Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-erubere Jehova Isi

Na-erubere Jehova Isi

Na-erubere Jehova Isi

“Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 JỌN 5:3.

1, 2. (a) Gịnị mere okwu banyere irube isi ji agba ọtụtụ ndị agba ná ntị taa? (b) Ma ndị sị na ọ dịghị onye ga-agwa ha ihe ha ga-eme, hà kwuru eziokwu? Kọwaa.

ỌTỤTỤ mmadụ n’ụwa taa adịghị achọ ịnọ n’okpuru onye ọzọ. Ọ dịtụghị amasị ọtụtụ ndị ime ihe onye ọzọ kwuru. Àgwà ndị dị otú a na-akpa mere ka o yie ka ndị a ha na-asị: “Ọ dịghị onye ga-agwa m ihe m ga-eme.” Ma ọ̀ bụ eziokwu na ọ dịghị onye na-agwa ndị dị otú a ihe ha ga-eme? N’ebeekwanụ! Ọtụtụ n’ime ndị a amaghị na ha na-akpa àgwà ka ọtụtụ ndị ọzọ, bụ́ ndị “na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.” (Rom 12:2) Kama ịbụ ndị ọ na-adịghị onye ga-agwa ha ihe ha ga-eme, ha bụ “ohu nke ire ure,” dị ka Onye Kraịst bụ́ Pita onyeozi si kọwaa ha. (2 Pita 2:19) Ha na-eje ije “dị ka usoro ihe nke ụwa a si dị, dị ka onye na-achị ikike nke ikuku si chọọ,” ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu.—Efe. 2:2.

2 Otu onye na-ede akwụkwọ turu ọnụ, sị: “Anaghị m ekwe ka nne m ma ọ bụ nna m ma ọ bụ onye ụkọchukwu ma ọ bụ pastọ, onyeisi okpukpe ọ bụla ma ọ bụ Baịbụl na-agwa m ihe m ga-eme.” Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nọ n’isi na-eji ikike ha emegbu ndị ọzọ, nke na-emekwa ka ha ghara iru eru ka anyị rubere ha isi, ma mmadụ ikwu na ya achọghị ka onye ọ bụla gwa ya ihe ọ ga-eme, ọ̀ bụ ya ga-eme ka ihe ka mma? Akụkọ ndị na-agba n’akwụkwọ akụkọ na-egosi na o mebeghị otú ahụ. Ọ dị mwute na ọ bụ n’oge a ọ dị nnọọ ụmụ mmadụ mkpa ka e nwee onye ga-eduzi ha ka ọtụtụ ndị kacha ajụ ịnabata nduzi.

Otú Anyị Si Ele Nrubeisi Anya

3. Olee otú Ndị Kraịst narị afọ mbụ si gosi na ha adịghị eme ihe ọ bụla mmadụ gwara ha mee n’ajụghị ase?

3 Echiche Ndị Kraịst na nke ụwa abụghị otu n’okwu a. Ọ bụghị na anyị na-eme ihe ọ bụla a gwara anyị mee n’ajụghị ase. Kama nke ahụ, a na-enwe mgbe anyị na-ajụ ime ihe ndị ọzọ gwara anyị mee ọ sọkwa ya ya bụrụ na ha nọ n’ọkwá dị elu. Otú a ka ọ dịkwa Ndị Kraịst narị afọ mbụ. Dị ka ihe atụ, mgbe onyeisi nchụàjà na ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu so ná ndị Sanhedrin gwara ndịozi ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ha ejighị ụjọ kweta ime ihe ahụ a gwara ha. Ha ahapụghị ime ihe ọma iji hụ na ha rubeere mmadụ isi.—Gụọ Ọrụ 5:27-29.

4. Olee ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị na-egosi na ọtụtụ ndị Chineke mere ihe dị iche n’ihe ndị ọzọ mere?

4 Imerime ndị ohu Chineke dịrị ndụ tupu Kraịst abịa n’ụwa mekwara ihe yiri nke a. Dị ka ihe atụ, Mozis ‘jụrụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero, ọ họọrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke’ n’agbanyeghị na ọ maara na ime nke a ga-eme ka ‘iwe wee eze.’ (Hib. 11:24, 25, 27) Josef ekweghị ka nwunye Pọtịfa rata ya iso ya nwee mmekọahụ n’agbanyeghị na ọ maara na nwaanyị ahụ nwere ike ime ka ọ taa ahụhụ. (Jen. 39:7-9) Daniel “kpebisiri ike n’obi ya na ya agaghị eji nri pụrụ iche nke eze na mmanya ya merụọ onwe ya,” n’agbanyeghị na ihe a o kpebiri ime ga-esiri onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze ike ikweta. (Dan. 1:8-14) Ihe atụ ndị a na-egosi na kemgbe ụwa, ndị Chineke adịghị ala azụ ime ihe dị mma, n’agbanyeghị nsogbu ndị ọ ga-akpatara ha. Ha adịghị ekwere ime ihe ọ bụla ndị mmadụ kwuru naanị ka ha wee zọrọ ụtọ; anyị onwe anyị ekwesịghịkwa ime otú ahụ.

5. Olee otú ụzọ anyị si ele irube isi anya si dị iche n’otú ụwa si ele ya anya?

5 Na anyị nọgidere na-eji obi ike eme ihe dị mma apụtaghị na anyị bụ ndị isi ike; anyị adịghịkwa ka ndị na-enupụrụ ndị ọchịchị isi n’ihi na ha anabataghị ọchịchị ha. Kama nke ahụ, anyị kpebisiri ike irubere Jehova isi karịa mmadụ ọ bụla. Mgbe iwu mmadụ megidere nke Chineke, ọ naghị esiri anyị ike ikpebi nke anyị ga-ahọrọ. Dị ka ndịozi mere na narị afọ mbụ, anyị na-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.

6. Gịnị mere o ji kacha mma irube isi n’iwu Jehova?

6 Gịnị nyerela anyị aka irubere Chineke isi? Ọ bụ n’ihi na anyị kwenyere n’ihe e dere n’Ilu 3:5, 6: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” Anyị kwenyere na ihe ọ bụla Chineke si anyị mee bụ nnọọ maka ọdịmma anyị. (Gụọ Diuterọnọmi 10:12, 13.) N’ezie, Jehova kọwaara ndị Izrel onwe ya dị ka “Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.” Ọ gakwara n’ihu ikwu, sị: “A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri, ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.” (Aịza. 48:17, 18) Anyị kwetara n’ihe a e kwuru ebe a. Obi sikwara anyị ike na irube isi n’iwu Chineke ga-abara anyị uru mgbe niile.

7. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị aghọtachaghị ihe mere e ji nye iwu ụfọdụ n’Okwu Chineke?

7 Anyị na-anabata ịchịisi Jehova ma na-erubere ya isi a sịgodị na anyị aghọtachaghị ihe mere o ji nye anyị iwu ụfọdụ n’Okwu ya. Nke a abụghị mmadụ ikwere ihe a gwara ya n’ajụghị ase; ọ bụ ịtụkwasị onye gwara ya ihe ahụ obi. Ọ na-egosi na obi siri anyị nnọọ ike na Jehova maara ihe ga-adị anyị mma. Irube isi anyị na-egosikwa na anyị hụrụ Chineke n’anya, n’ihi na Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.” (1 Jọn 5:3) Ma e nwekwara ụzọ ọzọ anyị si erube isi nke anyị na-ekwesịghị ileghara anya.

Ịzụ Ikike Nghọta Anyị

8. Olee ihe jikọrọ anyị ‘ịzụ ikike nghọta’ anyị na irubere Jehova isi?

8 Baịbụl na-agwa anyị na anyị kwesịrị ‘ịzụ ikike nghọta anyị iji mata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’ (Hib. 5:14) N’ihi ya, ihe dị anyị mkpa abụghị ịhụ na anyị rubere isi n’Iwu Chineke n’echebaraghị ha echiche; kama, anyị kwesịrị ịhụ na anyị ‘matara ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi’ dị ka Jehova n’onwe ya si ele ya anya. Anyị kwesịrị ịghọta amamihe dị n’ihe ndị Jehova nyere n’iwu, ka anyị wee nwee ike ikwu dị ka ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Iwu gị dịkwa n’ime obi m.”—Ọma 40:8.

9. Olee otú anyị ga-esi mee ka akọnuche anyị kwekọọ n’otú Jehova si ele ihe anya, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mee nke a?

9 Iji ghọtakwuo uru Iwu Chineke bara dị ka ọbụ abụ ahụ ghọtara ya, ọ dị mkpa ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị na-agụ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị agụọ banyere otu n’ime iwu Jehova nyere, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị mere iwu a ji dị mkpa? Gịnị mere irube isi na ya ga-eji baara m uru? Olee nsogbu ndị leghaara ndụmọdụ Chineke nyere n’okwu a anya dabarala na ha?’ Mgbe akọnuche anyị si otú a kwekọọ n’otú Jehova si ele ihe anya, o yikarịrị ka anyị ga-eme mkpebi ndị kwekọrọ n’uche ya. Anyị ga-enwe ike ‘ịnọgide na-aghọta ihe uche Jehova bụ’ ma nwezie ike irubere ya isi. (Efe. 5:17) Nke a anaghị adịcha mfe omume.

Setan Na-agbalị Ime Ndị Mmadụ Ka Ha Nupụrụ Chineke Isi

10. Olee otu ebe Setan na-agbalị ime ka ndị mmadụ ghara irubere Chineke isi?

10 Ọ dịla anya Setan gbalịwara ime ka ndị mmadụ nupụrụ Chineke isi. E nwere ọtụtụ ụzọ pụtara ìhè ndị mmadụ si akpa àgwà e ji mara Setan, nke bụ́ ime ihe otú o si masị ha. Were dị ka ihe atụ, otú ndị mmadụ si ghara ịdị na-akwanyere alụmdi na nwunye Chineke hiwere ùgwù. Ụfọdụ na-ahọrọ ibikọ ọnụ n’alụghị alụ, ebe ndị ọzọ na-achọ ụzọ ha ga-esi hapụ di ma ọ bụ nwunye ha. Ndị na-eme ụdị ihe ndị a nwere ike ikweta n’ihe otu nwaanyị a ma ama na-eme ihe nkiri kwuru, sị: “Ọ gaghị ekwe omume mmadụ inwe naanị otu nwoke ma ọ bụ otu nwaanyị.” O kwukwara, sị: “Ahụtubeghị m onye nọgidere n’otu nwoke ma ọ bụ otu nwaanyị ma ọ bụkwanụ onye chọrọ ime otú ahụ.” Mgbe otu onye ọzọ a ma ama na-eme ihe nkiri na-ekwu banyere alụmdi na nwunye ndị nke ya, bụ́ ndị na-adabaghị, o kwuru ihe yiri nke ahụ onye mbụ kwuru, sị: “Echeghị m na e kere anyị inwe naanị otu di ma ọ bụ nwunye ná ndụ anyị niile.” Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Àna m erube isi n’ihe ndị Jehova kwuru banyere alụmdi na nwunye, ka otú ụwa si ele alụmdi na nwunye anya ò meela ka m soro ha lewe ya anya otú ahụ?’

11, 12. (a) Gịnị nwere ike ịdị na-eme ka ọ na-esiri ndị na-eto eto ike irube isi n’iwu Jehova? (b) Kọọ otu ahụmahụ na-egosi ihe mere mmadụ inupụ isi n’iwu Jehova ji bụrụ ịda iberibe.

11 Ị̀ bụ onye na-eto eto nọ n’ọgbakọ Jehova? Ọ bụrụ na ị bụ, i nwere ike ịbụ onye Setan kacha elekwasị anya ime ka i nupụrụ Jehova isi. “Ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa” na otú ndị ọgbọ gị na-esi aranye gị ime ihe ụfọdụ, nwere ike ime ka i chee na iwu Chineke bụ ibu arọ. (2 Tim. 2:22) Ekwela ka ụdị ihe a mee gị. Gbalịsie ike ịchọpụta amamihe dị n’iwu ndị Chineke nyere. Dị ka ihe atụ, Baịbụl na-agwa gị ka ị ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Kọr. 6:18) N’ebe a kwa, jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Gịnị mere iwu a ji bụrụ ihe amamihe dị na ya? Olee uru m ga-erite ma m rube isi n’iwu a?’ O nwere ike ị maara ụfọdụ ndị na-egeghị ntị na ndụmọdụ Chineke ma hụkwa nsogbu ndị ọ kpataara ha. Ị̀ ga-asị na ha nwere obi ụtọ n’ezie ugbu a? Hà na-ebi ndụ ka mma ugbu a karịa mgbe ha nọ n’ọgbakọ Jehova? Hà achọtala ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ ná ndụ bụ́ nke ndị ohu Chineke ndị ọzọ na-amaghị?—Gụọ Aịzaya 65:14.

12 Legodị ihe otu Onye Kraịst aha ya bụ Sharon kwuru n’otu oge. Ọ sịrị: “Ebutela m ọrịa o biri n’ájá ọcha n’ihi erubeghị isi n’iwu Jehova. Ọtụtụ mgbe, ana m echeta obi ụtọ m na-enwebu mgbe m na-ejere Jehova ozi.” Ọ chọpụtara na mmadụ inupụrụ Jehova isi bụ ịda iberibe, chọpụtakwa na ya gaara ewere iwu Jehova dị ka ihe dị oké mkpa. Iwu ndị Jehova nyere bụ iji chebe anyị. Sharon nwụrụ izu asaa ka o dechara ihe ndị a e kwuru ebe a. Ihe a mere ya na-egosi na ọ dịghị ihe dị mma Setan nwere inye ndị họọrọ ịbụ akụkụ nke usoro ihe ọjọọ nke ụwa a. Ebe ọ bụ “nna ụgha,” ọ na-ekwe ọtụtụ nkwa, ma ọ dịghị emezu nkwa ya ndị ahụ dị nnọọ ka ọ na-emezughị nke ahụ o kwere Iv. (Jọn 8:44) N’ezie, ọ kacha mma irubere Jehova isi mgbe niile.

Zere Ịbụ Eze Onye Agwala M

13. Olee otu ebe ọ dị mkpa ka anyị zere ịbụ eze onye agwala m?

13 Ọ bụrụ na anyị chọrọ irubere iwu ndị Jehova nyere isi, anyị ekwesịghị ịbụ eze onye agwala m. Mpako nwere ike ime ka anyị chee na ọ dịghị anyị mkpa ka onye ọ bụla na-eduzi anyị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịdị na-agba ndụmọdụ ndị na-edu ndú n’etiti ndị Chineke ụkwụ. Chineke haziri ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-enye ndị ya nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. (Mat. 24:45-47) Anyị kwesịrị iji obi umeala ghọta na ihe a bụ ụzọ Jehova si elekọta ndị ya taa. Anyị kwesịrị ịdị ka ndịozi ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsịrị iso ya, Jizọs jụrụ ndịozi ya, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” Pita wee zaa ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:66-68.

14, 15. Gịnị mere anyị ji kwesị iji umeala n’obi na-erube isi na ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl?

14 Irubere Jehova isi gụnyere irube isi na ndụmọdụ ndị dị n’Okwu ya. Dị ka ihe atụ, ọ dịla anya ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche dọwara anyị aka ná ntị “ka anyị mụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.” (1 Tesa. 5:6) Ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ kwesịrị ekwesị n’oge ikpeazụ ndị a mgbe ọtụtụ ndị bụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya.” (2 Tim. 3:1, 2) Ànyị nwere ike iso kpawa àgwà ndị a jupụtaziri ebe niile? Eenụ. Ihe mgbaru ọsọ ndị na-agbasaghị ofufe Chineke nwere ike ime anyị ka anyị na-eleghara ihe ime mmụọ anya, ma ọ bụkwanụ mee ka anyị chụwa ihe nke ụwa. (Luk 12:16-21) N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya irube isi na ndụmọdụ dị na Baịbụl ma zere ndụ ịhụ naanị onwe onye n’anya nke juru n’ụwa Setan a!—1 Jọn 2:16.

15 E si n’aka ndị okenye ọgbakọ enye anyị nri ime mmụọ nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-akwadebe. Baịbụl na-adụ anyị ọdụ, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.” (Hib. 13:17) Nke a ọ̀ pụtara na ndị okenye ọgbakọ na-emetacha ihe niile? Mbanụ! Chineke na-ahụ ebe ndị ha na-adịghị emecha nke ọma karịa ka mmadụ ọ bụla pụrụ ịhụ. Ma ọ ka chọkwara ka anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ha. Irubere ndị okenye isi, n’agbanyeghị na ha ezughị okè, na-egosi na anyị na-erubere Jehova isi.

Ihe Mere Ịdị Umeala n’Obi Ji Dị Mkpa

16. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwanyere Jizọs ùgwù dị ka Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst?

16 Ọ dị mkpa ka anyị cheta mgbe niile na Jizọs bụ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Kọl. 1:18) Nke ahụ bụ otu ihe mere anyị ga-eji jiri obi umeala na-erube isi n’ihe ndị okenye ọgbakọ na-agwa anyị, na-asọpụrụ ha “nke ukwuu n’ụzọ pụrụ iche.” (1 Tesa. 5:12, 13) N’ezie, ndị okenye ọgbakọ kwesịkwara ịdị na-egosi na ha onwe ha na-erubere Kraịst isi site n’ịhụ na ha adịghị akụzi echiche ha ma jiri nlezianya na-akụzi ihe ndị Chineke kwuru mgbe ha na-ezi ihe n’ọgbakọ. Ha adịghị ‘agabiga ihe e dere ede’ iji kụzie echiche nke onwe ha.—1 Kọr. 4:6.

17. Gịnị mere inwe oké ọchịchọ ji dị njọ?

17 Ọ dị mkpa ka onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ zere ịchọrọ onwe ya otuto. (Ilu 25:27) Eleghị anya, ọ bụ ụdị ọnyà a matara otu onye na-eso ụzọ Kraịst, bụ́ onye Jọn onyeozi kwuru okwu ya. Jọn dere, sị: “Dayọtrefis, onye na-achọ ịnọ n’ọkwá mbụ . . , adịghị eji nkwanye ùgwù anabata ihe ọ bụla nke si n’aka anyị. Ya mere, ọ bụrụ na mụ abịa, m ga-echeta ọrụ ya ndị ọ na-arụ, na-ekwu okwu ọjọọ banyere anyị.” (3 Jọn 9, 10) E nwere ihe anyị ka ga-esi na nke ahụ mụta taa. E nwere ezi ihe mere anyị ga-eji wepụ oké ọchịchọ ọ bụla nke ịnọ n’isi bụ́ nke nwere ike ịdị anyị n’ime. Baịbụl na-agwa anyị, sị: “Nganga na-abịa tupu nkụpịa, mmụọ mpako na-abịakwa tupu ịsụ ngọngọ.” Ndị na-erubere iwu Chineke isi aghaghị izere mpako, n’ihi na ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, anyị ga-emechu onwe anyị ihu.—Ilu 11:2; 16:18.

18. Gịnị ga-enyere anyị aka irubere iwu ndị Jehova nyere isi?

18 Ee, hụ na i zeere mmụọ nke mmadụ ime otú o si masị ya nke jupụtara n’ụwa a, kpebiekwa irubere Jehova isi. Site n’oge ruo n’oge, tụgharịa uche ná nnukwu ihe ùgwù nke i nwere ịbụ onye na-ejere Jehova ozi. Na i so ndị Chineke na-eje ozi na-egosi na Chineke n’onwe ya ejirila mmụọ nsọ ya dọta gị n’ebe ya onwe ya nọ. (Jọn 6:44) Ya adịkwala mgbe ị ga-eji ihe ùgwù nke i nwere ịbụ onye na-ejere Chineke ozi gwurie egwu. Gbalịa ike gị niile iji hụ na n’ihe ọ bụla ị na-eme ná ndụ na ị na-ezere ịbụ eze onye agwala m, ma hụ na ị na-erubere iwu ndị Jehova nyere isi.

Ì Chetara?

• Gịnị ka irube isi n’iwu Jehova gụnyere?

• Olee ihe jikọro anyị ịzụ ikike nghọta anyị na irube isi n’iwu Jehova?

• Olee ụzọ ndị Setan si agbalị iji mee ka anyị ghara irubere Chineke isi?

• Gịnị mere ịdị umeala n’obi ji dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ irube isi n’iwu Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

“Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ”

[Foto dị na peeji nke 20]

Irube isi n’iwu Chineke mgbe niile bụ ihe amamihe dị na ya