Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jụ “Ihe Ndị Na-abaghị Uru”

Jụ “Ihe Ndị Na-abaghị Uru”

Jụ “Ihe Ndị Na-abaghị Uru”

“Onye na-achụso ihe ndị na-abaghị uru enweghị uche.”—ILU 12:11.

1. Olee ihe ụfọdụ dị oké ọnụ ahịa anyị nwere, oleekwa ihe kacha mma anyị nwere ike iji ha mee?

Ọ DỊGHỊ Onye Kraịst na-enweghị ihe ndị dị oké ọnụ ahịa. Ihe ndị a nwere ike ịgụnye inwetụ ezi ahụ́ ike na ume, ọgụgụ isi, ma ọ bụ akụnụba. Ebe ọ bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, obi na-adị anyị ụtọ iji ihe ndị a na-ejere ya ozi, si otú a na-eme ihe a e dere site n’ike mmụọ nsọ, nke na-asị: “Jiri ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ Jehova.”—Ilu 3:9.

2. Olee ịdọ aka ná ntị Baịbụl nyere banyere ihe ndị na-abaghị uru, oleekwa ihe ịdọ aka ná ntị a pụtara n’ụzọ nkịtị?

2 Ma Baịbụl kwukwara banyere ihe ndị na-abaghị uru ma dọọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara imefusị ihe niile anyị nwere iji nweta ha. Lee ihe Ilu 12:11 kwuru banyere nke a: “Onye na-akọ ubi ya ga-eriju ihe oriri afọ, ma onye na-achụso ihe ndị na-abaghị uru enweghị uche.” O sighị ike ịghọta ihe ilu ahụ pụtara n’ụzọ nkịtị. Ọ bụrụ na nwoke ejiri oge ya na ume ya na-arụsị ọrụ ike iji lekọta ezinụlọ ya, o yiri ka ha ga-enwe ego ha ga-eji egbo mkpa ha. (1 Tim. 5:8) Ma ọ bụrụkwanụ na o jiri oge ya na ume ya na-achụ ihe ndị na-abaghị uru, ọ na-egosi na o “nweghị uche,” ya bụ na o nweghị ezi amamihe na nzube ná ndụ. O yikarịrị ka ihe ndị dị nwoke dị otú a mkpa ọ̀ ga-akọ ya.

3. Olee otú ịdọ aka ná ntị ahụ dị na Baịbụl banyere ihe ndị na-abaghị uru si metụta ofufe anyị na-efe Jehova?

3 Gịnịkwanụ ka ilu ahụ pụtara mgbe a bịara n’ihe banyere ofufe anyị na-efe Jehova? Anyị na-achọpụta na obi na-eru Onye Kraịst ọ bụla ji obi ya dum nọgide jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi ala. Obi siri ya ike na Jehova ga-agọzi ya ugbu a, o nwekwara olileanya siri ike na ihe ga-adịrị ya mma n’ọdịnihu. (Mat. 6:33; 1 Tim. 4:10) Ma Onye Kraịst nke ihe ndị na-abaghị uru dọpụrụ uche ya na-emebi mmekọrịta ya na Jehova, na-emekwa ka olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi funahụ ya. Olee otú anyị ga-esi zere nke a? Anyị kwesịrị ịchọpụta ihe ndị “na-abaghị uru” ná ndụ anyị ma kpebisie ike ịhapụ ha.—Gụọ Taịtọs 2:11, 12.

4. Oleecha ihe ndị a gụnyere n’ihe ndị na-abaghị uru?

4 Oleedị ihe bụ́ ihe ndị a na-abaghị uru? Ọ bụrụ na anyị eleruo ha anya, ha nwere ike ịbụ ihe ọ bụla na-egbochi anyị iji obi anyị niile na-ejere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgụnye ụdị ntụrụndụ dị iche iche. N’eziokwu, ntụrụndụ bara uru ruo n’ókè ụfọdụ. Ma ọ bụrụ na anyị e jiri oge dị ukwuu “na-atụrụ ndụ” ma na-eleghara ihe ndị gbasara ofufe anyị na-efe Jehova anya, ntụrụndụ na-aghọzi ihe na-abaghị uru, bụ́ nke nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Jehova. (Ekli. 2:24; 4:6) Iji nwee ike izere nke a ime, Onye Kraịst na-eji nlezianya ama otú ọ ga-esi eji oge ya eme ihe ndị bara uru. (Gụọ Ndị Kọlọsi 4:5.) E nwekwara ihe ndị ọzọ na-abaghị uru kadị ntụrụndụ njọ. Otu n’ime ha bụ chi ụgha.

Jụ Chi Ndị Na-abaghị Uru

5. Olee otú Baịbụl si akọwakarị okwu ahụ bụ́ ihe “na-abaghị uru”?

5 Ọ na-akpali mmasị ịmara na n’ọtụtụ ebe okwu ahụ bụ́ ihe “na-abaghị uru” pụtara na Baịbụl, ọ bụ chi ụgha ka a na-ekwu maka ya. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara Izrel, sị: “Unu emerela onwe unu chi na-abaghị uru, unu eguzobekwarala onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị ma ọ bụ ogidi nsọ, unu edebela nkume a tụrụ ihe oyiyi na ya n’ala unu ka unu na-akpọ isiala n’ihu ya.” (Lev. 26:1) Eze Devid dere, sị: “N’ihi na Jehova dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya, e kwesịrị ịtụ ya egwu karịa chi niile ọzọ. N’ihi na chi niile nke ndị dị iche iche bụ chi na-abaghị uru. Ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe.”—1 Ihe 16:25, 26.

6. Gịnị mere na chi ụgha enweghị ike imeli ihe ọ bụla?

6 Devid gosiri na e nwere ọtụtụ ihe ndị gbara anyị gburugburu bụ́ ndị na-egosi na Jehova dị ukwuu. (Ọma 139:14; 148:1-10) Ọ bụụrụ ụmụ Izrel ihe ùgwù iso Jehova gbaa ndụ! Lee nnọọ ka ha si daa iberibe ịgbakụta Jehova azụ ma na-akpọrọ ihe ndị a kpụrụ akpụ na ogidi nsọ isi ala! N’oge e nwere nsogbu, chi ụgha ha emelighị ihe ọ bụla, ha enweghịdị ike ichebe onwe ha ma ya fọdụzie ichebe ndị na-efe ha ofufe.—Ikpe 10:14, 15; Aịza. 46:5-7.

7, 8. Olee otú “Akụnụba” pụrụ isi ghọọ chi?

7 N’ọtụtụ ebe taa, ndị mmadụ ka na-akpọrọ ihe ndị a kpụrụ akpụ isi ala, chi ndị a a kpụrụ akpụ abaghị uru ọ bụla taa dị nnọọ ka ha na-abaghị n’oge ndị gara aga. (1 Jọn 5:21) Ma e wezụga ihe ndị a kpụrụ akpụ, e nwere ihe ndị ọzọ Baịbụl kpọrọ chi. Dị ka ihe atụ, tụlegodị ihe a Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”—Mat. 6:24.

8 Olee otú “Akụnụba” pụrụ isi ghọọ chi? Ka anyị weregodị otu nnukwu nkume tọgbọ n’ala n’Izrel oge ochie dị ka ihe atụ. E nwere ike iji nkume dị otú a rụọ ụlọ ma ọ bụ mgbidi. Ma ọ bụrụ na a kwụwa ya dị ka “ogidi nsọ” ma ọ bụ dị ka “nkume a tụrụ ihe oyiyi na ya,” ọ na-aghọrọ ndị Jehova ihe ịsụ ngọngọ. (Lev. 26:1) N’otu aka ahụ, ego bara uru. Ọ bara uru iji ya akpata ihe ndị anyị ji ebi ndụ, anyị nwekwara ike iji ya mee ihe ndị bara uru n’ozi Jehova. (Ekli. 7:12; Luk 16:9) Ma ọ bụrụ na anyị ebute ịchụ ego ụzọ kama ibute ozi Chineke ụzọ, ọ pụtaziri na ego aghọọrọla anyị chi. (Gụọ 1 Timoti 6:9, 10.) N’ụwa a ndị mmadụ na-achụ ego ka a na-anwụ anwụ, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-ele ya anya otú kwesịrị ekwesị.—1 Tim. 6:17-19.

9, 10. (a) Olee otú Onye Kraịst si ewere agụmakwụkwọ? (b) Olee ihe ize ndụ dị n’agụmakwụkwọ dị elu?

9 Ihe ọzọ bara uru nke nwekwara ike ịghọ ihe na-abaghị uru bụ agụmakwụkwọ. Anyị chọrọ ka ụmụ anyị gaa akwụkwọ nke ọma ka ha wee nwee ike ịkpata ihe ha ga-eji elekọta onwe ha. Nke ka mkpa bụ na Onye Kraịst gụrụ akwụkwọ nke ọma ga-enwe ike ịgụ Baịbụl ma ghọta ya, chebara nsogbu ndị bịaara ya echiche ma mara ihe ọ ga-eme banyere ha. Ọ ga-enwekwa ike ịkụzi eziokwu Baịbụl otú ọ ga-edo ndị ọ na-akụziri ya anya ma mee ka ha kwere. Ọ na-ewe oge iji gụọ akwụkwọ nke ọma, ma oge niile ahụ efughị ọhịa.

10 Oleekwanụ maka ịga ụlọ akwụkwọ dị elu dị ka pọliteknik ma ọ bụ mahadum? Ọtụtụ ndị weere nke a dị ka ihe na-eme ka mmadụ nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ. Ma ọtụtụ ndị gụrụ ụdị akwụkwọ a na-eji amamihe nke ụwa, bụ́kwanụ nke dị ize ndụ, kpojuo uche ha. Ụdị agụmakwụkwọ a na-eme ka onye na-eto eto tụfuo oge ndị bara uru ọ gaara eji jeere Jehova ozi. (Ekli. 12:1) Ikekwe ọ bụ ya mere na ná mba ebe ọtụtụ ndị gụrụ ụdị akwụkwọ a, ọ bụ mmadụ ole na ole na-ekwere na e nwere Chineke. Kama ilewe agụmakwụkwọ dị elu anya dị ka ihe na-eme ka mmadụ nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ, Onye Kraịst na-atụkwasị Jehova obi.—Ilu 3:5.

Ekwela Ka Ọchịchọ Anụ Ahụ́ Ghọọrọ Gị Chi

11, 12. Gịnị mere Pọl ji kwuo banyere ụfọdụ ndị, sị: “Afọ ha bụ chi ha”?

11 N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Filipaị, o kwuru otu ihe nwere ike ịghọrọ mmadụ chi. O kwuru banyere ụfọdụ ndị bụ́bu Ndị Kraịst ibe ya, sị: “E nwere ọtụtụ ndị, m na-ekwu banyere ha mgbe mgbe n’oge gara aga, ma ugbu a, eji m ákwá na-ekwu banyere ha, ya bụ, ndị na-eje ije dị ka ndị iro nke osisi ịta ahụhụ nke Kraịst, ọgwụgwụ ha bụ mbibi, chi ha bụ afọ ha, . . . ha na-atụkwasịkwa uche ha n’ihe ndị dị n’ụwa.” (Fil. 3:18, 19) Olee otú afọ mmadụ pụrụ isi ghọọrọ ya chi?

12 O yiri ka ihe ka ndị ahụ Pọl kwuru okwu ha mkpa bụ imeju ọchịchọ anụ ahụ́ ha kama iso Pọl na-ejere Jehova ozi. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha erigidela nri ribiga ya okè ma ọ bụ ṅụgide mmanya ṅụbiga ya okè. (Ilu 23:20, 21; tụlee Diuterọnọmi 21:18-21.) O nwekwara ike ịbụ na ndị ọzọ tinyere isi n’ịchụ ihe nke ụwa ndị e nwere na narị afọ mbụ nke na ihe ndị a dọpụrụ ha n’ozi Jehova. Ka anyị ghara ikwe ka ọchịchọ ibi ụdị ndụ a sịrị na ọ bụ ikpori ndụ mee ka anyị kwụsị iji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi.—Kọl. 3:23, 24.

13. (a) Gịnị bụ anyaukwu, oleekwa otú Pọl si kọwaa ya? (b) Olee otú anyị pụrụ isi zere anyaukwu?

13 Pọl kwukwara otú ọzọ e si ekpere arụsị. O dere, sị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.” (Kọl. 3:5) Anyaukwu bụ mmadụ inwe oké ọchịchọ inweta ihe ọ na-enweghị. Ọ pụrụ ịbụ oké ọchịchọ inweta ihe onwunwe. O nwedịrị ike ịgụnye agụụ mmekọahụ rụrụ arụ. (Ọpụ. 20:17) Ọ́ bụghị ihe e kwesịrị ichebara echiche na e kwuru na ọchịchọ ndị dị otú a bụ ikpere arụsị, ya bụ, ife chi ụgha? Jizọs ji ihe atụ kọwaa mkpa ọ dị mmadụ ime ihe niile o nwere ike ime iji chịkwaa ọchịchọ ndị a rụrụ arụ.—Gụọ Mak 9:47; 1 Jọn 2:16.

Zere Okwu Na-abaghị Uru

14, 15. (a) Olee “ihe ndị na-abaghị uru” bụ́ ndị mere ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ n’oge Jeremaya? (b) Gịnị mere okwu Mozis ji bụrụ okwu ndị bara uru?

14 Okwu ọnụ nwekwara ike iso n’ihe ndị na-abaghị uru. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara Jeremaya, sị: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m. Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu. Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.” (Jere. 14:14) Ndị amụma ụgha a na-asị na ha na-ebu amụma n’aha Jehova, ma ihe ha na-ebu n’amụma bụ echiche na amamihe nke onwe ha. N’ihi ya, okwu ha bụ “ihe na-abaghị uru.” Ha abaghị n’ihe, ha na-emebikwa mmekọrịta mmadụ na Chineke. Na 607 T.O.A., ọtụtụ ndị gere ntị n’okwu ndị ahụ na-abaghị uru nwụrụ ọnwụ ike n’aka ndị agha Babịlọn.

15 Ma, Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Tinyenụ okwu niile m na-agwa unu iji dọọ unu aka ná ntị taa n’obi unu . . . N’ihi na ọ bụghịrị unu okwu na-abaghị uru, kama ọ bụ ndụ unu, unu ga-esitekwa n’okwu a mee ka ụbọchị unu dị ogologo n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.” (Diut. 32:46, 47) Ee, ọ bụ Chineke gwara Mozis ihe o kwuru. N’ihi ya, ha bara uru, ha dị oké mkpa n’ezie n’ihi na ha bụ maka ọdịmma nke mba ahụ. Ndị gere ntị n’okwu ya biri ogologo ndụ, ihe gakwaara ha nke ọma. Ka anyị na-ajụ okwu ndị na-abaghị uru mgbe niile ma na-aṅa ntị n’eziokwu ndị bara uru.

16. Olee otú anyị si ele ihe ndị ọkà mmụta sayensị kwuru bụ́ ndị na-ekwekọghị n’Okwu Chineke anya?

16 Ànyị na-anụ ka a na-ekwu okwu ndị na-abaghị uru taa? Ee. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na ozizi evolushọn na ihe ọmụmụ sayensị ndị ọzọ gosiri na ọ dịghịzi mkpa ikwere na Chineke, na ihe niile pụtaara onwe ha. Ànyị kwesịrị igewe okwu mpako dị otú a? Mbanụ! Amamihe mmadụ dị iche na amamihe Chineke. (1 Kọr. 2:6, 7) Ma, anyị maara na mgbe ọ bụla amamihe mmadụ na nke Chineke na-ekwekọghị, ọ na-abụkarị echiche mmadụ bụ nke na-ezighị ezi. (Gụọ Ndị Rom 3:4.) N’agbanyeghị ọganihu ndị ụmụ mmadụ nwerela n’ihe ụfọdụ, ihe Baịbụl kwuru banyere amamihe mmadụ ka bụkwa eziokwu: “Amamihe nke ụwa a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.” Amamihe mmadụ bụ ihe efu ma e jiri ya tụnyere amamihe Chineke, bụ́ nke na-enweghị ọgwụgwụ.—1 Kọr. 3:18-20.

17. Olee otú e kwesịrị isi na-ele okwu ndị ndú okpukpe Krisendọm na nke ndị si n’ezi ofufe dapụ anya?

17 Okwu ọzọ na-abaghị uru bụ nke a na-anụ n’ọnụ ndị ndú okpukpe Krisendọm. Ha na-asị na ha na-ekwu okwu n’aha Chineke, ma ihe ka ukwuu n’ihe ndị ha na-ekwu esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, ha abaghịkwa uru. Ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwukwa okwu na-abaghị uru, ha na-asịkwa na ha nwere amamihe karịa “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Mat. 24:45-47) Ma, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu okwu site n’amamihe nke onwe ha, okwu ha abaghịkwa uru, ọ bụ ihe ịsụ ngọngọ nye onye ọ bụla na-ege ha ntị. (Luk 17:1, 2) Olee otú anyị ga-esi zere ịbụ ndị ha duhiere?

Otú Anyị Ga-esi Jụ Okwu Ndị Na-abaghị Uru

18. Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe kwekọrọ na ndụmọdụ ahụ dị na 1 Jọn 4:1?

18 Jọn onyeozi merela agadi nyere ndụmọdụ mara mma n’okwu a. (Gụọ 1 Jọn 4:1.) Iji mee ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Jọn, anyị na-agwa ndị anyị na-ekwusara ozi ọma ka ha lee na Baịbụl iji mara ma ihe a na-akụziri ha ọ̀ bụ eziokwu. Anyị onwe anyị kwesịkwara ime otu ihe ahụ. Ọ bụrụ na anyị anụ ihe ọ bụla na-emegide eziokwu ahụ, ma ọ bụ nụ ebe a na-akọta ọgbakọ, ndị okenye, ma ọ bụ nwanna ọ bụla ọzọ, anyị adịghị ekwere ya n’ajụghị ase. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: “Onye a na-agbasa akụkọ a ọ̀ na-eme ihe Baịbụl kwuru? Akụkọ a ọ̀ na-akwado nzube Jehova? Hà na-eme ka udo dị n’ọgbakọ?” Ihe ọ bụla anyị nụrụ nke na-akpasasị òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ kama iwusi ya ike bụ ihe na-abaghị uru.—2 Kọr. 13:10, 11.

19. Olee otú ndị okenye si ahụ na okwu ha abụghị okwu ndị na-abaghị uru?

19 Ndị okenye na-amụtakwa ezigbo ihe n’ihe ndị a e kwuru banyere okwu ndị na-abaghị uru. Mgbe ọ bụla ha na-enye ndụmọdụ, ha kwesịrị icheta na ha bụ ndị na-ezughị okè ma ghara inye ndụmọdụ dabeere n’amamihe nke onwe ha. Ndụmọdụ ha kwesịrị ihiwe isi na Baịbụl. Pọl onyeozi nyere ndụmọdụ bara uru, sị: “Unu agabigala ihe e dere ede.” (1 Kọr. 4:6) Ndị okenye adịghị agabiga ihe ndị e dere na Baịbụl. Nke a pụtakwara na ha adịghị agabiga ndụmọdụ dabeere na Baịbụl ndị e dere n’akwụkwọ ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na-ebipụta.

20. Olee ụzọ ndị e si enyere anyị aka ịjụ ihe ndị na-abaghị uru?

20 Ihe ndị na-abaghị uru—ma hà bụ “chi dị iche iche,” okwu ọnụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ—na-emebi ihe. N’ihi ya, anyị ga na-ekpeku Jehova ekpere mgbe niile ka o nyere anyị aka ịmata ha ma na-arịọ ya ka o zi anyị otú anyị ga-esi jụ ha. Mgbe anyị mere otú ahụ, anyị na-ekwu otu ihe ahụ ọbụ abụ ahụ kwuru mgbe ọ sịrị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru; chebe m ndụ n’ụzọ nke gị.” (Ọma 119:37) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle uru ọ bara ịnakwere nduzi Jehova.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee “ihe ndị na-abaghị uru” ndị anyị kwesịrị ịjụ?

• Olee otú anyị pụrụ isi zere ikwe ka ego ghọọrọ anyị chi?

• Olee otú ọchịchọ anụ ahụ́ pụrụ isi ghọọ ikpere arụsị?

• Olee otú anyị pụrụ isi jụ okwu na-abaghị uru?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 3]

A gwara ndị Izrel ka ha ‘kọọ ala ha,’ ọ bụghị ka ha chụsowe ihe ndị na-abaghị uru

[Foto dị na peeji nke 5]

Ya adịla mgbe ị ga-ekwe ka ọchịchọ inweta ihe onwunwe mee ka ị na-ala azụ n’ozi Jehova

[Foto dị na peeji nke 6]

Okwu ndị okenye nwere ike ịba ezigbo uru