Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị Ike n’Agbanyeghị Adịghị Ike

Ịdị Ike n’Agbanyeghị Adịghị Ike

Ịdị Ike n’Agbanyeghị Adịghị Ike

I NWERE ike ịdị na-enwe mwute n’ihi adịghị ike ndị i nwere. Ha adịghị ekwe ahapụ gị aka. I nwere ike iche na ị gaghị emerili ha ma ọ bụkwanụ ya adị gị ka ị naghị etinye mgbalị kwesịrị ekwesị, ma ọ bụdị gị ejiri onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ ma kpebie na ndị ọzọ ka gị mma. O nwekwara ike ịbụ na ị na-arịa ọrịa na-eme gị ike ọgwụgwụ nke na-eme ka ike ụwa gwụ gị. N’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara adịghị ike gị, isiokwu bụ na ọ dị gị ka ị tọrọ atọ. O nwere ike ịdị gị ka ọ dị Job, bụ́ onye gwara Chineke, sị: “A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol, na ị ga-ezobe m ruo mgbe iwe gị dajụrụ, na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru, i wee cheta m!”—Job 14:13.

Olee otú anyị ga-esi kwụsị ịda mbà n’obi otú a? Ọ bụ ezie na ọ dịghị mfe ime, ọ ga-adị mkpa ma i wepụtụgodị obi gị ná nsogbu ahụ gị na ya na-alụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike icheta ajụjụ Jehova jụrụ ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job, sị: “Olee ebe ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m, ma ọ bụrụ na i nwere nghọta. Ònye kpebiri otú ọ ga-aha, ma ọ bụrụ na ị maara, ka ọ̀ bụ onye setịrị eriri e ji atụ̀ ihe n’elu ya?” (Job 38:4, 5) Ọ bụrụ na anyị echee ihe ajụjụ ndị ahụ pụtara, ọ ga-eme ka anyị ghọta na amamihe na ike Jehova karịrị nke anyị. O nwere ezi ihe mere o ji kwe ka ọnọdụ ụwa dịgide otú a ọ dị taa.

“Ogwu n’Anụ Ahụ́”

Ohu Jehova ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi rịọrọ Jehova ka o wepụrụ ya “ogwu n’anụ ahụ́” ya, nke bụ́ otu nsogbu o nwere nke na-ekweghị akwụsị akwụsị. Pọl onyeozi rịọrọ Chineke ugboro atọ ka o wepụrụ ya nsogbu ahụ. Ihe ọ sọrọ nsogbu ahụ yiri ogwu na-adụkasị ya ahụ́ ya bụrụ, o nwere ike ịbụ na o mere ka Pọl ghara inwe ọṅụ n’ozi ọ na-ejere Jehova. Pọl ji nsogbu ya ahụ tụnyere ebe a na-ama ya ụra mgbe niile. Jehova zara ya, sị: “Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị; n’ihi na a na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” Jehova ewepụghị ogwu ahụ dị n’anụ ahụ́ ya. Pọl nọgidere na-edi ya, ma o kwuru, sị: “Mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Kọr. 12:7-10) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

Nsogbu ahụ Pọl nwere akwụsịghị n’ụzọ ọrụ ebube. Ma nke ahụ egbochighị ya ịrụpụta ihe ndị pụtara ìhè n’ozi Jehova. Pọl lekwasịrị Jehova anya ka o nyere ya aka, ọ rịọkwara ya mgbe niile maka enyemaka. (Fil. 4:6, 7) Nke a mere ka Pọl nwee ike ikwu mgbe ọnwụ ya na-eru nso, sị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ.”—2 Tim. 4:7.

Jehova na-eji ụmụ mmadụ na-ezughị okè emezu uche ya n’agbanyeghị na ha ezughị okè ma nwee nsogbu ndị ha na ha na-alụ, ma ọ bụ ya ka otuto niile na-agara. O nwere ike iduzi ha ma nye ha amamihe iji die ihe isi ike ndị ahụ ha na-enwe ma nọgidekwa na-enwe ọṅụ n’ozi ha na-ejere ya. Ee, o nwere ike iji ụmụ mmadụ na-ezughị okè rụọ ọrụ dị ukwuu n’agbanyeghị adịghị ike ndị ha nwere.

Pọl kwuru ihe mere Chineke ewepụghị ogwu ahụ dị n’anụ ahụ́ ya, sị: “Ka e wee ghara ibuli m elu gabiga ókè.” (2 Kọr. 12:7) “Ogwu” a dị n’anụ ahụ́ Pọl nyeere ya aka icheta na o nwere ebe ndị ọ na-adịghị emetacha ma nyere ya aka ịnọgide na-adị umeala n’obi. Nke ahụ yiri ihe Jizọs kụziri mgbe ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.” (Mat. 23:12) Ihe isi ike na-akụziri ndị ohu Chineke ịdị umeala n’obi ma nyere ha aka ịghọta na ọ bụrụ na ha chọrọ ịnọgide na-atachi obi n’emebighị iwu Jehova, ha kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. N’ụzọ dị otú a, ha ga-adị ka onyeozi ahụ wee nwee ike “jiri Jehova nyaa isi.”—1 Kọr. 1:31.

Adịghị Ike Ndị Zoro Ezo

Ụfọdụ ndị nwere ike inwe adịghị ike ndị ha na-amaghịdị na ha nwere ma ọ bụ ndị nke ha na-achọghị ikweta na ha nwere. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịbụ onye na-atụkwasị onwe ya obi karịa ka o kwesịrị. (1 Kọr. 10:12) Adịghị ike ọzọ ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwekarị bụ ịchọ ịbụ ndị a ma ama.

Joab, onye bụ́ ọchịagha ndị agha Eze Devid, bụ nwoke obi kara, onye ọ na-adịghị esiri ike ikpebi ihe a ga-eme na onye bụ́ aka ochie n’idozi nsogbu. Ma Joab mere otu mmehie ọjọọ nke gosiri na ọ dị mpako ma nwee oké ọchịchọ. O ji obi ọjọọ gbuo ndị ọchịagha abụọ. Onye mbụ bụ Abna, n’ihi na ọ chọrọ ịbọ ọbọ nwanne ya Abna gburu. Ka e mechara, Joab mere ka ọ̀ chọrọ ikele nwa nwanne ya bụ́ Amesa, ma jide ya n’ajị agba ya, mee ka ọ̀ na-esusu ya ọnụ, ma were mma agha o ji n’aka ekpe manye ya n’afọ. (2 Sam. 17:25; 20:8-10) Ọ bụ Amesa nọchiri anya Joab dị ka ọchịagha, Joab jizi ohere a gbuo Amesa, eleghị anya na-atụ anya na a ga-akpọghachi ya ka ọ bụrụ ọchịagha. Ị̀ hụrụ na Joab achịkwalighị onwe ya, ya bụ na ọ chịkwaghị oké ọchịchọ ya? Obi tara ya mmiri, o nweghịkwa mgbe ihe o mere wutere ya. Mgbe Eze Devid na-achọ ịnwụ, ọ gwara nwa ya nwoke bụ́ Sọlọmọn ka ọ hụ na Joab ji ndụ ya kwụọ ụgwọ ihe ọjọọ ndị o mere.—1 Eze 2:5, 6, 29-35.

N’ezie, anyị ekwesịghị ikwe ka ọchịchọ ọjọọ na-achị anyị; anyị nwere ike ịchịkwa adịghị ike anyị. Ihe mbụ anyị ga-eme bụ ịmata ebe anyị na-adịghị ike ma kweta na anyị nwere nsogbu. Mgbe ahụzi anyị agbalịa ịkwụsị ha. Anyị nwere ike ịrịọ Jehova mgbe niile n’ekpere ka o nyere anyị aka imeri adịghị ike ndị anyị nwere ma na-amụchi Okwu ya anya iji chọta ụzọ ndị anyị ga-esi lụsoo ọchịchọ ọjọọ ndị ahụ ọgụ. (Hib. 4:12) O nwere ike ịdị mkpa na anyị ga-anọgide na-agbalịsi ike ịkwụsị adịghị ike ahụ, anyị agaghị ekwekwa ka ihe ọ bụla kụda anyị aka. O nwedịrị ike ịdị mkpa na anyị ga-anọgide na-agbaso adịghị ike ahụ mgba n’oge niile anyị bụ ndị na-ezughị okè. Pọl gosiri na nke a bụ eziokwu mgbe o dere, sị: “Ihe m na-achọ ime ka m na-adịghị eme; ma ihe m kpọrọ asị ka m na-eme.” Ma dị ka ị maara, Pọl adaghị mbà, dị ka à ga-asị na ọ dịghịzi ihe o nwere ike ime banyere nsogbu ya. Kama nke ahụ, ọ nọgidere na-alụso adịghị ike ya ọgụ, na-atụkwasị Chineke obi na ọ ga-enyere ya aka site n’aka Jizọs Kraịst. (Rom 7:15-25) N’ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ, Pọl kwuru, sị: “M na-etipụta ahụ́ m ọnyá, na-achị ya dị ka ohu, ka m wee ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịịrị ndị ọzọ ozi ọma.”—1 Kọr. 9:27.

Ụmụ mmadụ na-achọkarị ihe ha ga-eji zọrọ isi onwe ha mgbe ha mere ihe ụfọdụ. Anyị nwere ike ịkwụsị ịkpa ụdị àgwà a site n’ịmụta ịdị na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya, na-eme ihe Pọl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha na-eme, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, jidesienụ ezi ihe ike.” (Rom 12:9) Na mgba a anyị na-agbaso adịghị ike ndị anyị nwere, ọ dị mkpa na anyị ga-abụ ndị na-akwụwa aka ọtọ, ndị kpebisiri ike n’ihe ha na-eme, nakwa ndị na-etipụta ahụ́ ha ọnyà. Devid rịọrọ Jehova n’ekpere, sị: “Nụchaa akụrụ m na obi m.” (Ọma 26:2) Ọ maara na Chineke nwere ike ịma nnọọ ihe ndị dị anyị n’obi ma nyere anyị aka mgbe anyị chọrọ enyemaka. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị Jehova na-agwa anyị site n’Okwu ya na mmụọ nsọ ya, anyị nwere ike ịkwụsịli adịghị ike ndị anyị nwere.

Ihe nwere ike ịdị na-enye ụfọdụ nsogbu bụ ihe ndị ha weere na ha onwe ha agaghị emeli ihe ọ bụla banyere ha. Ndị okenye ọgbakọ nwere ike iji ịhụnanya nyere onye ahụ aka ma nye ya agbamume. (Aịza. 32:1, 2) Ma ọ dịkwa mkpa ka onye ahụ na-atụ anya ihe ga-ekwe omume. E nwere nsogbu ndị na-agaghị akwụsili n’usoro ihe Setan a. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị amụtala idi nsogbu ndị ha na-enwe, nke ahụ enyekwarala ha aka ibi ndụ na-eju afọ.

Jehova Kwere Nkwa Inyere Anyị Aka

Nsogbu ọ bụla ọ sọkwara ya ya bịara anyị n’oge ndị a ihe siri ike, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eduzi anyị ma nyere anyị aka. Baịbụl gbara anyị ume, sị: “Ya mere, wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ruru; na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:6, 7.

Mgbe Kathy, bụ́ onye nọ na-eje ozi na Betel kemgbe ọtụtụ afọ, matara na di ya na-arịa ọrịa Alzheimer, ọ dị ya ka ọ gaghị ebuli ihe dị n’ilekọta di ya n’ụdị ọrịa ahụ ọ na-arịa. Ọ nọgidere na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka Jehova nye ya nkwado na amamihe dị mkpa iji buo ibu bịara ya. Ka ọrịa di ya ahụ na-akawanye njọ, ụmụnna ndị ọzọ gosiri ya ịhụnanya site n’ịgbalị ịmụta ihe banyere ụdị ọrịa ahụ na otú ha ga-esi nyere nwanna nwaanyị ahụ aka, ụmụnna ndị nwaanyị nyekwara ya nkwado site n’ịgba ya ume. Enyemaka ụmụnna ndị a nyere so n’ụzọ Jehova si kwado ya, nke a nyekwaara Kathy aka ilekọta di ya ruo mgbe ọ nwụrụ ka afọ iri na otu gachara. O kwuru, sị: “E ji m anya mmiri na obi m niile na-ekele Jehova maka enyemaka ya niile; o nyeere m aka idi nsogbu ahụ. Amaghị m na m ga-enwe ike ịnọgide na-arụ ọrụ ndị dịịrị m ruo ogologo oge niile ahụ n’agbanyeghị na ike gwụrụ m nnọọ!”

Enyemaka Iji Merie Adịghị Ike Ndị Zoro Ezo

Mgbe ọ dị ụfọdụ ndị ka ha abaghị uru, ha nwere ike iche na Jehova agaghị anụ arịrịọ ha na-arịọ ka o nyere ha aka mgbe ha nọ ná mkpa. Mgbe ọ dị otú a, ọ dị nnọọ oké mkpa ka e chebara ihe Devid kwuru echiche mgbe mmehie dị oké njọ ya na Batshiba mere wutere ya. O kwuru, sị: “Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.” (Ọma 51:17) Devid si n’ala ala obi ya chegharịa, ọ makwaara na o nwere ike ịbịakwute Chineke n’ekpere, obi sikwara ya ike na ọ ga-emere ya ebere. Jizọs ṅomiri obi ebere Jehova. Matiu, onye so dee Oziọma, kwuru na ihe ahụ Aịzaya buru n’amụma mezuru n’isi Jizọs, wee sị: “Ọ dịghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ọ ga-egwepịa, ọ dịghịkwa owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ ọ ga-emenyụ.” (Mat. 12:20; Aịza. 42:3) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha na ndị a na-emegbu emegbu. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, o menyụghị oriọna na-achọ ịnyụ anyụ nke yiri ndụ fọdụụrụ onye ike ụwa gwụrụ. Kama nke ahụ, o lekọtara ndị na-ata ahụhụ ma nyere ha aka inwekwa ihe ga-eme ka ndụ tọwa ha ụtọ. Ọ bụ ụdị omume a ka e ji mara ya mgbe ọ nọ n’ụwa. Í kweghị na Jizọs ka nwekwara ụdị ọmịiko a, nakwa na ọ ga-enwe ike imere gị ebere n’adịghị ike gị? Cheta na Ndị Hibru 4:15 kwuru na ọ bụ Onye pụrụ “imere anyị ebere n’adịghị ike anyị.”

Mgbe Pọl na-ede banyere “ogwu n’anụ ahụ́” ya, o kwuru na ike nke Kraịst “dị ka ụlọikwuu” nke kpuchiri ya. (2 Kọr. 12:7-9) Ọ dị ya ka Chineke si n’aka Kraịst na-echebe ya, dị nnọọ ka onye nọ n’ime ụlọikwuu si bụrụ onye e chebere ka anwụ ghara ịcha ya nakwa ka oké ifufe na mmiri ozuzu ghara inweta ya. Dị ka Pọl, anyị ekwesịghị ikwe ka nsogbu anyị na adịghị ike anyị merie anyị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma, anyị kwesịrị iji ihe niile Jehova na-esi n’ọgbakọ ya dị n’ụwa ebe a na-enye anyị kpọrọ ihe. Anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike ime ma tụkwasị Jehova obi, na-enwe obi ike na ọ ga-eduzi nzọụkwụ anyị. Ọ bụrụ na anyị ahụ otú ike Chineke si na-enyere anyị aka imeri adịghị ike anyị, anyị ga-enwe ike ikwu dị ka Pọl kwuru, sị: “Mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.”—2 Kọr. 12:10.

[Foto dị na peeji nke 3]

Pọl kpegaara Jehova ekpere mgbe niile ka o duzie ya ka o wee jezuo ozi ya

[Foto dị na peeji nke 5]

Eze Devid mere Joab onyeisi ndị agha ya

[Foto dị na peeji nke 5]

Joab gburu Amesa, bụ́ onye nọchiri ya

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndị okenye na-eji ịhụnanya esi n’Akwụkwọ Nsọ enye anyị ntụziaka ndị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị na-enwe