Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Ịgbara Ọsọ

Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Ịgbara Ọsọ

Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Ịgbara Ọsọ

“unu ụmụ ajụala, ònye gwara unu ka unu gbanahụ ọnụma ahụ nke na-abịa?”—MAT. 3:7.

1. Olee ụfọdụ ndị Baịbụl kọrọ na ha gbapụrụ?

GỊNỊ na-agbata gị n’obi ma ị nụ okwu ahụ bụ́ “gbanahụ”? Ihe nwere ike ịgbata ụfọdụ n’obi bụ ebe nwa okorobịa ahụ mara mma na-eto eto bụ́ Josef na-agbapụ n’ihu nwunye Pọtịfa bụ́ onye chọrọ ka ya na ya nwee mmekọahụ. (Jen. 39:7-12) Ndị ọzọ nwere ike icheta Ndị Kraịst ahụ siri na Jeruselem gbapụ n’afọ 66 O.A., bụ́ ndị ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs, bụ́: “Mgbe unu hụkwara Jeruselem ka ụsụụ ndị agha ndị mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ . . . ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya si na ya pụọ, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya.”—Luk 21:20, 21.

2, 3. (a) Gịnị mere Jọn Onye Na-eme Baptizim ji katọọ ndị ndú okpukpe ndị Juu? (b) Olee otú Jizọs si mesikwuo ịdọ aka ná ntị ahụ Jọn dọrọ ndị ndú okpukpe ike?

2 Ndị ahụ a kpọrọ aha n’elu gbapụrụ n’ụzọ nkịtị. Taa, ọ dị mkpa ka ezi Ndị Kraịst nọ n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ mba niile gburugburu ụwa gbapụ ngwa ngwa n’ụzọ ihe atụ. Jọn Onye Na-eme Baptizim ji okwu ahụ bụ́ “gbanahụ” mee ihe n’ụzọ ihe atụ. Ndị ndú okpukpe ndị Juu, ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha ndị chekwara na ọ dịghị ha mkpa ichegharị, so ná ndị gara hụ Jọn. Ha na-eleda ndị ọzọ na-abụghị ndị Farisii anya, bụ́kwanụ ndị bịara ka e mee ha baptizim iji gosi na ha echegharịala ná mmehie ha. Jọn gbara omume ihu abụọ nke ndị ndú okpukpe a n’anwụ n’atụghị ụjọ ọ bụla. Ọ sịrị ha: “Unu ụmụ ajụala, ònye gwara unu ka unu gbanahụ ọnụma ahụ nke na-abịa? Ya mere, mịanụ mkpụrụ kwesịrị nchegharị.”—Mat. 3:7, 8.

3 Ihe Jọn na-ekwu abụghị ịgbanahụ ihe n’ụzọ nkịtị. Ọ nọ na-adọ ha aka ná ntị maka ikpe na-abịanụ, nke bụ́ ụbọchị ọnụma; o mekwara ka ndị ndú okpukpe ahụ mata na ọ bụrụ na ha achọghị ịnwụ n’ụbọchị ahụ, ha kwesịrị ịmị mkpụrụ na-egosi na ha echegharịala. Jizọs n’onwe ya atụghịkwa ụjọ ịkatọ ndị ndú okpukpe ahụ—àgwà obi ọjọọ ha gosiri na ọ bụ Ekwensu bụ nna ha n’ezie. (Jọn 8:44) Iji mesikwuo ịdọ aka ná ntị ahụ Jọn burula ụzọ dọọ ha ike, Jizọs kpọrọ ha “ụmụ ajụala” ma jụọ, sị: “Olee otú unu ga-esi gbanahụ ikpe Gehena?” (Mat. 23:33) Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru banyere “Gehena”?

4. Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru okwu banyere “Gehena”?

4 Gehena bụ ndagwurugwu nọ n’azụ mgbidi Jeruselem bụ́ ebe a na-akpọ ihe mkpofu na anụmanụ ndị nwụrụ anwụ ọkụ. Jizọs jiri Gehena mee ihe nnọchianya nke ọnwụ ebighị ebi. (Lee peeji nke 27.) Ajụjụ ahụ ọ jụrụ banyere otú ha ga-esi gbanahụ ikpe Gehena gosiri na ndị ndú okpukpe ahụ kwesịrị ka e bibie ha kpamkpam dị ka otu ìgwè.—Mat. 5:22, 29.

5. Olee otú akụkọ ihe mere eme si gosi na ihe Jọn na Jizọs dọrọ aka ná ntị na ọ ga-eme mezuru?

5 Ndị ndú okpukpe ndị Juu mekwuru mmehie n’elu nke ha merela eme site n’ịkpagbu Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Chineke mechara wụsa ha ọnụma ya dị nnọọ ka Jọn na Jizọs dọrọ aka ná ntị na ọ ga-eme. Ebe ọ bụ naanị na Judia na Jeruselem ka a wụsara “ọnụma ahụ nke na-abịa,” ọ pụrụ ịdị mfe isi n’ebe ahụ gbapụ n’ụzọ nkịtị. A wụsara ọnụma ahụ mgbe ndị agha Rom bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya n’afọ 70 O.A. Ọ dịghị ihe ọ bụla metụrụla Jeruselem e nwere ike iji tụnyere “mkpagbu” ahụ. E gburu ọtụtụ ndị, ma dọrọ ọtụtụ ndị ọzọ n’agha. Nke a na-egosi na mbibi ka nke a na-echere ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na ndị na-ekpe okpukpe ndị ọzọ.—Mat. 24:21.

Ọnụma Na-abịanụ Bụ́ Nke E Kwesịrị Ịgbanahụ

6. Gịnị malitere ime n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ?

6 Ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ siri n’ezi ofufe dapụ, e nwekwara ndị sowere ha. (Ọrụ 20:29, 30) Oge ndịozi Jizọs dị ndụ, ha bụụrụ ndị a si n’ezi ofufe dapụ “ihe mgbochi,” ma mgbe ha nwụchara, ọtụtụ òtù Ndị Kraịst ụgha bilitere. Taa, e nweela ọtụtụ narị okpukpe ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst, ma ozizi ha na-emegiderịta ibe ha. Baịbụl buru amụma na a ga-enwe ndị ụkọchukwu Krisendọm. Ọ kọwara ha niile n’ozuzu dị ka “onye ahụ na-emebi iwu” na “nwa mbibi . . . onye Onyenwe anyị Jizọs ga-eji mmụọ nke ọnụ ya gbuo, bibiekwa ya site n’ime ka ọnụnọ ya pụta ìhè.”—2 Tesa. 2:3, 6-8.

7. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ịkpọ ndị ndú okpukpe Krisendọm “onye ahụ na-emebi iwu”?

7 Ndị ụkọchukwu Krisendọm na-emebi iwu n’echiche bụ́ na ha eduhiela ọtụtụ puku mmadụ site n’ịkwado nkụzi na ememme ndị Baịbụl na-akwadoghị, ha na-agbachikwa ndị mmadụ nkịtị ka ha na-akpa àgwà ndị Baịbụl na-akwadoghị. Dị nnọọ ka ndị ndú okpukpe ahụ Jizọs katọrọ, a ga-ebibi ndị niile sị na ha na-efe Chineke taa ma ka bụrụ akụkụ nke “nwa mbibi” ahụ, ha agaghịkwa atụ anya ibilite n’ọnwụ. (2 Tesa. 1:6-9) Oleekwanụ ihe na-echere ndị ndị ụkọchukwu Krisendọm na ndị ndú nke okpukpe ụgha ndị ọzọ duhierela? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị lee ihe ndị mere ka e bibichara Jeruselem nke mbụ ya n’afọ 607 T.O.A.

“Sinụ n’Ime Babịlọn Gbapụ”

8, 9. (a) Olee amụma Jeremaya buru banyere ndị Juu ahụ a kpụụrụ gaa Babịlọn? (b) Mgbe ndị Midia na ndị Peshia merichara Babịlọn, olee ụdị mgbapụ nke a mere ka o kwe omume?

8 Jeremaya onye amụma buru amụma banyere mbibi Jeruselem bụ́ nke mere n’afọ 607 T.O.A. Ọ sịrị na a ga-adọrọ ndị Chineke n’agha, ma ha ga-emecha lọghachi n’ala nna ha mgbe “afọ iri asaa” gachara. (Jere. 29:4, 10) Jeremaya nwere ozi dị mkpa ọ ga-ezi ndị Juu ahụ a kpụụrụ gaa Babịlọn. Ozi ahụ bụ́ ka ha ghara itinye aka n’okpukpe ụgha ndị Babịlọn. Nke a ga-eme ka ha dị njikere ịlaghachi Jeruselem ma maliteghachi ezi ofufe n’oge Chineke kara aka. Ihe a mezuru obere oge ka ndị Midia na ndị Peshia merichara Babịlọn n’afọ 539 T.O.A. Eze ndị Peshia bụ́ Saịrọs nke Abụọ nyere iwu ka ndị Juu laghachi n’ala nna ha ma wughachi ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem.—Ezra 1:1-4.

9 Ọtụtụ puku ndị Juu jiri ohere a laghachi obodo ha. (Ezra 2:64-67) Ha si otú a mezuo ihe ahụ Jeremaya buru n’amụma banyere ha nke bụ́ ịgbaga ebe ọzọ n’ụzọ nkịtị. (Gụọ Jeremaya 51:6, 45, 50.) Ọ bụghị ndị Juu niile ka o kwere omume ime ogologo njem ahụ iji laghachi Jeruselem na Juda. Ma Chineke ga-agọzi ndị nke fọdụrụ na Babịlọn, ndị dị ka Daniel onye amụma merela agadi, ma ọ bụrụhaala na ha ejiri obi ha niile kwado ezi ofufe nke a nọ na Jeruselem na-efe, ma ghara iso ndị Babịlọn fewe chi ụgha ha.

10. Olee ụdị “ihe arụ” ndị “Babịlọn Ukwu” ahụ merela?

10 Taa, ọtụtụ ijeri mmadụ na-ekpe ụdị okpukpe ụgha dị iche iche bụ́ ndị sitere n’obodo Babịlọn oge ochie. (Jen. 11:6-9) A kpọrọ okpukpe ụgha a n’ozuzu ha “Babịlọn Ukwu ahụ, nne ụmụ nwaanyị akwụna na nke ihe arụ nke ụwa.” (Mkpu. 17:5) O teela okpukpe ụgha kwadowere ndị ọchịchị nke ụwa a. Ọtụtụ agha ndị ejirila ‘gbuo ọtụtụ narị nde ndị mmadụ n’ụwa’ so ‘n’ihe arụ’ okpukpe ụgha merela. (Mkpu. 18:24) “Ihe arụ” ndị ọzọ na-agụnye idina ụmụaka na ụdị mmekọahụ rụrụ arụ ndị ọzọ bụ́ ndị ndị ụkọchukwu na-eme, bụ́ ihe ndị isi chọọchị gbachiri nkịtị ka ha na-aga n’ihu. N’ihi ihe arụ ndị a, ò kwesịrị iju anyị anya na n’oge na-adịghị anya, Jehova Chineke ga-ewepụsị okpukpe ụgha n’ụwa a?—Mkpu. 18:8.

11. Olee ọrụ ezi Ndị Kraịst nwere ịrụ tupu e bibie Babịlọn Ukwu ahụ?

11 E nyere ezi Ndị Kraịst, bụ́ ndị maara ihe a na-aga ime okpukpe ụgha, ọrụ ịdọ ndị nọ na Babịlọn Ukwu ahụ aka ná ntị. Otu ụzọ ha si eme nke a bụ ikesa Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl nke “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụta, bụ́ onye Jizọs nyefere ọrụ inye ‘nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Mat. 24:45) Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwee mmasị n’ozi a sitere na Baịbụl, a na-eme ndokwa ka e nyere ha aka site n’ịmụrụ ha Baịbụl. Anyị nwere olileanya na ha ga-ahụ mkpa ọ dị ‘isi n’ime Babịlọn gbapụ’ mgbe oge ka dị.—Mkpu. 18:4.

Gbaaranụ Ikpere Arụsị Ọsọ

12. Olee otú Chineke si ele ife ihe oyiyi na arụsị anya?

12 Ife ihe oyiyi na arụsị ofufe bụ omume ọzọ rụrụ arụ juru na Babịlọn Ukwu ahụ. Chineke kpọrọ ha “ihe arụ” na ‘arụsi ndị na-asọ oyi ka nsị.’ (Diut. 29:17) Ndị niile chọrọ ime ihe na-amasị Chineke kwesịrị izere ikpere arụsị, iji kwekọọ n’ihe a Chineke kwuru, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m, agaghịkwa m enye ihe oyiyi a pịrị apị otuto m.”—Aịza. 42:8.

13. Olee ụzọ ndị na-apụtachaghị ìhè ndị mmadụ si ekpere arụsị bụ́ ndị anyị kwesịrị ịgbara ọsọ?

13 Okwu Chineke kwukwara ụzọ ndị ọzọ na-apụtachaghị ìhè ndị mmadụ si ekpere arụsị. Dị ka ihe atụ, ọ kpọrọ anyaukwu “ikpere arụsị.” (Kọl. 3:5) Anyaukwu pụtara mmadụ ịchọ inweta ihe ọ na-ekwesịghị inweta, dị ka ịchọ inweta ihe bụ́ nke onye ọzọ. (Ọpụ. 20:17) Mmụọ ozi ahụ ghọrọ Setan bụ́ Ekwensu malitere inwe anyaukwu ịdị ka Onye Kasị Ihe Niile Elu nakwa ka a na-efe ya. (Luk 4:5-7) Nke a mere ka o nupụrụ Jehova isi ma rafuo Iv inwewe anyaukwu inweta ihe Chineke machibidoro iwu. A pụkwara ikwu na Adam kpeere arụsị site na ya iwere adịm ná mma ya na nwunye ya dị ka ihe dị mkpa karịa irubere Nna ya nke eluigwe na-ahụ n’anya isi. Ma ndị niile chọrọ ịgbanahụ ụbọchị iwe Chineke ga-efe naanị ya ofufe ma gbaara ụdị anyaukwu ọ bụla ọsọ.

“Gbaaranụ Ịkwa Iko Ọsọ”

14-16. (a) Gịnị mere Josef ji bụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’ihe banyere omume ọma? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị enwee ọchịchọ inwe mmekọahụ na-ezighị ezi? (c) Olee otú anyị ga-esi gbaara ịkwa iko ọsọ?

14 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:18. Mgbe nwunye Pọtịfa nwara ịrata Josef ka ya na ya kwaa iko, Josef siri n’ebe ọ nọ gbapụ. N’ezie, Josef setịpụụrụ ma Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ndị nke lụrụlanụ ihe nlereanya magburu onwe ya. O doro anya na ihe zụrụ akọnuche Josef bụ ihe ndị merela eme ndị gosiri otú Chineke si ele omume rụrụ arụ anya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ irube isi n’iwu ahụ e nyere ka a ‘gbaara ịkwa iko ọsọ,’ anyị ga-ezere ihe ndị nwere ike ime ka anyị nwewe mmasị ịchọ iso onye ọzọ na-abụghị di ma ọ bụ nwunye anyị nwee mmekọahụ. A gwara anyị, sị: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị. Ọ bụ n’ihi ihe ndị ahụ ka ọnụma Chineke ji abịa.”—Kọl. 3:5, 6.

15 Ị̀ chọpụtara na e kwuru na ‘ọnụma Chineke na-abịa’? Ọtụtụ ndị n’ụwa na-enwe ọchịchọ inwe mmekọahụ na-ezighị ezi, ha na-emezukwa ọchịchọ ha. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị bụ́ Ndị Kraịst na-ekpe ekpere ka Chineke nyere anyị aka nakwa ka o nye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị ghara ịdị na-enwe ọchịchọ inwe mmekọahụ rụrụ arụ. E wezụga nke a, ịmụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, na ikwusara ndị agbata obi anyị ozi ọma ga-enyere anyị aka ‘ịnọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ.’ N’ụzọ dị otú a, anyị “agaghịkwa emezu ọchịchọ anụ ahụ́ ọ bụla ma ọlị.”—Gal. 5:16.

16 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, anyị agaghị “na-eje ije site na mmụọ nsọ.” Onye Kraịst ekwesịghịkwa ịgụ, ikiri, ma ọ bụ ige ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. N’otu aka ahụ, “ndị nsọ” Chineke ekwesịghịkwa iji okwu ndị dị otú a na-ama njakịrị ma ọ bụ jiri ha mere akụkọ ọchị. (Efe. 5:3, 4) Ọ bụrụ na anyị ezere ime ihe ndị a, anyị na-egosi Nna anyị na-ahụ n’anya na anyị chọrọ n’ezie ịlanahụ ọnụma ya na-abịanụ ma banye n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume ahụ.

Gbaara “Ịhụ Ego n’Anya” Ọsọ

17, 18. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbara “ịhụ ego n’anya” ọsọ?

17 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara Timoti, o kwuru ihe ụfọdụ Ndị Kraịst na-agba ohu kwesịrị icheta, bụ́ ndị o nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha na-atụ anya irite ihe dị ukwuu n’aka nna ha ukwu ebe ọ bụ na ndị nna ha ukwu bụkwa Ndị Kraịst dị ka ha onwe ha bụ. Ndị ọzọ nwere ike ha anwaala iji ihe dị nsọ nweta uru nke onwe ha. Pọl dọrọ aka ná ntị ka ha ghara ‘iche na nsọpụrụ Chineke bụ ụzọ isi rite uru ihe onwunwe.’ Ihe nwere ike ịkpata nke a bụ “ịhụ ego n’anya,” bụ́ nke nwere ike imegharị ma ọgaranya ma ogbenye anya.—1 Tim. 6:1, 2, 5, 9, 10.

18 Ì nwere ike icheta ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ́ ndị “ịhụ ego n’anya” ma ọ bụ ịhụ ihe ndị na-adịghị mkpa ego ga-azụtali n’anya, mebiri mmekọrịta ha na Chineke? (Jọsh. 7:11, 21; 2 Eze 5:20, 25-27) Pọl gbara Timoti ume, sị: “Gị onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a ọsọ. Kama chụsoo ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ n’obi.” (1 Tim. 6:11) Onye ọ bụla chọrọ ịlanahụ ụbọchị ọnụma ahụ na-abịanụ kwesịrị ime ihe a Pọl dụrụ ọdụ ya.

Gbaara Ọchịchọ A Na-enwe n’Oge Ntorobịa Ọsọ”

19. Gịnị dị ndị niile na-eto eto mkpa?

19 Gụọ Ilu 22:15. Omume nzuzu dị n’obi onye na-eto eto nwere ike ime ka ọ kpafuo. Ma iji Baịbụl na-azụ ya nwere ike inye aka mee ka ọ ghara ịkpafu. Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto, bụ́ ndị ndị mụrụ ha na-abụghị Ndịàmà Jehova, na-agbalịsi ike ime ihe ndị ha gụtara na Baịbụl. Ndị ọzọ na-erite uru n’ezigbo ndụmọdụ ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-enye ha. Onye ọ sọkwara ya ya site na Baịbụl nye anyị ndụmọdụ, ime ihe ahụ a gwara anyị nwere ike ime ka anyị nwee obi ụtọ ugbu a nakwa n’ọdịnihu.—Hib. 12:8-11.

20. Olee ihe ndị ga-enyere ndị na-eto eto aka ịgbara ọchịchọ ọjọọ ọsọ?

20 Gụọ 2 Timoti 2:20-22. Ọtụtụ ndị na-eto eto a na-azụghị nke ọma adabala n’omume nzuzu, dị ka inwe mmụọ ịsọ mpi, anyaukwu, ịkwa iko, ịhụ ego n’anya na ịchụso ihe ụtọ. Ihe ndị a bụ “ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa,” bụ́ nke Baịbụl gbara anyị ume ka anyị gbaara ọsọ. Ịgbara ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa ọsọ chọrọ ka onye na-eto eto bụ́ Onye Kraịst zere ihe ndị nwere ike imebi àgwà ya, ebe ọ sọkwara ihe ndị ahụ ha si. Ihe ga-akacha enye aka bụ ndụmọdụ ahụ Chineke nyere ka anyị soro “ndị ji obi dị ọcha na-akpọku Onyenwe anyị” na-achụso àgwà ndị na-asọpụrụ Chineke.

21. Olee nkwa magburu onwe ya Jizọs Kraịst kwere ụmụazụ ya yiri atụrụ?

21 Ma ànyị bụ nwata ma ànyị bụ agadi, ịghara ige ndị chọrọ iduhie anyị ntị na-egosi na anyị chọrọ iso bụrụ ụmụazụ Jizọs ndị yiri atụrụ bụ́ ndị ‘na-adịghị eso olu ndị bịara abịa.’ (Jọn 10:5) N’ihi ya, iji nwee ike ịgbanahụ ụbọchị ọnụma Chineke, a chọrọ ka anyị mee ihe karịrị isi n’ihe ọjọọ gbapụ. Anyị kwesịkwara ịdị na-akpa àgwà ndị dị mma. Anyị ga-atụle asaa n’ime àgwà ndị a n’isiokwu na-esonụ. Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji lerukwuo nke a anya, n’ihi na Jizọs kwere nkwa a magburu onwe ya, sị: “M na-enyekwa [atụrụ m] ndụ ebighị ebi, a gaghịkwa ebibi ha ma ọlị, ọ dịghịkwa onye ga-apụnara ha n’aka m.”—Jọn 10:28.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ịdọ aka ná ntị Jizọs dọrọ ndị ndú okpukpe?

• Olee ọnọdụ ọjọọ ọtụtụ nde mmadụ nọ na ya taa?

• Olee ụzọ ndị na-apụtachaghị ìhè mmadụ nwere ike isi na-ekpere arụsị bụ́ ndị anyị kwesịrị ịgbara ọsọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Gịnị na-agbata gị n’obi ma ị nụ okwu bụ́ “gbanahụ”?