Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gbalịa ‘Ịdị Nsọ n’Egwu Chineke’

Gbalịa ‘Ịdị Nsọ n’Egwu Chineke’

Gbalịa ‘Ịdị Nsọ n’Egwu Chineke’

IJI gosi na ọ bụ Jehova Chineke kacha dị nsọ, Baịbụl sịrị: ‘Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova dị.’ (Aịza. 6:3; Mkpu. 4:8) Okwu Grik na nke Hibru e ji sụgharịa “ịdị nsọ” na-enye echiche ịdị ọcha ma ọ bụ ofufe dị ọcha, ihe e debere iche ka a ghara imerụ ya. Ịdị nsọ Jehova na-ezo aka n’àgwà ọma ya na-enweghị atụ.

Ì cheghị na Chineke ahụ dị nsọ bụ́ Jehova ga-atụ anya ka ndị na-ejere ya ozi dịrị nsọ, ya bụ ka ha dịrị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́, nwee omume dị ọcha ma na-efe ya n’eziokwu? Baịbụl mere ka o doo nnọọ anya na Jehova chọrọ ka ndị ya dịrị nsọ. Anyị na-agụ na 1 Pita 1:16, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.” Ụmụ mmadụ na-ezughị okè hà nwere ike ịdịru nsọ ka Jehova? Ha nwere ike ịdị nsọ, ma ha agaghị adịru nsọ ka Jehova. Ma Chineke nwere ike ịgụ anyị dị ka ndị dị nsọ ma ọ bụrụ na anyị na-efe ya ofufe dị ọcha ma soro ya nwee mmekọrịta chiri anya.

Oleezi otú anyị pụrụ isi dị ọcha n’ime ụwa a omume rụrụ arụ jupụtara? Olee àgwà ndị anyị kwesịrị izere? Olee ụdị okwu ndị anyị na-ekwesịghị ikwu na ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime? Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta site n’ihe Chineke chọrọ n’aka ndị Juu ahụ si Babịlọn lọghachi n’ala nna ha n’afọ 537 T.O.A.

‘Okporo Ụzọ nke Ịdị Nsọ Ga-adị n’Ebe Ahụ’

Jehova buru n’amụma na ndị ya a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn ga-alọghachi n’ala ha. E mesiri ha obi ike n’amụma ahụ, sị: “Okporo ụzọ ga-adị n’ebe ahụ, ee, ụzọ ga-adị; a ga na-akpọ ya Ụzọ nke Ịdị Nsọ.” (Aịza. 35:8a) Ihe a e kwuru ebe a na-egosi na ọ bụghị naanị na Jehova ga-eme ka ndị Juu lọghachi n’ala ha kamakwa o mesiri ha obi ike na ọ ga-echebe ha n’ụzọ ka ha na-alọta.

Jehova meghekwaara ndị ohu ya nke oge a “Ụzọ nke Ịdị Nsọ” site n’ịkpọpụta ha na Babịlọn Ukwu ahụ bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. N’afọ 1919, o mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ si n’okpukpe ụgha nwere onwe ha, ha jikwara nke nta nke nta kwụsị ịkụzi ozizi ụgha niile. Taa, anyị bụ́ ndị ohu Jehova dị nnọọ ọcha, anyị nọkwa n’ọgbakọ dị ọcha bụ́ ebe anyị nwere ike ịnọ fee Jehova ma soro ya na mmadụ ibe anyị ndị ọzọ dịrị ná mma.

Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ “ìgwè atụrụ nta” ahụ, na “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-amụba n’ike n’ike ahọrọla ije ije n’ụzọ ahụ dị nsọ, ha na-akpọkwa ndị ọzọ ka ha bịa soro ha. (Luk 12:32; Mkpu. 7:9; Jọn 10:16) Ndị niile dị njikere ‘inyefe Chineke ahụ́ ha dị ka àjà dị nsọ, nke dị Chineke ezi mma’ nwere ohere ije ije ‘n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ.’—Rom 12:1.

“Onye Na-adịghị Ọcha Agaghị E Si na Ya Gafee”

N’afọ 537 T.O.A., ndị Juu ahụ na-alọtanụ nwere ihe dị mkpa ha ga-eme. Aịzaya 35:8b kwuru banyere ndị ruru eru ije ije ‘n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ,’ sị: “Onye na-adịghị ọcha agaghị esi na ya gafee. Ọ ga-abụ maka onye na-eje ije n’ụzọ ahụ, ọ dịghịkwa ndị nzuzu ga-awagharị na ya.” Ebe ọ bụ na ihe mere ndị Juu ahụ ji lọghachi Jeruselem bụ iji maliteghachi ezi ofufe, e kwesịghị inwe ndị na-achọ ọdịmma onwe ha naanị, ndị na-adịghị akwanyere ihe ndị dị nsọ ùgwù ma ọ bụ ndị na-efe chi ụgha. Ndị ahụ na-alọghachịnụ kwesịrị ịnọgide na-akpa àgwà ndị dị nnọọ ọcha Jehova chọrọ. A chọkwara otu ihe ahụ n’aka ndị chọrọ ka ha na Chineke dịrị ná mma taa. Ha ga-agbalị ‘ịdị nsọ n’egwu Chineke.’ (2 Kọr. 7:1) Oleezi àgwà ndị na-adịghị ọcha anyị kwesịrị izere?

Pọl onyeozi dere, sị: “Ọrụ nke anụ ahụ́ pụtara ìhè, ha bụ ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ.” (Gal. 5:19) Ịkwa iko gụnyere ụdị ihe ọ bụla mmadụ na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya ji akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị mee. Omume rụrụ arụ gụnyere “enweghị njide onwe onye n’ihe metụtara mmekọahụ; oké agụụ mmekọahụ; àgwà emeghị ihere; ịkpa àgwà ndị na-akpali agụụ mmekọahụ.” Ma ịkwa iko ma omume rụrụ arụ na-emegide ịdị nsọ Jehova. N’ihi ya, a naghị ekwe ka ndị nọgidere na-eme ụdị omume ndị a ghọọ Ndịàmà Jehova, a na-achụpụkwa ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma kpọọ ekwo nkụ na-eme ụdị omume ahụ. Otú ahụkwa ka ọ dị ndị adịghị ọcha ha dị oké njọ, ya bụ, ndị ji “anyaukwu na-eme ụdị omume adịghị ọcha niile.”—Efe. 4:19.

“Adịghị ọcha” bụ okwu e ji akọwakarị ụdị mmehie dị iche iche. Okwu Grik e ji kọwaa ya na-ezo aka n’ihe ọ bụla ruru unyí—n’omume, okwu ọnụ, na iso ndị na-ekweghị ekwe na-efekọ ofufe. Ọ gụnyere ime ihe ndị na-adịchaghị ọcha bụ́ ndị o nwere ike ọ gaghị adị mkpa ka e hiwere onye mere ihe ahụ òtù ikpe. * Ma ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ na-adịchaghị ọcha, hà na-agbalị ịdị nsọ?

Ka e were ya na Onye Kraịst malitere ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na nzuzo. Ka ọchịchọ ọjọọ ahụ na-esiwanye ike, mkpebi o mere ịnọgide na-adị ọcha n’anya Jehova na-eji nwayọọ nwayọo na-ajụ oyi. E nwere ike àgwà ọjọọ ahụ erubeghị n’ókè nke ịghọ ajọ adịghị ọcha, ma ọ dịghịzi echebara naanị “ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya” echiche. (Fil. 4:8) Ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ omume na-adịghị ọcha, ọ na-emebikwa mmekọrịta mmadụ na Chineke. E kwesịghịdị ịkpọtatụ ụdị adịghị ọcha ọ bụla aha n’etiti anyị.—Efe. 5:3.

Lee ihe atụ ọzọ. Ka e were ya na Onye Kraịst na-emetọkarị ahụ́ onwe ya—mara ama na-akpali onwe ya inwe agụụ mmekọahụ—ma ihe kpatara nke a ọ̀ bụ n’ihi na ọ na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma ọ bụ na ọ bụghị. N’agbanyeghị na okwu ahụ bụ́ “imetọ ahụ́ onwe onye” adịghị na Baịbụl, obi abụọ ọ̀ dị ya na ọ bụ omume rụrụ arụ nke na-emetọ uche? Ì cheghị na mmadụ ịnọgide na-emerụ onwe ya otú a ga-emebi nnọọ mmekọrịta onye ahụ na Jehova ma mee ka mmadụ bụrụ onye na-adịghị ọcha n’anya Chineke? Ka anyị buru n’uche ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ́ ka anyị “sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ” na ka anyị ‘mee ka akụkụ ahụ́ anyị ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu.’—2 Kọr. 7:1; Kọl. 3:5.

Ụwa a Setan na-achị nwere mmasị n’omume na-adịghị ọcha, na-agbadị ndị mmadụ ume ime ya. O nwere ike isi ezigbo ike mmadụ izere ọnwụnwa nke ime omume na-adịghị ọcha. Ma ezi Ndị Kraịst ekwesịghị ịdị “na-eje ije dị nnọọ ka ndị mba ọzọ na-ejekwa n’echiche na-abaghị uru nke uche ha.” (Efe. 4:17) Ọ bụ naanị mgbe anyị zeere omume na-adịghị ọcha, ma ọ bụ na nzuzo ma ò nwere onye na-ahụ anyị, ka Jehova ga-ekwe ka anyị nọgide na-eje ije ‘n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ.’

“Ọ Dịghị Ọdụm Ga-anọ n’Ebe Ahụ”

Ọ dị mkpa ka anyị kwụsị ime omume rụrụ arụ na ikwu okwu ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngọzi Chineke ahụ dị nsọ bụ́ Jehova. Aịzaya 35:9 sịrị: “Ọ dịghị ọdụm ga-anọ n’ebe ahụ, ụdị anụ ọhịa ọ bụla nke na-adọgbu adọgbu agaghị abata na ya,” ya bụ́, ‘n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ.’ E ji ndị na-eme ihe ike, na ndị na-ewe iwe ọkụ tụnyere anụ ọhịa. A gaghị ahụ ụkwụ ha n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke. (Aịza. 11:6; 65:25) N’ihi ya, ọ dị nnọọ mkpa ka ndị chọrọ inweta ngọzi Chineke hapụ àgwà ndị a yiri nke anụ ọhịa ma soro ụzọ nke ịdị nsọ.

Akwụkwọ Nsọ dụrụ anyị ọdụ, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.” (Efe. 4:31) Ná Ndị Kọlọsi 3:8, anyị na-agụ, sị: “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu.” “Okwu mkparị” e kwuru okwu ya n’amaokwu Baịbụl abụọ a na-ezokarị aka n’okwu ọjọọ, okwu nlelị, ma ọ bụ nkwulu.

Taa ndị mmadụ na-ekwukarị okwu ndị na-agbawa obi na nke rere ure, ọbụnadị n’ime ezinụlọ. Ụfọdụ di na nwunye na-agwarịta onwe ha okwu na-agbawa obi, okwu ọjọọ, ma ọ bụ okwu nlelị, ha na-agwadị ụmụ ha ụdị okwu a mgbe ụfọdụ. E kwesịghị ịhụ ụdị ihe a n’ezinụlọ Ndị Kraịst.—1 Kọr. 5:11.

Ịgbalị ‘Ịdị Nsọ n’Egwu Chineke’ Na-eweta Ngọzi!

Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù ijere Chineke ahụ dị nsọ bụ́ Jehova ozi! (Jọsh. 24:19) Paradaịs ime mmụọ nke Jehova kpọbatara anyị n’ime ya enweghị atụ. Ịnọgide na-akpa àgwà dị ọcha n’anya Jehova bụ nnọọ ụzọ kacha mma isi bie ndụ.

N’oge na-adịghị anya, a ga-enwe ụwa Paradaịs nke Chineke kwere ná nkwa. (Aịza. 35:1, 2, 5-7) Ndị na-atụsi anya ya ike ma nọgide na-akpa àgwà ọma ga-aba n’ime ya. (Aịza. 65:17, 21) N’ihi ya, ka anyị mee ike anyị niile iji nọgide na-efe Chineke ofufe dị ọcha, ma soro ya na-enwe mmekọrịta dị mma.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Iji gụkwuo banyere ọdịiche dị ‘n’adịghị ọcha anya ukwu kpalitere’ na “adịghị ọcha,” lee Ụlọ Nche nke July 15, 2006, peeji nke 29-31.

[Foto dị na peeji nke 26]

Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị Juu iji nwee ike ije ije ‘n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ’?

[Foto dị na peeji nke 27]

Ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-emebi mmekọrịta mmadụ na Jehova

[Foto dị na peeji nke 28]

“Wepụnụ . . . iti mkpu na okwu mkparị”