Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi

Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi

Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi

NDỊ mejupụtara Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ ụmụ nwoke e tere mmanụ raara onwe ha nye Chineke. Ha na-anọchi anya ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke e nyere ọrụ inye ndị ohu Jehova nri ime mmụọ na iduzi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ iji hụ na e kwusara ya n’ụwa niile.—Mat. 24:14, 45-47.

Òtù Na-achị Isi na-enwekarị nzukọ ha n’ụbọchị Wednesday nke izu ọ bụla. Nke a na-enyere ụmụnna ndị a aka ịdị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’otu. (Ọma 133:1) Ndị so n’Òtù Na-achị Isi nọ na Kọmitii dị iche iche. Iji hụ na a na-elekọta ihe ndị metụtara Alaeze ahụ nke ọma, kọmitii nke ọ bụla nwere ọrụ nke ya. A kọwara ọrụ kọmitii nke ọ bụla n’okpuru ebe a.

▪ KỌMITII NHAZI: Ndị so na kọmitii a bụ ndị isi na-ahazi kọmitii ndị ọzọ dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi, ha na otu odeakwụkwọ, onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi. Kọmitii a na-ahụ na kọmitii ndị ọzọ na-arụ ọrụ nke ọma n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ọ na-ahụkwa maka ihe mberede dapụtaranụ, mkpagbu, ọdachi, na ihe ndị ọzọ metụtara Ndịàmà Jehova n’ụwa niile, bụ́ ndị chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa maka ha.

▪ KỌMITII NDỊ ỌRỤ: Ọrụ ụmụnna so na kọmitii a bụ ịhụ maka mkpa anụ ahụ́ na nke ime mmụọ nke ndị ezinụlọ Betel n’ụwa niile, nakwa inyere ha aka n’ụzọ ndị ọzọ. Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka ịhọrọ na ịkpọ ndị ọhụrụ ga-eje ozi na Betel ma na-aza ajụjụ ọ bụla gbasara ozi ha na-eje na Betel.

▪ KỌMITII MBIPỤTA: Kọmitii a na-ahụ maka ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ụwa niile na ịhụ na e bugara ha n’ebe a chọrọ ha. Ọ bụ ya na-ahụ maka ebe ndị a na-anọ ebi akwụkwọ na ihe onwunwe nke ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ. Ọ bụ kọmitii a na-ahazi otú a ga-esi jiri ego ndị e nwetara maka ọrụ zuru ụwa ọnụ mee ihe n’ụzọ ga-akasị baa uru.

▪ KỌMITII IJE OZI: Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka ọrụ nkwusa na ihe ọ bụla metụtara ọgbakọ, ndị ọsụ ụzọ, ndị okenye, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ọ na-ahụ maka ịkwadebe Ozi Alaeze Anyị, ọ bụkwa kọmitii a na-akpọ ndị ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ma kenye ha ebe ha ga-eje ozi ma ha gụchaa.

▪ KỌMITII IZI IHE: Kọmitii a na-ahụ maka akwụkwọ ndị e ji ezi ihe ná mgbakọ ukwu na nke nta, nakwa n’ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ọ na-ahazi nri ime mmụọ maka ndị ezinụlọ Betel, ọ bụkwa ha na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ dị iche iche, dị ka Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ, ọ bụkwa ha na-akwadebe vidio ndị a na-egere naanị egere na ndị nke a na-ekiri ekiri.

▪ KỌMITII IHE ODIDE: Kọmitii a na-ahụ maka ihe a na-ede n’akwụkwọ ndị a na-ebipụtara ndị kwere ekwe ibe ha na ọhaneze, hụkwa na e kesara ha. Ọ bụ kọmitii a na-aza ajụjụ ọ bụla sitere na Baịbụl a jụrụ ma hụ na e wepụtara akwụkwọ e ji eme ihe nkiri na ndị nke e ji ekwu okwu ihu ọha. Ọ bụkwa ya na-ahụ maka ọrụ nsụgharị a na-arụ n’ụwa niile.

Pọl onyeozi ji ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ tụnyere ahụ́ mmadụ ma kwuo ọrụ akụkụ ahụ́ nke ọ bụla na-arụ na otú nke ọ bụla si dị ibe ya mkpa, otú ha si hụ ibe ha n’anya nakwa otú ha si arụkọ ọrụ Chineke nyere ha ọnụ. (Rom 12:4, 5; 1 Kọr. 12:12-31) Jizọs Kraịst bụ́ Isi ahụ́ ahụ, na-enye akụkụ ahụ́ niile ihe dị mkpa iji hụ na ha na-arụkọ ọrụ ọnụ, na a haziri ha nke ọma, nakwa na ha na-eriju nri ime mmụọ afọ. (Efe. 4:15, 16; Kọl. 2:19) Otú a ka e si hazie Òtù Na-achị isi ka ha wee na-eduzi ọgbakọ nke ọma dị ka mmụọ nsọ Jehova si chọọ.