ime mmụọ ya. Anyị ga-enwe obi ụtọ ma anyị mee nke a.—Mat. 5:3.

6:44. Jehova n’onwe ya na-elekọta anyị. Ọ na-eji ozi ọma a na-ekwusa adọta anyị n’ebe Ọkpara ya nọ. Ụzọ ọzọ o si adọta anyị n’ebe Ọkpara ya nọ bụ site n’iji mmụọ nsọ Ya enyere anyị aka ịghọta eziokwu na ime ihe ndị anyị na-amụta.

11:33-36. Mmadụ ibe ákwá apụtaghị na onye ahụ adịghị ike.

‘NA-ESO YA’

(Jọn 11:55–21:25)

Ka Ememme Ngabiga nke afọ 33 O.A. na-eru nso, Jizọs gaghachiri Betani. Na Naịsan 9, o rutere Jeruselem, na-anọkwasị n’elu nwa ịnyịnya ibu. Na Naịsan 10, Jizọs bịakwara n’ụlọ nsọ ahụ ọzọ. Mgbe o kpere ekpere ka Nna ya mee ka aha ya dị ebube, otu olu siri n’eluigwe kwuo, sị: “Emewo m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”—Jọn 12:28.

Ka ha nọ na-eme Ememme Ngabiga ahụ, Jizọs gwara ụmụazụ ya okwu ikpeazụ ma kpee ekpere maka ha. Ka a kpụrụsịịrị ya, kpee ya ikpe, ma gbuo ya, a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

14:2—Olee otú Jizọs ga-esi ‘kwadebere’ ụmụazụ ya ndị kwesịrị ntụkwasị obi ebe n’eluigwe? Nke a ga-agụnye Jizọs ime ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malite ọrụ site n’ịga n’ihu Chineke ma gosi Ya uru ọbara ya bara. Nkwadebe ahụ ga-agụnyekwa Kraịst ịnata ikike ịchị achị, nke a gasịa, a malite ịkpọlite ụmụazụ ya ndị e tere mmanụ ka ha nwee ike ịga n’eluigwe.—1 Tesa. 4:14-17; Hib. 9:12, 24-28; 1 Pita 1:19; Mkpu. 11:15.

19:11—Ọ̀ bụ Judas Iskarịọt ka Jizọs na-ekwu okwu ya mgbe ọ gwara Paịlet banyere onye nyefere ya onwe ya bụ́ Jizọs n’aka Paịlet? Kama ikwu kpọmkwem na ọ bụ Judas ma ọ bụ otu onye ọzọ, o yiri ka ihe Jizọs bu n’obi ọ̀ bụ ndị niile so kpaa nkata igbu ya. Nke a gụnyere Judas, “ndị isi nchụàjà na Sanhedrin dum,” na ọbụna “ìgwè mmadụ ahụ” a kpaliri ikwu ka a hapụrụ ha Barabas.—Mat. 26:59-65; 27:1, 2, 20-22.

20:17—Gịnị mere Jizọs ji gwa Meri Magdalin ka ọ kwụsị ịrapara ya n’ahụ́? O nwere ike ihe mere Meri ji rapara Jizọs n’ahụ́ bụ́ n’ihi na o chere na ọ na-achọ ịgbago n’eluigwe nakwa na ya agaghị ahụ ya anya ọzọ. Ma iji mee ka obi sie ya ike na ya agbagowebeghị eluigwe, Jizọs gwara ya ka ọ kwụsị ịrapara ya n’ahụ́ kama ka ọ gaa gwa ndị na-eso ụzọ ya na ya esila n’ọnwụ bilie.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

12:36. Iji bụrụ “ụmụ nke ìhè,” ma ọ bụ ndị na-enye ìhè, anyị kwesịrị ịmụta eziokwu nke Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl. Anyị ga-ejizi ihe ndị ahụ anyị mụtara dọpụta ndị ọzọ n’ọchịchịrị ime mmụọ ma kpọbata ha n’ìhè nke Chineke.

14:6. Ọ bụ naanị site n’aka Jizọs Kraịst ka anyị na Chineke ga-esi dị ná mma. Naanị site n’inwe okwukwe na Jizọs ma gbasoo ihe nlereanya ya ka anyị ga-enwe ike ịbịaru Jehova nso.—1 Pita 2:21.

14:15, 21, 23, 24; 15:10. Irube isi n’iwu Chineke ga-enyere anyị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke nakwa n’ịhụnanya nke Ọkpara ya.—1 Jọn 5:3.

14:26; 16:13. Mmụọ Jehova na-akụziri anyị ihe ma na-echetara anyị ihe ndị anyị mabu. Ọ na-ekpughekwara anyị eziokwu. N’ihi ya, ọ pụrụ inyere anyị aka inwekwu ihe ọmụma, amamihe, nghọta, nyekwara anyị aka ime mkpebi ziri ezi, ma nwee ikike iche echiche nke ọma. Ya mere, anyị kwesịrị ịnọgidesi ike n’ekpere, na-arịọ kpọmkwem ka e nye anyị mmụọ ahụ.—Luk 11:5-13.

21:15, 19. A jụrụ Pita ma ọ hụrụ Jizọs n’anya karịa “ihe ndị a,” ya bụ́, azụ̀ ndị ahụ wụsa n’ihu ha. Jizọs si otú a mee nnọọ ka Pita ghọta mkpa ọ dị ịhọrọ iji oge ya niile jeere ya ozi kama ịchọ iji igbu azụ̀ mere aka ọrụ. Ugbu a anyị tụlesịrị Oziọma anọ ndị ahụ e dere banyere Jizọs, ka anyị nọgidesie ike ná mkpebi anyị mere ịhụ Jizọs n’anya karịa ihe ọ bụla nwere ike ịdọpụ uche anyị. Ee, ka anyị jiri obi anyị niile nọgide na-eso ya.

[Foto dị na peeji nke 31]

Olee ihe anyị nwere ike isi n’akụkọ banyere Nikọdimọs mụta?