Na-emenụ Ihe Ọma
Na-emenụ Ihe Ọma
“Na-emekwanụ ihe ọma.”—Luk 6:35.
1, 2. Gịnị mere o ji esikarị ike imere ndị ọzọ ihe ọma?
Ọ NA-ESIKARỊ ike imere ndị ọzọ ihe ọma. Ndị anyị hụrụ n’anya nwere ike ha agaghị ahụ anyị n’anya. Ọ bụ ezie na anyị na-agbalị inyere ndị mmadụ aka ịbịa mara Chineke site n’ikwusara ha “ozi ọma dị ebube nke Chineke bụ́ onye obi ụtọ” na nke Ọkpara ya, ha nwere ike ha agaghị egosi mmasị mgbe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ kelee anyị maka ihe anyị na-emere ha. (1 Tim. 1:11) Ndị ọzọ na-egosi na ha bụ nnọọ “ndị iro nke osisi ịta ahụhụ nke Kraịst.” (Fil. 3:18) Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-emeso ndị dị otú a?
2 Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-emekwanụ ihe ọma.” (Luk 6:35) Ugbu a, ka anyị leruo ndụmọdụ a anya. Ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru banyere imere ndị ọzọ ihe ọma ga-abakwara anyị uru.
“Na-ahụnụ Ndị Iro Unu n’Anya”
3. (a) N’okwu nke aka gị, kọwaa ihe ahụ Jizọs kwuru nke e dekọrọ na Matiu 5:43-45. (b) Gịnị ka ndị ndú okpukpe ndị Juu na narị afọ mbụ chere banyere ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu?
3 N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị ka ha na-ahụ ndị iro ha n’anya ma na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu ha. (Gụọ Matiu 5:43-45.) Ndị ahụ na-ege ya ntị bụ ndị Juu, ndị maara iwu Chineke nke ọma. Iwu ahụ sịrị: “Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi; hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Lev. 19:18) Ndị ndú okpukpe ndị Juu na narị afọ mbụ kwuru na ọ bụ naanị ndị Juu bụ “ụmụ ndị gị” na “mmadụ ibe gị” ndị e kwuru okwu ha n’ebe a. Iwu Mozis chọrọ ka ndị Izrel na-anọpụ iche n’ebe mba ndị ọzọ nọ, ma ụfọdụ ndị Juu bịara na-eche na ndị niile na-abụghị ndị Juu bụ ndị iro, e kwesịkwara ịkpọ ha asị.
4. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi na-emeso ndị iro ha?
4 Jizọs nwere echiche dị iche na nke ndị ndú okpukpe ndị Juu. Ọ sịrị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Mat. 5:44) Ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịhụ ndị niile na-akpagbu ha n’anya. Luk, bụ́ onye so dee akụkọ banyere ndụ Jizọs dere na Jizọs sịrị: “Ma ana m asị unu ndị na-ege ntị, Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-emerenụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma, na-agọzinụ ndị na-abụ unu ọnụ, na-ekpenụ ekpere maka ndị na-akparị unu.” (Luk 6:27, 28) Dị ka ndị narị afọ mbụ ahụ, bụ́ ndị mere ihe Jizọs kụziri, anyị ‘na-emere ndị na-akpọ anyị asị ihe ọma’ site n’imeso ha ihe n’ụzọ dị mma mgbe ha na-akpagbu anyị. Anyị ‘na-agọzi ndị na-abụ anyị ọnụ’ mgbe anyị ji obiọma na-agwa ha okwu. Anyị ‘na-ekpekwa ekpere maka ndị ji obi ọjọọ na-akpagbu anyị’ ma ọ bụ ndị “na-akparị” anyị n’ụzọ ndị ọzọ. Ekpere ndị dị otú a na-egosi na anyị hụrụ ndị na-akpagbu anyị n’anya ma na-arịọ ka ha gbanwee obi ha ma mee ihe ga-eme ka ha na Jehova dịrị ná mma.
5, 6. Gịnị mere anyị ji kwesị ịhụ ndị iro anyị n’anya?
5 Gịnị mere anyị ga-eji na-ahụ ndị iro anyị n’anya? Jizọs kwuru, sị: “Ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe.” (Mat. 5:45) Ọ bụrụ na anyị anakwere ndụmọdụ ahụ, anyị na-aghọ “ụmụ” nke Chineke n’ụdị na anyị na-eṅomi Jehova, bụ́ onye “na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” Dị ka Luk si dee ya, Chineke “nwere obiọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ.”—Luk 6:35.
6 Iji gosi nnọọ mkpa ọ dị ka ndị na-eso ụzọ ya ‘na-ahụ ndị iro ha n’anya,’ Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee ụgwọ ọrụ unu nwere? Ọ̀ bụ na ndị ọnaụtụ adịghị eme otu ihe ahụ? Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị ụmụnne unu ka unu na-ekele, olee oké ihe unu na-eme? Ọ̀ bụ na ndị mba ọzọ adịghị emekwa otu ihe ahụ?” (Mat. 5:46, 47) Ọ bụrụ na ndị anyị na-ahụ n’anya bụ naanị ndị na-ahụ anyị n’anya, anyị agaghị enweta “ụgwọ ọrụ” ọ bụla ma ọ bụ ngọzi n’aka Chineke. Ọbụna ndị ọnaụtụ, bụ́ ndị ọtụtụ ndị kpọrọ asị, na-ahụ ndị hụrụ ha n’anya n’anya.—Luk 5:30; 7:34.
7. Gịnị mere ọ gaghị abụ oké ihe ma anyị na-ekele naanị “ụmụnna” anyị?
7 Otu ekele ndị Juu na-ekelekarị bụ “udo” dịrị gị. (Ikpe 19:20; Jọn 20:19) Onye kelere mmadụ ụdị ekele a na-ekwu ka ọ dịrị onye ahụ ná mma, ka o nwee ezi ahụ́ ike na akụnụba. Ọ gaghị abụ “oké ihe” ma ọ bụrụ na anyị na-ekele naanị ndị anyị weere na ha bụ “ụmụnna” anyị. Dị ka Jizọs kwuru, “ndị mba ọzọ” na-eme otu ihe ahụ.
8. Gịnị ka Jizọs nọ na-agba ndị na-ege ya ntị ume ka ha na-eme mgbe o kwuru, sị: “Unu aghaghị izu okè”?
8 Mmehie e ketara eketa mere ka o siere ndị na-eso ụzọ Kraịst ike ịghara inwe ntụpọ, ya bụ, Rom 5:12) Ma Jizọs mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Ya mere, unu aghaghị izu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” (Mat. 5:48) O si otú a na-agba ndị na-ege ya ntị ume ka ha ṅomie “Nna ha nke eluigwe” bụ́ Jehova, site n’ime ka ịhụnanya ha zuo okè—na-eme ka o zuo ezuo site n’ịhụ ndị iro ha n’anya. A chọkwara ka anyị na-eme otú ahụ.
izu okè. (Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịdị Na-agbaghara?
9. Gịnị ka okwu ahụ bụ́, “Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji” pụtara?
9 Anyị na-eme ihe ọma ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi ebere na-agbaghara onye mejọrọ anyị. N’ezie, otu n’ime ihe e kwuru n’ekpere nlereanya Jizọs bụ: “Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.” (Mat. 6:12) Ma ihe a na-ekwu ebe a abụghị ịhapụrụ onye ji gị ụgwọ ego o ji gị n’ụgwọ. Oziọma Luk kwuru na “ụgwọ” Jizọs bu n’obi bụ mmehie. Luk dere, sị: “Gbaghara anyị mmehie anyị, n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke mehiere anyị.”—Luk 11:4.
10. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Chineke mgbe a bịara n’ịgbaghara mmehie?
10 Anyị kwesịrị iṅomi Chineke, bụ́ onye na-agbaghara nnọọ ndị mmehie chegharịrịnụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ma nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.” (Efe. 4:32) Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Jehova dị ebere, na-emekwa amara, Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, o nwere obiọma dị ukwuu. . . . Ọ dịghị emeso anyị dị ka mmehie anyị si dị; Ọ dịghịkwa enye anyị ntaramahụhụ dị ka njehie anyị si dị. . . . Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere dị ka nna si emere ụmụ ya ebere. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, Ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Ọma 103:8-14.
11. Olee ndị ka Chineke na-agbaghara?
11 Ọ bụ naanị mgbe ndị mmadụ gbaghaara ndị mejọrọ ha ka Chineke ga-agbaghara ha. (Mak 11:25) Jizọs mesiri nke a ike site n’ịgbakwụnye, sị: “N’ihi na ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu; ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.” (Mat. 6:14, 15) Chineke ga-agbaghara naanị ndị na-agbaghara ndị ọzọ kpamkpam. Otu ụzọ e si anọgide na-eme ihe ọma bụ site n’ime ihe Pọl dụrụ n’ọdụ, sị: “Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”—Kọl. 3:13.
“Kwụsịnụ Ikpe Ikpe”
12. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere banyere ikpe ndị ọzọ ikpe?
12 Jizọs kwuru otu ọzọ anyị ga-esi na-eme ihe ọma n’Ozizi Elu Ugwu ahụ mgbe ọ gwara ndị na-ege ya ntị ka ha kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe ma nyezie ha otu ihe atụ katara ahụ́ iji kọwaa nke a. (Gụọ Matiu 7:1-5.) Ka anyị tụlee ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe.”
13. Olee otú ndị na-ege Jizọs ntị ga-esi ‘na-atọhapụ ndị ọzọ’?
13 Matiu kwuru n’Oziọma ya na Jizọs sịrị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe.” (Mat. 7:1) Luk dere na Jizọs kwuru, sị: “Kwụsịkwanụ ikpe ikpe, a gaghịkwa ekpe unu ikpe ma ọlị; kwụsịkwanụ ịma ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe ma ọlị. Na-atọhapụnụ ndị mmadụ, a ga-atọhapụkwa unu.” (Luk 6:37) Ndị Farisii narị afọ mbụ na-eso omenala ha na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, na-eji obi ọjọọ ekpe ndị ọzọ ikpe. Onye ọ bụla n’ime ndị na-ege Jizọs ntị nke na-eme ka ndị Farisii kwesịrị ‘ịkwụsị ikpe ikpe.’ Kama ikpe ndị ọzọ ikpe, ha kwesịrị ịdị ‘na-atọhapụ ndị ọzọ,’ ya bụ, na-agbaghara ha. Dị ka e kwuru ná mbụ, Pọl onyeozi nyekwara ndụmọdụ yiri nke a n’ihe banyere ịgbaghara ndị ọzọ.
14. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-akpali ndị ọzọ ime ma ọ bụrụ na ha onwe ha ana-agbaghara ndị mmadụ?
14 Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ana-agbaghara ndị ọzọ, ọ ga-akpali ndị ahụ ịgbaghara ndị mejọrọ ha. Jizọs kwuru, sị: “Otú unu si Mat. 7:2) Mgbe a bịara n’otú anyị si emeso ndị ọzọ, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ anyị kụrụ.—Gal. 6:7.
ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe; ihe unu jikwa atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.” (15. Olee otú Jizọs si gosi na ọ dị nnọọ njọ ịkatọ ndị ọzọ?
15 Cheta na Jizọs jụrụ otu ajụjụ gbara ọkpụrụkpụ iji gosi na ịkatọ ndị ọzọ dị njọ. Ọ sịrị: “Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche? Ma ọ bụ, olee otú ị pụrụ isi sị nwanna gị, ‘Chere ka m wepụ irighiri ahịhịa n’anya gị’; ma, lee! ntụhie dị n’anya nke gị?” (Mat. 7:3, 4) Onye ọ maara ahụ́ ịkatọ ndị ọzọ na-ahụkarị obere ntụpọ dị “n’anya” nwanna ya. Onye nkatọ ahụ na-ekwu na echiche nwanna ya hiere ụzọ. Ọ bụ ezie na ntụpọ ahụ dị obere—dị ka irighiri ahịhịa—onye nkatọ ahụ chọrọ ‘iwepụ irighiri ahịhịa’ ahụ. Ọ bụ onye ihu abụọ, o chere na ya na-enyere nwanna ya aka ịhụ ihe nke ọma.
16. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na “ntụhie” dị n’anya ndị Farisii?
16 Ndị ndú okpukpe ndị Juu kacha nnọọ akatọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ: Mgbe otu nwoke kpuru ìsì nke Kraịst gwọrọ kwuru na ọ ga-abụrịrị na Jizọs si n’ebe Chineke nọ bịa, ndị Farisii ji iwe kwuo, sị: “A mụrụ gị n’ime mmehie, n’agbanyeghị nke a, ị̀ na-ezi anyị ihe?” (Jọn 9:30-34) Ma mgbe a bịara n’ikpe ikpe ziri ezi n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Chineke, ndị Farisii nwere “ntụhie” n’anya ha, ha kpukwara ìsì. N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ntụhie dị n’anya nke gị, mgbe ahụ ka ị ga-ahụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị.” (Mat. 7:5; Luk 6:42) Ọ bụrụ na anyị ekpebie na anyị ga na-eme ihe ọma ma na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị mma, anyị agaghị abụ ndị na-akatọkarị ndị ọzọ, ndị na-achọgharị irighiri ahịhịa n’anya nwanna anyị. Kama nke ahụ, anyị ga-amata na anyị niile ezughị okè, nke a ga-emekwa ka anyị kwụsị ikpe ụmụnna anyị ikpe ma ọ bụ na-akatọgharị ha.
Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Ọzọ
17. Dị ka e dere na Matiu 7:12, olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ?
17 N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs kwuru na Chineke na-emeso ndị ohu Ya ihe dị ka nna site Matiu 7:7-12.) Ọ dị mma ịmara na Jizọs kwuru ihe a anyị kwesịrị ime: “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Mat. 7:12) Ọ bụ naanị mgbe anyị si otú a na-emeso ndị mmadụ ibe anyị ihe ka anyị ga-egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Krasịt n’ezie.
n’ịza ekpere ha. (Gụọ18. Olee otú “Iwu ahụ” si gosi na anyị kwesịrị imeso ndị ọzọ otú anyị ga-achọ ka ha na-emeso anyị?
18 Mgbe Jizọs kwuchara na anyị kwesịrị imeso ndị ọzọ ihe dị ka anyị ga-achọ ka ha na-emeso anyị, ọ gbakwụnyere, sị: “Nke a bụ ihe Iwu ahụ na ihe ndị amụma kụziri pụtara.” Ọ bụrụ na anyị ana-emeso ndị ọzọ otú a Jizọs kwuru, anyị na-emezu ihe e bu n’uche nye “Iwu ahụ”—ya bụ, ihe ndị ahụ e dere n’akwụkwọ Jenesi ruo na Diuterọnọmi. E wezụga ime ka anyị mata nzube Jehova nke bụ́ ime ka e nwee mkpụrụ ga-ekpochapụ ihe ọjọọ, akwụkwọ Baịbụl ndị a gwara anyị Iwu ahụ Chineke nyere mba Izrel site n’aka Mozis n’afọ 1513 T.O.A. (Jen. 3:15) Ihe ndị so n’ihe a gwara ụmụ Izrel n’iwu ahụ bụ na ha ga na-ekpe ikpe ziri ezi, ha agaghị na-ele mmadụ anya n’ihu, ha gakwa na-emere ndị na-ahụsi anya na ndị ọbịa bi n’ala ha ihe ọma.—Lev. 19:9, 10, 15, 34.
19. Olee otú “Ndị Amụma” si gosi na anyị kwesịrị ịdị na-eme ihe ọma?
19 Ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ kpọtụrụ “Ndị Amụma” aha bụ akwụkwọ ndị amụma dere, bụ́ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ bụ́ ndị mezuru n’ahụ́ Kraịst dị n’akwụkwọ ndị a. Akwụkwọ ndị ahụ gosikwara na Chineke na-agọzi ndị ya mgbe ha mere ihe ziri ezi n’anya ya nakwa mgbe ha mesoro ndị ọzọ ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, e nyere ụmụ Izrel ndụmọdụ a n’amụma Aịzaya: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru: ‘Na-emenụ ihe ziri ezi, na-emekwanụ ezi omume. . . . Obi ụtọ na-adịrị mmadụ efu nke na-eme ihe a, na nwa nke mmadụ nke na-edebe ya, . . . onye na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ụdị ihe ọjọọ ọ bụla.’” (Aịza. 56:1, 2) N’ezie, Chineke na-atụ anya ka ndị ya nọgide na-eme ihe ọma.
Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma Mgbe Niile
20, 21. Olee ụdị mmetụta Ozizi Elu Ugwu Jizọs nwere n’ahụ́ ndị gere ya ntị, gịnịkwa mere anyị ji kwesị ichebara ozizi ahụ echiche?
20 Anyị atụleela naanị ole na ole n’ime ihe ndị dị oké mkpa Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya na-enweghị atụ. Anyị ga-ejizi nke a ghọta ụdị mmetụta nke a nwere n’ahụ́ ndị gere ya ntị n’oge ahụ. Baịbụl na-ekwu, sị: “Mgbe Jizọs kwusịrị okwu ndị a, otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya; n’ihi na ọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ ha.”—Mat. 7:28, 29.
21 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ ‘Onye Ndụmọdụ Dị Ebube’ e buru n’amụma. (Aịza. 9:6) Ozizi Elu Ugwu ahụ bụ ihe atụ doro anya na-egosi na Jizọs maara otú Nna ya nke eluigwe si ele ihe anya. Tụkwasị n’ihe ndị a anyị tụlerela, a ka nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e kwuru n’ozizi ahụ banyere otú e si enwe ezi obi ụtọ, otú e si ezere itinye aka n’omume rụrụ arụ, otú anyị ga-esi na-eme ezi omume, ihe anyị ga-eme iji bie ndụ na-enye ọṅụ n’ọdịnihu, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Gbalịa gụgharịa Matiu isi 5 ruo isi 7 nke ọma ma kpee ekpere ka ị na-eme nke a. Tụgharịa uche na ndụmọdụ magburu onwe ya Jizọs nyere bụ́ ndị e dere n’ebe ndị ahụ. Mee ihe ndị ahụ Kraịst kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-enwe ike ime ihe na-amasị Jehova, na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ma nọgide na-eme ihe ọma.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị iro anyị?
• Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị na-agbaghara ndị ọzọ?
• Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ikpe ndị ọzọ ikpe?
• Dị ka e dere na Matiu 7:12, olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
Ị̀ maara ihe mere Jizọs ji sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe”?
[Foto dị na peeji nke 8]
Gịnị mere anyị ji kwesị ikpe ekpere maka ndị na-akpagbu anyị?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ị̀ na-emeso ndị ọzọ ihe mgbe niile otú ị ga-achọ ka ha siri na-emeso gị?