Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Eruwela Mgbe Alaeze Chineke Ga-anapụta Anyị!

Oge Eruwela Mgbe Alaeze Chineke Ga-anapụta Anyị!

Oge Eruwela Mgbe Alaeze Chineke Ga-anapụta Anyị!

“Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—MAT. 6:10.

1. Olee ihe bụ́ isi Jizọs kụziri?

MGBE Jizọs Kraịst ziri Ozizi Elu Ugwu ya, ọ kụziri ekpere nlereanya nke ọ nọ na ya kwuo ihe bụ́ isi ọ bịara ịkụziri ndị mmadụ. Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha rịọ Chineke n’ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 6:9-13) Jizọs “nọ na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 8:1) Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.” (Mat. 6:33) Ka ị na-amụ isiokwu a, chọpụta otú ị ga-esi jiri ihe ndị ị mụtara mee ihe n’ozi gị. Dị ka ihe atụ, chọpụta otú i nwere ike isi zaa ajụjụ ndị a: Olee otú ozi Alaeze ahụ dịruru ná mkpa? Olee ihe ọ dị mkpa ka a napụta ụmụ mmadụ na ya? Oleekwanụ otú Alaeze Chineke ga-esi anapụta ụmụ mmadụ?

2. Olee otú ozi Alaeze ahụ dịruru ná mkpa?

2 Jizọs buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:14) Ozi ọma banyere Alaeze Chineke dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ozi kacha mkpa n’ụwa a! N’ihe karịrị narị puku ọgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile, ihe dị ka ndị ohu Chineke nde asaa na-arụ ọrụ a na-enweghị atụ, na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma na e ehiwela Alaeze ahụ n’eluigwe. Nhiwe a e hiwere Alaeze ahụ bụ ozi ọma n’ihi na nke a na-egosi na Chineke eguzowela ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achịkwa ihe ndị na-eme n’ụwa. Mgbe Alaeze a ga-achịwa ụwa, a ga na-eme uche Jehova n’elu ụwa dị ka a na-eme ya n’eluigwe.

3, 4. Olee ihe ga-eme mgbe uche Chineke ga-eme n’ụwa?

3 Olee ihe Chineke ga-emere ụmụ mmadụ mgbe a malitere ime uche ya n’ụwa? Jehova “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpu. 21:4) Ndị mmadụ agaghị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwụọ anwụọ n’ihi mmehie ha ketara eketa na ezughị okè. Ndị nwụrụ anwụ nọ n’ikike ncheta Chineke ga-enwe ohere ịdị ndụ ebighị ebi, n’ihi na Baịbụl kwere nkwa, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Agha, ọrịa, ma ọ bụ agụụ agaghị adịzi, ụwa ga-aghọkwa paradaịs. Ụmụ anụmanụ ndị na-akpa ike ugbu a agaghịzi na-egbu ụmụ anụmanụ ibe ha, ha na ụmụ mmadụ ga-anọkwa n’udo.—Ọma 46:9; 72:16; Aịza. 11:6-9; 33:24; Luk 23:43.

4 Ebe ọ bụ na a ga-enweta ngọzi ndị a magburu onwe ha mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ịchị, ọ bụghị ihe iju anya na otu amụma e buru na Baịbụl ji okwu ndị a na-akasi obi kọwaa otú ihe ga-adị n’oge ahụ, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Oleekwanụ maka ndị ajọ mmadụ? Akwụkwọ Nsọ buru amụma, sị: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ.” Ma, “ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.”—Ọma 37:9-11.

5. Gịnị ga-eme usoro ihe dị ugbu a?

5 Ka ihe ndị a niile wee mezuo, a ga-ewepụ usoro ihe dị ugbu a na ọchịchị ya niile na-eserịta okwu, okpukpe ya na azụmahịa ya. Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe ọchịchị alaeze eluigwe ahụ ga-eme. Mmụọ nsọ kpaliri Daniel onye amụma ikwu, sị: “N’ụbọchị ndị eze ahụ [ndị nke na-achị ugbu a], Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị [n’eluigwe]. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile [dị ugbu a], mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” (Dan. 2:44) Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị ọhụrụ ga-esi n’eluigwe na-achị—ga-amalitezi ịchị ụwa, nke bụ́ ụmụ mmadụ ọhụrụ. A ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ . . . , ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.”—2 Pita 3:13.

Nnapụta Dị Ụmụ Mmadụ Oké Mkpa Taa

6. Olee otú Baịbụl si kọwaa ihe ọjọọ dị n’ụwa a?

6 Nsogbu ụmụ mmadụ malitere mgbe Setan, Adam, na Iv nupụụrụ Chineke isi n’ihi na ha chọrọ iji aka ha kpebie ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Mgbe ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ isii gachara, ya bụ́ tupu e nwee Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ, ‘ihe ọjọọ nke mmadụ bịara dị ukwuu n’ụwa, ihe niile obi ya na-echekwa mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.’ (Jen. 6:5) Ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ atọ ka e mechara, Sọlọmọn chọpụtara na ihe akakwuola njọ nke na o dere, sị: “M wee kwuo na ọ dịịrị ndị nwụrụ anwụ mma, bụ́ ndị nwụrụla anwụ, karịa ndị nọ ndụ, bụ́ ndị ka dị ndụ. Onye ka ha abụọ mma bụ onye a na-amụbeghị amụ, onye na-ahụghị ọrụ ahụhụ a na-arụ n’okpuru anyanwụ.” (Ekli. 4:2, 3) Ka ihe dị ka puku afọ atọ ọzọ gachara, nke bụ́ n’oge anyị a, ihe ọjọọ akwụsịbeghịkwa ịka njọ.

7. Gịnị mere o ji dịsie anyị mkpa ike ugbu a ka Chineke napụta anyị?

7 Ọ bụ ezie na ọ dịla anya ihe ọjọọ dịwara, anyị na-achọpụta na ọ dị oké mkpa ka Alaeze Chineke napụta ụmụ mmadụ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Otú ọnọdụ ụwa jọruru ná njọ kemgbe otu narị afọ gara aga enweghị atụ, ihe anọgidekwala na-aka njọ. Dị ka ihe atụ, akụkọ sitere n’aka ụlọ ọrụ bụ́ Worldwatch Institute na-ekwu, sị: “Ndị nwụrụ n’agha n’ime afọ 1900 ruo afọ 1999 ji okpukpu atọ karịa ndị nwụrụ n’agha niile a lụrụ site na narị afọ mbụ ruo n’afọ 1899.” Kemgbe afọ 1914, ihe karịrị narị nde mmadụ anwụọla n’agha! Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-ekwu na ndị nwụrụ n’Agha Ụwa nke abụọ nwere ike iru nde iri isii. Ugbu a ọtụtụ mba nwere ngwa agha nuklia, ụmụ mmadụ nwedịrị ike igbuchapụ ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị bi n’ụwa. N’agbanyeghị na e nweela ọganihu na sayensị nakwa n’ihe banyere ọgwụ na ahụ́ ike, ihe dị ka nde ụmụaka ise na-anwụ kwa afọ n’ihi agụụ.—Gụọ isi nke 9 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

8. Gịnị ka ọtụtụ puku afọ ụmụ mmadụ chịwara onwe ha gosirila?

8 Mgbalị ụmụ mmadụ na-eme iji kwụsị ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa akụọla afọ n’ala. Ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa, azụmahịa ụwa, na okpukpe ndị e nwere n’ụwa emebeghị ka e nwee udo, ọganihu, na ahụ́ ike, bụ́cha ihe ndị dị ụmụ mmadụ ezigbo mkpa. Kama inyere ndị mmadụ aka idozi nnukwu nsogbu ndị ha na ha na-alụ, ihe ndị a a kpọrọ aha na-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ na-aka njọ. N’ezie, ihe ndị na-eme kemgbe puku afọ ole ụmụ mmadụ chịwara onwe ha na-egosi na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu: “Ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jere. 10:23) N’eziokwu, ‘mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’ (Ekli. 8:9) Ihe ọzọkwa bụ na “ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.”—Rom 8:22.

9. Olee ihe Ndị Kraịst na-atụ anya ịhụ “n’oge ikpeazụ” a?

9 Baịbụl kwuru banyere oge anyị a, sị: “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” Ka Baịbụl kwuchara ihe ndị ga-eme n’oge ikpeazụ a ụmụ mmadụ ga na-achị onwe ha, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ.” (Gụọ 2 Timoti 3:1-5, 13.) Ndị Kraịst na-atụ anya na ọ bụ otú ahụ ka ụwa ga-adị n’ihi na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ” bụ́ Setan. (1 Jọn 5:19) Ma, ozi ọma dịnụ bụ na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-anapụta ndị hụrụ ya n’anya. A ga-anapụta ha n’ụwa a, bụ́ nke na-akawanye njọ n’ike n’ike.

Naanị Ebe A Ga-esi Nweta Nnapụta

10. Gịnị mere o ji bụrụ naanị Jehova ka anyị pụrụ ịtụkwasị obi na ọ ga-anapụta anyị?

10 Mgbe ị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, nyere ha aka ka ha ghọta na ọ bụ naanị Jehova bụ Onye ha pụrụ ịtụkwasị obi na ọ ga-anapụta ha. Ọ bụ naanị ya nwere ike ma dịkwa njikere ịnapụta ndị ohu ya n’ọnọdụ ọjọọ ọ bụla. (Ọrụ 4:24, 31; Mkpu. 4:11) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-anapụta ndị ya mgbe niile ma mezuo nzube ya n’ihi na ọ ṅụrụ iyi, sị: “Dị nnọọ ka ọ dị m n’obi, otú ahụ ka ọ ga-eme.” Okwu ya ‘agaghị agba aka lọghachikwute ya.’—Gụọ Aịzaya 14:24, 25; 55:10, 11.

11, 12. Olee nkwa Chineke na-ekwe ndị ohu ya?

11 Jehova ekwela nkwa ịnapụta ndị ohu ya mgbe ọ ga-ebibi ndị ajọ omume. Mgbe o zigara Jeremaya onye amụma ka ọ gaa gwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu n’atụghị ụjọ, Chineke kwuru, sị: ‘Atụla ha ụjọ.’ N’ihi gịnị? “N’ihi na anọnyeere m gị ịnapụta gị.” (Jere. 1:8) N’otu aka ahụkwa, tupu Jehova ebibie obodo ọjọọ bụ́ Sọdọm na Gọmọra, o zigara ndị mmụọ ozi abụọ ka ha gaa kpọpụta Lọt na ezinụlọ ya n’ebe ahụ. “Jehova wee mee ka sọlfọ na ọkụ . . . zokwasị Sọdọm, zokwasịkwa Gọmọra.”—Jen. 19:15, 24, 25.

12 Ọbụna mgbe mbibi ahụ ga-ezu ụwa niile, Jehova pụrụ ịnapụta ndị na-eme uche ya. Mgbe o ji Iju Mmiri bibie ụwa ọjọọ e nwere n’oge ochie, o “chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume, ya na mmadụ asaa ndị ọzọ.” (2 Pita 2:5) Jehova ga-anapụtakwa ndị ezi omume mgbe ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ a. N’ihi ya, Baịbụl na-agwa anyị, sị: “Chọọnụ Jehova, unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa . . . Chọọnụ ezi omume, chọọnụ ịdị umeala n’obi. Ma eleghị anya, a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” (Zef. 2:3) Ebe ọ bụ na mbibi ahụ ga-ezu ụwa ọnụ, “ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, . . . ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume.”—Ilu 2:21, 22.

13. Olee otú a ga-esi napụta ndị ohu Jehova nwụrụ anwụ?

13 Ma, ọtụtụ ndị ohu Chineke anwụọla n’ihi ọrịa, mkpagbu, na ihe ndị ọzọ. (Mat. 24:9) Oleezi otú a ga-esi napụta ndị a niile? Dị ka anyị kwuru ná mbụ, “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke . . . ndị ezi omume.” (Ọrụ 24:15) Ịmara na ọ dịghị ihe nwere ike igbochi Jehova ịnapụta ndị ya bụ nnọọ ihe na-akasi obi!

Ọchịchị Ezi Omume

14. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Alaeze Chineke bụ ọchịchị ezi omume?

14 Mgbe ị nọ n’ozi ọma, i nwere ike ịkọwara ndị mmadụ na Alaeze eluigwe Jehova bụ ọchịchị ezi omume. Ihe mere o ji bụrụ ọchịchị ezi omume bụ n’ihi na ọ na-eme ka anyị mara na Chineke nwere àgwà ndị magburu onwe ha dị ka ikpe ziri ezi, ezi omume, na ịhụnanya. (Diut. 32:4; 1 Jọn 4:8) Chineke enyefeela Jizọs Kraịst, bụ́ onye kacha ruo eruo ịchị ụwa, Alaeze ahụ. Jehova ezubekwala na a ga-esi n’ụwa họrọ mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ Ndị Kraịst e tere mmanụ gaa eluigwe ka ha wee soro Kraịst chịa ụwa.—Mkpu. 14:1-5.

15. Kwuo ihe ga-adị iche n’ọchịchị Chineke na nke ụmụ mmadụ.

15 Ọchịchị Jizọs na mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso chịa ga-adị nnọọ iche na nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè! Ndị ọchịchị ụwa a na-adịkarị obi ọjọọ, ha edubakwala ndị ha na-achị ịga lụwa agha, bụ́ nke kpatarala ọnwụ ọtụtụ nde mmadụ. Ka a sịkwa ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji dọọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịtụkwasị mmadụ obi “bụ́ onye ọ na-adịghị nzọpụta dị n’aka ya”! (Ọma 146:3) Ma ọchịchị Kraịst ga-amagbu onwe ya n’ihi na ọ bụ onye ezi omume. Jizọs kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Mat. 11:28-30.

Oge Ikpeazụ Agwụwala!

16. Olee otú ụbọchị ikpeazụ a ga-esi bịa ná njedebe?

16 Ụwa a abanyela n’ụbọchị ikpeazụ ma ọ bụ “ọgwụgwụ usoro ihe a,” kemgbe afọ 1914. (Mat. 24:3) N’oge na-adịghị anya, ihe Jizọs kpọrọ “oké mkpagbu” ga-amalite. (Gụọ Matiu 24:21.) Oké mkpagbu ahụ a na-enwetụbeghị ụdị ya mbụ ga-eweta ụwa Setan dum ná njedebe. Ma olee otú oké mkpagbu ahụ ga-esi malite? Oleekwa otú ọ ga-esi kwụsị?

17. Olee ihe Baịbụl kwuru ga-abụ mmalite nke oké mkpagbu ahụ?

17 Oké mkpagbu ahụ ga-amalite ná mberede. Ee, “ụbọchị Jehova” ga-abịa mgbe a na-atụghị anya ya “mgbe ọ bụla ha na-asị: ‘Udo na obi iru ala!’” (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 3.) Mkpagbu ahụ e buru amụma ya ga-amalite mgbe mba dị iche iche ga-eche na ha achọtawala ụzọ ha ga-esi dozie nsogbu ndị bụ́ isi ha na-enwe. Mbibi a ga-ebibi “Babịlọn Ukwu ahụ,” bụ́ Alaeze ụwa nke okpukpe ụgha ná mberede, ga-eju ụwa anya. Ọ ga-atụ ndị eze na ndị ọzọ n’anya mgbe a ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ.—Mkpu. 17:1-6, 18; 18:9, 10, 15, 16, 19.

18. Olee ihe Jehova ga-eme mgbe Setan ga-abịa ịlụso ndị Ya agha?

18 N’otu oge ga-ata ezigbo akpụ, a ga-enwe “ihe ịrịba ama dị iche iche n’anyanwụ na n’ọnwa nakwa na kpakpando,” “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụta n’eluigwe.” Mgbe ahụzi, anyị ga-enwe ike ‘iguzo kwem ma welie isi anyị elu, n’ihi na nnapụta anyị na-eru nso.’ (Luk 21:25-28; Mat. 24:29, 30) Setan, ma ọ bụ Gọg, ga-achọzi iji ndị ya lụsoo ndị Chineke agha. Ma Jehova kwuru banyere ndị na-emegide ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ mkpụrụ anya m aka.” (Zek. 2:8) N’ihi ya, mgbalị Setan ga-akụ afọ n’ala. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-agbata ọsọ ozugbo bịa napụta ndị ohu ya.—Ezik. 38:9, 18.

19. Olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na ndị agha Chineke ga-ebibi usoro ihe Setan?

19 Mgbe Chineke ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’isi mba niile, ‘ha ga-amara na ya onwe ya bụ Jehova.’ (Ezik. 36:23) Ọ ga-eji ndị mmụọ ozi ya, nke bụ́, ìgwè ndị mmụọ o kere eke ndị Kraịst Jizọs bụ onye ndú ha, bibie usoro ihe Setan ndị fọdụrụ n’ụwa. (Mkpu. 19:11-19) Ọ bụrụ na anyị echeta na n’otu oge, naanị otu mmụọ ozi ji otu abalị “gbuo otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise” nke ndị iro Chineke, obi kwesịkwara isi anyị ike na ọ gaghị esiri ndị agha Chineke ike ibibi akụkụ niile nke usoro ihe Setan nọ n’ụwa mgbe oké mkpagbu ahụ ga-eduga n’Amagedọn. (2 Eze 19:35; Mkpu. 16:14, 16) A ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis ruo otu puku afọ. A ga-emecha bibie ha n’ikpeazụ.—Mkpu. 20:1-3.

20. Olee ihe Jehova ga-eji Alaeze ahụ rụzuo?

20 A ga-esi otú a kpochapụ ihe ọjọọ niile n’eluigwe na n’ụwa, ụmụ mmadụ ndị ezi omume ga-adịzi ndụ ebighị ebi n’ụwa a. Mgbe ahụ, Jehova ga-egosi na ya bụ́ Onye Nnapụta Ukwu. (Ọma 145:20) Ọ ga-eji Alaeze ahụ gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị, doo aha ya nsọ, ma mezuo nzube ya dị ebube maka ụwa. Ekpere anyị bụ ka ị na-enwe ọṅụ dị ukwuu n’ozi gị ka ị na-ekwusa ozi ọma a ma na-enyere ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” aka ịghọta na Alaeze Chineke ga-anapụta ha n’oge na-adịghị anya!—Ọrụ 13:48.

Ì Chetara?

• Olee otú Jizọs si gosi na Alaeze ahụ dị mkpa?

• Olee ihe mere nnapụta ji dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ?

• Olee ihe ndị anyị ga-atụ anya na ha ga-eme n’oge oké mkpagbu ahụ?

• Olee otú Jehova si gosi na ya bụ Onye Nnapụta Ukwu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

E buru amụma n’Okwu Chineke na a ga-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile n’oge anyị a n’ụdị a na-emetụbeghị ya mbụ

[Foto dị na peeji nke 15]

Jehova pụrụ ịnapụta anyị dị nnọọ ka Ọ napụtara Noa na ezinụlọ ya

[Foto dị na peeji nke 16]

Jehova “ga-ehichapụ anya mmiri niile . . . , ọnwụ agaghị adị ọzọ.”—Mkpu. 21:4