Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Họrọ Ijere Jehova Ozi Mgbe Ị Ka Na-eto Eto

Họrọ Ijere Jehova Ozi Mgbe Ị Ka Na-eto Eto

Họrọ Ijere Jehova Ozi Mgbe Ị Ka Na-eto Eto

“Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere, ebe ị maara ndị i si n’aka ha mụta ha.”—2 TIM. 3:14.

1. Olee otú Jehova si ewere ozi Ndịàmà na-eto eto na-ejere ya?

JEHOVA weere ozi dị nsọ ndị na-eto eto na-ejere ya dị ka ihe dị mkpa nke na o mere ka e buo amụma banyere ha. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ndị gị ga-eji obi ha wepụta onwe ha n’ụbọchị i du ndị agha gị na-eje agha. N’ịma mma nke ịdị nsọ gị, i nwere ìgwè ụmụ okorobịa gị ndị si n’afọ nke ụtụtụ dị nnọọ ka igirigi.” (Ọma 110:3) N’ezie, Jehova anaghị eji ndị na-eto eto dị njikere ijere ya ozi egwuri egwu.

2. Olee ndị na-akụda ndị na-eto eto taa aka mgbe a bịara n’ihe banyere ọdịnihu ha?

2 Unu bụ́ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ, ùnu ararala onwe unu nye Jehova? O nwere ike isiri ọtụtụ ndị ike ikpebi ijewere ezi Chineke ahụ ozi. Ndị ọchụnta ego, ndị nkụzi, na mgbe ụfọdụ ndị ezinụlọ na ndị enyi, na-agba ndị na-eto eto ume ka ha chụwa akụ̀ nke ụwa. Ụfọdụ ndị na-achị ndị na-eto eto ọchị ma ọ bụrụ na ha na-agba mbọ iji ozi Chineke mere aka ọrụ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ijere ezi Chineke ahụ ozi bụ ihe kacha mma mmadụ nwere ike iji ndụ ya mee. (Ọma 27:4) Ka anyị tụlee ajụjụ atọ metụtara ihe a anyị na-ekwu: Gịnị mere i ji kwesị ijere Chineke ozi? Olee otú ị ga-esi nọgide na-ebi ndụ n’ụzọ gosiri na ị raara onwe gị nye Chineke n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ nwere ike ịdị na-ekwu ma ọ bụ na-eme? Olee ohere ndị magburu onwe ha i nwere iji jekwuoro Chineke ozi?

Ijere Jehova Ozi Bụ Ihe Kwesịrị Ekwesị Ime

3. Olee otú ihe ndị Jehova kere eke kwesịrị isi metụta anyị?

3 Gịnị mere ị ga-eji na-ejere ezi Chineke ahụ dị ndụ ozi? Mkpughe 4:11 gwara anyị ihe bụ́ isi mere anyị ga-eji mee otú ahụ, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” Ọ bụ Jehova bụ Onye Okike ọma kere ihe niile. Lee nnọọ ka ụwa si magbuo onwe ya! Ọ bụ Jehova kere osisi, okooko osisi, ụmụ anụmanụ, oké osimiri, ugwu, na ugwu mmiri na-esi na ya asụda. Abụ Ọma 104:24 kwuru, sị, “Ụwa jupụtara n’ihe [Chineke] rụrụ.” Anyị kwesịrị inwe obi ekele na Jehova ji ịhụnanya kee ahụ́ anyị na uche anyị otú anyị ga-eji ha na-anụ ụtọ ụwa na ihe ọma ndị dị n’ime ya! Ọ̀ bụ na ekele anyị nwere maka ihe ndị magburu onwe ha o kere ekwesịghị ịkpali anyị ịchọ ijere ya ozi?

4, 5. Olee ihe ndị Chineke mere bụ́ ndị mere ka Jọshụa hụkwuo Jehova n’anya?

4 Ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-ejere Jehova ozi bụ n’ihi ihe Jọshụa bụ́ onye ndú ndị Izrel kwuru. Mgbe oge ọnwụ ya na-eru nso, Jọshụa gwara ndị Chineke, sị: “Unu jikwa obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu.” Gịnị mere Jọshụa ji kwuo ihe a o kwuru?—Jọsh. 23:14.

5 Mgbe ndị Izrel nọ n’Ijipt, Jọshụa ka na-eto eto mgbe ahụ nụrụ nkwa Jehova kwere inye ndị Izrel ala nke ha. (Jen. 12:7; 50:24, 25; Ọpụ. 3:8) Jọshụa hụziri mgbe Jehova malitere imezu nkwa ya ahụ site n’iwetara ndị Ijipt Ihe Otiti Iri ahụ ma mee ka Fero bụ́ ekwe ekwe kwetazie ịhapụ ndị Izrel. Jọshụa so ná ndị a napụtara n’Oké Osimiri Uhie, ọ hụkwara ka osimiri ahụ riri Fero na ndị agha ya. Mgbe ndị Izrel na-awagharị ná “nnukwu ala ịkpa nke dị egwu” nke bụ́ Ọzara Saịnaị, Jọshụa hụrụ otú Jehova si nye ndị ya ihe ndị dị ha mkpa. Ọ dịghị otu onye n’ime ha nwụrụ n’ihi akpịrị ịkpọ nkụ ma ọ bụ agụụ. (Diut. 8:3-5, 14-16; Jọsh. 24:5-7) Mgbe oge ruru ka ndị Izrel merie mba ndị dị ike dị na Kenan n’agha ma weghara Ala Nkwa ahụ, Jọshụa hụrụ otú Chineke ya na ndị Izrel ndị ọzọ na-efe si nyere ha aka.—Jọsh. 10:14, 42.

6. Gịnị ga-enyere gị aka ịchọ ijere Chineke ozi?

6 Jọshụa maara na Jehova mezuru nkwa ndị o kwere. Ọ bụ ya mere Jọshụa ji kwuo, sị: “Mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.” (Jọsh. 24:15) Oleekwanụ maka gị onwe gị? Ọ bụrụ na i cheta nkwa ndị ezi Chineke ahụ mezurula na ndị nke ọ ka ga-emezu, ọ̀ bụ na ha adịghị akpali gị ịchọ ijere ya ozi dị ka Jọshụa mere?

7. Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka mmadụ mee baptizim ime mmiri?

7 Iche echiche banyere ihe ndị Jehova kere eke na iche echiche banyere nkwa ya ndị magburu onwe ha, bụ́kwa ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na ha ga-emezurịrị, kwesịrị ịkpali gị ịrara onwe gị nye Jehova nakwa ime baptizim iji gosi na ị rarala onwe gị nye ya. Baptizim bụ otu ihe dị oké mkpa ndị chọrọ ijere Chineke ozi ga-eme. Onye Nlereanya anyị bụ́ Jizọs mere ka nke a doo anya. Obere oge tupu ya amalite ịrụ ọrụ ya dị ka Mesaya, ọ gakwuuru Jọn Onye Na-eme Baptizim ka o mee ya baptizim. Gịnị mere Jizọs ji mee nke a? O mechara kwuo, sị: “Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m.” (Jọn 6:38) Jizọs mere baptizim iji gosi na ya bịara ime uche Nna ya.—Mat. 3:13-17.

8. Olee ihe mere Timoti ji họrọ ife Chineke, gịnịkwa ka o nwere ike ịdị mkpa ka i mee?

8 Tụleekwa ihe banyere Timoti, bụ́ Onye Kraịst na-eto eto, onye Jehova mechara nye ọrụ dị ukwuu na ọtụtụ ihe ùgwù ije ozi. Gịnị mere Timoti ji kpebie ife ezi Chineke ahụ? Baịbụl gwara anyị na ‘ọ mụtara ihe, e mekwara ka o kwere na ha.’ (2 Tim. 3:14) Ọ bụrụ na ị mụọla Okwu Chineke, kwenyekwa na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu, gị na Timoti nọ n’otu ụgbọ. Ugbu a, ọ dị mkpa ka i mee mkpebi. Gbalịa gwa ndị mụrụ gị ihe ị chọrọ ime. Ha na ndị okenye ọgbakọ nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru dị mkpa ka i mee iji ruo eruo ịbụ onye a ga-eme baptizim.—Gụọ Ọrụ 8:12.

9. Olee otú ụfọdụ ndị nwere ike isi were mkpebi gị ime baptizim?

9 Ime baptizim bụ ụzọ magburu onwe ya isi malite ijere ezi Chineke ahụ ozi. Ọ bụrụ na i mee otú a, i sonyela ná ndị na-agba ọsọ nke ụgwọ ọrụ ya bụ́ ndụ ebighị ebi. Ị ga-enwekwa ọṅụ nke a na-enweta ugbu a site n’ime uche Chineke. (Hib. 12:2, 3) Ị ga-emekwa ka ndị ezinụlọ gị ndị gbawarala ọsọ ahụ na ndị enyi gị ndị nọ n’ọgbakọ ṅụrịa. Nke kacha mkpa bụ na ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Gụọ Ilu 23:15.) Ọ bụ eziokwu na a ga-enwe ndị na-agaghị aghọta ihe mere i ji họrọ ife Jehova, ha nwekwara ike iche na ihe ị họọrọ ime ezighị ezi. Ha nwedịrị ike imegide gị. Ma ị pụrụ imericha nsogbu ndị ahụ niile.

Mgbe Ndị Ọzọ Na-emegide Gị

10, 11. (a) Olee ajụjụ ndị mmadụ nwere ike ịjụ gị banyere mkpebi i mere ijere Chineke ozi? (b) Olee ihe i nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si zaa ajụjụ ndị a jụrụ ya banyere ezi ofufe?

10 Mkpebi i mere ijere Jehova ozi nwere ike ịgbagwoju ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị agbata obi gị, na ndị ikwu gị anya. Ha nwere ike ịjụ gị ihe mere i ji họrọ ijere Chineke ozi ma jụọ gị ajụjụ banyere ihe ndị i kweere. Olee otú i kwesịrị isi zaghachi ha? I kwesịrị ibu ụzọ chee echiche nke ọma iji nwee ike ịkọwara ha ihe mere i ji họrọ ijere Chineke ozi. Mgbe ị na-azakwa ajụjụ banyere ihe ndị i kweere, ṅomie ihe nlereanya Jizọs.

11 Mgbe ndị ndú okpukpe ndị Juu gbara Jizọs ajụjụ banyere mbilite n’ọnwụ, o chetaara ha ihe e kwuru n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke o yiri ka ha echebatụbeghịrị echiche. (Ọpụ. 3:6; Mat. 22:23, 31-33) Mgbe otu onye odeakwụkwọ jụrụ Jizọs iwu kacha n’ime Iwu Iri ahụ, ọ dọọrọ uche ya gaa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị zara ihe ọ jụrụ. O kelere Jizọs maka ịza ya ajụjụ ya. (Lev. 19:18; Diut. 6:5; Mak 12:28-34) Otú Jizọs si eji Akwụkwọ Nsọ aza ajụjụ na otú o si ekwu okwu mere ka ‘nkewa bilite n’etiti ìgwè mmadụ ahụ banyere ya,’ nke na ndị iro ya apụghị ime ya ihe ọ bụla. (Jọn 7:32-46) Mgbe ị na-aza ajụjụ banyere ihe ndị i kweere, jiri Baịbụl zaa ha “n’obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu.” (1 Pita 3:15) Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-aza, gwa ha na ị maghị ya ma kwuo na ị ga-aga mee nchọnchọ. E mesịa, i nwere ike ịchọ isiokwu ahụ na Watch Tower Publications Index ma ọ bụ Watchtower Library nke dị na CD-ROM ma ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ gị. Ọ bụrụ na ịkwadebe nke ọma, ị ga-ama “otú [i] kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.”—Kọl. 4:6.

12. Gịnị mere i kwesịghị ikwe ka mkpagbu kụda gị mmụọ?

12 O nwere ike ọ bụghị naanị ajụjụ banyere ihe i kweere na ihe ị họọrọ ime ka a ga-ajụ gị. E kwuwe nnọọ, ọ bụ onye iro Chineke bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, na-achị ụwa. (Gụọ 1 Jọn 5:19.) I kwesịghị ịtụ anya na onye ọ bụla ga-ekwe gị n’aka ma ọ bụ kwado mkpebi i mere ijere Chineke ozi, e nwedịrị ike inwe ndị ga-emegidewe gị. Ụfọdụ ndị nwere ike ‘ikwujọ gị,’ ha nwekwara ike ịnọgide na-eme nke a. (1 Pita 4:4) Ma cheta na ọ bụghị naanị gị ka e metụrụla ụdị ihe a. A kpagburu Jizọs Kraịst n’onwe ya. Kpagbuokwa Pita onyeozi nke mere o ji dee, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka ọkụ nke na-ere n’etiti unu, nke na-ere ịbụrụ unu ọnwụnwa, ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe a na-ahụtụbeghị na-adakwasị unu. Kama nke ahụ, na-aṅụrịnụ ọṅụ, ebe unu bụ ndị na-eketa òkè n’ahụhụ nke Kraịst.”—1 Pita 4:12, 13.

13. Gịnị nwere ike ime ka Ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ mgbe a na-akpagbu ha?

13 Idi mkpagbu ma ọ bụ mmegide n’ihi ịbụ Onye Kraịst kwesịrị ime ka anyị nwee ọṅụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na ụwa anabata anyị, ọ na-egosi na anyị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Setan chọrọ, ọ bụghị n’ihe Chineke chọrọ. Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu mgbe mmadụ niile na-ekwu okwu ọma banyere unu, n’ihi na ụdị ihe ndị a ka ndị nna nna ha mere ndị amụma ụgha.” (Luk 6:26) Mkpagbu na-egosi na Setan na ụwa ya na-ewesa gị iwe n’ihi na ị na-ejere Jehova ozi. (Gụọ Matiu 5:11, 12.) Anyị kwesịkwara inwe obi ụtọ na “a na-akọcha [anyị] n’ihi aha Kraịst.”—1 Pita 4:14.

14. Olee ihe ọma ndị nwere ike ịpụta mgbe mmadụ nọgidere na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị mkpagbu?

14 Ọ bụrụ na ị nọgide na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị mmegide, e nwere ma ọ dịghị ihe ọzọ ihe anọ nke ahụ ga-arụpụta. Ị na-agbara Chineke na Ọkpara ya àmà. Ntachi obi gị na-agba ụmụnna gị Ndị Kraịst ndị ọzọ ume. Ntachi obi gị nwere ike ịkpali ụfọdụ ndị ọzọ na-amaghị Jehova na-ahụ gị ịbịa fewe Jehova. (Gụọ Ndị Filipaị 1:12-14.) Mgbe ị na-ahụkwa ka Jehova si na-enye gị ike iji die ọnwụnwa ndị na-abịara gị, nke a na-eme ka ị hụkwuo ya n’anya.

E Megheworo Gị “Ọnụ Ụzọ Buru Ibu”

15. Olee “ọnụ ụzọ buru ibu” nke e megheere Pọl onyeozi?

15 Pọl onyeozi dere banyere ozi o jere n’Efesọs, sị: “E megheworo m ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.” (1 Kọr. 16:8, 9) Ọnụ ụzọ a na-eduga n’ịrụkwu ọrụ ikwusa ozi ọma n’obodo ahụ ma nyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi na Pọl banyere n’ọnụ ụzọ ahụ, o nyeere ọtụtụ ndị aka ịmata Jehova ma bịa fewe Ya.

16. Olee otú ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ si banye ‘n’ọnụ ụzọ ghere oghe’ n’afọ 1919?

16 N’afọ 1919, Jisọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube debere “ọnụ ụzọ ghere oghe” n’ihu ndị fọdụrụ ná ndị ahụ e tere mmanụ. (Mkpu. 3:8) Ha banyere n’ọnụ ụzọ ahụ ma malite iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, na-akụziri ha eziokwu Baịbụl karịa ka ha na-emebu. Gịnị ka ozi ha ahụ rụpụtara? Ugbu a ozi ọma ahụ eruola n’ebe ụwa sọtụrụ, ihe dịkwa ka nde mmadụ asaa nwekwara olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke.

17. Olee otú i nwere ike isi banye ‘n’ọnụ ụzọ ahụ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ’?

17 “Ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ” ka gheere nnọọ ndị ohu Jehova niile oghe. Ndị banyere na ya na-enweta obi ụtọ na afọ ojuju ka ha na-arụkwu ọrụ buru ibu n’ikwusa ozi ọma ahụ. Unu ndị ohu Jehova na-eto eto, olee otú unu jiruru ihe ùgwù na-enweghị atụ nke inyere ndị ọzọ aka ịbịa ‘kwere n’ozi ọma ahụ’ kpọrọ ihe? (Mak 1:14, 15) Ì chetụla echiche ma ị̀ ga-enwe ike ịghọ onye ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ inyeaka? Ọtụtụ n’ime unu nwere ike inwe ohere iso na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ije ozi Betel, na ịghọ onye ozi ala ọzọ. Ebe ọ bụ na oge na-agwụnahụ ụwa ọjọọ Setan a, ọ dị nnọọ oké mkpa ugbu a ịmalite ije ozi ndị a metụtara Alaeze ahụ. Ị̀ ga-ekwe ịbanye ‘n’ọnụ ụzọ ahụ buru ibu’ ugbu a oge ka dị?

“Detụnụ Jehova Ire Ma Hụ Na Ọ Dị Mma”

18, 19. (a) Gịnị mere o ji gụsie Devid agụụ ike ịchọ ijere Jehova ozi? (b) Gịnị gosiri na ọ dịghị mgbe Devid kwara mmakwaara n’ihi ijere Chineke ozi?

18 Ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ kpọrọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa ‘detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’ (Ọma 34:8) Mgbe Eze Devid nke Izrel oge ochie ka bụ nwa okoro na-azụ atụrụ, Jehova zọpụtara ya n’aka anụ ndị gaara egbu ya. Chineke nyeere ya aka mgbe ọ lụsoro Golayat ọgụ, napụtakwa ya n’ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ. (1 Sam. 17:32-51; Ọma 18, okwu mmeghe ya) Obiọma Chineke kpaliri Devid ide, sị: “I mewo ọtụtụ ihe, Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị; ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị.”—Ọma 40:5.

19 Devid bịara hụ Jehova n’anya nke ukwuu, chọọkwa iji obi ya na uche ya dum too ya. (Gụọ Abụ Ọma 40:8-10.) Ka afọ na-aga, ọ dịghị mgbe Devid kwara mmakwaara na ya ji ndụ ya na-efe ezi Chineke ahụ. Ibi ndụ gosiri na ọ na-asọpụrụ Chineke bụ ihe kacha mma o nwere—nke bụ́kwanụ ihe na-enye ya obi ụtọ na-enweghị atụ. Mgbe Devid mere agadi, ọ sịrị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ olileanya m na obi ike m malite n’oge m bụ nwata. Chineke, biko, ahapụla m ruo ọbụna mgbe m mere agadi na mgbe isi chara m awọ́.” (Ọma 71:5, 18) Ntụkwasị obi Devid nwere n’ebe Jehova nọ na adịm ná mma ya na Ya bịara sikwuo ike n’agbanyeghị na ume adịchaghịzi ya n’ahụ́.

20. Gịnị mere ijere Chineke ozi ji bụrụ ihe kacha mma ị pụrụ iji ndụ gị mee?

20 Otú Jọshụa, Devid, na Timoti si bie ndụ na-emekwu ka anyị kweta na ijere Jehova ozi bụ ụzọ kacha mma isi bie ndụ anyị. Uru na-adịghị adịte aka a na-enweta n’ịchụso akụnụba ụwa a enweghị ebe o ruru uru na-adịte aka ị ga-enweta site ‘n’iji obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na-ejere Jehova ozi.’ (Jọsh. 22:5) Ọ bụrụ na ị rarabeghị onwe gị nye Jehova n’ekpere, jụọ onwe gị si, ‘Gịnị ji m ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova?’ Ọ bụrụ na ị bụ onye na-efe Jehova nke merela baptizim, ị̀ ga-achọ inwekwu ọṅụ ná ndụ gị? Tinyekwuo mgbalị n’ozi Jehova ma nọgide na-enwe ọganihu. Isiokwu na-esonụ ga-agwa gị otú ị ga-esi nwekwuo ọganihu n’ozi Jehova site n’iṅomi ihe nlereanya Pọl onyeozi.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Kwuo ihe abụọ mere anyị ji kwesị ijere Chineke ozi.

• Gịnị nyeere Timoti aka ikpebi ijere Chineke ozi?

• Gịnị mere i ji kwesị ịnọgidesi ike mgbe a na-akpagbu gị?

• Olee ohere ije ozi ndị i nwere ike ịbanye?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Ijere Jehova ozi bụ ihe kacha mma anyị ga-eji ndụ anyị mee

[Foto dị na peeji nke 19]

Ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a jụrụ gị banyere ihe ndị i kweere?