Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Akọ Merie Ihe Isi Ike

Iji Akọ Merie Ihe Isi Ike

Iji Akọ Merie Ihe Isi Ike

ỤMỤ okorobịa atọ bi n’ebe Etiti Africa chọrọ ịga otu mgbakọ distrikti a na-enwe n’obodo ha. Ma olee otú ha ga-esi ruo n’ala mgbakọ ahụ? Ebe a na-enwe mgbakọ ahụ fọrọ nke nta ka o ruo kilomita iri itoolu, ụzọ e sikwa aga ya jọrọ njọ ma dị uzuzu uzuzu, ha enweghịkwa ụgbọ njem ha ga-eji gaa. Ha kpebiri ịgbaziri ịnyịnya ígwè atọ, ma ha ahụghị ndị dị mma iji mee njem ahụ.

Otu okenye ọgbakọ hụrụ nsogbu ha nọ na ya wee nye ha ịnyịnya ígwè ya—o meela ochie ma ọ ka na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ kọwaara ha otú ya na ndị ọzọ si gaa mgbakọ n’oge ndị gara aga. Okenye ahụ tụụrụ ha aro otú ha atọ ga-esi were otu ịnyịnya ígwè ahụ gaa. Aro ahụ ọ tụụrụ ha dị mfe, ma ọ chọrọ ha ịhazi onwe ha nke ọma. Olee otú mmadụ atọ ga-esi jiri otu ịnyịnya ígwè mee njem?

Ụmụ okorobịa atọ a ji isi ụtụtụ malite njem ha iji gbanahụ oké anwụ. Ha bukwasịrị ngwongwo ha n’elu ịnyịnya ígwè ahụ. Onye nke mbụ gbaara ịnyịnya ígwè ahụ gawa, ebe mmadụ abụọ ndị nke ọzọ ji ụkwụ na-esosi ya ike. Mgbe onye nke ji ịnyịnya ígwè gbara ihe dị ka kilomita abụọ, ya akwụsị ma gbabiwe ịnyịnya ígwè ahụ ha bukwasịrị ibu ha n’ahụ́ otu osisi. Ọ ga-ahụ na ọ gbabiwere ya ebe ndị nke ọzọ ga-ahụ ya ka onye ọzọ ghara izuru ya. Onye nke mbụ ahụ gbara ịnyịnya ígwè ahụ ejirizie ụkwụ gawa.

Mgbe mmadụ abụọ ndị nke ọzọ ruru ebe ịnyịnya ígwè ahụ dị, otu onye agbarakwa ya gawa, onye nke ọzọ ewerekwa ụkwụ na-abịa ruokwa mgbe ọ ga-eruru ya ịgba. Site n’ịhazi ihe nke ọma na site ná ntachi obi ha, ihe ha atọ gara n’ụkwụ bụzi ihe dị ka iri kilomita isii kama ịga iri kilomita itoolu. Mgbalị ha mere baara ha uru. Mgbe ha rutere ná mgbakọ ahụ, ha zutere ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwaanyị ma soro ha rijuo nri ime mmụọ afọ. (Diut. 31:12) Ị̀ ga-eme ihe niile i nwere ike ime iji hụ na ị gara mgbakọ distrikti a ga-enwe n’obodo gị n’afọ a?