Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Pọl onyeozi kwuru na ‘a ga-azọpụta Izrel dum.’ (Rom 11:26) Ọ̀ na-ekwu na a ga-enwe mgbe ndị Juu niile ga-aghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst?

Mba, nke ahụ abụghị ihe Pọl na-ekwu. Ụmụ Ebreham dị ka otu mba jụrụ ịnabata Jizọs dị ka Mesaya ahụ. N’afọ ndị sochirinụ ka Jizọs nwụchara, ọ bịara doo anya na ndị Juu niile agaghị aghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’agbanyeghị nke a, ihe ahụ Pọl kwuru na ‘a ga-azọpụta Izrel dum’ bụ eziokwu. Olee otú o si bụrụ eziokwu?

Jizọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu nke oge ya, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” (Mat. 21:43) Ebe ọ bụ na mba Izrel n’ozuzu jụrụ Jizọs, Jehova ga-elekwasịzi anya ná mba ọhụrụ, nke bụ́ mba nke ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Pọl kpọrọ mba a “Izrel nke Chineke.”—Gal. 6:16.

Ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gosiri na ndị so ‘n’Izrel nke Chineke’ bụ mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. (Rom 8:15-17; Mkpu. 7:4) Mkpughe 5:9, 10 gosiri na ndị na-abụghị ndị Juu ga-eso n’ìgwè a mgbe o kwuru na Ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ “si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile.” A họpụtara ndị so n’Izrel ime mmụọ a n’ụzọ pụrụ iche ka ha bụrụ “otu alaeze na ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.” Ọ bụ eziokwu na Jehova adịghị elezi mba Izrel n’ozuzu anya dị ka ndị ya pụrụ iche, ọ ka na-anabata ndị mmadụ si ná mba ahụ chọrọ ka ha na ya dị ná mma. Ọ bụ nke ahụ mere e ji nabata ndịozi na ọtụtụ Ndị Kraịst oge mbụ. N’eziokwu, e jikwa ọbara Jizọs Kraịst zụta ndị Juu dị otú ahụ dịkwa ka e ji ya zụta ụmụ mmadụ ndị ọzọ.—1 Tim. 2:5, 6; Hib. 2:9; 1 Pita 1:17-19.

Na ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu tụfuru ohere ha nwere ịghọ ndị ha na Jizọs ga-eso chịa egbochighị nzube Chineke imezu. Nke a enweghị ike ime n’ihi na Jehova si n’ọnụ onye amụma ya kwuo, sị: “Otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị. Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ, ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.”—Aịza. 55:11.

Otú a kwa ka ọ dị n’ihe banyere nzube Chineke ka mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ soro Ọkpara ya chịa n’eluigwe. Baịbụl mere ka o doo anya na Chineke ga-ahọpụta mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ zuru ezu. Ọ dịghị onye n’ime ha na-agaghị eso!—Mkpu. 14:1-5.

N’ihi ya, mgbe Pọl dere na ‘a ga-azọpụta Izrel dum,’ ọ naghị ekwu na ndị Juu niile ga-aghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na nzube Chineke bụ́ na a ga-enwe otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ndị bụ́ Izrel ime mmụọ ga-eso Ọkpara Ya, bụ́ Jizọs Kraịst chịa n’eluigwe, ga-emezu. Mgbe oge Chineke ruru, ọnụ ọgụgụ ndị ahụ—nke bụ́ “Izrel dum”—a ga-azọpụta ka ha bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’Alaeze Mesaya ahụ, ga-ezu.—Efe. 2:8.

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ndị e tere mmanụ “si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile”