Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Ọzọ?
Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Ọzọ?
“Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.”—LUK 6:31.
1, 2. (a) Gịnị bụ Ozizi Elu Ugwu ahụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a na nke na-eso ya?
JIZỌS Kraịst bụ Onye Ozizi Ukwu n’ezie. Mgbe ndị ndú okpukpe bụ́ ndị iro ya dunyere ndị nche ka ha gaa jide ya, ha gbaara aka lọta, ma kwuo, sị: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.” (Jọn 7:32, 45, 46) Otu n’ime ozizi magburu onwe ya Jizọs ziri bụ Ozizi Elu Ugwu ahụ. E dekọrọ ya n’Oziọma Matiu isi nke 5 ruo isi nke 7, e dekọkwara ihe yiri ya na Luk 6:20-49. *
2 Ikekwe okwu a kacha mara amara n’Ozizi Elu Ugwu ahụ bụ ndụmọdụ Jizọs nyere banyere otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ. Ọ sịrị: “Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.” (Luk 6:31) Jizọs meere ndị mmadụ ihe ọma n’ezie! Ọ gwọrọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ma ndị mmadụ kacha rite uru mgbe ha nabatara ozi ọma o ziri ha. (Gụọ Luk 7:20-22.) Ọ na-atọkwa anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ụtọ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. (Mat. 24:14; 28:19, 20) N’isiokwu a na nke na-eso ya, anyị ga-atụle ihe Jizọs kwuru banyere ọrụ a nakwa ihe ndị ọzọ o kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ banyere otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ.
Dịrị Nwayọọ n’Obi
3. Olee otú ị ga-esi kọwaa ịdị nwayọọ n’obi?
3 Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Mat. 5:5) N’Akwụkwọ Nsọ, e nweghị ihe ọ bụla jikọrọ ịdị nwayọọ n’obi na adịghị ike. Ịdị nwayọọ n’obi bụ iji obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe dị ka Chineke nyere anyị iwu na Baịbụl ka anyị na-eme. Anyị na-egosikwa na anyị dị nwayọọ n’obi site n’otú anyị si emeso mmadụ ibe anyị ihe. Dị ka ihe atụ, anyị adịghị eji “ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.”—Rom 12:17-19.
4. Gịnị mere ndị dị nwayọọ n’obi ji enwe obi ụtọ?
4 Ndị dị nwayọọ n’obi nwere obi ụtọ n’ihi na “ha ga-eketa ụwa.” Ọ bụ Jizọs, onye “dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi,” ka a “họpụtara ka ọ bụrụ onye nketa nke ihe niile,” n’ihi ya kwa, ọ bụ ya bụ Onye bụ́ isi e nyere ụwa dị ka ihe nketa. (Mat. 11:29; Hib. 1:2; Ọma 2:8) E buru n’amụma na e nwere ndị ga-eso “nwa nke mmadụ” onye bụ́ Mesaya ahụ chịa n’Alaeze eluigwe. (Dan. 7:13, 14, 21, 22, 27) Ebe ọ bụ na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ndị e tere mmanụ bụ́ ndị dị nwayọọ n’obi na “Kraịst na-eketakọ ihe,” ha na Jizọs ga-eketakọkwa ụwa. (Rom 8:16, 17; Mkpu. 14:1) Ndị ọzọ dị nwayọọ n’obi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe Alaeze ahụ ga-achị ụwa.—Ọma 37:11.
5. Olee otú ịdị nwayọọ n’obi dị ka Kraịst si emetụta àgwà anyị?
5 Ọ bụrụ na anyị na-agba ka akpị, anyị nwere ike ịdị na-akpasukarị ndị ọzọ iwe nke ga-eme ka ha na-agbara anyị ọsọ. Ma ịdị nwayọọ n’obi dị ka Kraịst na-eme ka ọ na-amasị ụmụnna anyị ịnọ anyị nso, nke a na-enyekwara ha aka ịkwụsi ike n’okwukwe. Ịdị nwayọọ n’obi so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke na-eme ka anyị nwee ma ọ bụrụ na anyị ‘na-adị ndụ ma na-eje ije site na mmụọ nsọ.’ (Gụọ Ndị Galeshia 5:22-25.) N’ezie anyị chọrọ ka a gụnye anyị ná ndị dị nwayọọ n’obi, ndị mmụọ nsọ Jehova na-eduzi!
Ndị Na-eme Ebere Na-enwe Nnọọ Obi Ụtọ!
6. Olee àgwà ndị mara mma “ndị na-eme ebere” nwere?
6 Jizọs kwukwara n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere, n’ihi na a ga-emere ha ebere.” (Mat. 5:7) “Ndị na-eme ebere” nwere obi ọmịiko ma na-echebara ndị ọzọ echiche, ọbụna na-emetere ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha ebere. Jizọs rụrụ ọrụ ebube iji kwụsị ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ihi na o nwere “ọmịiko” n’ebe ha nọ. (Mat. 14:14; 20:34) Ọmịiko na ichebara ndị ọzọ echiche kwesịkwara ịkpali anyị imere ha ebere.—Jems 2:13.
7. Olee ihe ọmịiko kpaliri Jizọs ime?
7 Mgbe ìgwè mmadụ zutere Jizọs oge ọ na-aga izurutụ ike, “o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” N’ihi ya, “o wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Anyị na-enwe nnọọ ọṅụ ka anyị onwe anyị na-ekwusakwara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ ma mee ka ha mata banyere obi ebere na-enweghị atụ nke Chineke.
8. Gịnị mere ndị na-eme ebere ji enwe obi ụtọ?
8 Ndị na-eme ebere na-enwe obi ụtọ n’ihi na “a ga-emere ha ebere.” Ọ bụrụ na anyị na-emere ndị mmadụ ebere, ha ga na-emekwara anyị ebere. (Luk 6:38) Jizọs kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu.” (Mat. 6:14) Ọ bụ naanị ndị na-eme ebere ka a ga-agbaghara mmehie ha, ha na Chineke na-adịkwa ná mma, ihe ndị a na-ewetakwa obi ụtọ.
Ihe Mere “Ndị Na-eme Udo” Ji Enwe Obi Ụtọ
9. Olee otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eme udo?
9 Jizọs kwuru ihe ọzọ na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo, n’ihi na a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’” (Mat. 5:9) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eme udo, anyị agaghị na-ege asịrị ọjọọ ma ọ bụ soro na-agbasa ya, bụ́ nke nwere ike ‘ikewa ndị ha na ibe ha dị ná mma.’ (Ilu 16:28) Site n’okwu ọnụ na n’omume anyị, anyị ga-agbalị hụ na anyị na ndị nọ n’ọgbakọ na ndị na-anọghị n’ọgbakọ na-adị n’udo. (Hib. 12:14) Nke kacha mkpa bụ na anyị kwesịrị ime ike anyị niile iji hụ na anyị na Jehova Chineke dị n’udo.—Gụọ 1 Pita 3:10-12.
10. Gịnị mere “ndị na-eme udo” ji enwe obi ụtọ?
10 Jizọs sịrị na “ndị na-eme udo” nwere obi ụtọ, “n’ihi na a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’” Ihe mere e ji nye Ndị Kraịst e tere mmanụ “ikike ịghọ ụmụ Chineke” bụ n’ihi na ha nwere okwukwe na Jizọs onye bụ́ Mesaya ahụ. (Jọn 1:12; 1 Pita 2:24) Oleekwanụ maka “atụrụ ọzọ” Jizọs, bụ́ ndị na-eme udo? Jizọs ga-abụrụ ha “Nna Mgbe Ebighị Ebi” n’oge Ọchịchị Puku Afọ ahụ mgbe ya na ndị ga-eso ya chịa ga-amalite ịchị n’eluigwe. (Jọn 10:14, 16; Aịza. 9:6; Mkpu. 20:6) Ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ, ndị a na-eme udo ga-aghọ ụmụ Chineke ndị nke bi n’ụwa n’ụzọ zuru nnọọ ezu.—1 Kọr. 15:27, 28.
11. Olee otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe ma ọ bụrụ na “amamihe nke si n’elu” na-eduzi anyị?
11 Ka anyị na Jehova bụ́ “Chineke nke udo” wee dị ná mma, anyị kwesịrị iṅomi àgwà ya, nke otu n’ime ya bụ ime udo. (Fil. 4:9) Ọ bụrụ na anyị ekwere ka “amamihe nke si n’elu” na-eduzi anyị, anyị ga na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ udo. (Jems 3:17) N’ezie, anyị ga-abụ ndị na-eme udo nwere obi ụtọ.
“Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”
12. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ìhè nke eziokwu si n’ebe Chineke nọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ìhè anyị na-enwu?
12 Anyị na-emeso ndị mmadụ ihe n’ụzọ kacha mma mgbe anyị nyeere ha aka inweta ìhè nke eziokwu si n’ebe Chineke nọ. (Ọma 43:3) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha bụ “ìhè nke ụwa” ma gbaa ha ume ka ha mee ka ìhè ha na-enwu ka ndị mmadụ wee hụ “ọrụ ọma” ha, ma ọ bụ omume ọma ha na-emeso ndị ọzọ. Nke a ga-eme ka “ndị mmadụ” hụ eziokwu ahụ, bụ́ nke ga-abara ha uru. (Gụọ Matiu 5:14-16.) Taa, anyị na-eme ka ìhè anyị na-enwu site n’imere ndị agbata obi anyị ihe ọma na site n’iso na-ekwusa ozi ọma ahụ “n’ụwa dum,” ya bụ, “ná mba niile.” (Mat. 26:13; Mak 13:10) E nwetụghị ihe ùgwù ka nke a!
13. Olee ihe ndị anyị na-eme ndị ndị mmadụ na-ahụ?
13 Jizọs sịrị: “A pụghị izo obodo ezo ma ọ bụrụ na ọ dị n’elu ugwu.” Ọ na-adị mfe ịhụ obodo ọ bụla nọ n’elu ugwu. N’otu aka ahụ, ndị mmadụ na-ahụ ọrụ ọma anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, ha na-ahụkwa àgwà ọma anyị ndị dị ka imeru ihe n’okè na ịdị ọcha.—Taị. 2:1-14.
14. (a) Olee otú oriọna ndị e nwere na narị afọ mbụ dị? (b) Olee otú o si bụrụ na anyị adịghị ezo ìhè ime mmụọ anyị n’okpuru “nkata”?
14 Jizọs kwuru na a na-amụnye oriọna ma dọwa ya, ọ bụghị n’okpuru nkata, kama n’elu ihe e ji adọwa oriọna, ka o nwee ike inye ndị niile nọ n’ime ụlọ ìhè. Oriọna ndị e nwere na narị afọ mbụ bụ ụdị nke e ji ụrọ kpụọ, nke nwere eriri na-amịrị mmanụ ọkụ (karịsịa mmanụ oliv) iji mee ka ọkụ na-enwu. A na-adọwakarị ya n’elu ihe e ji adọwa oriọna bụ́ nke e ji osisi ma ọ bụ ọla rụọ, ọ na-esi n’ebe ahụ enye ‘ndị niile nọ n’ime ụlọ ìhè.’ Ndị mmadụ agaghị amụnye oriọna dọwa ya “n’okpuru nkata.” Jizọs achọghị ka ndị na-eso ụzọ ya zoo ìhè ime mmụọ ha n’okpuru nkata ihe atụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikwe ka ìhè anyị na-enwu, ghara ikwetụdị ka mmegide ma ọ bụ mkpagbu mee ka anyị zowe eziokwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ ezowe ma ọ bụ ghara ịkọrọ ya ndị ọzọ.
15. Gịnị ka “ọrụ ọma” anyị na-eme ka ụfọdụ mee?
15 Ọ bụ mgbe Jizọs kwuchara banyere oriọna na-enwu enwu ka ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Otú ahụ, meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” N’ihi “ọrụ ọma” anyị, ndị ụfọdụ ‘na-enye Chineke otuto’ site n’ịbịa soro jewere ya ozi. Nke a kwesịrị ime nnọọ ka anyị nọgide ‘na-enwu dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.’—Fil. 2:15.
16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji gosi na anyị bụ “ìhè nke ụwa”?
16 Iji bụrụ “ìhè nke ụwa,” anyị kwesịrị iso na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ ma na-enyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma e nwekwara ihe ọzọ a chọrọ anyị n’aka. Pọl onyeozi dere, sị: “Na-ejenụ ije dị ka ụmụ nke ìhè, n’ihi na mkpụrụ nke ìhè ahụ bụ ụdị ịdị mma ọ bụla na ụdị ezi omume ọ bụla na ụdị eziokwu ọ bụla.” (Efe. 5:8, 9) Àgwà anyị kwesịrị ịbụrụ ndị ọzọ ihe nlereanya. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ime ihe a Pita onyeozi nyere ndụmọdụ ka anyị mee. Ọ sịrị: “Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ, ka o wee bụrụ na n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide unu, na-asị na unu bụ ndị ajọ omume, ha ga-enye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ya n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.” (1 Pita 2:12) Ma gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị na nwanna anyị enwee nghọtahie?
“Mee Ka Gị na Nwanne Gị Dị n’Udo”
17-19. (a) Gịnị bụ “onyinye” ahụ a kpọrọ aha na Matiu 5:23, 24? (b) Olee otú mmadụ na nwanne ya idozi nsogbu ha nwere dịruru ná mkpa, oleekwa otú Jizọs si mee ka nke a pụta ìhè?
17 N’Ozizi Elu Ugwu Jizọs, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ghara ibu iwe n’obi ma ọ bụ gwa nwanne ha okwu nlelị. Kama nke ahụ, ha ekwesịghị igbu oge n’ime ka udo dị n’etiti ha na nwanne ha ha mejọrọ. (Gụọ Matiu 5:21-25.) Leruo ndụmọdụ a Jizọs nyere anya. Ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, gịnị ka i kwesịrị ime? I kwesịrị ịhapụgodị onyinye gị n’ihu ebe ịchụàjà ma gaa mee ka gị na nwanne gị dị n’udo. I mechaa, i nweziri ike ịlọghachi bịa nye onyinye gị.
18 “Onyinye” ahụ na-abụkarị onyinye mmadụ nwere ike iji chụọ àjà n’ụlọ nsọ Jehova. Àjà ụmụ anụmanụ dị nnọọ mkpa n’ihi na Chineke kwuru ka ụmụ Izrel na-achụ ya dị ka otu n’ime ụzọ ndị ha si efe ya mgbe ha ka na-edebe Iwu Mozis. Ma ọ bụrụ na i cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, idozi nsogbu ahụ kadị inye onyinye gị mkpa. Jizọs sịrị: “Hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.” Mmadụ na nwanne ya idozi nsogbu ha ka mkpa karịa ịchụ àjà a Iwu ahụ kwuru.
19 Jizọs ekwughị kpọmkwem ụdị àjà mmadụ ga-ahapụgodị n’ebe ịchụàjà ma ọ bụ ụdị mmejọ o kwesịrị ibu ụzọ gaa dozie. N’ihi ya, ụdị àjà ọ sọkwara ya ya bụrụ, mmadụ ga-ahapụgodị ya ma o cheta na obi adịghị nwanne ya mma n’ebe ọ nọ. Ọ bụrụ na anụmanụ ahụ e ji bịa ịchụ àjà dị ndụ, a ga-ahapụ ya “n’ihu ebe ịchụàjà” nsure ọkụ dị n’ogige ndị nchụàjà n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụrụ na ha edozichaa nsogbu ha, onye ahụ ga-alọghachi bịa chụọ àjà ya.
20. Ọ bụrụ na anyị na-eweso nwanne anyị iwe, gịnị mere anyị kwesịrị iji dozie nsogbu ahụ ọsọ ọsọ?
20 Chineke weere mmekọrịta anyị na ụmụnna anyị dị ka otu ụzọ dị mkpa anyị si efe ya. Àjà e ji ụmụ anụmanụ chụọ abaghị uru ọ bụla n’anya Jehova ma ọ bụrụ na ndị na-achụ ha adịghị emeso mmadụ ibe ha ihe n’ụzọ dị mma. (Maị. 6:6-8) N’ihi ya, Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha “dozie okwu ọsọ ọsọ.” (Mat. 5:25) Pọl dekwara ihe yiri ya, mgbe ọ sịrị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela; unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara, unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Efe. 4:26, 27) Ọ bụrụgodị na e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji wee iwe, anyị kwesịrị ịgbalị idozi nsogbu ahụ ọsọ ọsọ ka anyị ghara ịnọgide na-ewe iwe ma si otú ahụ nye Ekwensu ohere ka o jiri anyị kwara ngwa ọrụ.—Luk 17:3, 4.
Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù Mgbe Niile
21, 22. (a) Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe ndị ahụ Jizọs kụziri bụ́ nke anyị ka tụlechara? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
21 Ihe ụfọdụ Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya anyị tụlerela ugbu a kwesịrị inyere anyị aka iji obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe ma na-akwanyere ha ùgwù. N’agbanyeghị na anyị niile ezughị òkè, anyị ga-emeli ihe ahụ Jizọs kwuru n’ihi na ọ dịghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli, otú ahụkwa ka ọ dị Nna anyị nke eluigwe. Site n’ikpe ekpere, ịgbalịsi ike, nakwa site n’enyemaka Jehova Chineke, anyị nwere ike ịbụ ndị dị nwayọọ n’obi, ndị na-eme ebere, nakwa ndị na-eme udo. Anyị ga na-eme ka ìhè nke eziokwu ahụ na-enwusi ike bụ́ nke ga-ewetara Jehova otuto. Tụkwasị na nke ahụ, anyị ga-enwe ike iso nwanne anyị mee udo mgbe ọ bụla ọ dị mkpa ka anyị mee otú ahụ.
22 Imeso ndị agbata obi anyị ihe n’ụzọ dị mma so n’ụdị ofufe Jehova na-anara. (Mak 12:31) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-emere ndị ọzọ ihe ọma. Ugbu a anyị tụlechara ihe ndị a na-enweghị atụ Jizọs kwuru, anyị nweziri ike ịjụ onwe anyị sị, ‘Olee otú m si emeso ndị ọzọ ihe?’
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 1 Mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe gị, o yiri ka ị ga-akacha erite uru n’ihe ị na-amụ ma ọ bụrụ na i buru ụzọ gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a tupu ị gụwa isi okwu a na nke na-eso ya.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Gịnị ka ịdị nwayọọ n’obi pụtara?
• Gịnị mere “ndị na-eme ebere” ji enwe obi ụtọ?
• Olee otú anyị ga-esi mee ka ìhè anyị na-enwu?
• Gịnị mere anyị ji kwesị iji ọsọ gaa ka anyị na ‘nwanne anyị dị n’udo’?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 4]
Ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ bụ otu ụzọ dị mkpa isi mee ka ìhè anyị na-enwu
[Foto dị na peeji nke 5]
Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-akpa àgwà ndị na-egosi na ha na-asọpụrụ Chineke
[Foto dị na peeji nke 6]
Mee ihe niile i nwere ike ime ka gị na nwanna gị wee dị n’udo