Jigide “Ịhụnanya Ahụ I Nwere na Mbụ”
Jigide “Ịhụnanya Ahụ I Nwere na Mbụ”
“Jidesie ihe i nwere ike.”—MKPU. 3:11.
1, 2. Olee otú obi dị gị mgbe ị ghọtara na ihe ị na-amụ banyere Jehova bụ eziokwu?
Ì CHETARA mgbe mbụ ị matara banyere ihe ndị magburu onwe ha Jehova kwere nkwa imere ụmụ mmadụ na-erube isi? Ọ bụrụ na ị na-ekpebu okpukpe ọzọ, olee otú obi dị gị mgbe e ji Baịbụl kọwaara gị ihe bụ́ nzube Chineke, ma ọ bụ mgbe e mere ka ị ghọta ihe ụfọdụ ndị sibuuru gị ike nghọta? Ikekwe ọ bịara doo gị anya na e duhiela gị. Ma obi dị gị nnọọ ụtọ ugbu a na ị matala nke bụ́ eziokwu! Ọ bụrụ na nne na nna gị bụ́ Ndị Kraịst zụlitere gị, ì chetara otú obi dị gị mgbe ọ bịara doo gị nnọọ anya na ihe ị na-amụ banyere Jehova bụ eziokwu ma kpebie ime ihe ị na-amụta?—Rom 12:2.
2 Ọtụtụ ụmụnna ga-agwa gị na obi tọgburu ha atọgbu mgbe ha mụtara eziokwu, ha na Jehova abịa dịkwuo ná mma, ha enweekwa obi ụtọ na ọ dọtala ha n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Obi ụtọ ha nwere kpaliri ha iso na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Ọṅụ juru ha obi nke na ha chọrọ ịkọrọ onye ọ bụla otú obi dị ha. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?
3. Olee otú ọgbakọ Efesọs dị mgbe Jizọs zigaara ha ozi?
3 Mgbe Jizọs na-agwa ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nọ n’Efesọs okwu, o kwuru banyere “ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” Ndị Efesọs nwere ọtụtụ àgwà ọma, ma ha ahụchaghịzi Jehova n’anya otú ha hụburu ya. N’ihi ya, Jizọs gwara ha, sị: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ na ntachi obi i nwere, amakwaara m na ị pụghị ịnabata ndị ọjọọ, na ị na-anwalekwa ndị na-asị na ha bụ ndịozi, ma ha abụghị, i wee chọpụta na ha bụ ndị ụgha. Ị na-atachikwa obi, i diwokwa ọtụtụ ihe n’ihi aha m, ị dabeghịkwa mbà. Otú ọ dị, ihe i mere nke na-adịghị m mma bụ na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.”—4. Gịnị mere ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere ndị Efesọs ji dị anyị mkpa taa?
4 Ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere ọgbakọ Efesọs na ọgbakọ ndị ọzọ ọ gwara okwu n’akwụkwọ Mkpughe kwesịrị nnọọ ekwesị n’ihi ọnọdụ ndị e tere mmanụ nọ na ya site n’afọ 1914 gawa. (Mkpu. 1:10) Ma Ndị Kraịst taa nwekwara ike ịhapụ “ịhụnanya ahụ [ha] nwere ná mbụ” maka Jehova na eziokwu ahụ. Buru nke a n’uche ka anyị tụlee otú icheta na ịtụgharị uche n’ahụmahụ ndị i nwerela ná ndụ pụrụ isi nyere gị aka ịnọgide n’ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ, mee ka ịhụnanya gị na-esikwu ike, meekwa ka ị hụ Chineke n’anya otú ị hụburu ya, ma nyere gị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa eziokwu ahụ dị ka ị na-emebu.
Gịnị Mere I Ji Kweta na Ị Mụtala Eziokwu Ahụ?
5, 6. (a) Olee ihe Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ikweta? (b) Gịnị mere i ji kweta na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu? (c) Gịnị nwere ike inyere mmadụ aka ime ka ịhụnanya o nwere na mbụ dịghachi ọhụrụ?
5 Onye ọ bụla raara onwe ya nye Jehova ga-ebu ụzọ “chọpụta” n’onwe ya ihe “bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Rom 12:1, 2) Otu n’ime ihe nke a na-agụnye bụ ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi. Ihe mere otu onye ji kweta na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi bụ eziokwu nwere ike ịdị iche n’ihe mere onye ọzọ ji kweta. Ụfọdụ kwuru na ihe gbanwere obi ha bụ mgbe ha gụtara aha Chineke na Baịbụl ma ọ bụkwanụ mgbe ha ghọtara ihe bụ́ eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. (Ọma 83:18; Ekli. 9:5, 10) Ihe masịrị ndị ọzọ bụ otú ndị Jehova si hụ ibe ha n’anya. (Jọn 13:34, 35) Ihe kpaliri mmasị ndị ọzọ bụ mgbe ha ghọtara ihe ọ pụtara mgbe a sị na mmadụ abụghị akụkụ nke ụwa. Ha ghọtara na ezi Ndị Kraịst ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’agha nke obodo ọ bụla.—Aịza. 2:4; Jọn 6:15; 17:14-16.
6 Ọ bụ ihe ndị a anyị kwuru okwu ha na ihe ndị ọzọ kpaliri ọtụtụ ndị ịmalite ịhụ Chineke n’anya. Wepụta nnọọ oge tụgharịa uche n’ihe mere i ji kweta na ị chọtala eziokwu ahụ.
Ọnọdụ ndị mmadụ ná ndụ na àgwà ha abụghị otu, n’ihi ya, eleghị anya ihe kacha mee ka ị hụ Jehova n’anya ma kweta na ọ ga-emezu nkwa ya nwere ike ịdị iche n’ihe mere ndị ọzọ ji mee otú ahụ. Ikekwe ihe ndị ahụ ka dị gị ọkụ n’obi dị ka ha dị gị mgbe mbụ ị mụtara eziokwu. Eziokwu ahụ ị mụtara mgbe ahụ agbanwebeghị. N’ihi ya, ịdị na-atụgharị ihe ndị a n’uche na icheta otú ọ dị gị mgbe ị mụtara ha ọhụrụ nwere ike ime ka ị hụ eziokwu ahụ n’anya otú ahụ i si hụ ya na mbụ.—Gụọ Abụ ọma 119:151, 152; 143:5.Mee Ka Ịhụnanya Mbụ ahụ I Nwere Sikwuo Ike
7. Gịnị mere anyị ji kwesị ime ka ịhụnanya mbụ anyị nwere maka eziokwu ahụ sikwuo ike, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ya?
7 Ikekwe e nweela ọtụtụ mgbanwe ndị merela ná ndụ gị kemgbe ị raara onwe gị nye Jehova. Ịhụnanya mbụ ahụ i nwere maka eziokwu ahụ dị nnọọ mkpa, ma ka oge na-aga, ọ bịara dịkwuo mkpa na ị ga-eme ka ịhụnanya ahụ i nwere sikwuo ike ka i wee nwee ike imerili ọnwụnwa ndị bịara gị. Jehova nyekwaara gị aka ime nke a. (1 Kọr. 10:13) N’ihi ya, ahụmahụ ndị i nwetarala kemgbe ọtụtụ afọ baara gị ezigbo uru. Ha enyerela gị aka ime ka ịhụnanya i nwere ná mbụ sikwuo ike, ha bụkwa ụzọ ọzọ isi chọpụta n’onwe gị ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma.—Jọsh. 23:14; Ọma 34:8.
8. Olee otú Jehova si kọwaara Mozis onye ọ bụ, oleekwa otú ụmụ Izrel si bịa marakwuo ụdị onye Chineke bụ?
8 Dị ka ihe atụ, chegodị ụdị ahụhụ ụmụ Izrel nọ na-ata mgbe Jehova kwuru na ya ga-anapụta ha n’ohu ha nọ n’Ijipt. Chineke kọwaara Mozis onwe ya, sị: “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụ. 3:7, 8, 13, 14) Ihe Jehova na-ekwu bụ na ya ga-aghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji napụta ndị ya. Ụmụ Izrel hụrụ otú Jehova si gosipụta àgwà ya dị iche iche n’ihe ndị ọzọ mewerenụ nakwa ka ọnọdụ ha gbanwewere. Ha hụrụ otú Jehova si ghọọ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, Onyeikpe, Onye Ndú, Onye Nnapụta, Dike n’Agha, na Onye Na-egbo Mkpa.—Ọpụ. 12:12; 13:21; 14:24-31; 16:4; Nehe. 9:9-15.
9, 10. Olee ụdị ọnọdụ mmadụ nwere ike ịnọ na ya ya e nyere ya aka ịbịa mara Chineke, oleekwa ihe mere o ji dị mma icheta ahụmahụ ndị dị otú ahụ?
9 Ọnọdụ gị na nke ụmụ Izrel oge ochie abụghị otu. N’agbanyeghị nke a, ikekwe e nweela ihe ndị mere gị bụ́ ndị mere ka i kweta na Chineke nwere mmasị n’ebe ị nọ, ndị mekwara ka okwukwe gị sikwuo ike. Ikekwe ọ dịla ụzọ ụfọdụ Jehova si gosi na ya bụ Onye Na-egbo Mkpa, Onye Nkasi Obi, ma ọ bụ Onye Ozizi. (Gụọ Aịzaya 30:20b, 21.) Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e nweela mgbe Jehova zara ekpere gị n’ụzọ pụtara ìhè. E nwere ike ị nọ ná nsogbu tara akpụ, Onye Kraịst ibe gị abịa nyere gị aka. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị hụrụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ nyeere gị aka ka ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye.
10 Ọ bụrụ na ị kọọrọ ndị ọzọ ihe ndị a, e nwere ike ha agaghị ewere ha ka oké ihe dị ka i si were ya. A sị kwuwe, ihe ndị a abụghị ọrụ ebube. Ma i weere ha dị ka ihe ndị pụrụ iche. N’ezie, Jehova ghọrọ ihe dị mkpa ka ọ ghọọrọ gị. Chetụkwala echiche laa azụ kemgbe ị batara n’eziokwu a. Ì nwere ike icheta ihe karịrị otu ugboro ná ndụ gị Jehova lekọtara gị? Ya bụrụ otú ahụ, icheta ihe ndị ahụ Jehova meere gị na ụdị obi ụtọ i nwere n’ihi ha, nwere ike ịkpali gị ịhụ Jehova n’anya otú ahụ ị hụrụ ya mgbe ahụ. Eledala ahụmahụ ndị ahụ i nwere anya. Na-atụgharị uche na ha. Ha na-egosi na Jehova hụrụ gị onwe gị n’anya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ị kwụsị ikweta nke a.
Nyochaa Onwe Gị nke Ọma
11, 12. Olee ihe nwere ike ime ka Onye Kraịst kwụsị ịhụ eziokwu ahụ n’anya otú ọ hụburu ya, oleekwa ndụmọdụ Jizọs nyere?
11 Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị hụghịkwa Chineke na eziokwu ahụ n’anya otú ị hụburu ha, nke a abụghị n’ihi na Chineke agbanweela. Jehova adịghị agbanwe agbanwe. (Mal. 3:6; Jems 1:17) Ọ hụrụ gị n’anya mgbe ahụ, ọ ka hụkwara gị n’anya ugbu a otú ahụ o si hụ gị mgbe ahụ. Ọ̀ bụrụ na e nweela ihe mere ka mmekọrịta gị na Jehova gharazie isi ike dị ka ọ dị ná mbụ, gịnị ka ọ bụ? Ọ̀ ga-abụ na e nwere ihe ndị na-echegbu gị ugbu a karịa mgbe mbụ? Ikekwe n’oge ndị gara aga, ị na-ekpechi ekpere anya, na-amụchi ihe anya ma na-atụgharị uche mgbe niile. Ị̀ na-agachi ozi ọma na ọmụmụ ihe anya n’oge ahụ karịa ka ị na-eme ugbu a?—2 Kọr. 13:5.
12 E nwere ike ị gaghị achọpụta na ị naghị emechazi nke ọma dị ka ị na-emebu, ma ọ bụrụ na ị chọpụta na ị naghị emechazi nke ọma, gịnị ka i chere kpatara ya? Ọ̀ ga-abụ na nchegbu maka ihe ndị dị mkpa, dị ka igboro ndị ezinụlọ gị mkpa ha, ịhụ na i nwere ezi ahụ́ ike, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha, emeela ka i chefuo na ụbọchị Jehova dị nso? Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi n’elu ụwa niile. Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe niile ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:34-36.
13. Olee ihe Jems ji tụnyere Okwu Chineke?
13 Jems bụ́ onye so dee Baịbụl e nyere ike mmụọ nsọ gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha jiri Okwu Chineke nyochaa onwe ha nke ọma. Jems dere, sị: “Bụrụnụ ndị na-eme okwu Chineke, unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ, ndị ji echiche ụgha na-aghọgbu onwe ha. N’ihi na ọ bụrụ na onye ọ bụla bụ onye na-anụ okwu Chineke, ma ọ bụghị onye na-eme ya, onye a dị ka onye na-ekiri ihu ya n’enyo. N’ihi na ọ na-ekiri onwe ya, ọ na-apụkwa ma chefuo ụdị mmadụ ọ bụ ozugbo. Ma onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme, n’ihi na ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama ọ bụ onye na-arụ ọrụ ahụ.”—Jems 1:22-25.
14, 15. (a) Olee otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma? (b) Olee ajụjụ ndị i nwere ike ichebara echiche?
14 Mmadụ nwere ike ile onwe ya n’enyo iji hụ na ya dị mma n’anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwoke achọpụta na taị ya anọzighị anọzi, o nwere ike idozi ya. Ọ bụrụ na nwaanyị achọpụta na ntutu isi ya adịghị mma n’anya, o nwere ike imezi ya. N’otu aka ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka inyocha ụdị onye anyị bụ. Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị iji mara ma ànyị dị otú Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịdị, anyị ji Baịbụl na-ele onwe anyị dị ka anyị si eji enyo ele onwe anyị. Ma oleekwanụ uru ile onwe anyị n’enyo bara ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe anyị mere iji mezie ihe anyị hụrụ na ọ dịghị mma? Anyị na-egosi na anyị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe anyị hụrụ ‘n’iwu zuru okè’ nke Chineke, si otú ahụ ghọọ “ndị na-eme” ya. N’ihi ya, onye ọ bụla chọpụtara na ọ hụghịkwa Jehova na eziokwu ahụ n’anya otú ọ hụburu ha kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a echiche: ‘Olee nsogbu ndị m na-enwe ná ndụ, oleekwa ihe m na-eme banyere ha? Olee ihe m mere banyere ha n’oge ndị gara aga? È nweela ihe gbanwerenụ?’ Ọ bụrụ na ị jụchaa onwe gị ajụjụ ndị a ma chọpụta na e nwere ebe ndị ị na-adịghị emecha nke ọma, elegharala ha anya. Ọ bụrụ na e nwere ebe ndị chọrọ ka Hib. 12:12, 13.
i mee mgbanwe, egbula oge ọ bụla ime ya.—15 Ịtụgharị uche otú a nwekwara ike inyere gị aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ga-ekwe omume bụ́ ndị ga-enyere gị aka inwe ọganihu n’ozi Jehova. Pọl onyeozi nyere onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti ndụmọdụ site n’ike mmụọ nsọ otú ọ ga-esi mee ka ozi ya ka mma. Pọl gbara nwa okorobịa ahụ ume, sị: “Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.” Anyị kwesịkwara iji Okwu Chineke mara ebe ndị ọ dị mkpa ka anyị nwee ọganihu.—1 Tim. 4:15.
16. Olee ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche ka i ji Akwụkwọ Nsọ na-enyocha onwe gị?
16 Ọ bụrụ na i jiri ezi obi nyochaa onwe gị, ị ga-achọpụta na e nwere ebe ụfọdụ i kwesịrị ịrụkwu ọrụ. Nke a nwere ike ịkụda gị mmụọ, ma ekwela ka nke ahụ mee gị. A sị kwuwe, ihe mere i ji na-enyocha onwe gị bụ iji chọpụta ebe ndị i kwesịrị imezikwu ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na Setan ga-achọ ka Onye Kraịst chee na ya abaghịkwa uru ọ bụla n’ihi ezughị okè ya. N’ezie, Setan ekwuola na Chineke adịghị eji mgbalị niile ndị ohu ya na-eme iji fee ya ofufe akpọrọ ihe. (Job 15:15, 16; 22:3) Jizọs gosiri na nke a bụ ụgha chara acha; onye ọ bụla n’ime anyị dị okè ọnụ ahịa n’anya Chineke. (Gụọ Matiu 10:29-31.) Ịmara na i zughị okè kwesịrị ime ka i jiri obi umeala kpebie imeziwanye ihe site n’enyemaka Jehova. (2 Kọr. 12:7-10) Ọ bụrụ ọrịa ma ọ bụ nká na-eme ka ị ghara imeru ihe otú ị ga-achọ, gbalịa setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị i ga-eruli, adakwala mbà ma ọ bụ kwe ka ịhụnanya gị jụọ oyi.
Anyị Nwere Ọtụtụ Ihe Anyị Ga-eji Maka Ha Nwee Ekele
17, 18. Olee uru ndị dị n’ime ka ịhụnanya mbụ ahụ i nwere na-esikwu ike?
17 E nwere ọtụtụ uru dị n’ịnọgide na-eme ka ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ na-esikwu ike. Ị ga-amarukwu Chineke ala, ị ga-enwekwukwa ekele maka otú o si jiri ịhụnanya na-edu gị. (Gụọ Ilu 2:1-9; 3:5, 6.) Ọbụ abụ ahụ, sịrị: “Idebe [mkpebi ikpe Jehova] na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.” “Ihe ncheta Jehova bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi, na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.” Ọzọkwa, “obi ụtọ na-adịrị ndị ụzọ ha na-enweghị ntụpọ, ndị na-eje ije n’iwu Jehova.”—Ọma 19:7, 11; 119:1.
18 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekweta na i nwere ọtụtụ ihe ọma mere ị ga-eji nwee ekele. Ị maara ihe mere ihe ndị na-eme n’ụwa taa ji na-eme. Nri ime mmụọ Chineke na-enye ndị ya taa na-abara gị. Obi abụọ adịghị ya na i nwekwara ekele na Jehova adọtala gị n’ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ, nyekwa gị ihe ùgwù ịbụ otu n’ime Ndịàmà ya. Gụkọọ ngọzi ndị i nwere! A sị gị detuwe ha, eleghị anya ha ga-eju akwụkwọ. Ịdị na-agụkọ ngọzi ndị i nwere ga-enyere gị aka ime ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru: “Jidesie ihe i nwere ike.”—Mkpu. 3:11.
19. E wezụga ịtụgharị uche banyere mmekọrịta gị na Chineke, olee ihe dị mkpa ga-enye aka mee ka gị na Chineke nọgide na-adị ná mma?
19 Ịtụgharị uche n’otú okwukwe gị si na-esiwanye ike ka oge na-aga bụ otu n’ime ihe ndị nwere ike inyere gị aka ijigidesi ihe i nwere ike. Ụlọ Nche ekwuola ugboro ugboro ihe ndị ọzọ dị mkpa ga-enyere anyị aka ime ka anyị na Chineke nọgide na-adị ná mma. Ụfọdụ n’ime ha bụ ekpere, ịga ọmụmụ ihe na ikere okè n’ihe omume, na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ihe ndị a nwere ike inye aka mee ka ịhụnanya i nwere ná mbụ na-adịkwu ọhụrụ, ma na-ebuwanye ibu.—Efe. 5:10; 1 Pita 3:15; Jud 20, 21.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Olee otú ihe ndị mere i ji bịa hụ Jehova n’anya ga-esi gbaa gị ume ugbu a?
• Gịnị ka icheta ahụmahụ ndị i nwetarala kemgbe ọtụtụ afọ ga-eme ka i kweta?
• Gịnị mere i ji kwesị inyocha onwe gị iji mara ma ị ka hụkwara Chineke n’anya otú ị hụburu ya?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 23]
Olee ihe ị mụtara dọtara gị n’eziokwu ahụ ma mee ka i kwere na ya?
[Foto dị na peeji nke 25]
È nwere ihe ndị ị chọpụtara n’ime onwe gị i kwesịrị imezi emezi?