Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Ọkụ Ala Mmụọ Ka Jizọs Na-ekwu Okwu Ya?

Ọ̀ Bụ Ọkụ Ala Mmụọ Ka Jizọs Na-ekwu Okwu Ya?

Ọ̀ Bụ Ọkụ Ala Mmụọ Ka Jizọs Na-ekwu Okwu Ya?

ỤFỌDỤ ndị kweere n’ozizi ọkụ ala mmụọ na-arụtụ aka n’ihe Jizọs kwuru bụ́ nke e dekọrọ na Mak 9:48 (ma ọ bụ n’amaokwu nke 44, 46) iji kwadoo ozizi a. O kwuru okwu banyere ikpuru na-adịghị anwụ anwụ na ọkụ a na-adịghị emenyụ emenyụ. Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị ihe okwu ndị ahụ pụtara, gịnị ka ị ga-agwa ya?

Dabere na Baịbụl onye ahụ ji, o nwere ike ịgụ amaokwu nke 44, nke 46, ma ọ bụ nke 48, n’ihi na ọ bụ otu ihe ahụ ka e dere n’amaokwu atọ a ná nsụgharị ụfọdụ. * Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-agụ, sị: “Ọ bụrụkwa na anya gị emee ka ị sụọ ngọngọ, tụfuo ya, ọ kaara gị mma ibu otu anya banye n’alaeze Chineke kama inwe anya abụọ e wee tụba gị n’ime Gehena, bụ́ ebe ikpuru ha na-adịghị anwụ anwụ, a dịghị emenyụkwa ọkụ ya emenyụ.”—Mak 9:47, 48.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe ahụ Jizọs kwuru na-egosi na ọ bụrụ na onye mmehie anwụọ, mkpụrụ obi ya na-ata ahụhụ ebighị ebi. Dị ka ihe atụ, ihe e kwuru n’akwụkwọ e dere n’asụsụ ndị Spen bụ́ Sagrada Biblia nke University of Navarre kwuru, sị: “Onyenwe anyị ji [okwu ndị a] kọwaa ahụhụ na-adị n’ọkụ ala mmụọ. A kọwaala ọtụtụ mgbe na ‘ikpuru ahụ na-adịghị anwụ anwụ’ na-egosi otú ndị nọ n’ọkụ ala mmụọ si akwa mmakwaara ruo ebighị ebi; ebe ‘ọkụ ahụ a na-adịghị emenyụ emenyụ’ bụ ụdị ahụ́ ụfụ ha ga na-enwe.”

Ma were ihe ahụ Jizọs kwuru tụlee ihe e dere n’amaokwu ikpeazụ nke amụma Aịzaya. * Ọ̀ bụ na o doghị anya na ọ bụ ihe ahụ e dere na Aịzaya isi 66 ka Jizọs na-arụtụ aka na ya? Obi abụọ adịghị ya na onye amụma a na-ekwu okwu banyere ebe ahụ dị “n’azụ obodo Jeruselem, n’ebe ndagwurugwu Hinọm (Gehena), bụ́ ebe a na-anọbu eji ụmụ mmadụ achụ àjà (Jere 7:31) bụ́kwanụ ebe mechara bụrụ ebe ndị obodo ahụ na-ekpofu ahịhịa.” (The Jerome Biblical Commentary) O doro anya na ihe atụ ahụ dị na Aịzaya 66:24 adịghị egosi na a ga-ata ndị mmadụ ahụhụ; ọ na-ekwu banyere ozu. Ihe o kwuru na ha adịghị anwụ anwụ bụ ikpuru—ọ bụghị ụmụ mmadụ dị ndụ ma ọ bụ mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Oleezi ihe ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara?

Lee ihe e kwuru banyere Mak 9:48 n’otu akwụkwọ ndị Katọlik nke a na-akpọ El evangelio de Marcos. Análisis lingüístico y comentario exegético, Mpịakọta nke II: “Ihe a e dere na Mak si n’Aịzaya (66,24). N’ebe ahụ, onye amụma ahụ kwuru ihe abụọ a na-eme iji laa ozu n’iyi: nke bụ́ ịhapụ ya ka o ree ere na ịkpọ ya ọkụ . . . Otú ahụ e si webata ikpuru na ọkụ mere ka a ghọtakwuo na ihe a na-ekwu okwu ya bụ ịla ozu n’iyi. . . . Ụzọ abụọ a a kọwara e si ala ihe n’iyi na-eme ka alaa ihe ahụ n’iyi kpamkpam (‘adịghị emenyụ emenyụ, adịghị anwụ anwụ’): enweghị otú a ga-esi gbanahụ ha. N’ihe a a kọwara ebe a, naanị ihe ndị a na-alaghị n’iyi bụ ikpuru na ọkụ—ọ bụghị mmadụ—ikpuru na ọkụ na-alakwa ihe ọ bụla ha zutere n’iyi. N’ihi ya, ihe a na-ekwu ebe a abụghị ahụhụ ebighị ebi, kama ọ bụ ịla n’iyi kpamkpam bụ́ nke, ebe ọ bụ na a gaghị akpọlite onye ahụ n’ọnwụ, bụ ọnwụ ebighị ebi. Nke a pụtara na [ọkụ] bụ ihe atụ nke mbibi ebighị ebi.”

Onye ọ bụla maara na ezi Chineke ahụ bụ́ Chineke ịhụnanya na onye na-ekpe ikpe ziri ezi kwesịrị ịghọta na ezi uche dị n’isi otú a ghọta ihe ahụ Jizọs kwuru. Ọ naghị ekwu na a ga-ata ndị ajọ mmadụ ahụhụ ebighị ebi. Kama ihe ọ na-ekwu bụ na ha ga-enweta mbibi ebighị ebi, a gaghịkwa akpọlite ha n’ọnwụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Amaokwu nke 44 na nke 46 adịghị n’ihe odide Baịbụl ndị e ji aka dee bụ́kwa ndị a nabatara dị ka ndị kacha zie ezie. Ndị ọkà mmụta na-ekwu na o yiri ka a gbakwụnyere amaokwu abụọ ndị ahụ ka oge na-aga. Prọfesọ Archibald T. Robertson dere, sị: “Amaokwu abụọ a adịghị n’ihe odide Baịbụl ndị kacha ochie na ndị kacha zie ezie e ji aka dee. E webatara ha n’oge e dere akwụkwọ mpịakọta nke ndị Western na Syrian (Byzantine). Ihe e mere ebe ndị ahụ bụ ikwughachi ihe e kwuru n’amaokwu nke 48. Ọ bụ ya mere na anyị etinyeghị amaokwu nke 44 na nke 46, n’ihi na ha adịghị ná nsụgharị ndị mbụ.”

^ par. 5 “Ha ga-apụkwa na-ele ozu nke ndị ahụ nọ na-emehie m; n’ihi na ikpuru dị na ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ ha agaghịkwa anyụ anyụ. Ha ga-aghọkwara anụ ahụ́ niile ihe na-asọ oyi.”—Aịza. 66:24.