Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Àgwà Ndị Anyị Kwesịrị Ịchụso

Àgwà Ndị Anyị Kwesịrị Ịchụso

Àgwà Ndị Anyị Kwesịrị Ịchụso

“Chụsoo ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, [nakwa] ịdị nwayọọ n’obi.”—1 TIM. 6:11.

1. Jiri ihe atụ kọwaa ihe okwu ahụ bụ́ “chụsoo” pụtara.

GỊNỊ na-agbata gị n’uche ma ị nụ okwu bụ́ “chụsoo”? Ikekwe, ị na-echeta ihe mere n’oge Mozis mgbe ndị agha ndị Ijipt ‘chụụrụ’ ndị Izrel gawa ma nwụọ n’ime Osimiri Uhie. (Ọpụ. 14:23) Ma ọ bụkwanụ ị na-echeta nsogbu onye gburu mmadụ n’amaghị ama n’Izrel oge ochie nọ na ya. Ọ ghaghị ịgbaga ngwa ngwa n’otu n’ime obodo mgbaba isii e nwere n’oge ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, ‘onye ọbọ ọbara obi dị ọkụ nke na-achụ onye ahụ gburu mmadụ nwere ike ịchụkwute ya ma gbuo mkpụrụ obi ya.’—Diut. 19:6.

2. (a) Olee ihe mgbata n’ọsọ Chineke debere n’ihu ụfọdụ Ndị Kraịst ka ha chụsowe? (b) Oleekwa olileanya Jehova debere n’ihu ihe ka ọtụtụ ná Ndị Kraịst taa?

2 Tụlee ihe dị mma Pọl onyeozi mere nke dị iche n’akụkọ ndị a dị na Baịbụl. O dere, sị: “Ana m achụso ihe mgbaru ọsọ ahụ iji nweta ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ́ òkù a kpọrọ ịga eluigwe, nke Chineke kpọrọ site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 3:14) Baịbụl na-egosi na Ndị Kraịst e tere mmanụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị Pọl so n’ime ha, ga-enweta ụgwọ ọrụ nke ibi ndụ n’eluigwe. Ha ga-eso Jizọs Kraịst chịa ụwa n’oge Ọchịchị Otu Puku Afọ. Leenụ ihe mgbaru ọsọ magburu onwe ya Chineke debere n’ihu ha ka ha chụsoo! Ma imerime ezi Ndị Kraịst taa nwere olileanya ma ọ bụ ihe mgbaru ọsọ dị iche. Jehova ji ịhụnanya na-enye ha ihe ahụ Adam na Iv tụfuru, nke bụ́ olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs, bụ́kwa ebe ha na-agaghị arịa ọrịa ọ bụla.—Mkpu. 7:4, 9; 21:1-4.

3. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke gosiri anyị?

3 N’ihi ezughị okè, ụmụ mmadụ na-eme mmehie agaghị enweta ndụ ebighị ebi site naanị ná mgbalị nke onwe ha ha na-eme iji mee ezi ihe. (Aịza. 64:6) Naanị ihe ga-eme ka o kwe omume inweta ndụ ebighị ebi bụ ma mmadụ nwee okwukwe ná ndokwa Chineke ji ịhụnanya mee ka anyị nweta nzọpụta site na Jizọs Kraịst. Olee ihe anyị ga-eme iji gosi na anyị nwere ekele maka obiọma a na-erughịrị mmadụ Chineke gosiri anyị? Otu ihe anyị ga-eme bụ irube isi n’iwu ahụ bụ́: “Chụsoo ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, [na] ịdị nwayọọ n’obi.” (1 Tim. 6:11) Ịtụle àgwà ndị a nwere ike inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ikpebisikwu ike ịnọgide na-achụso ha “n’ụzọ zuru ezu karị.”—1 Tesa. 4:1.

“Chụsoo Ezi Omume”

4. Olee ihe ndị na-egosi na ịchụso “ezi omume” dị mkpa, oleekwa ihe ndị ọ dị mkpa ka mmadụ buru ụzọ mee iji chụsoo ya?

4 N’akwụkwọ ozi abụọ Pọl onyeozi degaara Timoti, Pọl kwuru àgwà ndị anyị kwesịrị ịchụso, ọ na-ebukwa ụzọ akpọtụ “ezi omume” aha mgbe ọ bụla ọ na-edepụtasị àgwà ndị a. (1 Tim. 6:11; 2 Tim. 2:22) A gbakwara anyị ume ugboro ugboro n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl ka anyị chụsoo ezi omume. (Ilu 15:9; 21:21; Aịza. 51:1) Otu ụzọ anyị si eme nke a bụ “ịmata . . . ezi Chineke, matakwa onye [o] zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ịchụso ezi omume ga-akpali mmadụ ime ihe—nke bụ́ ichegharị ná mmehie ndị o mere ná mbụ ma ‘chigharịa’ iji mewe uche Chineke.—Ọrụ 3:19.

5. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke nọgide na-adị ná mma?

5 Ọtụtụ nde ndị ji obi ha niile na-achụso ezi omume ararala ndụ ha nye Jehova ma gosipụta nke a site n’ime baptizim ime mmiri. Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst e mere baptizim, ì chetụla echiche na i kwesịrị ibi ndụ na-egosi na ị nọgidere na-achụso ezi omume? Eleghị anya ndụ gị na-egosi na ị na-eme otú ahụ. Otu ụzọ isi mee nke a bụ isite na Baịbụl mata “ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi” mgbe i nwere mkpebi ndị ị ga-eme ná ndụ. (Gụọ Ndị Hibru 5:14.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst rurula ogo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ì kpebiela kpamkpam izere gị na onye ọ bụla na-abụghị Onye Kraịst mere baptizim ịdịwa ná mma ruo n’ókè ikwuwe okwu ọlụlụ? Ọ bụrụ na i meela ụdị mkpebi a, ị na-achụso ezi omume.—1 Kọr. 7:39.

6. Gịnị ka ịchụso ezi omume n’ezie gụnyere?

6 Mmadụ ime ezi omume dị iche na mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya ma ọ bụ ịbụ onye “ezi omume gabiga ókè.” (Ekli. 7:16) Jizọs dọrọ aka ná ntị ka mmadụ ghara ịdị na-egosi na ya bụ onye ezi omume karịa ndị ọzọ. (Mat. 6:1) Ịchụso ezi omume n’ezie na-esi n’obi—ọ chọrọ mmadụ ịgbanwe echiche na-ezighị ezi o nwere, ịhapụ àgwà, nzube na ọchịchọ ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme nke a, o yiri ka ọ gaghị adị mfe anyị ime mmehie dị oké njọ. (Gụọ Ilu 4:23; tụlee Jems 1:14, 15.) Tụkwasị na nke ahụ, Jehova ga-agọzi anyị ma nyere anyị aka ka anyị na-achụso àgwà ndị ọzọ dị mkpa e ji mara Ndị Kraịst.

“Chụsoo . . . Nsọpụrụ Chineke”

7. Gịnị bụ “nsọpụrụ Chineke”?

7 Nsọpụrụ gụnyere mmadụ iji obi ya niile na-eje ozi ma nọgidesie ike n’ozi ya. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl na-akọwa okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “nsọpụrụ Chineke” dị ka mmadụ “ilezi anya nke ọma iji hụ na ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme ka ọ kwụsị ịtụ egwu Chineke.” Ọtụtụ mgbe, ndị Izrel kpara àgwà gosiri na ha enweghị ụdị nsọpụrụ Chineke dị otú a. Otú ha si nupụrụ Chineke isi ọtụtụ ugboro ọbụna mgbe ọ gbapụtachara ha n’Ijipt gosiri na nke a bụ eziokwu.

8. (a) Olee ajụjụ mmehie Adam kpalitere? (b) Olee otú e si kpughee azịza nke “ihe nzuzo ahụ dị nsọ”?

8 Ọtụtụ puku afọ ka Adam bụ́ nwoke zuru okè mehiechara, a zabeghị ajụjụ ahụ bụ́, “È nwere onye ga-anọgide na-asọpụrụ Chineke n’emeghị mmehie ọ bụla?” N’ime ọtụtụ narị afọ ndị gaferenụ, e nweghị mmadụ na-ezughị okè nke sọpụụrụ Chineke n’emeghị mmehie ọ bụla. Ma mgbe oge ya ruru, Jehova zara ajụjụ ahụ ma mee ka a mata “ihe nzuzo ahụ dị nsọ.” O tifere ndụ Ọkpara ọ mụrụ naanị ya nọ n’eluigwe n’ime afọ Meri ka a mụọ ya dị ka mmadụ zuru okè. N’oge niile Jizọs dịrị ndụ n’ụwa ruokwa mgbe ọ nwụrụ ọnwụ ihere, o gosiri ihe mmadụ iji obi ya niile na-ejere Chineke ozi na ihe ịnọgidesi ike na-eme uche ezi Chineke ahụ ruo n’isi pụtara. Ekpere ya gosiri na ọ na-asọpụrụ nnọọ Nna ya nke eluigwe na-ahụ n’anya. (Mat. 11:25; Jọn 12:27, 28) N’ihi nke a, Jehova ji mmụọ nsọ ya kpalie Pọl ikwu banyere “nsọpụrụ Chineke” mgbe ọ na-ekwu banyere ndụ Jizọs biri nke kwesịrị nṅomi.—Gụọ 1 Timoti 3:16.

9. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-asọpụrụ Chineke?

9 N’ihi ịbụ ndị na-ezughị okè, anyị agaghị enwe ike ịsọpụrụ Chineke n’ụzọ zuru ezu. Ma anyị nwere ike ịgbalị ike anyị. Ime nke a chọrọ anyị isochi ihe nlereanya Kraịst anya ruo ókè o kwere omume. (1 Pita 2:21) N’ụzọ dị otú a, anyị agaghị adị ka ndị ihu abụọ, bụ́ ndị “na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya.” (2 Tim. 3:5) Ihe a na-ekwu abụghị na a dịghị esi n’otú mmadụ dị n’elu ahụ́ amara onye na-asọpụrụ Chineke. A na-eji ya amara. Dị ka ihe atụ, ma ànyị na-ahọrọ uwe agbamakwụkwọ ma ọ bụ nke anyị ji eje ahịa, ọdịdị anyị kwesịrị igosi na anyị bụ ndị “na-asọpụrụ Chineke.” (1 Tim. 2:9, 10) N’ezie, ịbụ ndị na-asọpụrụ Chineke chọrọ anyị ịbụ ndị na-agbalị ịdị na-edebe iwu Chineke n’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ.

“Chụsoo . . . Okwukwe”

10. Olee ihe anyị kwesịrị ime iji hụ na okwukwe anyị nọgidere na-esi ike?

10 Gụọ Ndị Rom 10:17. Iji nwee okwukwe siri ike ma nọgide na-enwe ya, Onye Kraịst kwesịrị ịdị na-atụgharị uche n’eziokwu ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa dị n’Okwu Chineke. “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ewepụtala ọtụtụ akwụkwọ ndị mara mma. Akwụkwọ atọ mara nnọọ mma e bipụtara iji nyere anyị aka ịmatakwu onye Kraịst bụ ma nwee ike iṅomi ya bụ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ na Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ nakwa ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M.’ (Mat. 24:45-47) Òtù ohu ahụ ahaziekwala ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche, bụ́ ndị na-akọwa ‘okwu banyere Kraịst.’ Ị̀ na-achọpụta ebe ndị ị ga-eji ihe ndị a Chineke na-enye anyị mee ihe, ka ị ‘na-eme ka uche gị dịrị n’ihe ị nụrụ karịa otú ị na-eme’?—Hib. 2:1.

11. Olee otú ekpere na irube isi si enyere anyị aka mgbe anyị na-achụso okwukwe?

11 Ekpere bụ ihe ọzọ na-enye aka eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. N’otu oge, ụmụazụ Jizọs rịọrọ ya, sị: “Nyekwuo anyị okwukwe.” Anyị onwe anyị nwekwara ike iji obi umeala rịọ Chineke otu ihe ahụ. (Luk 17:5) Iji nwekwuo okwukwe, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke; okwukwe bụkwa otu akụkụ nke “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22) Ihe ọzọkwa bụ na irube isi n’iwu Chineke na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgbalịsi ike ịmụba oge anyị ji ekwusa ozi ọma. Ime nke a nwere ike ime ka anyị nwekwuo obi ụtọ. Ka anyị na-atụgharịkwa uche ná ngọzi ndị mmadụ na-enweta n’ihi ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke,’ anyị ga-enwekwu okwukwe.—Mat. 6:33.

“Chụsoo . . . Ịhụnanya”

12, 13. (a) Olee iwu ọhụrụ Jizọs nyere? (b) Olee ebe ndị ọ dị mkpa ka anyị na-achụso ịhụnanya yiri nke Kraịst?

12 Gụọ 1 Timoti 5:1, 2. Pọl nyere ndụmọdụ bara uru banyere otú Ndị Kraịst pụrụ isi gosi ibe ha ịhụnanya. Anyị ga-egosi na anyị bụ ndị na-asọpụrụ Chineke ma anyị na-erube isi n’iwu ọhụrụ ahụ Jizọs nyere ka anyị ‘na-ahụrịta ibe anyị n’anya’ dị ka ọ hụrụ anyị. (Jọn 13:34) Jọn onyeozi kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa a nke e ji ebi ndụ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, ma o nweghị ọmịiko n’ebe ọ nọ, olee otú ịhụnanya maka Chineke si dịrị n’ime ya?” (1 Jọn 3:17) Ì nwere ike icheta oge ndị i meere ndị ọzọ ihe iji gosi na ị hụrụ ha n’anya?

13 Ụzọ ọzọ anyị si egosi na anyị na-achụso ịhụnanya bụ site n’ịdị na-agbaghara ndị ọzọ, ghara ịdị na-eburu ụmụnna anyị iwe n’obi. (Gụọ 1 Jọn 4:20.) Kama ibu iwe n’obi, anyị ga-eme ihe a e ji ike mmụọ nsọ gwa anyị, sị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.” (Kọl. 3:13) Ọ̀ dị onye nọ n’ọgbakọ unu ị ga-emere ihe a e kwuru ebe a? Ị̀ ga-agbaghara ya?

“Chụsoo . . . Ntachi Obi”

14. Gịnị ka anyị pụrụ isi n’aka ọgbakọ dị na Filadelfịa mụta?

14 Ọ dị mfe ime ike anyị niile iji nweta ihe anyị chere na anyị nwere ike inweta ọsọ ọsọ ma mgbe ihe ahụ anyị na-achọ inweta siri ike nnweta ma ọ bụ ya abụrụ na ọ ga-adị anya karịa otú anyị chere tupu anyị enweta ya, anyị nwere ike ịkwụsị mbọ anyị na-agba inweta ya. O doro anya na ntachi obi dị anyị mkpa iji chụsoo ihe mgbaru ọsọ nke bụ́ ndụ ebighị ebi. Onyenwe anyị Jizọs gwara ọgbakọ dị na Filadelfịa, sị: “N’ihi na i debere okwu banyere ntachi obi m, m ga-echebekwa gị n’oge awa nke ule.” (Mkpu. 3:10) N’ezie, Jizọs kụziiri ndị mmadụ mkpa ọ dị ịtachi obi—nke bụ́ àgwà na-enyere anyị aka ịghara ịla azụ mgbe anyị nwetara ule ma ọ bụ ọnwụnwa. Ọ ga-abụ na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ Filadelfịa na narị afọ mbụ ahụ tachiri nnọọ obi n’oge e lere okwukwe ha ule. Ọ bụ ya mere Jizọs ji mesie ha obi ike na ya ga-enyekwuru ha aka n’oge ule ka ukwuu ga-abịanụ.—Luk 16:10.

15. Olee ihe Jizọs kụziri banyere ntachi obi?

15 Jizọs maara na ụmụazụ ya ga-abụ ndị ndị ikwu ha na-ekweghị ekwe na ụwa ga-akpọ asị, ọ bụ ya mere o ji gbaa ha ume, ma ọ dịghị ihe ọzọ ugboro abụọ, sị: “Ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” (Mat. 10:22; 24:13) Jizọs kwukwara otú ndị na-eso ụzọ ya ga-esi nweta ike iji die nsogbu ahụ ha na-enweta. N’otu ihe atụ o mere, o ji ndị “na-eji ọṅụ anabata okwu [Chineke]” ma dapụ n’oge ule tụnyere ala nkume. Ma o ji ụmụazụ ya tụnyere ala dị mma n’ihi na ha “na-ejigide” okwu Chineke wee “jiri ntachi obi na-amị mkpụrụ.”—Luk 8:13, 15.

16. Olee ihe e ji ịhụnanya nye anyị nke nyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ịtachi obi?

16 Ị̀ chọpụtara ihe na-enyere mmadụ aka ịtachi obi? Ọ bụ ‘ijigide’ okwu Chineke, na-eme ka ọ dịrị ndụ n’ime obi na uche anyị. Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ—bụ́ nke a sụgharịtara otú o kwesịrị, nke dịkwa mfe ọgụgụ, ma bụrụkwa nke a na-asụgharịkwu n’ọtụtụ asụsụ, emeela ka ịgụ na ịmụ Baịbụl dịkwuo mfe ma kwe omume. Ịtụgharị uche n’otu akụkụ nke Okwu Chineke kwa ụbọchị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eji “ntachi obi” na-amị mkpụrụ.—Ọma 1:1, 2.

“Chụsoo . . . Ịdị Nwayọọ n’Obi” na Udo

17. (a) Gịnị mere “ịdị nwayọọ n’obi” ji dị mkpa? (b) Olee otú Jizọs si gosi na ya dị nwayọọ n’obi?

17 E nweghị onye obi na-adị ụtọ ma e bo ya ebubo na o kwuru ma ọ bụ mee ihe ọ na-emeghị. E kwesịkwara ịtụ anya na onye e boro ụdị ebubo a ga-eji iwe zaghachi onye ahụ boro ya ebubo. Ma leenụ ka ọ gaara esi ka mma ma onye ahụ e boro ebubo gosi “ịdị nwayọọ n’obi”! (Gụọ Ilu 15:1.) Mmadụ ijide onwe ya mgbe a na-ebo ya ebubo adịghị mfe. Jizọs Kraịst setịpụrụ ezi ihe nlereanya na nke a. “Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Anyị ekwesịghị ịtụ anya na anyị ga-emeru ihe Jizọs mere n’akụkụ a, ma ànyị nwere ike ịgba mbọ iji hụ na anyị na-adịkwu nwayọọ n’obi?

18. (a) Olee ihe ọma ịdị nwayọọ n’obi na-arụpụta? (b) Olee àgwà ọzọ a gbara anyị ume ka anyị chụsoo?

18 Iji ṅomie Jizọs, anyị kwesịrị ‘ịdị njikere mgbe niile ịzara ọnụ anyị’ n’ihe anyị kweere ma ‘jiri obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-eme otú ahụ.’ (1 Pita 3:15) Anyị ịbụ ndị dị nwayọọ n’obi ga-egbochi anyị na ndị ọzọ ịbawa mba mgbe echiche ha dị iche na nke anyị, ma ndị anyị na-ezute n’ozi ọma ma ndị kwere ekwe ibe anyị. (2 Tim. 2:24, 25) Ịdị nwayọọ n’obi na-eme ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ikekwe, ọ bụ ya mere Pọl ji gụnye “udo” n’àgwà ndị anyị kwesịrị ịchụso n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara Timoti. (2 Tim. 2:22; tụlee 1 Timoti 6:11.) N’ezie, “udo” bụ àgwà ọzọ Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ka anyị chụsoo.—Ọma 34:14; Hib. 12:14.

19. Ugbu a anyị tụlechara àgwà asaa Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-akpa, olee ihe i kpebiri ịchụso, n’ihi gịnịkwa ka i ji kpebie ime otú ahụ?

19 Anyị atụleela ná mkpirikpi àgwà asaa a gbara Ndị Kraịst ume ka ha chụsoo—ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ n’obi, na udo. Lee nnọọ ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ma ọ bụrụ na ụmụnna nwoke na ndị nwaanyị nọ n’ọgbakọ niile agbalịsikwuo ike ịdị na-akpa àgwà ndị a magburu onwe ha! Ime nke a ga-ewetara Jehova nsọpụrụ ma mee ka ọ kpụzie onye ọ bụla n’ime anyị ime ihe ga-ewetara ya otuto.

Ihe Ndị Anyị Ga-echebara Echiche

• Gịnị ka ịchụso ezi omume na nsọpụrụ Chineke gụnyere?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ịchụso okwukwe na ntachi obi?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ha n’anya?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị chụsoo ịdị nwayọọ n’obi na udo?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 12]

Jizọs dọrọ aka ná ntị ka anyị ghara ịdị na-eme ezi omume anyị n’ihu ndị mmadụ ka ha wee hụ anyị

[Foto dị na peeji nke 13]

Anyị nwere ike ịchụso okwukwe site n’ịtụgharị uche n’eziokwu nke Okwu Chineke

[Foto dị na peeji nke 15]

Anyị nwere ike ịchụso ịhụnanya na ịdị nwayọọ n’obi