Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom

N’IHE dị ka n’afọ 56 O.A., mgbe Pọl onyeozi nọ ná njem ozi ala ọzọ ya nke atọ, o rutere n’obodo Kọrịnt. Ọ nụla banyere nghọtahie dị n’etiti Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị nke Jentaịl bi na Rom. Ebe ọ chọrọ ime ka ha niile dịrị n’otu n’ime Kraịst, Pọl kpebiri idegara ha akwụkwọ ozi.

N’akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Rom, ọ kọwara otú e si agụnye ụmụ mmadụ ná ndị ezi omume nakwa otú ndị a a gụrụ dị ka ndị ezi omume kwesịrị isi na-ebi ndụ. Akwụkwọ ozi ahụ na-eme ka anyị mụtakwuo banyere Chineke na Okwu ya, na-eme ka anyị ghọta obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, na-emekwa ka a ghọtakwuo ọrụ dị ezigbo mkpa Kraịst n’onwe ya na-arụ iji mee ka a zọpụta anyị.—Hib. 4:12.

OLEE OTÚ E SI KPỌỌ HA NDỊ EZI OMUME?

(Rom 1:1–11:36)

Pọl onyeozi dere, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke, a na-akpọkwa ha ndị ezi omume, nke bụ́ onyinye e nyere n’efu, site n’obiọma [Chineke] na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.” Pọl kwukwara, sị: “A na-akpọ mmadụ onye ezi omume site n’okwukwe nke na-agụnyeghị ọrụ nke iwu.” (Rom 3:23, 24, 28) N’ihi okwukwe ha nwere ‘n’otu omume ziri ezi,’ e nwere ike ịkpọ ma Ndị Kraịst e tere mmanụ ma “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ndị “ezi omume”—ndị ahụ e tere mmanụ ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe ebe atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị enyi Chineke, ga-enwe olileanya ịlanahụ “oké mkpagbu ahụ.”—Rom 5:18; Mkpu. 7:9, 14; Jọn 10:16; Jems 2:21-24; Mat. 25:46.

Pọl jụrụ ajụjụ a: “Ànyị ga-eme mmehie n’ihi na anyị anọghị n’okpuru iwu kama n’okpuru obiọma na-erughịrị mmadụ? Ọ zara ajụjụ ahụ, sị: “Tụfịakwa!” Ọ gara n’ihu ịkọwa, sị: “Unu bụ ndị ohu . . . mmehie nke na-eweta ọnwụ ma ọ̀ bụ nke nrubeisi nke na-eweta ezi omume.” (Rom 6:15, 16) O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu emee ka omume niile nke ahụ́ nwụọ site na mmụọ nsọ, unu ga-adị ndụ.”—Rom 8:13.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:24-32—Ọ̀ bụ ndị Juu ka ọ̀ bụ ndị Jentaịl na-eme omume rụrụ arụ ndị a kọwara ebe a? Ọ bụ ezie na ma ndị Juu ma ndị Jentaịl nwere ike ime ihe a Pọl kwuru n’ebe a, ma ọ bụ ndị Izrel oge ochie si n’ezi ofufe dapụ ka ọ na-ekwu maka ha. N’agbanyeghị na ha maara iwu Chineke nke ọma, “ha achọghị ịmara Chineke dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” Ha si otú a gosi na ha bụ ndị e kwesịrị ịma ikpe.

3:24, 25—Olee otú ‘ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ’ ga-esi kpuchie “mmehie ndị e mere n’oge gara aga” tupu a kwụọ ya? Amụma mbụ e buru banyere Mesaya ahụ, bụ́ nke e dekọrọ na Jenesis 3:15, mezuru n’afọ 33 O.A., bụ́ mgbe e gburu Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ. (Gal. 3:13, 16) Ma ozugbo Jehova buchara amụma ahụ, n’anya ya a kwụọlarị ụgwọ àjà mgbapụta ahụ, n’ihi na ọ dịghị ihe nwere ike igbochi Chineke imezu nzube ya. N’ụzọ dị otú a, Jehova nwere ike ịgbaghara mmehie ụmụ Adam ndị nwere okwukwe ná nkwa ahụ dabere n’àjà Jizọs Kraịst ka ga-eji ndụ ya chụọ n’ọdịnihu. Àjà mgbapụta ahụ mekwara ka o kwe omume na a ga-akpọlite ndị nwụrụ tupu oge Ndị Kraịst.—Ọrụ 24:15.

6:3-5—Gịnị ka mmadụ ịbụ onye e mere baptizim ka ya na Kraịst Jizọs dịrị n’otu na ịbụ onye e mere baptizim ịnwụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ pụtara? Mgbe Jehova jiri mmụọ nsọ ya tee ndị na-eso ụzọ Kraịst mmanụ, ha na Jizọs na-abụ otu, ha esonyekwa n’ọgbakọ nke ndị e tere mmanụ, nke bụ́ ahụ́ Kraịst, ebe Kraịst n’onwe ya bụ Isi. (1 Kọr. 12:12, 13, 27; Kọl. 1:18) Otú a ka e si eme ha baptizim n’ime Kraịst Jizọs. E mekwara Ndị Kraịst e tere mmanụ ‘baptizim ịnwụ ụdị ọnwụ [Kraịst] nwụrụ’ n’ụdị na ha na-adị ndụ nke iji onwe ha chụọ àjà ma jụ olileanya ọ bụla nke ịdị ndụ n’ụwa. N’ihi ya, ọnwụ ha bụ ọnwụ iji ndụ ha chụọ àjà dị ka Jizọs ji ndụ nke ya chụọ, ọ bụ ezie na ọnwụ ha abụghị ihe mgbapụta. Ọ bụ mgbe ha nwụrụ a kpọlitekwa ha ibi ndụ n’eluigwe ka ha na-abụ ndị e mere baptizim ịnwụ ụdị ọnwụ Kraịst nwụrụ.

7:8-11—Olee otú ‘ihe ahụ e nyere n’iwu si kpalie mmehie’? Iwu ahụ nyeere ndị mmadụ aka ịghọta nnọọ ihe niile bụ́ mmehie, na-eme nnọọ ka ha mata na ha bụ ndị mmehie. N’ihi ya, ha na-achọpụta ọtụtụ ụzọ dị iche iche ha si emehie, mekwaa ka ọtụtụ mmadụ chọpụta na ha bụ ndị mmehie karịa ka ha cheburu. Ọ bụ n’ụzọ ndị dị otú a ka a pụrụ ikwu na ihe ahụ e nyere n’Iwu kpaliri mmehie.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:14, 15. Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Otu ihe mere anyị ga-eji mee ya bụ n’ihi na anyị ji ndị mmadụ, bụ́ ndị Jizọs ji ọbara ya zụta ụgwọ, iwu jikwa anyị inyere ha aka mee ka ha na Chineke dịrị ná mma.

1:18-20. Ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke na ndị ajọ omume enweghị “ihe ngọpụ” n’ihi na a na-esi n’ihe ndị e kere eke ahụ àgwà Chineke ndị a na-apụghị ịhụ anya.

2:28; 3:1, 2; 7:6, 7. Pọl na-eji okwu dị nro agwa ndị Juu ihe nwere ike ịda ka okwu mkparị. Nke a bụ ihe nlereanya anyị kwesịrị iṅomi, bụ́ nke na-egosi na anyị kwesịrị ịdị akọ mgbe anyị na-akọwara ndị mmadụ isiokwu ụfọdụ pụrụ ịkpasu ha iwe.

3:4. Mgbe echiche mmadụ gbara iche n’ihe Okwu Chineke na-ekwu, anyị ga-ekwe “ka Chineke bụrụ onye eziokwu” site n’ikwenye n’ihe e kwuru na Baịbụl ma mee ihe kwekọrọ n’uche Chineke. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi soro na-ekwusa ozi ọma ma na-enyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị nwere ike inyere ha aka ịhụ na Chineke bụ onye eziokwu.

4:9-12. A kpọrọ Ebreham onye ezi omume n’ihi okwukwe o nwere tupu e bie ya úgwù mgbe ọ dị afọ iri itoolu na itoolu. (Jen. 12:4; 15:6; 16:3; 17:1, 9, 10) Chineke si otú a gosi ihe na-eme ka ọ gụọ mmadụ dị ka onye ezi omume.

4:18. Olileanya bụ otu ihe dị oké mkpa n’okwukwe. Okwukwe anyị gbadoro ụkwụ n’olileanya.—Hib. 11:1.

5:18, 19. Pọl kọwara n’ụzọ dị mfe nghọta otú Jizọs si yie Adam, si otú a gosi otú otu onye nwere ike isi ‘nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Mat. 20:28) Anyị kwesịkwara iṅomi ụzọ a magburu onwe ya e si akụzi ihe, ya bụ, ụzọ doro anya ma dị mfe nghọta.—1 Kọr. 4:17.

7:23. Akụkụ ahụ́ anyị ndị dị ka aka, ụkwụ, na ire, nwere ike ‘ịdọrọ anyị n’agha gaa n’iwu nke mmehie,’ n’ihi ya, anyị kwesịrị ilezi anya ka anyị ghara iji ha mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.

8:26, 27. Mgbe anyị nwere nsogbu ndị riri anyị ọnụ nke na anyị amaghịzi ihe anyị ga-ekpe n’ekpere, “mmụọ nsọ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ.” Mgbe ahụzi, Jehova bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” na-anabata ekpere ndị dabara n’ọnọdụ anyị, bụ́ ndị e dere n’Okwu ya, dị ka à ga-asị na ọ bụ anyị na-ekpe ha.—Ọma 65:2.

8:38, 39. Nsogbu, ndị mmụọ ọjọọ, na ọchịchị ụmụ mmadụ apụghị ime ka Jehova kwụsị ịhụ anyị n’anya; ihe ndị a ekwesịghịkwa ime ka anyị kwụsị ịhụ ya n’anya.

9:22-28; 11:1, 5, 17-26. Ọtụtụ n’ime amụma ndị e buru banyere iweghachi Izrel mezuru n’isi ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ọ “kpọrọ ọ bụghị naanị site n’etiti ndị Juu kamakwa site n’etiti ndị mba ọzọ.”

10:10, 13, 14. Ịhụ Chineke na mmadụ ibe anyị n’anya na inwe okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ nakwa ná nkwa ndị o kwere nwere ike ịkpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi anyị.

11:16-24, 33. “Obiọma Chineke na otú o si emesi mmadụ ike” na-agakọ nnọọ otú kwesịrịnụ. Ee, “Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.”—Diut. 32:4.

IBI NDỤ KA NDỊ A KPỌRỌ NDỊ EZI OMUME

(Rom 12:1–16:27)

Pọl sịrị: “Ya mere, ụmụnna m, eji m ọmịiko nke Chineke na-arịọsi unu ike ka unu nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.” (Rom 12:1) “Ya mere,” ma ọ bụ ebe ọ bụ na a kpọrọ Ndị Kraịst ndị ezi omume n’ihi okwukwe ha, ihe ọzọ Pọl kwuru kwesịrị imetụta otú ha si emeso ndị kwere ekwe ibe ha, ndị na-abụghị Ndị Kraịst, nakwa ndị ọchịchị.

Pọl dere, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche.” O nyekwara ndụmọdụ a, sị: “Ka ịhụnanya unu ghara ịbụ nke ihu abụọ.” (Rom 12:3, 9) “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị ọchịchị.” (Rom 13:1) A bịa n’okwu metụtara akọnuche, ọ gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘kwụsị ikpe ibe ha ikpe.’—Rom 14:13.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

12:20—Olee otú anyị si ‘ekpokwasị icheku ọkụ n’isi’ onye iro anyị? N’oge Baịbụl, a na-etinye ọla e gwupụtara n’ala n’ime ọkụ na-ere ere, a na-ekpokwasịkwa icheku ọkụ n’elu ya na n’okpuru ya. Icheku ọkụ ahụ dị ezigbo ọkụ e kpokwasịrị n’elu ya na-enye aka gbazee ọla ahụ ma mee ka ọla nọrọ iche, ihe ndị na-adịghị mma dị n’ime ya anọrọ iche. N’otu aka ahụ, anyị na-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi onye iro anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-emere ya ihe ọma iji gbazee obi ya kpọrọ nkụ ma mee ka ọ malite ịkpa àgwà ndị dị mma.

12:21—Olee otú anyị ga-esi “jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ”? Otu ụzọ anyị si eme nke a bụ site n’ịnọgide n’ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ Chineke sị anyị na-arụ n’atụghị egwu, ruo mgbe a ga-arụru ya otú Jehova chọrọ ya.—Mak 13:10.

13:1—Olee otú o si bụrụ na “Chineke debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya”? “Chineke debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya” n’ụdị na o kwere ka ha na-achị, e nwedịrị ụfọdụ n’ime ha Chineke maara na ha ga-achị tupu ha ebido chịwa. Ihe gosiri nke a bụ na e nwere ihe e buru n’amụma na Baịbụl banyere ụfọdụ ndị ọchịchị.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

12:17, 19. Imegwara ihe ọjọọ mmadụ mere anyị bụ anyị ịrụ ọrụ dịịrị Jehova. Anyị ‘iji ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ’ gosiri na anyị dị mpako’!

14:14, 15. Anyị ekwesịghị ime ihe ga-ewute nwanna anyị ma ọ bụ mee ka ọ sụọ ngọngọ site n’ihe oriri ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ anyị na-enye ya.

14:17. Ihe bụ́ isi na-eme ka mmadụ na Chineke dịrị ná mma abụghị ihe onye ahụ riri ma ọ bụ ṅụọ ma ọ bụ ihe onye ahụ kpebiri na ọ gaghị eri ma ọ bụ ṅụọ. Kama nke ahụ, ọ dabeere n’ezi omume na udo na ọṅụ.

15:7. Anyị kwesịrị ịnabata ndị niile ji ezi obi na-achọ ịmụta eziokwu ahụ n’eleghị mmadụ anya n’ihu, anyị kwesịkwara ikwusara ndị niile anyị zutere ozi ọma Alaeze ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ihe mgbapụta ahụ, ò nwere ike ikpuchi mmehie ndị e mere tupu a kwụọ ya?