Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto, Na-echetanụ Onye Okike Ukwu Unu Ugbu A

Ndị Na-eto Eto, Na-echetanụ Onye Okike Ukwu Unu Ugbu A

Ndị Na-eto Eto, Na-echetanụ Onye Okike Ukwu Unu Ugbu A

“Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.”—EKLI. 12:1.

1. Olee otú Jehova si egosi na ya tụkwasịrị ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi obi?

JEHOVA na-ele ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ bụ́ Ndị Kraịst anya dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa na dị ka ndị na-enye ume ọhụrụ ka igirigi. N’ezie, o kwuru na n’ụbọchị Ọkpara ya du ‘ndị agha ya na-eje agha,’ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ “ga-eji obi ha wepụta onwe ha” ijere Kraịst ozi. (Ọma 110:3) Amụma a ga-emezu n’oge ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-agaghị na-eme uche Chineke kama ha ga na-achụ ego na ihe ndị ga-adịrị naanị ha mma, na-enupụkwa isi. Ma Jehova maara na ụmụ okoro na agbọghọ na-ejere ya ozi ga-adị iche. N’ezie Jehova tụkwasịrị unu ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị na-eto eto obi!

2. Gịnị ka icheta Jehova gụnyere?

2 Chetụkwala ụdị obi ụtọ Chineke ga-enwe ma ya hụ na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ na-echeta ya dị ka Onye Okike Ukwu ha. (Ekli. 12:1) N’ezie icheta Jehova karịrị naanị iche banyere ya. Ọ chọrọ ọrụ, ya bụ, ime ihe ndị na-amasị Chineke, na-ekwe ka iwu ya na-eduzi anyị n’ihe niile anyị na-eme n’ụbọchị. Ọ pụtakwara na anyị ga na-atụkwasị Jehova obi, na-amata na o bu ọdịmma anyị n’obi. (Ọma 37:3; Aịza. 48:17, 18) Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ele Onye Okike Ukwu gị anya?

“Jiri Obi Gị Dum Tụkwasị Jehova Obi”

3, 4. Olee otú Jizọs si gosi na ya tụkwasịrị Jehova obi, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị tụkwasị Jehova obi taa?

3 Jizọs Kraịst bụ onye kacha setịpụ ihe nlereanya n’ịtụkwasị Chineke obi. O mere ihe a e kwuru n’Ilu 3:5, 6: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” Obere oge ka e mechara Jizọs baptizim, Setan bịakwutere ya ma nwaa ya ka ọ nara ikike na ebube nke ụwa. (Luk 4:3-13) Ọ nwatalighị Jizọs. Jizọs maara na “ihe ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu Jehova na-arụpụta bụ akụnụba na otuto na ndụ.”—Ilu 22:4.

4 Ihe e ji mara ndị mmadụ taa bụ anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe ha naanị. Ebe anyị bi n’ụwa dị otú a, o kwesịrị nnọọ ekwesị ka anyị ṅomie Jizọs. Burukwa n’obi na Setan ga-eme ike ya niile iji hụ na ọ dọpụrụ ndị ohu Jehova n’ụzọ ahụ dị mkpagide na-eduga ná ndụ. Ọ chọrọ ka mmadụ niile sowe ụzọ ahụ dị obosara nke na-eduga ná mbibi. Ekwela ka o duhie gị! Kama nke ahụ, kpebisie ike icheta Onye Okike Ukwu gị. Tụkwasị ya obi kpamkpam, ma jidesie aka ike ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” bụ́ nke o doro anya na ọ ga-abịa ngwa ngwa.—1 Tim. 6:19.

Ndị Na-eto Eto, Maranụ Ihe!

5. Olee otú obi na-adị gị ma i cheta ihe na-echere ụwa a?

5 Ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ bụ́ ndị chetara Onye Okike Ukwu ha maara ihe karịa ndị ọgbọ ha. (Gụọ Abụ Ọma 119:99, 100.) Ebe ọ bụ na ha na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya, ha maara nnọọ ihe na-echere ụwa a n’ọdịnihu. N’agbanyeghị na unu ka na-eto eto, o doro anya na unu achọpụtala na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nọ n’ụjọ ma na-echegbu onwe ha banyere ọdịnihu. Ọ bụrụ na ị ka na-aga akwụkwọ, e leghị anya ị nụla banyere imetọ ụwa, ime ihe ndị na-eme ka ụwa na-ekpo ọkụ gabiga ókè, igbukpọsị oké ọhịa, na nsogbu ndị yiri ha. Ihe ndị a na-echu ndị mmadụ ụra, ma ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova maara nnọọ na ihe ndị a bụ akụkụ nke ihe ndị na-egosi na ụwa Setan agwụwala.—Mkpu. 11:18.

6. Olee otú e sirila duhie ụfọdụ ndị na-eto eto?

6 Ọ dị nnọọ mwute na ụfọdụ ndị ohu Chineke na-eto eto akwụsịla iche nche, ma chefuo na ụwa a nwere naanị obere oge fọdụụrụ ya. (2 Pita 3:3, 4) Ndị ọzọ emeela mmehie dị oké njọ n’ihi mkpakọrịta ọjọọ na ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. (Ilu 13:20) Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị emebie mmekọrịta anyị na Chineke ugbu a oge gwụrụla agwụ! Kama nke ahụ, mụta ihe site n’ihe mere ndị Izrel n’afọ 1473 T.O.A. oge ha mara ụlọ ukwuu ha n’Ala dị Larịị nke Moab, mgbe ọ fọrọ nnọọ obere ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Gịnị mere n’ebe ahụ?

Ha Dara Mgbe Ọ Fọrọ Obere Ka Ha Ruo Ebe Ha Na-aga

7, 8. (a) Olee aghụghọ Setan ji rafuo ndị Izrel n’Ala Dị Larịị nke Moab? (b) Olee ụzọ aghụghọ Setan ji eme ihe taa?

7 N’oge ahụ, o doro nnọọ anya na Setan achọghị ka ụmụ Izrel nweta ihe nketa e kwere ha ná nkwa. Mgbe atụmatụ Setan mere iji Belam bụọ ụmụ Izrel ọnụ kụchara afọ n’ala, o jiri ụzọ aghụghọ ọzọ ka njọ mee ihe; ọ nwara ime ka ha ghara iru eru inweta ngọzi Jehova. O jiri ụmụ nwaanyị Moab na-eme omume na-akpali agụụ mmekọahụ chọọ ịnwata ha, Ekwensu nwetụkwara ihe ịga nke ọma na nke a. Ụmụ Izrel malitere iso ụmụ nwaanyị Moab nwewe mmekọahụ ma na-akpọrọ Bel nke Piọ isi ala! Ọ bụ ezie na ọ fọrọ nnọọ obere ka ha nweta ihe nketa ha dị oké ọnụ ahịa, bụ́ Ala Nkwa ahụ, ihe dị ka puku ụmụ Izrel iri abụọ na anọ nwụrụ. Nke ahụ bụ nnọọ ọdachi a na-amaghị otú e si akọ ya!—Ọnụ Ọgụ. 25:1-3, 9.

8 Taa, anyị eruwele nso n’ike n’ike n’ala nkwa ka nke ahụ mma—ya bụ usoro ihe ọhụrụ ahụ. Setan jikwa mmekọahụ rụrụ arụ, nke bụ́ ụzọ aghụghọ maara ya ahụ́, na-achọ imerụ ndị Chineke. Àgwà ọjọọ arịala ibe ya elu n’ụwa nke na a dịghịzi ewere ịkwa iko dị ka ihe ọjọọ, a na-elekwa nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị anya dị ka ihe mmadụ ga-ekpebi n’onwe ya ma ọ̀ ga-eme ma ọ bụ na ọ gaghị eme. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Ọ bụ naanị n’ụlọ na n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ụmụ m mụtara na nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị na mmadụ iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya na-enwe mmekọahụ bụ ihe ọjọọ n’anya Chineke.”

9. Gịnị pụrụ ime “n’oge ntoju ntorobịa,” oleekwa otú ndị na-eto eto pụrụ isi ghara ịdaba ná nsogbu ndị a?

9 Ndị na-eto eto bụ́ ndị na-echeta Onye Okike Ukwu ha maara na mmekọahụ bụ onyinye dị nsọ nke ya na ndụ na ọmụmụ so aga. N’ihi ya, ha ghọtara na ọ bụ naanị otú Chineke kwuru ka e si na-enwe mmekọahụ ka e kwesịrị isi na-enwe ya, ya bụ, naanị n’etiti di na nwunye. (Hib. 13:4) Ma ọ pụrụ isiri mmadụ ike ịnọgide na-eme omume dị ọcha “n’oge ntoju ntorobịa,” bụ́ mgbe ọ na-agụsi agụụ ike inwe mmekọahụ nke pụkwara ime ka mmadụ mee mkpebi na-ezighị ezi. (1 Kọr. 7:36) Gịnị ka i nwere ike ime mgbe echiche na-ezighị ezi batara gị n’obi? Kpekusie Jehova ekpere ike ka o nyere gị aka ichewe banyere ihe ndị ziri ezi. Jehova na-ege ndị ji obi ha dum bịakwute ya ntị mgbe niile. (Gụọ Luk 11:9-13.) Mkparịta ụka ndị na-ewuli elu pụkwara ime ka uche anyị pụọ n’ihe ndị na-adịghị mma.

Jiri Amamihe Họrọ Ihe Mgbaru Ọsọ Gị!

10. Olee ụdị echiche hiere ụzọ nke anyị kwesịrị izere, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-ajụ onwe anyị?

10 Otu ihe mere ọtụtụ ndị na-eto eto n’ụwa a ji eme ihe na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ kama inwe njide onwe onye bụ n’ihi na ha enweghị “ọhụụ”—ha enweghị nduzi Chineke, ha enweghịkwa olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu. (Ilu 29:18) Ha dị ka ndị Izrel nupụụrụ Chineke isi n’oge Aịzaya bụ́ ndị ndụ ha hiwere isi ‘n’inwe obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ na iri anụ na ịṅụ mmanya.’ (Aịza. 22:13) Kama imewere ndị dị otú a anya ụfụ, ọ ga-aka mma ma unu na-atụgharị uche n’olileanya dị ebube Jehova debere n’ihu ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ na ị bụ ohu Chineke na-eto eto, ị̀ na-atụsi anya ụwa ọhụrụ ahụ ike? Ị̀ na-agbalịsi ike ‘ibi ndụ n’uche zuru okè ka ị na-echere olileanya ahụ nke na-enye obi ụtọ’ nke Jehova debere gị n’ihu? (Taị. 2:12, 13) Azịza gị ga-ekpebi ụdị ihe mgbaru ọsọ ị ga-esetịpụrụ onwe gị, na ihe ndị ị ga-ebute ụzọ ná ndụ.

11. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst na-eto eto ka nọ n’ụlọ akwụkwọ ji kwesị ịgbasi mbọ ike?

11 Ụwa chọrọ ka ndị na-eto jiri ume ha niile na-achụ ihe nke ụwa. Unu ndị ka nọ n’ụlọ akwụkwọ kwesịrị ịgbalịsi ike inweta agụmakwụkwọ ndị bụ́ isi. A sị kwuwe, nzube gị abụghị naanị ka i wee nweta ọrụ dị mma kama ọ bụ iji baara ọgbakọ uru na iji na-eme nke ọma dị ka onye nkwusa Alaeze. Iji mee nke a, ọ dị mkpa na ị ga-ama otú e si ekwu okwu n’ụzọ doro anya, otú e si eche echiche nke ọma, na otú ị ga-esi nwee ike iji obiọma na nkwanye ùgwù soro ndị ọzọ kparịta ụka. Ma ndị na-eto eto, bụ́ ndị na-amụ Baịbụl ma na-agbalịsi ike ime ihe ndị ha na-amụta, na-enweta agụmakwụkwọ kacha mma, ha na-atọkwa ntọala nke ga-eme ka ha nwee ihe ịga nke ọma ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Abụ Ọma 1:1-3. *

12. Olee ihe nlereanya ezinụlọ Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi?

12 N’Izrel, ọ di oké mkpa ka ndị nne na nna na-enye ụmụ ha ọzụzụ. Ha na-enye ha ọzụzụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe niile ha na-eme ná ndụ, karịsịa n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke. (Diut. 6:6, 7) N’ihi ya, ndị na-eto eto bụ́ ndị gere ndị nne na nna ha na ndị ọzọ torola eto na-efe Chineke ntị na-amụta ihe, ọ bụghị naanị nke a, ha na-enwekwa amamihe, ezi uche, nghọta, nweekwa ike iche echiche nke ọma. Ihe ndị a bụcha àgwà ndị kọrọ ụkọ n’ụwa ma a na-amụta ha site n’ịmụ banyere Chineke na iwu ya. (Ilu 1:2-4; 2:1-5, 11-15) Ezinụlọ Ndị Kraịst nke oge a kwesịkwara iji ụdị ọzụzụ a kpọrọ ihe.

Na-ege Ndị Hụrụ Gị n’Anya Ntị

13. Olee ụdị ndụmọdụ ụfọdụ ndị na-eto eto na-anata, gịnịkwa mere ha ji kwesị ịkpachara anya?

13 Ndị na-eto eto na-anata ndụmọdụ site n’aka ụdị ndị dị iche iche—gụnyere ndị ọrụ ha bụ inye ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ. Ihe bụ́ isi ndị a na-agwa ụmụ akwụkwọ bụ otú ha ga-esi nwee ọganihu n’ihe nke ụwa. Biko rịọ Chineke n’ekpere ka o duzie gị ka ị na-atụle ndụmọdụ niile ha na-enye, marakwa ma hà kwekọrọ n’Okwu Chineke nakwa ná nri ime mmụọ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke nwekwara uche na-enye. Site n’ịmụ Baịbụl, ị maara na ọ bụ ndị na-eto eto na ndị na-enwechaghị amamihe bụ ndị bụ́ isi Setan na-ede. Dị ka ihe atụ, n’ogige Iden, Iv na-amachaghị nke a na-akọ gere Setan ntị, bụ́ onye ọ na-amaghị na onye na-ahụtụghị ya n’anya. Cheedị nnọọ otú ihe gaara esi dịrị ya mma ma a sị na o gere Jehova, bụ́ onye gosirila n’ọtụtụ ụzọ na ya hụrụ ya n’anya, ntị!—Jen. 3:1-6.

14. Olee ihe mere anyị ji kwesị ige Jehova na ndị mụrụ anyị bụ́ Ndị Kraịst ntị?

14 Onye Okike Ukwu gị hụkwara gị n’anya, ụdị ịhụnanya o nwere n’ebe ị nọ bụ́kwa nke ezigbo ya. Ọ chọrọ ka i nwee obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị naanị ugbu a! N’ihi ya, o ji obiọma e ji mara nna na-ahụ n’anya na-agwa gị na ndị niile na-efe ya ofufe, sị: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.” (Aịza. 30:21) Ọ bụrụ na i nwere ndị nne na nna hụrụ Jehova n’anya n’ezie, mara na i nwekwuru ngọzi. Jiri nkwanye ùgwù na-ege ha ntị mgbe ị na-eche ihe ndị ị ga-ebute ụzọ ná ndụ na ihe ndị ga-abụ ihe mgbaru ọsọ gị. (Ilu 1:8, 9) A sị kwuwe, ha chọrọ ka ị dị ndụ, bụ́ ihe bara uru karịa akụnụba ma ọ bụ ọkwá dị elu e nwere n’ụwa a.—Mat. 16:26.

15, 16. (a) Olee ụdị obi ike anyị nwere ike inwe na Jehova? (b) Olee ihe dị mkpa anyị na-amụta site n’akụkọ banyere Barọk?

15 Ndị na-echeta Onye Okike Ukwu ha na-ebi ndụ dị mfe, ha nwere obi ike na Jehova ‘agaghị ahapụ ha ma ọlị, ọ gaghịkwa agbahapụ ha ma ọlị.’ (Gụọ Ndị Hibru 13:5.) Ebe ọ bụ na àgwà ọma ndị a dị iche n’ihe ụwa na-eche, anyị ga-akpachara anya ka anyị ghara ikwe ka ụwa mee ka anyị dị ka ya. (Efe. 2:2) Tụlee ihe mere odeakwụkwọ Jeremaya bụ́ Barọk, bụ́ onye dịrị ndụ n’oge ihe siri oké ike na Jeruselem nke dugara ná mbibi nke obodo ahụ na 607 T.O.A.

16 O nwere ike ịbụ na Barọk chọrọ ịba ọgaranya. Jehova hụrụ nke a ma jiri obiọma dọọ Barọk aka ná ntị ka ọ ghara ịchọrọ onwe ya “ihe ukwu.” Barọk bịaziri mee ihe gosiri na ọ dị umeala n’obi ma mara ihe site n’ige Jehova ntị ma lanahụ mbibi nke Jeruselem. (Jere. 45:2-5) Ma ndị ha na Barọk dịkọrọ ndụ nwetara “ihe ukwu,” na-edebe Jehova n’ọnọdụ nke abụọ, ihe niile ha nwere funahụkwara ha n’oge na-adịghị anya mgbe ndị Kaldia (Babịlọn) bibiri Jeruselem. Ọtụtụ n’ime ha nwụkwara. (2 Ihe 36:15-18) Akụkọ banyere Barọk na-enyere anyị aka ịghọta na mmadụ na Chineke ịdị ná mma ka mkpa karịa akụnụba na ịbụ onye a ma ama n’ụwa a.

Na-eṅomi Ndị Bụ́ Ezi Ihe Nlereanya

17. Olee ihe mere Jizọs, Pọl, na Timoti ji bụrụ ezi ihe nlereanya ndị ohu Jehova taa ga-eṅomi?

17 Iji nyere anyị aka ije ije n’ụzọ nke ndụ, Okwu Chineke na-akọrọ anyị akụkọ banyere ndị setịpụrụ ezi ihe nlereanya. Dị ka ihe atụ, n’ime ụmụ mmadụ niile dịtụrụla ndụ, Jizọs kacha nwee nkà, ma o lekwasịrị anya n’ihe ahụ nke ga-enyere ndị mmadụ aka ịdị ndụ ebighị ebi—“ozi ọma alaeze.” (Luk 4:43) Iji nye Jehova ihe kacha mma o nwere, Pọl onyeozi hapụrụ ọrụ na-enye ya ezigbo ego ma jiri oge na ume ya kwusaa ozi ọma. Timoti, “onye bụ́ ezigbo nwa n’okwukwe,” ṅomiri ezi ihe nlereanya nke Pọl. (1 Tim. 1:2) Jizọs, Pọl, na Timoti, hà kwara ụta banyere ihe ha ji ndụ ha mee? Ọ dịghị ma ọlị! Pọl kwudịrị na ya lere ihe nke ụwa anya dị ka “nnukwu ihe e kpofuru ekpofu” ma e jiri ya tụnyere ihe ùgwù nke ijere Chineke ozi.—Fil. 3:8-11.

18. Olee nnukwu mgbanwe otu nwanna nwoke mere, gịnịkwa mere ọ naghị akwa ụta ọ bụla?

18 Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto taa na-eṅomi okwukwe Jizọs, Pọl, na Timoti. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwoke na-eto eto onye na-arụbu ọrụ na-enye ya ezigbo ego dere, sị: “E buliri m n’ọkwá ngwa ngwa n’ihi na m na-ebi ndụ kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru. N’agbanyeghị ezigbo ego nke a na-enye m, echere m na m na-achụso ifufe. Mgbe m jekwuuru ndị isi ụlọ ọrụ anyị ma gwa ha na m chọrọ ịbanye n’ozi oge niile, ha kwere nkwa ozugbu ịmanyere m ego n’ego a na-akwụbu m, na-atụ anya na nke ahụ ga-eme ka m nọgide n’ọrụ m. Ma ekpebiela m ihe m chọrọ ime. Ọtụtụ ndị aghọtaghị ihe mere m ji hapụ ọrụ na-enye nnọọ ezigbo ego iji banye n’ozi oge niile. Ihe m zara ha bụ na achọrọ m n’ezie ibi ndụ kwekọrọ ná nrara m raara onwe m nye Chineke. Ugbu a ndụ m hiweziri isi n’ozi Jehova, enwere m ụdị obi ụtọ na afọ ojuju nke ọ na-adịghị ego ma ọ bụ ọkwà ọ bụla dị elu ga-enyeli m.”

19. Olee ihe amamihe dị na ya nke a na-agba ndị na-eto eto ume ka ha họrọ ime?

19 N’ụwa niile, ọtụtụ puku ndị na-eto eto na-eme mkpebi ndị yiri nke a amamihe dị na ya. Ya mere, ndị na-eto eto, mgbe unu na-atụgharị uche banyere ihe unu ga-eme n’ọdịnihu, burunụ ụbọchị Jehova n’uche. (2 Pita 3:11, 12) Unu enwerela ndị na-aba ọgaranya n’ụwa a anyaụfụ. Kama nke ahụ, geenụ ndị hụrụ unu n’anya n’ezie ntị. Ịkpakọba “akụ̀ n’eluigwe” bụ ihe kacha mma unu nwere ike ime nke na-enweghị ihe ga-eme ya, ọ bụkwa naanị ya ga-abara unu uru ruo mgbe ebighị ebi. (Mat. 6:19, 20; gụọ 1 Jọn 2:15-17.) Ee, na-echetanụ Onye Okike Ukwu unu. Ọ bụrụ na unu emee otú a, Jehova ga-agọzi unu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Iji gụkwuo ihe banyere agụmakwụkwọ dị elu na ụdị ọrụ ị ga-arụ, gaa n’Ụlọ Nche nke October 1, 2005, peeji nke 26-31.

Ì Chetara?

• Olee otú anyị si egosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi?

• Olee agụmakwụkwọ kacha mma?

• Olee ihe anyị pụrụ ịmụta n’aka Barọk?

• Olee ndị setịpụrụ ezi ihe nlereanya, gịnịkwa mere ha ji bụrụ ezi ihe nlereanya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Jehova na-akụziri anyị ihe ga-akacha abara anyị uru

[Foto dị na peeji nke 15]

Barọk gere Jehova ntị ma lanahụ mbibi Jeruselem. Gịnị ka ị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ya?