Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Dị Njikere Ịgbachitere Ihe I Kweere?

Ị̀ Dị Njikere Ịgbachitere Ihe I Kweere?

Ị̀ Dị Njikere Ịgbachitere Ihe I Kweere?

Ọ̀ Dịtụla mgbe ị nọ n’ebe ọ dị nnọọ mkpa ka ị gbachitere ihe i kweere? Gụọ ihe mere Susana, bụ́ nwanna nwaanyị dị afọ iri na isii nke bi na Paraguay. Mgbe a na-akụziri ha ihe n’ụlọ akwụkwọ otu ụbọchị, e kwuru na Ndịàmà Jehova ekwenyeghị “n’Agba Ochie,” na Jizọs Kraịst, ma ọ bụ na Meri. E kwukwara na Ndịàmà bụ ndị okpukpe ha na-agba ara, ndị ọ ga-akara mma ịnwụ kama ikweta ịṅụ ọgwụ. Gịnị ka ị gaara eme ma ọ bụrụ na ị nọ ebe e kwuru ụdị ihe a?

Susana kpegaara Jehova ekpere ma tụlie aka ya elu. Ebe ọ fọrọ obere ka a kụzichaa ihe n’ụbọchị ahụ, ọ rịọrọ onye nkụzi ha ka o nye ya ohere ịkọwara ụmụ klas ya ihe Ndịàmà Jehova kweere. Onye nkụzi ha kwetara ozugbo. Susana ji izu abụọ kwadebe ihe ọ ga-ekwu, o ji broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova-Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? kwadebe ihe ọ ga-ekwu.

Ụbọchị a kara aka ruru. Susana kọwara ihe mere e ji akpọ anyị Ndịàmà Jehova. Ọ kọwakwara ihe bụ́ olileanya anyị maka ọdịnihu na ihe mere na anyị adịghị ekweta ka a mịnye anyị ọbara. O nyeziri ụmụ klas ya ohere ka ha jụọ ya ajụjụ. Ọtụtụ n’ime ụmụ klas ya tụliri aka elu. Ọ tọrọ onye nkụzi ha ụtọ otú nwa agbọghọ nta a si jiri Akwụkwọ Nsọ na-aza ajụjụ ndị a na-ajụ ya.

Otu nwa akwụkwọ sịrị, “Agatụla m Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, e nweghịdị ma otu mkpụrụ ihe a kpụrụ akpụ dị ebe ahụ.” Onye nkụzi ahụ jụrụ ihe mere na e nweghị ihe a kpụru akpụ. Susana gụrụ Abụ Ọma 115:4-8 nakwa Ọpụpụ 20:4. O juru onye nkụzi ahụ anya, o wee kwuo, sị, “Oleezi ihe mere ihe ndị a kpụrụ akpụ ji jupụta na chọọchị anyị ebe ọ bụ na Baịbụl katọrọ ha?”

Susana zagidere ajụjụ a na-ajụ ya ruo minit iri anọ. Mgbe ọ jụziri ụmụ klas ya ma ha ga-achọ ikiri vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge, ha niile kwetara na ha chọrọ ikiri ya. N’ihi ya, onye nkụzi ha haziri ka ha gaa n’ihu ná mkparịta ụka ha n’echi ya. Mgbe ha kirichara vidio ahụ, Susana kọwaara ha ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi gwọọ onye ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara, bụ́kwanụ nke Ndịàmà Jehova ụfọdụ na-anabata. Mgbe ọ kọwachara nke a, onye nkụzi ahụ kwuru, sị: “Amaghị m na e nwere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi gwọọ mmadụ n’amịnyeghị ya ọbara; amaghịkwa m uru amịnyeghị mmadụ ọbara bara. Ụzọ ndị a e si agwọ ọrịa n’amịnyeghị ọbara ọ̀ bụ naanị Ndịàmà Jehova ka e meere ya?” Mgbe a gwara ya na ọ bụghị, onye nkụzi ahụ sịrị, “Mgbe ọzọ Ndịàmà Jehova ga-abịa n’ụlọ m, m ga-ekwe ka ha zie m ozi ọma.”

Mkparịta ụka Susana chere na ọ ga-ewe minit iri abụọ weziri awa atọ. Ka otu izu gachara, ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ kwukwara okwu nke ha n’ihe ndị chọọchị ha kweere. Mgbe ha kwuchara, a jụrụ ha ọtụtụ ajụjụ ma ha enweghị ike ịgbachitere ihe ha kweere. Onye nkụzi ha jụrụ ha, sị, “Olee ihe mere na unu enweghị ike ịgbachitere ihe unu kweere dị ka nwa akwụkwọ ibe unu bụ́ Onyeàmà Jehova mere?”

Ihe ha zara ya bụ: “Ha na-amụchi Baịbụl anya. Anyị onwe anyị adịghị amụ ya otú ahụ.”

Onye nkụzi ahụ tụgharịrị gwa Susana, sị: “Unu na-amụ Baịbụl n’eziokwu, na-agbalịkwa ime ihe o kwuru. E kwesịrị ka a jaa unu mma.”

Susana gaara agba nkịtị. Ma site n’ịgbachitere ihe o kweere, ọ gbasoro ezi ihe nlereanya nke otu nwatakịrị nwaanyị Izrel a na-akpọghị aha ya na Baịbụl, bụ́ onye ndị Siria kpụụrụ n’agha. Nwatakịrị ahụ gara biri n’ụlọ ọchịagha ndị Siria bụ́ Neaman, onye na-arịa otu ọrịa ọjọọ n’akpụkpọ ahụ́ ya. Nwatakịrị nwaanyị Izrel ahụ katara obi gwa nne ya ukwu, sị: “A sị nnọọ na onyenwe m nọ n’ihu onye amụma nọ na Sameria! Ọ ga-agwọ ya ekpenta ya.” Obi nwatakịrị nwaanyị ahụ ekweghị ya gbachie nkịtị ma ghara ịgba àmà banyere ezi Chineke ahụ. Nke a mere ka onyenwe ya bụ́ Neaman, ghọọ onye na-efe Jehova.—2 Eze 5:3, 17.

N’otu aka ahụkwa, obi Susana ekweghị ya gbachie nkịtị ma ghara ịgba àmà banyere Jehova na ndị ya. Otú ahụ Susana si gbachitere okwukwe ya mgbe e kwuru okwu ọjọọ banyere ihe ndị o kweere gosiri na ọ na-erube isi n’iwu ahụ Akwụkwọ Nsọ nyere, sị: “Doonụ Kraịst nsọ dị ka Onyenwe anyị n’obi unu, dịrịnụ njikere mgbe niile ịzara ọnụ unu n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ unu nwere, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-eme otú ahụ.” (1 Pita 3:15) Ị̀ dị njikere ịzara ọnụ gị ma gbachitere ihe i kweere ma ọ bụrụ na ohere ime otú ahụ adapụta?

[Foto dị na peeji nke 17]

Ngwá ọrụ ndị a ga-enyere gị aka iji gbachitere ihe i kweere