Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụ “Chineke Na-eme Ka O Too”!

Ọ Bụ “Chineke Na-eme Ka O Too”!

Ọ Bụ “Chineke Na-eme Ka O Too”!

“Onye na-akụ mkpụrụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-agba ya mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla, kama ọ bụ Chineke onye na-eme ka o too.”—1 KỌR. 3:7.

1. Olee otú anyị si bụrụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ”?

“NDỊ ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” Ọ bụ otú ahụ ka Pọl onyeozi si kọwaa ihe ùgwù anyị niile nwere ike inwe. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:5-9.) Ọrụ Pọl na-ekwu okwu ya ihe a bụ ọrụ inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. O ji ọrụ a tụnyere ịkụ mkpụrụ na ịgba ya mmiri. Enyemaka Jehova dị anyị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-eme nke ọma n’ọrụ ahụ. Pọl chetaara anyị na ọ bụ “Chineke na-eme ka o too.”

2. Olee otú eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ “Chineke na-eme ka o too” si enyere anyị aka ile ozi ọma anyị anya otú kwesịrị ekwesị?

2 Eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ Chineke na-eme ka o too na-enyere anyị aka ile ozi anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Anyị nwere ike ịdị na-agbasi mbọ ike n’ikwusa ozi ọma na izi ndị mmadụ ihe, ma mee elu mee ala, ọ bụ Jehova ka otuto niile na-agara ma e nwee ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ọ sọkwara anyị anyị gbalịa, anyị agaghị aghọtacha otú mmadụ na-esi aghọ onye na-eso ụzọ Jizọs ma ya fọdụkwa ikwu otú nke ahụ ga-esi mee. Eze Sọlọmọn kọwara ya nnọọ nke ọma mgbe o dere, sị: ‘Ị maghị ọrụ ezi Chineke, bụ́ onye na-eme ihe niile.’—Ekli. 11:5.

3. Olee otú ịkụ mkpụrụ nkịtị na inyere ndị mmadụ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst si yie?

3 Na anyị enweghị ike ịghọta kpọmkwem otú mmadụ si aghọ onye na-eso ụzọ Jizọs ọ̀ ga-eme ka ọrụ a na-agwụ anyị ike? Mbanụ. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka ọrụ a na-amasịkwu anyị ma na-atọkwu anyị ụtọ. Eze Sọlọmọn kwuru, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị; n’ihi na ị maghị ebe ọ ga-eme nke ọma, ma ọ̀ bụ n’ebe a ma ọ bụ n’ebe ahụ, ma ọ̀ bụ na ha abụọ ga-adịcha mma.” (Ekli. 11:6) N’eziokwu, mgbe a bịara n’ịkụ mkpụrụ nkịtị, anyị anaghị ama ebe ọ ga-esi pupụta ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ gadị epu epu. E nwere ọtụtụ ihe anyị na-enweghị ihe ọ bụla anyị nwere ike ime banyere ha. Otu ihe a nwere ike imekwa n’ọrụ inyere ndị mmadụ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Jizọs gosiri na nke a bụ eziokwu n’ihe atụ abụọ o nyere, bụ́ ndị e dekọọrọ anyị n’isi nke anọ nke Oziọma Mak. Ka anyị hụ ihe anyị nwere ike isi n’ihe atụ abụọ a mụta.

Ụdị Ala Dị Iche Iche

4, 5. Kọọ ná mkpirikpi ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ọgha mkpụrụ nke ghasasịrị mkpụrụ.

4 Dị ka e dekọrọ na Mak 4:1-9, Jizọs kọrọ banyere ọgha mkpụrụ nke ghara mkpụrụ ya, mkpụrụ ahụ ewee daa n’ebe dị iche iche. Ọ sịrị: “Geenụ ntị. Lee! Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ. Ka ọ nọkwa na-agha mkpụrụ, mkpụrụ ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịakwara richapụ ha. Mkpụrụ ndị ọzọ dakwara n’ebe nkume dị, bụ́ ebe ha na-enweghị ájá dị ukwuu, ha wee pulite ozugbo n’ihi enweghị ájá miri emi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha chanwụrụ, ha kpọnwụkwara n’ihi na ha enweghị mgbọrọgwụ. Mkpụrụ ndị ọzọ dakwara n’etiti ogwu, ogwu ndị ahụ tolitekwara ma kpagbuo ha, ha amịghịkwa mkpụrụ ọ bụla. Ma ndị ọzọ dara n’ala dị mma, mgbe ha tolitere ma buo ibu, ha malitere ịmị mkpụrụ, ha na-amịkwa okpukpu iri atọ, nakwa iri isii nakwa otu narị.”

5 Otú e si agha mkpụrụ n’oge Baịbụl bụ ịghasasị ya ebe niile. Ọgha mkpụrụ na-ekponye mkpụrụ ahụ ọ chọrọ ịgha n’ime uwe ya ma ọ bụ jiri ihe buru ha ma na-agha ha ka ọ na-aga. N’ihi ya, n’ihe atụ a Jizọs nyere, ọgha mkpụrụ ahụ akpachaghị anya kụọ mkpụrụ ahụ n’ala ndị ahụ dị iche iche. Kama, mkpụrụ ndị ahụ a ghasasịrị aghasasị dasara n’ebe dị iche iche.

6. Olee otú Jizọs si kọwaa ihe atụ ahụ banyere ọgha mkpụrụ?

6 Ọ dịghị mkpa ka anyị gaa chewe ihe ihe atụ ahụ pụtara. Jizọs gara n’ihu ịkọwa ya, dị ka e dekọrọ na Mak 4:14-20: “Ọgha mkpụrụ na-agha okwu ahụ. Ndị a bụ ndị dị n’akụkụ ụzọ bụ́ ebe a ghara okwu ahụ; ma ozugbo ha nụrụ ya, Setan na-abịa were okwu ahụ a ghara n’ime ha dị ka mkpụrụ. N’otu aka ahụ, ndị a bụ ndị a ghara n’ebe nkume dị: ozugbo ha nụrụ okwu ahụ, ha na-eji ọṅụ nabata ya. Ma ha enweghị mgbọrọgwụ n’ime onwe ha, kama ha na-anọru nwa oge; e mesịa, ozugbo ahụhụ ma ọ bụ mkpagbu malitere n’ihi okwu ahụ, ha na-asụ ngọngọ. E nwekwara ndị ọzọ bụ́ ndị a ghara n’etiti ogwu; ndị a bụ ndị nụrụ okwu ahụ, ma nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba na ọchịchọ maka ihe ndị ọzọ na-awabata ma kpagbuo okwu ahụ, o wee ghọọ nke na-amịghị mkpụrụ. N’ikpeazụ, ndị a ghara n’ala dị mma bụ ndị na-ege ntị n’okwu ahụ, na-anabatakwa ya nke ọma ma na-amị mkpụrụ okpukpu iri atọ nakwa iri isii nakwa otu narị.”

7. Gịnị ka mkpụrụ ahụ na ụdị ala ndị ahụ dị iche iche na-anọchi anya ha?

7 Cheta na Jizọs ekwughị na mkpụrụ ndị ahụ a ghara dị iche iche. Kama, o kwuru banyere otu ụdị mkpụrụ dasara n’ala dị iche iche, nke mkpụrụ ole ha mịrị dị iche iche. Ala nke mbụ kpọrọ nkụ; nke abụọ bụ ala na-emighị emi; nke atọ bụ ala ogwu tojuru na ya; nke anọ bụ ala dị mma ma na-emepụta ihe nke ọma. (Luk 8:8) Gịnị bụ mkpụrụ ahụ? Ọ bụ ozi ọma nke Alaeze ahụ dị na Baịbụl. (Mat. 13:19) Gịnị ka ụdị ala ahụ dị iche iche na-anọchi anya ya? Ọ nọchiri anya ụmụ mmadụ ndị obi ha dị iche iche.—Gụọ Luk 8:12, 15.

8. (a) Ònye ka ọgha mkpụrụ ahụ na-anọchi anya ya? (b) Gịnị mere ihe ndị mmadụ na-eme ka ha nụchara ozi ọma Alaeze ahụ ji adịgasị iche?

8 Ònye ka ọgha mkpụrụ ahụ na-anọchi anya ya? Ọ na-anọchi anya ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Dị ka Pọl na Apọlọs, ha na-akụ mkpụrụ ma na-agba ya mmiri. Ọ bụ ezie na ha na-agbasi mbọ ike, ihe ha niile na-arụpụta ahaghị otu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi otú obi ndị na-anụ ozi ọma ahụ dịgasị. N’ihe atụ ahụ, ọ dịghị ọgha mkpụrụ ahụ n’aka ikpebi ihe mkpụrụ ndị ahụ ga-amịpụta. Nke a bụ nnọọ ihe na-akasi obi, karịsịa nye ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị jirila obi ha dum jee ozi ruo ọtụtụ afọ, ma ọ bụ ọtụtụ iri afọ, ma ya eyie ka ihe ozi ha rụpụtara enweghị ka ọ ha! * Gịnị mere o ji bụrụ ihe na-akasi obi?

9. Olee eziokwu na-akasi obi Pọl onyeozi na Jizọs kwuru okwu ya?

9 A naghị eji ihe mkpụrụ ndị ahụ mịrị amata ma ọgha mkpụrụ ahụ ọ̀ rụkwara ọrụ ya nke ọma ma ọ̀ bụ na ọ rụghị. Pọl kwuru ihe yiri nke a mgbe ọ sịrị: “Onye ọ bụla ga-anata ụgwọ ọrụ nke ya dị ka ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ si dị.” (1 Kọr. 3:8) Mmadụ ga-anata ụgwọ ọrụ dị ka ndọgbu ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ si dị ọ bụghị dị ka ihe ọ rụpụtara si dị. Jizọs n’onwe ya mekwara ka nke a doo anya mgbe ndị na-eso ụzọ ya si ikwusa ozi ọma lọta. Ọṅụ juru ha obi n’ihi na e doro ndị mmụọ ọjọọ n’okpuru ha site na ha ịkpọ aha Jizọs. Ọ bụ ezie na nke a bụ ihe na-enye obi ụtọ, Jizọs gwara ha, sị: “Unu aṅụrịla ọṅụ n’ihi nke a, na a na-eme ka mmụọ dị iche iche nọrọ n’okpuru unu, kama ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi na e dewo aha unu n’eluigwe.” (Luk 10:17-20) Ọ bụrụgodị na ọgha mkpụrụ adịghị ahụ ka ọrụ ya na-arụpụta ihe buru ibu, nke a apụtaghị na ọ gbasighị mbọ ike ma ọ bụkwanụ na o kwesịrughị ntụkwasị obi ka ndị ọzọ. Ọ na-abụkarị obi onye e ziri ozi ọma ga-ekpebi ma ozi ọma ahụ ọ̀ ga-arụpụta ihe. Ma è mere elu ma è mere ala, ọ bụ Chineke na-eme ka o too!

Ọrụ Dịịrị Ndị Nụrụ Okwu Ahụ

10. Gịnị na-ekpebi ma onye nụrụ okwu ahụ ọ̀ ga-adị ka ala dị mma ma ọ bụ na ọ gaghị adị?

10 Oleekwanụ maka ndị na-anụ okwu ahụ? È kpebielarị ma ọ̀ ga-amị mkpụrụ n’ime ha? Mba. Ọ bụ ha ka ọ dịịrị ịhọrọ ma hà ga-abụ ala dị mma ma ọ bụ ala na-adịghị mma. N’ezie, otú obi onye ahụ dị nwere ike ịgbanwe dị mma ma ọ bụ dị njọ. (Rom 6:17) N’ihe atụ Jizọs ahụ, o kwuru na “ozugbo [ụfọdụ] nụrụ” okwu ahụ, Setan bịara were okwu ahụ a ghara n’ime ha. Ma nke a ekwesịghị ime. Na Jems 4:7, a gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘na-eguzogide Ekwensu,’ ọ bụrụkwa na ha emee otú ahụ, ọ ga-agbapụ n’ebe ha nọ. Jizọs kwuru na ndị ọzọ ji ọṅụ nabata okwu ahụ na mbụ ma ha sụrụ ngọngọ n’ihi na ha “enweghị mgbọrọgwụ n’ime onwe ha.” Ma a dụrụ ndị ohu Chineke ọdụ ka ha “gbanye mgbọrọgwụ ma guzosie ike na ntọala ahụ,” ka ha wee nwee ike iji uche ghọta ihe bụ́ “ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi, na ịmara ịhụnanya nke Kraịst bụ́ nke karịrị ihe ọmụma.”—Efe. 3:17-19; Kọl. 2:6, 7.

11. Olee otú mmadụ ga-esi zere ikwe ka nchegbu na akụnụba kpagbuo okwu ahụ?

11 E kwuru na ndị ọzọ nụrụ okwu ahụ kwere ka “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba” wabata ma kpagbuo okwu ahụ. (1 Tim. 6:9, 10) Olee otú ha nwere ike isi gbochie ụdị ihe a ime? Pọl onyeozi zara, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na o kwuwo, sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’”—Hib. 13:5.

12. Gịnị mere ndị ala ahụ dị mma nọchiri anya ha ji mịa mkpụrụ dị iche iche?

12 N’ikpeazụzi, Jizọs kwuru na mkpụrụ ndị nke a ghara n’ala dị mma “na-amị mkpụrụ okpukpu iri atọ nakwa iri isii nakwa otu narị.” Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị gere ntị n’okwu ahụ nwere ezi obi ma mịa mkpụrụ, ihe ha rụpụtara n’ozi ahụ dịgasị iche dabere n’ọnọdụ ndị ha hụtara onwe ha na ya. Dị ka ihe atụ, nká ma ọ bụ ọrịa nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ghara imerucha otú ha gaara achọ ime n’ozi ọma. (Tụlee Mak 12:43, 44.) Ọ dịghịkwa ihe ọgha mkpụrụ ahụ ga-emeli banyere nke a, ma ọ na-enwe ọṅụ mgbe ọ hụrụ na Jehova emeela ka o too.—Gụọ Abụ Ọma 126:5, 6.

Ọgha Mkpụrụ nke Rahụrụ Ụra

13, 14. (a) Kọọ ná nkenke ihe atụ nke nwoke ahụ na-agha mkpụrụ Jizọs kọrọ. (b) Olee onye ọgha mkpụrụ ahụ na-anọchi anya ya, oleekwa ihe mkpụrụ ahụ na-anọchi anya ya?

13 Na Mak 4:26-29, e nwere ihe atụ ọzọ banyere ọgha mkpụrụ. Ebe ahụ na-ekwu, sị: “N’ụzọ dị otú a, alaeze Chineke dị nnọọ ka mgbe mmadụ ghara mkpụrụ n’ala, o wee hie ụra n’abalị ma bilie mgbe chi bọrọ, mkpụrụ ndị ahụ wee pulite ma too ogologo, otú o si mee, ọ maghị. Ala ahụ ji nwayọọ nwayọọ mịa mkpụrụ n’onwe ya, akwụkwọ ya bu ụzọ pụta, e mesịa, oko ya pụtara, n’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka si n’oko ya ahụ pụta. Ma ozugbo mkpụrụ ahụ kara, o ji mma e ji ewe ihe ubi were ya, n’ihi na oge owuwe ihe ubi eruwo.”

14 Ònye bụ ọgha mkpụrụ a? Ụfọdụ ndị na Krisendọm kweere na ọ bụ Jizọs n’onwe ya ka a na-ekwu okwu ya ebe a. Ma olee otú ọ ga-esi bụrụ na Jizọs na-arahụ ụra nke na ọ maghị otú mkpụrụ ahụ si too? Jizọs maara n’ezie otú mkpụrụ si eto! Kama ịbụ Jizọs, ọgha mkpụrụ a, dịkwa nnọọ ka nke ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ nke mbụ, na-anọchi anya onye ọ bụla na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, ndị na-agha mkpụrụ nke Alaeze ahụ site n’ozi ọma ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa. Mkpụrụ ahụ nke a ghara n’ala bụ okwu ahụ ha na-ekwusa. *

15, 16. Olee eziokwu Jizọs mere ka ọ pụta ìhè n’ihe atụ ọgha mkpụrụ ahụ banyere uto nkịtị na uto ime mmụọ?

15 Jizọs kwuru na ọgha mkpụrụ ahụ ‘na-ehi ụra n’abalị ma bilie mgbe chi bọrọ.’ Nke a apụtaghị na ọgha mkpụrụ ahụ na-eleghara ọrụ ya anya. Naanị ihe ọ na-ekwu bụ ihe ọtụtụ ndị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị. Okwu e ji mee ihe n’amaokwu a na-akọwa ihe a na-eme mgbe niile, nke bụ́, ịrụ ọrụ n’ụbọchị ma hie ụra n’abalị. Jizọs kọwara ihe mere n’oge ahụ. O kwuru, sị: “Mkpụrụ ndị ahụ wee pulite ma too ogologo.” Jizọs gakwara n’ihu ikwu, sị: “Otú o si mee, ọ maghị.” Ihe bụ́ isi Jizọs na-ekwu n’ebe a bụ na mkpụrụ ahụ pulitere “n’onwe ya.” *

16 Olee ihe Jizọs na-akọwa n’ebe a? Rịba ama na isi ihe Jizọs na-ekwu bụ otú mkpụrụ ahụ si too na otú o si jiri nwayọọ nwayọọ mee nke a. “Ala ahụ ji nwayọọ nwayọọ mịa mkpụrụ n’onwe ya, akwụkwọ ya bu ụzọ pụta, e mesịa, oko ya pụtara, n’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka si n’oko ya ahụ pụta.” (Mak 4:28) Mkpụrụ ahụ ji nwayọọ nwayọọ too, ya wepụtachaa otu ihe, ọzọ esochie. Ọ dịghịkwa onye ga-amanye ya ito ngwa ngwa. Otú ahụkwa ka ndị mmadụ si eto dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst. Nke a na-eji nwayọọ nwayọọ eme na-adabere n’otú Jehova ji kwe ka eziokwu ahụ too n’obi onye nwere ezi obi.—Ọrụ 13:48; Hib. 6:1.

17. Olee ndị na-eso enwe ọṅụ mgbe mkpụrụ nke eziokwu ahụ mịrị mkpụrụ?

17 Olee otú ọgha mkpụrụ ahụ si esonye n’iwe ihe ubi “ozugbo mkpụrụ ahụ kara”? Mgbe Jehova mere ka eziokwu nke Alaeze ahụ too n’ime obi ndị ka malitere iso ụzọ Kraịst ọhụrụ, ha na-emecha nwee ọganihu ruo n’ókè nke na ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali ha ịrara ndụ ha nye ya. Ha na-egosizi na ha ararala onwe ha nye Chineke site n’ime baptizim. Ụmụnna ndị nwoke ndị nọgidere na-agbalị itozu okè na-eji nwayọọ nwayọọ enwe ike ịrụkwu ọrụ ndị ọzọ dị n’ọgbakọ. Onye mbụ ahụ ghara mkpụrụ Alaeze ahụ ga-ewe ihe ubi ya, ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ, ndị o nwere ike ịbụ na ha esoghị ghaa mkpụrụ ahụ mere ka onye ahụ bịa bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst na-esokwa ewe ihe ubi. (Gụọ Jọn 4:36-38.) N’ezie, ‘onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi na-aṅụrịkọ ọṅụ.’

Ihe Ndị Anyị Na-amụta n’Ihe Ndị A Taa

18, 19. (a) Olee otú ntụle a anyị tụlere ihe atụ ndị a Jizọs nyere si gbaa gị onwe gị ume? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Olee ihe ndị anyị mụtara site n’ịtụle ihe atụ abụọ a e dekọrọ na Mak isi 4? Anyị mụtara na anyị nwere ọrụ anyị ga-arụ—ọrụ ịgha mkpụrụ. Anyị ekwesịtụghị ikwe ka ihe ọ bụla, ma ọ bụ nsogbu ma ọ bụkwanụ ihe isi ike, mee ka anyị ghara ịrụ ọrụ a. (Ekli. 11:4) Ma n’otu oge ahụ, anyị maara na ọ bụ ihe ùgwù magburu onwe ya iso ná ndị a ga-agụnye ná ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. Ọ bụ Jehova na-eme ka onye e ziri ozi ọma ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst, ọ na-agọzi mgbalị anyị na mgbalị nke ndị nabatara ozi ọma ahụ. Anyị ghọtara na anyị agaghị amanyeli onye ọ bụla ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst. Anyị ekwesịghịkwa inwe nkụda mmụọ ma ọ bụ daa mbà n’obi ma ọ bụrụ na onye ahụ na-ala azụ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ naghịdị enwe ọganihu ọ bụla. Ọ bụ nnọọ ihe na-akasi obi ịmara na ihe Jehova ji ele ihe ịga nke ọma anyị na-enwe n’ozi anyị bụ otú anyị kwesịruru ntụkwasị obi nakwa otú anyị si were ihe ùgwù ahụ o nyere anyị ịga kwusaa ‘ozi ọma nke alaeze ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.’—Mat. 24:14.

19 Olee ihe ọzọ Jizọs kụziri banyere otú onye ka ghọrọ onye na-eso ụzọ ya ọhụrụ si enwe ọganihu nakwa banyere ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ? A zara ajụjụ ahụ n’ihe atụ ndị ọzọ dị n’Oziọma ndị ọzọ dị na Baịbụl. Anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ihe atụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Gụọ ahụmahụ Nwanna Georg Fjölnir Lindal n’ozi o jere n’obodo Iceland bụ́ nke a kọrọ na 2005 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 210-211, nakwa ahụmahụ ndị ohu Jehova ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị tachiri obi jee ozi ná mba Ireland ruo ọtụtụ afọ ma enweghị ihe ozi ha rụpụtara ozugbo, nke a dịkwa na 1988 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 82-99.

^ par. 14 Ọ dịla mgbe a kọwara na magazin a na mkpụrụ ahụ na-anọchi anya àgwà mmadụ nke kwesịrị ịdị na-akawanye mma ruo mgbe ha mara nnọọ mma, bụ́kwanụ nke ọtụtụ ihe na-ekpebi otú ha ga-adị ka oge na-aga. Ma anyị kwesịrị icheta na n’ihe atụ Jizọs ahụ, ọ dịghị mgbe mkpụrụ ahụ bịara ghọọ mkpụrụ ọjọọ ma ọ bụ mkpụrụ rere ure. Naanị ihe o mere bụ ito ruo mgbe ọ kara.—Lee Ụlọ Nche, December 15, 1980, peeji nke 21-23.

^ par. 15 Naanị ebe ọzọ e kwuru ụdị ihe a bụ n’Ọrụ 12:10, bụ́ ebe e kwuru na ọnụ ụzọ ámá e ji ígwè rụọ ‘meghere n’onwe ya.’

Ì Chetara?

• Olee ụzọ ụfọdụ ịgha mkpụrụ nkịtị si yie ikwusa ozi ọma Alaeze?

• Olee otú Jehova si ekpebi ma onye nkwusa Alaeze ò kwesịkwara ntụkwasị obi?

• Olee ihe Jizọs kwuru banyere otú uto mkpụrụ nkịtị si yie uto ime mmụọ?

• Olee otú ‘onye ghara mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi si aṅụrịkọ ọṅụ’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Gịnị mere Jizọs ji jiri onye na-ekwusa Alaeze Chineke tụnyere onye na-agha mkpụrụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ndị ala ahụ dị mma na-anọchi anya ha ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ruo ókè ọnọdụ ha kwere ha

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ọ bụ Chineke nọgidere na-eme ka ọ na-eto