Na-achọ Nduzi Chineke n’Ihe Niile Ị Na-eme
Na-achọ Nduzi Chineke n’Ihe Niile Ị Na-eme
“Chineke a bụ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi. Ya onwe ya ga na-edu anyị ruo mgbe anyị nwụrụ.”—ỌMA 48:14.
1, 2. Gịnị mere anyị ji kwesị iso nduzi Jehova kama ịtụkwasị obi n’amamihe nke onwe anyị, oleekwa ajụjụ ndị na-ebilite?
ANYỊ nwere ike iduhie onwe anyị iche na ihe ndị na-abaghị uru ma ọ bụ ihe ndị na-emerụ ahụ́ bara uru. (Ilu 12:11) Ọ bụrụ nnọọ na anyị achọọ ime ihe na-ekwesịghị ka Onye Kraịst mee, obi anyị na-agwakarị anyị na ọ dịghị njọ ime ya. (Jere. 17:5, 9) N’ihi ya, ọbụ abụ ahụ gosiri na ya maara ihe mgbe o kpegaara Jehova ekpere, sị: “Zipụ ìhè gị nakwa eziokwu gị. Ka ha na-edu m.” (Ọma 43:3) Ọ tụkwasịrị Jehova obi, ọ bụghị n’amamihe nke ya na-ezughị ezu, ọ dịghịkwanụ ebe ọ ga-esi nweta nduzi ga-aka nke Jehova mma. Dị ka ọbụ abụ ahụ mere, ọ ga-adị mma ma anyị legara Chineke anya maka nduzi.
2 Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị nduzi Jehova obi karịa nduzi ọ bụla ọzọ? Olee mgbe anyị kwesịrị ịchọ nduzi Jehova? Olee ụdị àgwà ndị anyị kwesịrị inwe iji wee bụrụ ndị Jehova ga na-eduzi, oleekwa otú Jehova si eduzi anyị taa? A ga-atụle ajụjụ ndị a dị mkpa n’isiokwu a.
Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịtụkwasị Nduzi Jehova Obi?
3-5. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji nnọọ nwee obi ike na nduzi Jehova kacha mma?
3 Jehova bụ Nna anyị nke eluigwe. (1 Kọr. 8:6) Ọ maara onye ọ bụla n’ime anyị nke ọma, ọ makwaara ihe dị anyị n’obi. (1 Sam. 16:7; Ilu 21:2) Eze Devid gwara Chineke, sị: “Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m biliri ọtọ. Ị na-anọ n’ebe dị anya tụlee ihe m na-eche. N’ihi na ọ dịghị okwu dị n’ire m, ma, Jehova, lee! ị marachaala ya.” (Ọma 139:2, 4) Ebe ọ bụ na Jehova maara anyị nnọọ nke ọma, olee ihe mere anyị ga-eji na-enwe obi abụọ na ọ maara ihe ga-akacha adịrị anyị mma? Ihe ọzọkwa bụ na Jehova maara ihe niile. Ọ na-ahụ ihe niile, ọ na-eleba anya n’ihe nke ọma karịa mmadụ ọ bụla, ọ makwaara ihe ndị ga-eme n’ikpeazụ tupu ha emee. (Aịza. 46:9-11; Rom 11:33) Ọ bụ “Chineke, onye naanị ya maara ihe.”—Rom 16:27.
4 Tụkwasị na nke ahụ, Jehova hụrụ anyị n’anya, chọọkwa mgbe niile ka anyị nweta ihe ga-akacha abara anyị uru. (Jọn 3:16; 1 Jọn 4:8) Ebe ọ bụ Chineke na-ahụ n’anya, ọ na-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị. Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa, n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa.” (Jems 1:17) Ndị kwere ka Chineke na-eduzi ha na-erite uru dị ukwuu ná mmesapụ aka ya.
5 Jehova bụkwa onye pụrụ ime ihe niile. Ọbụ abụ ahụ kwuru banyere nke a, sị: “Onye ọ bụla nke bi n’ebe nzuzo nke Onye Kasị Elu ga-enwetara onwe ya ebe obibi na ndò nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. M ga-asị Jehova: ‘Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m ga-atụkwasị obi.’” (Ọma 91:1, 2) Mgbe anyị nakweere nduzi Jehova, anyị na-egosi na anyị na-agbaba na Chineke nke na-apụghị ịda ada. Ọ bụrụgodị na a na-emegide anyị, Jehova ga-enyere anyị aka. Ọ gaghị emechu anyị ihu. (Ọma 71:4, 5; Gụọ Ilu 3:19-26.) Ee, Jehova maara ihe ga-akacha abara anyị uru, ọ chọrọ ka anyị nweta ha, o nwekwara ike ime ka anyị nweta ha. Ọ ga-abụ nnọọ ihe nzuzu ma ọ bụrụ na anyị eleghara nduzi ya anya! Oleekwanụ mgbe nduzi ya na-adị anyị mkpa?
Olee Mgbe Nduzi Dị Anyị Mkpa?
6, 7. Olee mgbe nduzi Jehova dị anyị mkpa?
6 N’ezie, nduzi Chineke dị anyị mkpa ná ndụ anyị niile, site mgbe anyị dị obere ruo mgbe anyị mere agadi. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “N’ihi na Chineke a bụ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi. Ya onwe ya ga na-edu anyị ruo mgbe anyị nwụrụ.” (Ọma 48:14) Dị ka ọbụ abụ ahụ mere, Ndị Kraịst maara ihe na-achọ nduzi Chineke mgbe niile.
7 Ma e nwere oge enyemaka na-akacha adị anyị mkpa. Mgbe ụfọdụ anyị na-anọ “n’oké ihe isi ike,” ikekwe ya abụrụ na a na-akpagbu anyị, anyị a na-arịasi ọrịa ike, ma ọ bụkwanụ a chụọ anyị n’ọrụ. (Ọma 69:16, 17) Mgbe ihe ndị a mere, anyị ga-enweta nkasi obi ma ọ bụrụ na anyị ejekwuru Jehova, na-enwe obi ike na ọ ga-enye anyị ike iji die ha ma duzie anyị otú anyị ga-enwe ike ime mkpebi ndị dị mma. (Gụọ Abụ Ọma 102:17.) Ma, enyemaka ya dịkwa anyị mkpa n’oge ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-ekwusara ndị agbata obi anyị ozi ọma Alaeze ahụ, anyị ga-arụpụta ezigbo ihe naanị ma ọ bụrụ na Jehova eduzie anyị. Mgbe anyị na-achọ ime mkpebi—ma ọ bụ banyere ihe ntụrụndụ, uwe na ejiji, ndị anyị na ha ga na-akpakọrịta, ụdị ọrụ anyị ga-arụ, ókè anyị ga-agụru n’akwụkwọ, ma ọ bụ n’ihe ọ bụla ọzọ—anyị ga-eme mkpebi ziri ezi naanị ma ọ bụrụ na anyị anakwere nduzi Jehova. N’ezie, nduzi dị anyị mkpa n’ihe niile a na-eme ná ndụ.
Nsogbu Ndị Na-apụta Ma Ọ Bụrụ na Anyị Anakwereghị Nduzi Jehova
8. Gịnị ka oriri Iv riri mkpụrụ ahụ a sịrị ha erila pụtara?
8 Ma cheta na anyị kwesịrị ịdị njikere ịnakwere nduzi Jehova. Chineke agaghị amanye anyị ime nke a ma ọ bụrụ na anyị achọghị ime ya. Onye mbụ jụrụ nduzi Jehova bụ Iv, ihe mere ya gosikwara ọdachi mkpebi ọjọọ dị otú ahụ na-akpata. Cheedị ihe ihe ahụ o mere pụtara. Iv riri mkpụrụ ahụ a sịrị ha erila n’ihi na ọ chọrọ ‘ịdị ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.’ (Jen. 3:5) Ihe o mere gosiri na ọ chọrọ iweghara ọrụ dịịrị Chineke, na-ekpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ kama ịnakwere nduzi Jehova. O si otú a jụ ọchịchị Jehova. Ọ chọrọ iduziwe onwe ya. Di ya, bụ́ Adam, sokwara ya nupụ isi.—Rom 5:12.
9. Gịnị ka anyị na-eme mgbe anyị na-ajụ nduzi Jehova, gịnịkwa mere nke ahụ ji bụrụ nnọọ ihe nzuzu?
9 Taa, ọ bụrụ na anyị adịghị anakwere nduzi Jehova, ọ pụtakwara na anyị achọghị ka ọ na-achị anyị. Dị ka ihe atụ, chee banyere onye na-ekirikarị ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ọ bụrụ na ọ nọ n’ọgbakọ, ọ maara ihe Jehova kwuru banyere ihe ndị dị otú ahụ. E kwesịdịghị ịkpọtụ ihe ndị na-adịghị ọcha aha ma ya fọdụzie ịnọ na-ekiri ha. (Efe. 5:3) Onye ahụ ịjụ nduzi Jehova gosiri na ọ chọghị ka Jehova na-achị ya, ya bụ na ọ chọghị ka Jehova bụrụ isi Ya. (1 Kọr. 11:3) Nke ahụ ga-abụ nnọọ ihe nzuzu n’ihi na dị ka Jeremaya kwuru, “ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.”—Jere. 10:23.
10. Gịnị mere anyị ji kwesị iji ikike anyị nwere ịhọrọ ihe anyị ga-eme eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya?
10 E nwere ike ụfọdụ agaghị ekwe ihe a Jeremaya kwuru, na-eche na ebe Jehova nyere anyị ikike ịhọrọ ihe anyị ga-eme, ọ gaghị akatọ anyị ma anyị jiri ikike ahụ mee ihe. Ma, echefula na ikike ahụ bụ onyinye si n’aka Chineke, ọ na-ewetakwa ibu ọrụ. Anyị ga-aza ajụjụ maka ihe ndị anyị họọrọ ikwu na ime. (Rom 14:10) Jizọs kwuru, sị: “Ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” O kwukwara, sị: “N’obi ka echiche ọjọọ, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, si apụta.” (Mat. 12:34; 15:19) N’ihi ya, okwu ọnụ anyị na omume anyị na-egosi ihe dị anyị n’obi. Ha na-egosi onye anyị bụ n’ezie. Nke a mere Onye Kraịst maara ihe ji achọ nduzi Jehova n’ihe niile. Ime otú ahụ na-eme ka Jehova gụọ ya ‘n’onye obi ya ziri ezi’ ma ‘meere ya ihe ọma.’—Ọma 125:4.
11. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe mere n’oge ndị Izrel?
11 Cheta ihe banyere ụmụ Izrel. Jehova chebere mba ahụ mgbe ha họọrọ ime ihe ndị ziri ezi ma rube isi n’iwu ya. (Jọsh. 24:15, 21, 31) Ma ọtụtụ mgbe, ha họọrọ ime ihe ndị na-ezighị ezi. N’oge Jeremaya, Jehova kwuru, sị: “Ma ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala, kama ha jere ije dị ka atụmatụ ha si dị, dị ka isi ike nke dị n’ajọ obi ha si dị, nke mere ha ji na-ala azụ kama ịga ihu.” (Jere. 7:24-26) Nke a dị nnọọ mwute! Ya adịtụla mgbe anyị ga-ajụ nduzi Jehova n’ihi isi ike ma ọ bụ n’ihi na anyị chọrọ ime ihe na-agụ anyị agụụ ma si otú ahụ “na-ala azụ kama ịga ihu”!
Gịnị Dị Mkpa Iji Nakwere Nduzi Chineke?
12, 13. (a) Olee àgwà na-eme ka anyị chọọ iso nduzi Jehova? (b) Gịnị mere okwukwe ji dị oké mkpa?
12 Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-eme ka anyị chọọ ịnakwere nduzi ya. (1 Jọn 5:3) Ma, Pọl kwuru ihe ọzọ dị mkpa mgbe ọ sịrị: “Anyị na-eje ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ.” (2 Kọr. 5:6, 7) Gịnị mere okwukwe ji dị mkpa? Jehova na-edu anyị “n’ụzọ ezi omume,” ma ụzọ ndị ahụ adịghị eduga anyị n’inweta akụnụba na ọkwa dị elu n’ụwa a. (Ọma 23:3) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike na anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ na-enweghị atụ a na-enweta site n’ijere Jehova ozi. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:17, 18.) Okwukwe na-enyekwara anyị aka inwe afọ ojuju n’ihe ndị anyị nwere.—1 Tim. 6:8.
13 Jizọs gosiri na anyị ga-enwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà iji nwee ike ife Jehova ofufe, nke a chọkwara okwukwe n’aka anyị. (Luk 9:23, 24) Ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-efe Jehova achụọla ọtụtụ ihe n’àjà, na-edi ihe isi ike, mmegbu, na ọbụna mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. (2 Kọr. 11:23-27; Mkpu. 3:8-10) Ọ bụ okwukwe siri ike nyeere ha aka idi ihe ndị a ma ka na-enwe ọṅụ. (Jems 1:2, 3) Okwukwe siri ike na-eme ka obi sie anyị nnọọ ike na ọ kacha mma mgbe niile ịgbaso nduzi Jehova. Ọ bụ maka abamuru anyị mgbe niile. Obi siri anyị nnọọ ike na ụgwọ ọrụ ndị nọgidere na-atachi obi ga-enweta ga-akarị nnọọ ahụhụ ọ bụla ga-adị nwa oge ha na-ata.—Hib. 11:6.
14. Gịnị mere Hega ji kwesị ịdị umeala n’obi?
14 Tụleekwa ihe mere umeala n’obi ji dị mkpa iji soro nduzi Jehova. Akụkọ banyere Hega, bụ́ odibo nwaanyị Sera, gosiri na nke a bụ eziokwu. Mgbe Sera na-amụtaghị nwa ruo ogologo oge, ọ kpọnyere Ebreham Hega, Hega tụrụkwara ime n’aka Ebreham. Hega bịaziri wawara nne ya ukwu na-amụtaghị nwa anya. N’ihi ya, Sera ‘malitere iweda ya ala’ nke mere ka Hega gbapụ. Mmụọ ozi Jehova zutere Hega ma gwa ya, sị: “Laghachikwuru nne gị ukwu, wedakwa onwe gị ala n’okpuru ya.” (Jen. 16:2, 6, 8, 9) Ikekwe ọ gaara amasị Hega ma a sị na ọ bụ ihe ọzọ ka a gwara ya mee. Iji nwee ike ime ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya mee, Hega ga-akwụsị ịwa anya. Otú ọ dị, Hega ji obi umeala mee ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya, ọ mụkwara nwa ya bụ́ Ishmel n’ụlọ nna nwa ahụ.
15. Kwuo mgbe ụfọdụ ọ ga-adị mkpa taa ka mmadụ dị umeala n’obi iji nwee ike ịnakwere nduzi Jehova.
15 Nke a pụtara na o nwere ike ịdị mkpa ka anyị dị umeala n’obi iji nakwere nduzi Jehova. Ọ ga-adị mkpa ka ụfọdụ kweta na ụdị ihe ndị ha ji atụrụ ndụ adịghị amasị Jehova. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka Onye Kraịst mejọrọ mmadụ rịọ mgbaghara. O nwekwara ike ịbụ na o mehiela ihe ma kwesị ikweta ihe o mere. Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ mere mmehie dị oké njọ? O kwesịrị ịdị umeala n’obi ma kọọrọ ndị okenye ihe o mere. E nwedịrị ike ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ. Ka e wee nabataghachi onye ahụ, o kwesịrị iji obi umeala chegharịa ma chigharịa. n’Ilu 29:23 na-akasi obi: “Ọ bụ mpako mmadụ ga-eweda ya ala, ma onye dị umeala na mmụọ ya ga-enweta otuto.”
Mgbe ihe ndị a ma ọ bụ ihe ndị ọzọ yiri ha mere, okwu dịOlee Otú Jehova Si Eduzi Anyị?
16, 17. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru dị ukwuu na Baịbụl nke bụ́ ihe bụ́ isi Chineke ji eduzi anyị?
16 Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ ihe bụ́ isi Chineke ji eduzi anyị. (Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.) Ka Okwu ya ahụ wee baara anyị uru, anyị ekwesịghị ichere ruo mgbe anyị nwere nsogbu tupu anyị achọwa enyemaka site n’Akwụkwọ Nsọ. Kama nke ahụ, anyị ga na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. (Ọma 1:1-3) Ọ bụrụ na anyị emee nke a, anyị ga-ama nnọọ ihe ndị dị n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ nke ọma. Echiche anyị ga-abịa kwekọọ na nke Chineke, anyị ga-adịkwa njikere idi ọbụna nsogbu ndị anyị na-atụghịdị anya ha.
17 Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị mkpa ka anyị na-atụgharị uche n’ihe anyị gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ ma na-etinye ya n’ekpere. Mgbe anyị tụgharịrị uche n’amaokwu Baịbụl ndị anyị gụrụ, anyị na-eche otú ihe anyị gụrụ ga-esi baara anyị uru mgbe e nwere nsogbu ụfọdụ. (1 Tim. 4:15) Mgbe anyị nwere nsogbu tara akpụ, anyị na-ekpegara Jehova ekpere, na-arịọ ya ka o nyere anyị aka inweta nduzi dị anyị mkpa. Mmụọ Jehova ga-enyere anyị aka icheta ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị gụtara na Baịbụl ma ọ bụ n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.—Gụọ Abụ Ọma 25:4, 5.
18. Olee ụzọ ndị Jehova si eji òtù ụmụnna anyị eduzi anyị?
18 Òtù ụmụnna anyị bụkwa ebe ọzọ dị mkpa anyị pụrụ ịga iji nweta nduzi Jehova. Akụkụ dị mkpa nke òtù ụmụnna ahụ bụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na Òtù Na-achị Isi na-anọchi anya ya, bụ́ ndị na-enye nri ime mmụọ mgbe niile site n’akwụkwọ ndị ha na-ebipụta, nakwa n’ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche ha na-ahazi. (Mat. 24:45-47; tụlee Ọrụ 15:6, 22-31.) N’òtù ụmụnna a, e nwekwara ụmụnna ndị ọzọ tozuru okè, karịsịa ndị okenye ọgbakọ, bụ́ ndị ruru eru inyere anyị aka na inye ndụmọdụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ. (Aịza. 32:1) Ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nwekwara ebe ọzọ magburu onwe ya ha ga-esi nweta enyemaka. Ndị nne na nna ha kwere ekwe bụ ndị ọzọ Chineke nyere ha, ndị a gwara ha ka ha na-agakwuru mgbe niile maka nduzi.—Efe. 6:1-3.
19. Olee ngọzi ndị anyị na-enweta n’ihi ịnọgide na-achọ nduzi Jehova?
19 Ee, e nwere ọtụtụ ụzọ Jehova si eduzi anyị, ọ ga-adịkwa mma ma anyị nakwere nduzi ya ka ọ baara anyị uru. Mgbe Eze Devid na-ekwu banyere mgbe Izrel kwesịrị ntụkwasị obi, ọ sịrị: “Ọ bụ gị ka nna anyị hà tụkwasịrị obi; ha tụkwasịrị gị obi, i wee na-emere ha ụzọ mgbapụ. Ọ bụ gị ka ha tikuru, ha wee lanahụ; Gị ka ha tụkwasịrị obi, ihere emeghịkwa ha.” (Ọma 22:3-5) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị nduzi Jehova obi ma mee ihe ọ gwara anyị mee, ‘ihere agaghịkwa eme anyị.’ Olileanya anyị ga-emezu. Ọ bụrụ na anyị ‘enyefee ụzọ anyị n’aka Jehova,’ kama ịdabere n’amamihe nke onwe anyị, anyị ga-enweta ngọzi bara ụba ọbụna ugbu a. (Ọma 37:5) Ọ bụrụkwa na anyị anọgide na-erubere Jehova isi, ngọzi ndị anyị ga-enweta ga-adịru ebighị ebi. Eze Devid dere, sị: “Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya, Ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi; . . . Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, Ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 37:28, 29.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Gịnị mere anyị ji atụkwasị nduzi Jehova obi?
• Gịnị ka anyị na-egosi ma ọ bụrụ na anyị ajụ nduzi Jehova?
• Olee mgbe ndị ọ ga-adị mkpa ka Onye Kraịst gosi na ya dị umeala n’obi?
• Olee otú Jehova si eduzi anyị taa?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Ị̀ na-achọ nduzi Jehova n’ihe niile ị na-eme ná ndụ?
[Foto dị na peeji nke 9]
Iv jụrụ ọchịchị Jehova
[Foto dị na peeji nke 10]
Olee àgwà Hega kwesịrị inwe iji nwee ike ime ihe mmụọ ozi gwara ya?